< Isaya 5 >

1 Acha niimbe kwa mpendwa wangu mzuri, wimbo wa mpendwa wangu kuhusu shamba la mzabibu. Mpendwa wangu ana shamba kwenye mlima wenye rutuba.
Aga m abụ abụ nye onye m hụrụ nʼanya, abụ banyere ubi vaịnị ya. Onye m hụrụ nʼanya nwere ubi ya nʼelu ugwu nta nke bụ ezi ala.
2 Analilima, anaondoa mawe, na anaotesha aina ya mizabibu iliyo bora. Na hujenga mnara katikati ya shamba akichimba shinkizo ndani yake. Anasubiria mzabibu uzae matunda lakini unazaa zabibu mwitu.
O gwuzere ya, wepụsịa okwute niile dị nʼime ya, werekwa mkpụrụ vaịnị mara mma kụọ nʼime ya. O wuru ụlọ nche nʼetiti ya, sitekwa na nkume wapụtakwa ebe ịzọcha mmanya. Emesịa, ọ nọdụrụ chere oge owuwe ihe ubi. Mgbe oge ahụ ruru, ọ chọpụtara na nʼọnọdụ mkpụrụ vaịnị mara mma, ọ bụ ndị jọrọ njọ mịrị.
3 Kwa hiyo sasa, wakazi wa Yerusalemu na watu wa Yuda, toa hukumu kati yangu na shamba la mzabibu.
“Ugbu a, ndị ikom Jerusalem na Juda, unu anụla ihe mere. Kpebienụ ikpe a dị nʼetiti mụ na ubi vaịnị m.
4 Je ni kitu gani cha ziada unaweza ukakifanya kwenye shamba langu la mizabibu, ambacho sijakifanya? ninapotamzamia izae matunda, kwa nini inazaa matunda mwitu?
Olee ihe ọzọ m gaara emere ya karịa ihe m mere? Gịnị mere ubi vaịnị m ji mịara m mkpụrụ jọrọ njọ nʼọnọdụ mkpụrụ na-atọ ụtọ?
5 Sasa nitawambia kitu nitakacho kifanya kwenye shamba langu la mzabibu: nitaondoa uzio, nitaligeuza kuwa malisho, Nitavunja ukuta wake chini. Na itakanyagwa chini.
Ugbu a, lee, ihe m na-aga ime ubi vaịnị m a. Aga m ewepụ ihe mgbochi a gbara ya, hapụ ya ka ọ ghọọ ebe anụ ụlọ na-ata nri. Aga m etida mgbidi ya hapụ ya ka ọ bụrụ ebe a na-azọtọ ụkwụ.
6 Nami nitaliharibu wala halitapaliliwa wala kuilmwa, bali litatoa mbigiri na miba; nami nitayaamuru mawingu yasinyeshee mvua juu yake.
Agaghị m akwachakwa ya ọzọ. Agakwaghị m egwuru ya ala, aga m ahapụ ya ka ogwu na uke too nʼime ya. Aga m enyekwa igwe ojii iwu ka mmiri ghara izokwasị ya ọzọ.”
7 Maana shamba la mzabibu la Yahwe Bwana wa majeshi ni nyumba ya Israeli, na mtu wa Yuda ndio mazao yake ya kupendeza; anaisubiria haki lakini badala ya yaki kuna mauwaji; maana haki, lakini badala yake ni kelele zikihitaji msaada.
Ubi vaịnị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ mba Izrel na ndị Juda, ha bụ vaịnị ahụ nke nʼatọ obi ya ụtọ. Ma o lere anya ikpe ziri ezi, ma ihe ọ hụrụ bụ iwusi ọbara. O lere anya ezi omume, ma ihe ọ nụrụ bụ mkpu akwa ndị a na-emegbu emegbu.
8 Ole wao wanaoungana nyumba kwa nyumba, shamba kwa shamba, mpaka wanamaliza, na umebaki mwenyewe kwenye shamba!
Ahụhụ dịrị unu ndị na-azụkọta ala ma ndị ọzọ ahụghị ebe ha ga-ebi, unu ndị na-ewu ụlọ na-ewukwasị ụlọ nʼala buru ibu, ime ka ọ bụrụ naanị unu bi nʼụwa.
9 Yahwe wa majeshi ameniambia mimi, nyumba nyingi zitakuwa wazi, hata kubwa na zinazovutia, hakuna mwenyeji yeyote.
Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ihe banyere unu, na ọnọdụ unu. Eji m ntị m abụọ nụ mgbe ọ na-asị, “Nʼezie, ọtụtụ ụlọ mara mma ga-atọgbọrọ nʼefu, ụlọ ukwu mara mma ndị nwe ha agaghị anọkwa.
