< Mwanzo 9 >

1 Kisha Mungu akambariki Nuhu na wanawe, na kuwaambia, “Zaeni, mkaongezeke, na muijaze nchi.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke gọziri Noa na ụmụ ya sị ha: “Mụọnụ, baanụ, jupụtanụ nʼụwa.
2 Hofu na utisho wenu vitakuwa juu ya kila mnyama aliye hai juu ya nchi, juu ya kila ndege wa angani, juu ya kila kitu kiendacho chini juu ya ardhi, na juu ya samaki wote wa baharini. Vimetolewa katika mikono yenu.
Egwu unu na ụjọ unu ga-adakwasị anụmanụ niile nke ụwa nke dị ndụ, na anụ ufe niile nke eluigwe, na ihe e kere eke niile na-akpụgharị nʼala, na azụ niile dị nʼosimiri. Ewerela m ha niile nyefee unu nʼaka.
3 Kila kitu kiendacho kilicho hai kitakuwa chakula kwa ajili yenu. Kama nilivyo wapa mimea, sasa nawapa kila kitu.
Ihe ọbụla dị ndụ nke na-ejegharị ejegharị ga-abụ nri unu. Enyela m unu ihe niile ugbu a dịka m si nye unu ahịhịa ndụ niile.
4 Lakini msile nyama pamoja na uhai wake - yaani damu yake - ndani yake.
“Ma unu agaghị eri anụ ọbụla nke ọbara ndụ ya dị ya nʼahụ.
5 Lakini kwa ajili ya damu yenu, uhai uliomo katika damu yenu nitataka malipo. Kutoka katika mkono wa kila mnyama nitaitaka. Kutoka katika mkono wa kila mtu, yaani, kutoka katika mkono wa yule ambaye amemuua ndugu yake, nitataka fidia kwa ajili ya uhai wa mtu huyo.
Ma gbasara ọbara ndụ unu, unu ga-asara ọnụ unu nʼihu m. Anụmanụ ọbụla ga-asara ọnụ ya nʼihu m. Mmadụ ọbụla kwa ga-asara ọnụ ya nʼihu m banyere ndụ mmadụ ibe ya.
6 Yeyote amwagaye damu ya mtu, kwa njia ya mtu damu yake itamwagwa, kwa sababu ilikuwa ni katika mfano wa Mungu kwamba Mungu alimuumba mtu.
“Onye ọbụla wufuru ọbara mmadụ, nʼaka mmadụ ka a ga-awụfu ọbara nke ya, nʼihi nʼoyiyi Chineke ka Chineke mere mmadụ.
7 Na hivyo nanyi zaeni na kuongezeka, sambaeni katika inchi yote na muongezeke juu yake.”
Ma unu onwe unu, mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ ụwa, baakwanụ ụba nʼime ya.”
8 Kisha Mungu akazungumza na Nuhu na wanae pamoja naye, akisema,
Chineke gwara Noa na ụmụ ya sị,
9 “Kwa ajili yangu, sikiliza! Ninakwenda kulithibitisha agano langu pamoja nawe na uzao wenu baada yenu,
“Ugbu a, ana m ehiwe ọgbụgba ndụ nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti agbụrụ unu ndị ga-anọchi unu,
10 na kwa kila kiumbe hai kilicho pamoja nawe, pamoja na ndege, mnyama wa kufugwa, na kila kiumbe cha nchi pamoja nawe, kuanzia kwa wote waliotoka kwenye safina, mpaka kwa kila kiumbe hai juu ya nchi.
na nʼetiti ihe niile nwere ndụ nke unu na ha so, ụmụ anụ ufe, na ụmụ anụ ụlọ, na ụmụ anụ ọhịa niile, ndị ahụ niile so unu si nʼụgbọ mmiri pụta, bụ ihe niile nwere ndụ nʼụwa.
11 Kwa sababu hii ninalithibitisha agano langu pamoja nanyi, kwamba hapatatokea kuangamizwa kwa mwenye mwili kwa njia ya maji ya gharika. Tena hapatatokea gharika ya kuangamiza nchi.”
Ebe ọ bụ na m ehiwela ọgbụgba ndụ m nʼetiti mụ na unu, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri kpochapụ ihe niile e kere eke, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri bibie ụwa.”
12 Mungu akasema, “na hii ndiyo ishara ya agano ambalo ninafanya kati yangu na ninyi pamoja na kila kiumbe hai kilicho pamoja nanyi, kwa vizazi vyote vya baadaye:
Chineke kwuru sị, “Nke a bụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ nke m na-etinye nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti ihe niile nwere ndụ so unu, ọgbụgba ndụ nke ga-adị nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu.
13 Nimeweka upinde wangu wa mvua katika wingu, na itakuwa ndiyo ishara ya agano kati yangu na nchi.
Etinyela m eke na egwurugwu m na mbara eluigwe, ka ọ bụrụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na ụwa.
