< Waamuzi 16 >

1 Samsoni alikwenda Gaza na akamwona kahaba huko, naye akalala pamoja naye.
Otu ụbọchị, Samsin gara nʼotu obodo ndị Filistia a na-akpọ Gaza, soro otu nwanyị akwụna bi nʼebe ahụ hie ụra abalị.
2 Watu wa Gaza wakaambiwa, “Samsoni amekuja hapa.” Watu wa Gaza wakazunguka mahali hapo kwa siri, wakamngoja usiku wote katika lango la jiji. Walikaa kimya usiku wote. Wakisema, “Hebu tusubiri mpaka mchana, na kisha tumwuue.”
A gwara ndị Gaza sị, “Samsin nọ nʼobodo a.” Nʼihi ya, ha gbara ebe ahụ gburugburu ma nọdụ na-eche nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ abalị niile. Ọ dịghị ihe ha mere nʼabalị ahụ nʼihi na ha zubere sị, “Mgbe chi bọrọ, anyị ga-egbu ya.”
3 Samsoni akalala kitandani mpaka usiku wa manane. Usiku wa manane akaamka na akashika mlango wa jiji na miimo yake miwili. Akavivuta kutoka nje, komeo na vyote, akaviweka kwenye mabega yake, akavichukua hadi juu ya kilima, mbele ya Hebroni.
Ma Samsin dinara nʼụlọ nwanyị akwụna ahụ ruo nʼetiti abalị ahụ. Mgbe ọ pụtara, ọ gara ruo nʼọnụ ụzọ obodo ahụ, foro ibo ọnụ ụzọ obodo ahụ, ya na ibo ya abụọ, bukwasị ya nʼubu ya, buru ha gaa nʼelu ugwu chere obodo Hebrọn ihu.
4 Baada ya hayo, Samsoni alimpenda mwanamke aliyeishi katika bonde la Soreki. Jina lake alikuwa Delila.
Ọ dịghị anya, Samsin hụrụ otu nwaagbọghọ, onye ọ hụrụ nʼanya. Aha nwaagbọghọ a bụ Delaịla, onye si nʼobodo dị na Ndagwurugwu Sorek.
5 Wale wakuu wa Wafilisti wakamwendea, wakamwambia, “mdanganye Samsoni ili uone mahali zilipo nguvu zake kuu, na kwa namna gani tunaweza kumshinda, ili tumfunge na kumtesa. Fanya hili, na kila mmoja wetu atakupa vipande 1, 100 vya fedha.”
Ndị eze ndị Filistia, bịakwutere Delaịla rịọọ ya sị, “Gbalịa lee ma ị ga-enwe ike chọpụta ebe ike Samsin si abịa, ka anyị nwee ike ịmata ụzọ anyị ga-esi jide ya, kee ya agbụ. Ọ bụrụ na i meere anyị nke a, anyị na-ekwe nkwa na onye ọbụla nʼime anyị ga-enye gị puku shekel na narị shekel ọlaọcha.”
6 Ndipo Delila akamwambia Samsoni, “Tafadhali, niambie ni kwa jinsi gani wewe ni mwenye nguvu sana, na kwa namna gani mtu anaweza kukufunga, ili aweze kukudhibiti?”
Nʼihi nke a, Delaịla gwara Samsin okwu sị ya, “Gwa m ebe ike gị si abịa. Gwakwa m otu mmadụ pụrụ isi kee gị agbụ, merie gị.”
7 Samsoni akamwambia, “Ikiwa watanifunga na kamba saba safi ambazo hazijakauka, nitakuwa dhaifu na kuwa kama mtu mwingine yeyote.”
Mgbe ahụ, Samsin zara sị ya, “Ọ bụrụ na mmadụ e jiri akwara eriri asaa dị ọhụrụ, ndị a na-amịkpọghị amịkpọ kee m, m ga-abụkwa onye na-adịghị ike dịka mmadụ ọbụla ọzọ.”
8 Basi wakuu wa Wafilisti wakamletea Delila kamba saba ambazo hazijakauka, naye akamfunga Samsoni.
Ngwangwa, ndịisi ndị Filistia wetara ya eriri asaa dị ọhụrụ ndị a na-amịbeghị nʼanwụ, o weere ha kee Samsin.
9 Sasa alikuwa na watu waliojificha kwa siri, walikaa katika chumba chake cha ndani. Akamwambia, “Wafilisti wako juu yako, Samsoni!” Lakini akazikata kamba kama uzi wakati unapogusa moto. Na hawakujifunza siri ya nguvu zake.
