< Mambo ya Walawi 2 >

1 Yeyote akitoa sadaka ya nafaka kwa Bwana, sadaka yake lazima iwe unga safi, na atamwaga mafuta juu yake na kuweka ubani juu yake.
“‘Mgbe onye ọbụla wetaara Onyenwe anyị onyinye mkpụrụ ọka, onyinye ya ga-abụ nke ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma. Ha ga-awụkwasị ya mmanụ oliv, tinyekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ya,
2 Atachukua sadaka kwa wana wa Haruni, makuhani na pale kuhani atachukua konzi moja ya unga safi pamoja na mafuta na ubani. Kisha kuhani atateketeza hiyo sadaka juu ya madhabahu kuwa shukrani kwa uzuri wa Bwana. Italeta harufu nzuri sana kwa Bwana, itakuwa sadaka ya Bwana iliyotolewa kwa moto.
ọ ga-ebutere ya ụmụ Erọn ndị nchụaja. Onye nchụaja ga-ekpoju ụtụ ọka na mmanụ ahụ nʼaka, tinyekwara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile ahụ, kpọọ ihe ndị a ọkụ dịka oke ncheta nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ ga-abụkwa onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị.
3 Unga wowote uliobaki utakuwa ni wa Haruni na watoto wake. Ni takatifu sana kwa Bwana iliyotolewa sadaka kwa Bwana kwa moto.
Ma nke fọdụrụ nʼonyinye ọka ahụ bụ nke Erọn na ụmụ ya. Ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ nke onyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu Onyenwe anyị.
4 Kisha utakapotoa sadaka ya unga bila chachu iliyookwa kweye kiokeo, itakuwa mkate lainiya unga safi uliochanganywa na mafuta, au mkate mgumu usiokuwa na chachu, ambao umesambazwa na mafuta.
“‘Ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ achịcha eghere nʼite e ji eghe ihe, ọ ga-abụ nke e ji ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma mee. Ọ ga-abụ ogbe achịcha agwara mmanụ oliv nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, maọbụ achịcha mbadamba e tere mmanụ nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
5 Kama matoleo yako ya nafaka yameokwa na kikaango cha chuma ni lazima iwe unga safi bila chachu uliochanganywa na mafuta.
Ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ achịcha e ghere eghe, achịcha ahụ aghaghị ịbụ nke e mere site nʼezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma, nke a gwakọtara mmanụ, nke na-enweghị ihe na-eko achịcha nʼime ya.
6 Utagawanya katika vipande na kumwaga mafuta juu yake. Hii ni sadaka ya nafaka.
Nyawasịa ya, wụkwasị ya mmanụ nʼelu, ọ bụkwa onyinye mkpụrụ ọka.
7 Kama sadaka yako ya nafaka imepikwa katika kikaango, ni lazima iwe imetengenezwa kwa unga safi na mafuta.
Ọ bụrụ na onyinye mkpụrụ ọka gị bụ ihe e siri nʼite, ọ ghaghị ịbụ ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma, e tinyetụrụ mmanụ oliv.
8 Utaleta matoleo ya nafaka yaliyotengenezwa kwa vitu hivi kwa Bwana, italeta kwa kuhani, ambaye ataleta mbele ya madhabahu.
Ị ga-ebute onyinye mkpụrụ ọka ahụ bunye ya onye nchụaja. Ọ ga-eche ya nʼihu Onyenwe anyị nʼebe ịchụ aja.
9 Ndipo kuhani atachukua baadhi ya sadaka ya nafaka ya shukrani ya Bwana, ataitekeza katika madhabahu. Itakuwa sadaka ya kuteketezwa kwa moto, italeta harufu nzuri kwa Bwana.
Onye nchụaja ga-ekporo ụfọdụ nʼaka dịka oke ncheta nʼime onyinye ọka ahụ, kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka aja e surere nʼọkụ, nke isisi ya na-atọ Onyenwe anyị ezi ụtọ.
10 Itakayobaki sadaka ya nafaka itakuwa ya Haruni na wanawe. Itakuwa takatifu kamili ya Bwana kutoka matoleo kwa Bwana yatolewayo kwa moto.
Ma nke fọdụrụ nʼonyinye ọka ahụ bụ nke Erọn na ụmụ ya. Ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ nke onyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu Onyenwe anyị.
11 Sadaka ya nafaka itolewayo kwa Bwana isiwe na chachu, hautatekeza chachu wala asali kama matoleo yatakayotekezwa kwa moto kwa ajili ya Bwana.
“‘Unu etinyela ihe na-eko ọka ọbụla nʼonyinye mkpụrụ ọka unu na-enye Onyenwe anyị, nʼihi na unu ekwesighị ịkpọ ihe na-eko achịcha maọbụ mmanụ aṅụ ọkụ nʼonyinye nsure ọkụ unu na-enye Onyenwe anyị.
12 Utayatoa kwa Bwana kama mazao ya kwanza, lakini hayatatumika kama matoleo ya harufu nzuri ya moto juu ya madhabahu.
Unu nwere ike nye Onyenwe anyị achịcha e ji ihe na-eko achịcha na mmanụ aṅụ mee nʼoge onyinye owuwe ihe ubi, ma a gaghị eme otu a nʼoge onyinye ọchụchụ aja nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ.
13 Utaweka chumvi katika kila matoleo yako ya nafaka. Usipungukie chumvi ya agano la Bwana katika matoleo yako ya unga. Matoleo yako yote hayatapungukiwa na chumvi.
Unu aghaghị itinye nnu nʼime onyinye mkpụrụ ọka ọbụla unu na-enye. Unu ahapụla ọgbụgba ndụ Chineke unu nʼonyinye mkpụrụ ọka unu. Tinyenụ nnu nʼonyinye unu niile.
14 Kama ukitoa matoleo ya nafaka ya mazao ya kwanza kwa Bwana, utatoa nafaka mbichi yaliyookwa kwa moto, na yaliyopondwa.
“‘Ọ bụrụ na onyinye mkpụrụ ọka ị na-ewetara Onyenwe anyị bụ mkpụrụ mbụ nke ubi gị, site nʼọka ọhụrụ gị weta ọka a sụrụ asụ, maọbụ nke a hụrụ nʼọkụ.
15 Lazima utaweka mafuta na ubani juu yake. Haya ni matoleo ya nafaka.
Tinye ya mmanụ na ụda na-esi isi ụtọ. Ọ ga-abụ onyinye ọka.
16 Kuhani atatoa sehemu ya nafaka iliyopondwa na mafuta na ubani, kama sadaka ya shukrani itolewayo kwa uzuri wa Bwana. Hii ni sadaka ya Bwana inayotolewa kwa moto.
Onye nchụaja ga-ewere oke ncheta nʼime ọka ahụ a sụrụ asụ, nke a gwara mmanụ na ụda na-esi isi ụtọ, dịka onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.

< Mambo ya Walawi 2 >