14 Hata itakuwa nitakapoleta wingu juu ya nchi na upinde wa mvua ukaonekana katika wingu,
Mgbe ọbụla m zitere igwe ojii nʼụwa, ọ bụrụ na eke na egwurugwu apụta ìhè na mbara eluigwe,
15 ndipo nitakumbuka agano langu, ambalo ni kati yangu na ninyi na kila kiumbe hai cha wote mwenye mwili. Maji hayatafanyika tena gharika kuharibu wote wenye mwili.
aga m echeta ọgbụgba ndụ m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke. Ọ gaghị emekwa ọzọ na mmiri ga-aghọ uju mmiri ibibi ihe niile nwere ndụ.
16 Upinde wa mvua utakuwa katika mawingu na nitauona, ili kukumbuka agano la milele kati ya Mungu na kila kiumbe hai cha wote wenye mwili ambacho kiko juu ya nchi.”
Mgbe ọbụla eke na egwurugwu pụtara nʼigwe ojii, aga m ahụ ya cheta ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke dị nʼetiti Chineke na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke nọ nʼelu ụwa.”
17 Kisha Mungu akamwambia Nuhu, “Hii ni ishara ya agano ambalo nimelithibitisha kati yangu na wenye mwili wote ambao wako juu ya nchi.”
Chineke gwara Noa sị, “Nke a bụ ihe ama ọgbụgba ndụ ahụ m hiwere nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ nʼụwa.”
18 Wana wa Nuhu ambao walitoka katika safina walikuwa ni Shemu, Hamu, na Yafethi. Na Hamu akamzaa kanaani.
Ụmụ ndị ikom Noa ndị si nʼụgbọ mmiri pụta bụ Shem, Ham na Jafet. (Ham bụ nna Kenan.)
19 Watatu hawa walikuwa ndio wana wa Nuhu, na kutokea kwa hawa nchi yote ikajaa watu.
Ndị a bụ ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ọ bụ site na ha ka ndị mmadụ niile gbasara nʼụwa niile si pụta.
20 Nuhu akaanza kuwa mkulima, na akapanda mizabibu.
Noa, onye ọrụ ubi, bidoro ịkụ ubi vaịnị a gbara ogige.
21 Akanywa sehemu ya divai na akalewa. Akawa amelala hemeani uchi.
Mgbe ọ ṅụrụ mmanya si nʼubi a, ṅụbiga ya oke, ọ gbaara ọtọ dinaa ala nʼime ụlọ ikwu ya.
22 Kisha Hamu, baba yake na Kanaani, akaona uchi wa baba yake na akawaambia ndugu zake wawili waliokuwa nje.
Ham, nna Kenan, hụrụ ọtọ nna ya, gaa kọọrọ ụmụnne ya abụọ nọ nʼezi ihe ọ hụrụ.
23 Kwa hiyo Shemu na Yafethi wakachukua kanzu wakaitanda juu ya mabega yao, na wakatembea kinyumenyume na wakaufunika uchi wa baba yao. Nyuso zao zikiwa zimegeuka nyuma upande mwingine, kwa hiyo hawakuona uchi wa baba yao.
Ma Shem na Jafet weere akwa tụkwasị nʼubu ha, were azụ jere ije ruo nʼebe nna ha nọ, hapụ akwa ahụ ka ọ dakwasị nna ha kpuchikwaa ọtọ ya. Ma ha chepuru ihu nʼebe ọzọ mgbe ha na-eme nke a, nʼihi ya, ha elekwasịghị ọtọ nna ha anya.
24 Nuhu alipozinduka kutoka katika ulevi wake, alijua ni jambo gani mtoto wake mdogo amemfanyia.
Mgbe Noa si nʼụra mmanya ya bilie, chọpụta ihe nwa ya nwoke nke nta mere,
25 Hivyo akasema, “Alaaniwe Kanaani. Na awe mtumishi kwa watumishi wa ndugu zake.”
o kwuru sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka Kenan bụ! Ohu ndị ohu, ka ọ ga-abụrụ ụmụnne ya.”
26 Akasema pia, Yahwe, Mungu wa Shemu, abarikiwe, Kanaani na awe mtumwa wake.
Ọ sịkwara, “Ngọzị dịrị Onyenwe anyị Chineke Shem. Ka Kenan bụrụ ohu Shem.
27 Mungu na apanuwe mipaka ya Yafethi, na afanye makazi yake katika hema za Shemu. Kanaani na awe mtumwa wake.”
Ka Chineke mee ka ebe obibi Jafet saa mbara, ka Jafet biri nʼụlọ ikwu Shem, meekwa ka Kenan bụrụ ohu ya.”
28 Baada ya gharika, Nuhu aliishi miaka miatatu na hamsini.
Mgbe uju mmiri ahụ gabigachara, Noa biri ndụ narị afọ atọ na iri afọ ise ọzọ.
29 Siku zote za Nuhu zilikuwa ni miaka mia tisa na hamsini, na kisha alikufa.
Ọnụọgụgụ afọ Noa niile mgbe ọ nwụrụ, bụ narị afọ itoolu na iri afọ ise.

< Mwanzo 9 >