Ma o mere ka ụfọdụ ndị ikom Filistia zoo onwe ha nʼotu akụkụ ụlọ ya. O tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị!” Otu mgbe ahụ kwa, Samsin biliri dọbisie eriri ahụ dịka ọ bụ eriri e ji ogho mee nke bịara ọkụ nso. Ya mere, a chọpụtaghị ebe ike Samsin si abịa.
10 Ndipo Delila akamwambia Samsoni, “Ndivyo ulivyonidanganya mimi na kuniambia uongo. Tafadhali, niambie kwa namna gani unaweza kufungwa.”
Emesịa, Delaịla gwara Samsin sị ya, “Lee, ị kwaala m emo, ghaara m ụgha. Biko, gwa m ụzọ a ga-esi kee gị agbụ.”
11 Akamwambia, “Ikiwa watanifunga na kamba mpya ambayo haijawahi kutumika kwa kazi, nitakuwa dhaifu na kama mtu mwingine yeyote.”
Samsin zara sị ya, “Lee, ọ bụrụ na e jiri ụdọ ọhụrụ nke a na-ejibeghị kee ihe mgbe ọbụla, kee m, aga m adịkwa dịka ndị ọzọ.”
12 Basi Delila alichukua kamba mpya akamfunga pamoja naye, akamwambia, “Wafilisti wako juu yako Samsoni!” Watu waliokuwa wakisubiri walikuwa ndani ya chumba cha ndani. Lakini Samsoni akaondoa kamba kutoka mikono yake kama kilikuwa kipande cha uzi.
Ya mere, Delaịla chịkọtara ụdọ ọhụrụ jiri ya kee ya nke ọma. Ma ụfọdụ ndị ikom Filistia zokwara onwe ha nʼime ime ụlọ ahụ. Ọzọkwa, Delaịla tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị.” Ma Samsin biliri dọbisie eriri ahụ e ji kee ya ka a ga-asị na ọ bụ ogho ka e ji mee ha.
13 Delila akamwambia Samsoni, “Mpaka sasa umenidanganya na kuniambia uongo. Niambie kwa namna gani unaweza kufungwa.” Samsoni akamwambia, 'Ikiwa utavifuma vifungo saba vya nywele zangu na kuvifunga kwenye kitambaa, kisha kufunga kwenye msumari, nitakuwa kama mtu mwingine yeyote.”
Mgbe ahụ, Delaịla gwara ya sị, “Lee, ị na-eme ka abụ m onye nzuzu, ghaara m ụgha. Gwa m eziokwu, otu a ga-esi kee gị agbụ.” Samsin zara sị ya, “Lee, e kewara agịrị isi dị m nʼisi ụzọ asaa, i were ụzọ nkekọta asaa e kekọtara agịrị isi m, kpanyekọtaa ha nʼihe i ji ekwe akwa, were ntu osisi i ji akpachi akwa kpachie ya, mgbe ahụ, aga m adịkwa ka ndị ọzọ.” Mgbe Samsin rahụrụ ụra, Delaịla weere agịrị isi Samsin kpanyekọtaa ya nʼihe o ji ekwe akwa.
14 Alipokuwa amelala, Dalila akavifuma vifungo saba vya nywele zake akavifunga ndani ya kitambaa na kuzifunga kwenye msumari, akamwambia, “Wafilisti wako juu yako, Samsoni!” Aliamka kutoka usingizini akang'oa kitambaa na pini zilizokuwa zimefungwa.
O jikwa ǹtu osisi o ji akpachi akwa, kpachikọtasie agịrị isi Samsin ike. Ọzọ, Delaịla sịrị ya, “Samsin, ndị Filistia abịala ijide gị.” Ma Samsin bilitere nʼike fokọrọ ǹtu osisi ahụ, na ihe eji akpa akwa, na akwa akpara akpa.
15 Akamwambia, “Wawezaje kusema,” Unanipenda, wakati hushiriki siri zako na mimi? Umenidhihaki mara tatu hizi na hukukuambia ni kwa jinsi gani unazo nguvu nyingi.”
Mgbe ahụ, Delaịla gwara ya okwu sị, “Olee ka i si kwuo na ị hụrụ m nʼanya, ebe ọ bụ na i nweghị ike ịgwa m ihe dị gị nʼobi? Lee, ugbo atọ ndị a, i mere m ka m dịka onye nzuzu, ma ị gwabeghị m ebe ike gị dị ruo ugbu a.”