10 Maana mashamba ya mizabibu la nira kumi lilitoa bathi moja tu, na homeri ya mbegu itatoa efa tu.
Ubi vaịnị ahụ a ga-eji ehi abụọ kọọ ụbọchị iri ga-ewepụta naanị ihe nwere ike iru galọọnụ mmanya isii, ma ọka a kọrọ, nke ruru akpa ọka atọ ga-amịpụta ihe ruru otu akpa nʼọkara.”
11 Ole wao wanaoamka asubuhi na mapema kutafuta pombe kali, wale wanaokaa usiku wa manane mpaka pombe inawaka moto.
Ahụhụ ga-adịrị unu niile ndị na-ebili nʼisi ụtụtụ ịgbaso mmanya. Ndị na-amụgide anya abalị tutu ruo mgbe ha ṅụbigara mmanya oke.
12 Wanasherekea kwa kinubi, kinanda, kigoma, filimbi, na mvinyo, lakini hawazitambui kazi za Yahwe, wala hawaziangalii kazi za mikono yake.
Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une, na ihe iti egwu na opi, na mmanya na-eme onwe unu obi ụtọ nʼoge mmemme oriri unu, ma unu na-elelị Onyenwe anyị anya; unu adịghịkwa asọpụrụ akaọrụ ya.
13 Kwa hiyo watu wangu wameenda kifungoni kwa kukosa uelewa; viongozi wao wakuheshimiwa wanashinda na njaa, na watu wao hana kitu cha kunjwa.
Nʼihi ya, ndị m ga-eje biri na mba ọzọ, nʼihi amaghị ihe; ndị ọkwa ha dị elu ga-anwụ nʼihi agụụ, ndị mmadụ efu ga-abụ ndị akpịrị ga-akpọ nkụ nʼihi agụụ mmiri.
14 Hivyo basi kuzimu kumeongeza ladha yake na imefungua kinywa chake kwa kiasi kikubwa; wasomi wao, viongozi wao, manabii na wenye furaha miongoni mwao, watashuka kuzimu. (Sheol h7585)
Nʼihi ya, ala mmụọ na-eme ka ọchịchọ ya saa mbara, ọ na-asaghebigakwa ọnụ ya oke; ndị ukwu na ndị nta bi nʼime ala a ka ọ ga-elo, tinyere ndị na-emebiga mkpọtụ oke, na ndị na-egwuribiga egwu ọṅụ oke. (Sheol h7585)
15 Mtu atalazimishwa kuinama chini, na watu watakuwa wayenyekevu; na macho yao ya kujivuna yatatupwa chini,
Nʼụbọchị ahụ, a ga-eweda nʼala ndị dị elu, na ndị dị ala, ndị mpako ka a ga-eweda nʼala.
16 Yahwe wa majeshi atainuliwa katika haki yake, na Mungu mtakatifu atajidhirisha kuwa mtakatifu kwa haki yake.
Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee ọnọdụ dịkarịsịrị elu, nʼihi ikpe ikpe ziri ezi ya, Chineke onye dị nsọ na-egosikwa onwe ya na ọ dị nsọ site nʼezi omume ya.
17 Ndipo kondoo watalishwa kama wako kwenye malisho yao wenyewe, na katika uharibifu, kondoo watachungwa kama wageni.
Mgbe ahụ, ụmụ atụrụ ga-akpa nri ha dị ka ọ bụ nʼọzara ka ha nọ, ehi na anụ ụlọ ga-akpa nri ha nʼụlọ ndị ọgaranya niile e tikpọrọ etikpọ.
18 Ole wao wanaovuta pamoja na waovu kwa kamba isiyo na maana na wanaovuta pamoja na dhambi kwa kamba za gari.
Ahụhụ ga-adịrị ndị ji aghụghọ na-adọkpụgharị mmehie ha; ahụhụ dịkwara ndị na-adọkpụgharị ajọ omume ha dịka ụdọ eji adọkpụgharị ụgbọala.
19 Ole kwa wale wasemao, '' Basi na Mungu afanye haraka, basi afanya upesi, ili tuweze kuona kinachotokea; na tuache mipango ya Mtakatifu wa Israeli ije, ili tuifahamu.''
Nye ndị ahụ na-asị “Ka Chineke mee ngwa; ya rụọ ọrụ ya ọsịịsọ, ka anyị hụ ya. Atụmatụ nke Onye nsọ nke Izrel, ka ọ bịaruo nso, ka ọ pụta ìhè, ka anyị nwe ike mara ihe o zubere.”
20 Ole wao waitao uovu wema, na wema ni uovu; inayowakilisha giza kama mwanga, na mwanga kama giza; inayowakilisha kitu kichungu kama kitamu, na kitamu kama kichungu!
Ahụhụ dịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ, ndị na-etinye ọchịchịrị nʼọnọdụ ìhè na ìhè nʼọnọdụ ọchịchịrị ndị na-etinye ihe dị ilu nʼọnọdụ ihe ụtọ, na ihe ụtọ nʼọnọdụ ihe ilu.
