< Zaburi 116 >

1 Nampenda Yahwe kwa kuwa anasikia sauti yangu na kuomba kwangu kwa ajili ya huruma.
Ahụrụ m Onyenwe anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m; ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere.
2 Kwa sababu alinisikiliza, nitamuita yeye ningali ninaishi.
Nʼihi na o gere m ntị, aga m akpọku ya oge ndụ m niile.
3 Kamba za mauti zilinizunguka, na mitego ya kuzimu ilinikabili; niliona dhiki na huzuni. (Sheol h7585)
Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m, oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m; nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m. (Sheol h7585)
4 Kisha niliita kwa jina la Yahwe: “Tafadhali Yahwe, uiokoe nafsi yangu.”
Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị: “O Onyenwe anyị, zọpụta m!”
5 Yahwe ni mwenye neema na haki; Mungu wetu ni mwenye huruma.
Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume. Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko.
6 Yahwe huwalinda wasio na hila; nilishushwa chini akaniokoa.
Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche; mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m.
7 Nafsi yangu inaweza kurudi mahali pake pa kupumzika, kwa kuwa Yahwe amekuwa mwema kwangu.
Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m, nʼihi na Onyenwe anyị emesola gị mmeso ọma.
8 Kwa maana uliokoa uhai wangu dhidi ya kifo, mcho yangu dhidi ya machozi, na miguu yangu dhidi ya kujikwaa.
Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ, anya m site na anya mmiri akwa, napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,
9 Nitamtumikia Yahwe katika nchi ya walio hai.
ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi.
10 Nilimwamini yeye, hata niliposema, “nimeteswa sana.”
Ekwenyere m na Onyenwe anyị mgbe m kwuru sị, “Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,”
11 Kwa haraka nilisema, “Watu wote ni waongo.”
nʼime ịda mba m, ekwuru m sị, “Mmadụ niile bụ ndị ụgha.”
12 Nimlipeje Yahwe kwa wema wake wote kwangu?
Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m?
13 Nitakiinua kikombe cha wokovu, na kuliitia jina la Yahwe.
Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
14 Nitatimiza viapo vyangu kwa Yahwe katika uwepo wa watu wake wote.
Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ mezuo nkwa m kwere Onyenwe anyị.
15 Mauti ya wacha Mungu ina thamani machoni pa Mungu.
Ọnwụ nke ndị nsọ ya dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị.
16 Ee Yahwe, hakika, mimi ni mtumishi wako; mimi ni mtumishi wako, mwana wa mjakazi wako; umefungua vifungo vyangu.
O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị; abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị; ị zọpụtala m site na agbụ e kere m.
17 Nitakutolea dhabihu ya shukrani na nitaliitia jina la Yahwe.
Aga m achụrụ gị aja ekele kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
18 Nitatimiza viapo vyangu kwa Yahwe katika uwepo wa watu wake wote,
Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere,
19 katika nyua za nyumba ya Yahwe, katikati yako, Yerusalemu. Msifuni Yahwe.
nʼime ogige ụlọ Onyenwe anyị, nʼetiti gị, O Jerusalem. Toonu Onyenwe anyị.

< Zaburi 116 >