16 Kila siku alisisitiza kwa bidii na maneno yake, naye akamkemea sana kiasi kwamba alitamani kufa.
Delaịla sikwara otu a nyegide Samsin nsogbu tutu ruo mgbe Samsin na-enweghịkwa ike ịnagide nsogbu ya.
17 Basi Samsoni alimwambia kila kitu, akamwambia, “Wembe haujawahi kukata nywele juu ya kichwa changu, kwa maana nimekuwa Mnaziri kwa Mungu kutoka tumboni mwa mama yangu. Ikiwa kichwa changu kitanyolewa, basi nguvu zangu zitaniacha, nami nitakuwa dhaifu na kuwa kama kila mtu mwingine. '
Ya mere, ọ gwara ya ihe niile, “Ọ dịbeghị mgbe agụba ọbụla gara nʼelu isi m, nʼihi na abụ m onye Nazirait, onye e doro nsọ nye Chineke ka m bụ, site nʼafọ nne m. Ọ bụrụkwa na a kpụchapụ agịrị isi m, mgbe ahụ, ike niile dị m nʼahụ ga-apụ. Mgbe ahụ, aga m adịkwa ka ndị ọzọ.”
18 Delila alipoona kwamba amemwambia ukweli juu ya kila kitu, akawatuma na kuwaita watawala wa Wafilisti, akisema, “Njooni tena, kwa maana ameniambia kila kitu.” Ndipo wakuu wa Wafilisti wakamwendea, wakaleta fedha mkononi mwao.
Mgbe Delaịla matara na ọ gwala ya ihe niile, o ziri ozi kpọọ ndịisi ndị Filistia ahụ, sị, “Bịaghachinụ otu ugbu a, nʼihi na ọ gwara m ihe niile.” Ya mere, ndịisi ndị Filistia lọghachiri jiri ego ọlaedo ahụ nʼaka ha.
19 Alimfanya alale katika magoti yake. Alimwita mtu avinyoe vifungo saba vya kichwa chake, naye akaanza kumshinda, kwa maana nguvu zake zilikuwa zimemwacha.
Ma Delaịla mere ka o dinaa nʼapata ụkwụ ya rahụ ụra. Mgbe ahụ, ọ kpọbatara nwoke na-akpụcha isi, ka ọ kpụchapụ agịrị isi niile dị Samsin nʼisi, si otu a mee ka ike ghara ịdịkwa ya. Ike ya hapụrụ ya.
20 Alisema, “Wafilisti wako juu yako, Samsoni!” Aliamka nje ya usingizi wake akasema, “Nitatoka nje kama nyakati nyingine na kujiweka huru.” Lakini hakujua kwamba Bwana amemwacha.
O tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị.” Ma mgbe Samsin bilitere site nʼụra, o chere nʼobi ya, “Aga m apụ ka m si mee na mbụ megharịa arụ ma nwere onwe m.” Ma ọ maghị na Onyenwe anyị ahapụla ya.
21 Wafilisti walimkamata na kumng'oa macho. Wakampeleka Gaza na kumfunga kwa shaba. Alikuwa akisaga ngano katika gerezani.
Ndị Filistia jidere ya, ghụpụ ya anya ya abụọ, duru ya gbadata Gaza. Nʼebe ahụ, ha jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, nye ya ọrụ ịnyagharị igwe na-akwọ ọka nʼụlọ mkpọrọ ha tinyere ya.
22 Lakini nywele juu ya kichwa chake zilianza kukua tena baada ya kunyolewa.
Mgbe na-adịghị anya, agịrị isi ya malitekwara ito ọzọ.
23 Watawala wa Wafilisti walikusanyika ili kutoa dhabihu kubwa kwa Dagoni mungu wao, na kufurahi. Walisema, “mungu wetu amemshinda Samsoni, adui yetu, na kumtia katika ufahamu wetu.”
Ugbu a, ndịisi ndị Filistia niile zukọtara ịchụrụ chi ha bụ Dagọn, aja dị ukwuu, na ịṅụrị ọṅụ, na-asị, “Chi anyị enyela Samsin bụ onye iro anyị nʼaka anyị.”
24 Watu walipomwona, walimsifu mungu wao, kwa sababu walisema, “mungu wetu ameshinda adui yetu na kutupa sisi - mharibifu wa nchi yetu, ambaye aliwaua wengi wetu.”