21 Ole kwa wale wenye busara machoni mwao, na buasra kwa uelewa wao!
Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe nʼanya nke onwe ha, ndị na-elekwa onwe ha anya na ha bụ ndị nwere nghọta.
22 Ole wao ambao ni washindi kwa kunjwa mvinyo, na wazoefu wa kuchanganya pombe kali;
Ahụhụ ga-adịrị ndị bụ dike nʼịṅụ mmanya, na ndị bụkwa dimkpa nʼịgwakọta mmanya,
23 ambao wako huru kumpa haki mtenda maovu, na kuwanyima haki wenye haki!
ndị na-asị onye ikpe maara nʼikpe amaghị ya nʼihi ịnata ngarị, ma wezuga ikpe ziri ezi site nʼebe onye aka ya dị ọcha nọ.
24 Hivyo basi kama ndimi za moto zinazokula mabua, kama majani makavu yanavyochomwa na moto, hivyo basi mizizi yake itaoza na maua yake yataperuka kama mavumbi. Hii itatokea kwa sababu wameikataa sheria ya Yahwe wa majeshi, na kwa sababu wamedharau neno la Mtakatifu wa Israeli.
Nʼihi ya, dịka ire ọkụ si erechapụ ahịhịa ọka, na dịka ahịhịa kpọrọ nkụ si ada nʼime ọkụ na-enwu enwu, otu a ka mgbọrọgwụ ha ga-ere ure okoko ha ka ikuku ga-ebufu dịka uzuzu; nʼihi na ha ajụla iwu niile Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nyere, lelịakwa okwu nke Onye nsọ Izrel.
25 Hivyo basi hasira ya Yahwe imewaka juu ya watu wake. Ameunyoosh mkono wake juu yao na kuwaadhibu wao. Milima inatikisika, na maiti ni kama takata mitaani. Katika mambo yote haya, hasira yake haijapungua; badala yake, ameonyoosha mkono wake nje.
Nʼihi nke a, iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide ndị ya; o setịpụrụ aka ya na-etitu ha nʼala. Ugwu niile ga-ama jijiji, ozu ndị ahụ dịka ihe na-abaghị uru nʼokporoụzọ niile. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
26 Atapandisha bendera ya ishara mabali na mataifa na atapuliza filimbi kwa wale walio mwisho wa nchi. Tazama watakuja wakikimbia mara moja.
Ọ ga-eweli ọkọlọtọ nye mba niile dị nʼebe dị anya, ọ na-akpọkọta ndị niile nọ na nsọtụ ụwa. Ma lee, ka ha na-abịa, ha na-eme ngwa bịa ọsịịsọ.
27 Hakuna tairi wala mashaka miongoni mwao; hakuna asinzae wala kulala usingizi. Au kama mkanda uliolegea, wala kamba za viatu kukatika.
Ọ dịghị onye na-ada mba, ọ dịkwaghị onye nʼasụ ngọngọ nʼime ha, ọ dịghị onye nʼatụ oru ụra maọbụ rahụ ụra, ọ dịghị ihe ike nʼukwu ha nke tọpụrụ atọpụ ọ dịghị ihe ikechi akpụkpọụkwụ nke dọbiri adọbi.
28 Mishale yao ni mikali na upinde wao umejikunja; kwato za farasi wao' ni kama jiwe, na gari lao magurudumu yake ni kama miba.
Àkụ ha niile dị nkọ, ekweela ụta ha niile, ụkwụ ịnyịnya dị ka nkume ọkụ, ụkwụ ụgbọ agha ha dị ka oke ifufe.
29 Mngurumo wao utakuwa kama wa simba, wataunguruma kama mtoto wa simba. Watanguruma na kukamata mawindo na kuvuta mbali, na hakuna hatakayeokolewa.
Ha na-ebigbọ dịka ọdụm, ha na-ebigbọkwa dịka ụmụ ọdụm; ha na-asụ mgbe ha wụkwasịrị nʼelu ihe ndọgbu. Ha na-ejide ndị m, kpụrụ ha laa, ọ dịkwaghị onye nnapụta ha nwere.
30 Siku hiyo ataunguruma juu ya mawindo kama vile bahari kwa kishindo. Yeyote atakayeangalia nchi, ataona giza na mateso; hata mwanga hutafanjwa kuwa mweusi kwa mawingu.
Nʼụbọchị ahụ, ha ga-ebigbọ nʼelu ya dịka mbigbọ nke oke osimiri. A sịkwa na mmadụ elegide ala ahụ anya, ọ ga-ahụ na ọchịchịrị na ihe mgbu, ọ bụladị anyanwụ ka igwe ojii ga-eme ka ọ gbaa ọchịchịrị.

< Isaya 5 >