< Isaya 16 >

1 Mpeleke mwana kondoo kuongoza nchi kutoka Sela huko jangwani, kwenye mlima wa binti Sayuni.
Ziganụ ụmụ atụrụ dịka onyinye nye onye na-achị ala ahụ site na Sela, gafee nʼụzọ ọzara ruo ugwu nke Ada Zayọn.
2 Kama ndege wazururao, viota vimetapakaa, hivyo basi wanawake wa Moabu watavuka kwenye mto Arnoni.
Ndị inyom Moab nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn na-akwụgharị dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ.
3 Toa maelekezo, tekeleza haki; toa kivuli kama usiku wakati wa mchana; wahifadhi watuhumiwa; msiwahini watuhumiwa.
Moab na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,” “Kwubie okwu nʼihe ị kpebiri. Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalị nʼetiti oke ehihie. Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ, ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe.
4 Waache waishi miongoni mwenu, wakimbizi kutoka Moabu; muwe mahali pakujifichia wao wasiangamizwe.'' maana mateso yatakwisha, na uharibifu utapungua utakuwa na kikomo, wale wanotetemeka watapotea katika nchi.
Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu, ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.” Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ, mbibi ga-akwụsịkwa, onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ.
5 Kiti cha enzi kitaanzishwa katika agano la uaminifu; na mmoja katika hema la Daudi atakaa pale kwa uaminifu. Atahukumu kwa kufuata haki na atatenda haki.
A ga-ehiwe otu ocheeze site nʼịhụnanya; otu nwoke ga-anọkwasị nʼelu ya site nʼikwesị ntụkwasị obi, otu onye sitere nʼụlọ ikwu Devid, bụ, onye mgbe ọ na-ekpe ikpe, na-achọ ikpe ziri ezi, na-emekwa ngwa ime ezi omume.
6 Tumesikia kiburi cha Moabu, kiburi chake, majivuno yake, na hasira yake. Lakini majivuno yake ni maneno tu.
Anyị anụla akụkọ banyere Moab, nụkwa ihe banyere nganga ya na aghụghọ ya niile. Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi? Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ.
7 Hivyo basi Moabu atalia juu ya Moabu-wote watalia! wataomboleza, nyie mlioharibiwa kabisa, mikate ya Kira Haresethi.
Ya mere, ndị Moab niile na-eti mkpu akwa, ha na-ebetara Moab akwa. Kwasie akwa ike, nwee mwute, nʼihi achịcha e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee nke Kia Hereset.
8 Shamba la Heshboni limekauka kabisa pamoja na mizabibu ya Sibma. Kiongozi wa mataifa amekanyaga mizabibu iliyochaguliwa na kuelekea Jazeri na kuelekea jangwani. Mizizi yake nje ya nchi; imenda juu ya bahari.
Lee ka ubi niile nke Heshbọn si tọgbọrọ nʼefu; osisi vaịnị ha niile dị na Sibma akpọnwụsịala. E, ndị eze mba dị iche iche azọdala ọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ. E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo Jeza, ruokwa nʼọzara, nke mgbọrọgwụ ha gbasara ruo nʼọnụ osimiri.
9 Kweli nitalia pamoja Jazeri kwasababu ya shamba la mizabibu la Sibma. Nitakuloanisha kwa machozi yangu, Heshboni, na Eleale. Maana katika mashamba yenu kipindi cha majira ya joto matunda na mazao nitaishia kwa kupiga kelele za furaha.
Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza si akwa akwa nʼihi ubi vaịnị Sibma. Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ gị Heshbọn, na gị Eleale, nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ.
10 Furaha na shangwe zimezimwa na matunda ya miti ya shambani; na hakuna nyimbo wala kelele katika mashamba ya mizabibu, maana nimeweka mwisho wa kupiga kelele kwa yeyote anayetembea.
Ewepụla ọṅụ na obi ụtọ site nʼubi na-amị mkpụrụ ọma, ọ dịghị onye na-abụ maọbụ tie mkpu ọṅụ nʼubi vaịnị a gbara ogige; ọ dịkwaghị onye na-azọchapụta mmanya m vaịnị nʼebe ịzọcha mmanya; nʼihi na emeela m ka iti mkpu ọṅụ niile kwụsị.
11 Hivyo, moyo wangu unalia kama kinubi, na ndani yangu maana kwa ajili ya Kiri Hareseth.
Mkpụrụobi m na-enwe mwute nʼihi Moab dịka ụbọ akwara, ime mmụọ m kwa nʼihi Kia Heres.
12 Pindi ambapo Moabu wamejivika mahali pa juu, na kuingia katika hekalu kuomba, maombi yake hayatatimiza chochote.
Mgbe Moab ga-egosipụta onwe ya nʼebe ya dị elu, ọ na-eme naanị ka ike gwụ ya, mgbe ọ ga-aga ikpe ekpere nʼihu mmụọ ya, o nweghị uru nke a ga-abara ha.
13 Haya ndio maneno aliyoyazungumza Yahwe kuhusu Moabu iliyopita.
Ihe ndị a niile bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Moab na mbụ,
14 Tena Yahwe amesema, ''Ndani ya miaka mitatu utukufuwa Moabu utatoweka; japo watu wake wengi, watakao bakia ni wachache, na wasionafaida.
ma ugbu a Onyenwe anyị na-ekwu, sị, “Tupu afọ atọ agachaa, dịka onye e goro ọrụ si agụ afọ, a ga-eleli ugwu niile Moab nwere, ya na igwe mmadụ ya bara ụba. Ndị fọdụkwara ndụ ga-adị naanị mmadụ ole na ole bụrụkwa ndị na-adịghị ike.”

< Isaya 16 >