Mgbe ndị mmadụ hụrụ ya, ha toro chi ha sị, “Chi anyị enyela onye iro anyị nʼaka anyị, onye mere ka ala anyị tọgbọrọ nʼefu gbukwaa ọtụtụ ndị anyị.”
25 Walipokuwa wakisherehekea, wakasema, 'Mwite Samsoni, aje kutufurahisha.' Walimwita Samsoni nje ya jela na akawafanya wacheke. Walimsimamisha katikati ya nguzo.
Mgbe ha ka nọ nʼobi ụtọ, ha tiri mkpu sị, “Dupụtara anyị Samsin, ka o kpaa anyị ọchị.” Ya mere, e dupụtara Samsin site nʼụlọ mkpọrọ ka o meere ha ihe egwuregwu. Ha mere ka o guzo nʼetiti ebe ogidi e ji wuo ụlọ ahụ dị.
26 Samsoni akamwambia yule kijana ambaye alikuwa ameshika mkono wake, 'Niruhusu nishike nguzo zilizoshikilia nyumba hii, ili nipate kuegemea.”
Mgbe ahụ, Samsin sịrị onye na-eji ya nʼaka sị, “Debe m nʼebe m ga-emetụ ogidi ndị ụlọ a na-eguzo na ha aka, ka m nwe ike dabere na ha.”
27 Sasa nyumba ilikuwa imejaa wanaume na wanawake. Watawala wote wa Wafilisti walikuwa huko. Juu ya paa kulikuwa na wanaume na wanawake elfu tatu, ambao walikuwa wakiangalia wakati Samsoni alipokuwa akiwafurahisha.
Nʼoge a, mmadụ ejupụtala nʼime ụlọ ahụ, nwoke na nwanyị; ndịisi ọchịchị ndị Filistia nọkwa nʼebe ahụ. Ndị ọzọ ọnụọgụgụ ha ruru puku atọ, nwoke na nwanyị, nọ nʼelu ụlọ ahụ na-ele Samsin, ebe ọ na-emere ha ihe ọchị.
28 Samsoni akamwita Bwana, akasema, “Bwana MUNGU, nipe nia! Tafadhali niimarishe mara moja tu, Mungu, ili nipate kulipiza kisasi kwa Wafilisti kwa kuchukua macho yangu mawili.
Mgbe ahụ, Samsin kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ sị, “O! Onyenwe m Onyenwe anyị, biko cheta m naanị otu ugbu a. Biko, Chineke, nye m ike nʼotu ohere a m nwere, ka m nwee ike ịbọrọ ọbọ nʼahụ ndị Filistia nʼihi, ọ bụladị, mkpụrụ anya m abụọ.”
29 Samsoni aliweka nguzo mbili katikati ambzo zinashikilia nyumba hiyo, naye akaegemea juu yake, nguzo moja kwa mkono wake wa kuume, na mwingine kwa kushoto kwake.
Mgbe ahụ, Samsin jidesiri ogidi abụọ dị nʼetiti ụlọ ahụ aka ike, aka nri ya nʼotu, aka ekpe ya na nke ọzọ.
30 Samsoni akasema, “Na nife pamoja na Wafilisti!” Alipanda kwa nguvu zake na jengo likaanguka juu ya watawala na juu ya watu wote waliokuwa ndani yake. Hivyo waliouawa wakati alikufa walikuwa zaidi ya wale waliouawa wakati wa maisha yake.
Samsin kpere ekpere sị, “Ka m soro ndị Filistia nwụọ!” O ji ike ya niile nuo ogidi ahụ aka. Otu mgbe ahụ kwa, ụlọ arụsị ahụ dara, dakwasị ndịisi ọchịchị Filistia ndị ahụ, na ndị niile nọ nʼime ụlọ ahụ. Ya mere, ndị niile so Samsin nwụọ nʼoge ahụ dị ọtụtụ karịa ndị Samsin gburu mgbe ọ dị ndụ.
31 Kisha ndugu zake na nyumba yote ya baba yake wakashuka. Wakamchukua, wakamrudisha na kumzika kati ya Sora na Eshtaoli katika mahali pa kuzikwa Manoa, baba yake. Samsoni alikuwa mwamuzi wa Israeli kwa miaka ishirini.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụnna ndị ikom Samsin, na ndị ezinaụlọ nna ya bịara nʼebe ahụ, buru ozu ya. Ha liri ya nʼagbata Zora na Eshtaol, ebe e liri nna ya Manoa. Samsin kpere ụmụ Izrel ikpe iri afọ abụọ.

< Waamuzi 16 >