< Mwanzo 18 >

1 Yahwe alimtokea Abraham katika Mialoni ya Mamre, alipokua ameketi mlangoni pa hema wakati wa jua.
Onyenwe anyị gosiri Ebraham onwe ya nʼakụkụ osisi ukwu dị na Mamre, mgbe Ebraham nọdụrụ ala nʼihu ụlọ ikwu ya, nʼetiti ehihie.
2 Akatazama juu na, tazama, akaona wanaume watatu wamesimama mbele yake. Alipo waona, alikimbia kupitia mlango wa hema kuwalaki na kuinama chini hadi ardhini.
O lelitere anya ya hụ ndị ikom atọ ka ha guzo ebe ọ nọ nso. Mgbe ọ hụrụ ha, o sitere nʼihu ụlọ ikwu ya gbakwuru ha izute ha, kpọọ isiala.
3 Akasema, “Bwana, kama nimepata upendelea machoni pako, nakuomba usinipite na kuniacha mtumishi wako.
Ọ sịrị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na m natara amara nʼihu gị, agabigala ohu gị.
4 Naomba maji kidogo yaletwe, mnawe miguu yenu, na mjipumzishe chini ya mti.
Biko, ka ekutere unu mmiri ntakịrị, ka unu sachaa ụkwụ unu, zurukwa ike nʼokpuru osisi a.
5 Nami acha nilete chakula kidogo, ili kwamba mjiburudishe wenyewe. Ndipo baadae mwaweza kwenda zenu, kwa kuwa mmekuja kwa mtumishi wenu.” Nao wakasema, “Fanya kama ulivyo sema.”
Ka m wetara unu nri ntakịrị unu ga-eri nke ga-agba unu ume tupu unu agawa nʼihu nʼije unu ugbu a unu bịara na nke ohu unu.” Ha zara sị ya, “Ọ dị mma. Mee dịka i kwuru.”
6 Kisha Abraham akaenda upesi hemani kwa Sara, na akasema, “Harakisha, chukua vipimo vitatu vya unga safi, uukande, na fanya mkate.”
Ya mere, Ebraham mere ngwangwa banyekwuru Sera nʼụlọ ikwu ya sị ya, “Mee ngwa, mapụta ihe ọtụtụ sịa atọ site na ọka a kwọrọ nke ọma jiri meta achịcha.”
7 Kisha Abraham akakimbia kundini, akachukua ndama wa ng'ombe aliye laini na mzuri, na akampatia mtumishi na kwa haraka akamwandaa.
Mgbe ahụ, Ebraham gbagara nʼigwe ehi ya, họpụta otu nwa ehi na-akaghị aka nke ahụ ya dị mma, nye ya otu ohu ya onye mere ngwangwa gbuo ya, dozie ya maka oriri.
8 Akatwaa siagi na maziwa na ndama aliye kwisha andaliwa, na akaweka chakula mbele yao, naye akasimama karibu nao chini ya mti wakati wanakula.
Emesịa, Ebraham buuru mmiri ara ehi nke rahụrụ arahụ, na mmiri ara ehi, na anụ ahụ a kwadoro dozie ha nʼihu ndị ọbịa ahụ. O guzokwara nso nso ebe ha nọ nʼokpuru osisi ahụ mgbe ha na-eri nri.
9 Wakamwambia, “Mke wako Sara yuko wapi?” akajibu. “pale hemani.”
Ha jụrụ ya sị, “Ebee ka Sera nwunye gị nọ?” Ọ zara sị, “Ọ nọ nʼime ụlọ ikwu.”
10 akasema, “Hakika nitarejea kwako majira ya machipuko, na tazama Sara mkeo atakuwa na mtoto wa kiume.” Sara alikuwa akisikiliza mlangoni pa hema iliyokuwa nyuma yake.
Ọ sịrị ya, “Nʼezie, mụ onwe m ga-alọghachikwute gị nʼoge a nʼafọ ọzọ, Sera nwunye gị ga-amụta nwa nwoke.” Sera guzo nʼime ụlọ ikwu ahụ nke dị nʼazụ Ebraham na-ege ntị nʼihe ha na-ekwu.
11 Abraham na Sara walikuwa wazee, umri wao ulikuwa umeendelea sana, na Sara alikuwa amepita umri ambao mwanamke anaweza kuzaa watoto.
Nʼoge a, Ebraham na Sera emeela nnọọ agadi, gbaakwa isi awọ. Sera agafeela oge ịmụta nwa.
12 Kwa hiyo Sara akajicheka mwenyewe, akijisemesha mwenyewe, “baada ya kuwa nimechakaa na bwana wangu ni mzee, je ni tapata furaha hii?”
Ya mere, mgbe Sera nụrụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ọ chịrị ọchị sị, “Agadi nwanyị dịka m o si aṅaa amụta nwa, ugbu a onyenwe m karala nka?”
13 Yahwe akamwambia Abraham, “Kwa nini Sara amecheka na kusema, Je ni kweli nitazaa mtoto, nikiwa mzee'?
Onyenwe anyị jụrụ Ebraham ajụjụ sị, “Gịnị mere Sera ji achị ọchị? Gịnị mere o ji kwuo sị, ‘Olee otu agadi nwanyị dịka m ga-esi mụọ nwa?’
14 Je kuna jambo lolote gumu sana kwa Yahwe? Itakuwa katika wakati nilioweka mimi majira ya machipuko, nitarejea kwako. Majira haya mwakani Sara atakuwa na mtoto wa kiume.”
Ọ dị ihe nyịrị Onyenwe anyị ime? Mụ onwe m ga-alọghachikwute gị nʼoge a kara aka, Sera nwunye gị ga-amụta nwa nwoke.”
15 Kisha Sara akakataa na kusema, “sikucheka,” kwa kuwa aliogopa. Yahwe akasema, “hapana ulicheka.”
Ma ụjọ tụrụ Sera. Nʼihi ya, ọ gọrọ agọ sị, “Achịghị m ọchị.” Ma Ọ zara sị, “Ọ bụ ezie, Sera, ị chịrị ọchị.”
16 Kisha wale wanaume walisimama kuondoka na wakatazama chini kuelekea Sodoma. Abraham akafuatana nao kuona njia yao.
Mgbe ndị ikom atọ ahụ biliri ibidokwa ije ha, ha chere ihu ịga obodo Sọdọm, Ebraham dupụkwara ha.
17 Lakini Yahwe akasema, Je ni mfiche Abraham kile ninacho kusudia kufanya,
Mgbe ha na-aga nʼụzọ, Onyenwe anyị tulere sị, “O kwesiri ka m zochiere Ebraham ihe m chọrọ ime?
18 Ikiwa kwa hakika Abraham atakuwa mkuu na taifa lenye nguvu, na katika yeye mataifa yote ya dunia watabarikiwa?
Ebraham aghaghị ịbụ mba dị ukwuu dịkwa ike. A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na ya.
19 Kwa kuwa nimemchagua ili awaelekeze wanawe na nyumba yake baada yake waishike njia ya Yahwe, watende utakatifu na haki, ili kwamba Yahwe ampatie Abraham yale aliyo yasema kwake.”
Nʼihi na ahọpụtala m ya, ka ọ tụziere ụmụ ya na ụlọ ya ndị ga-esote ya ịgbaso ụzọ Onyenwe anyị site nʼime ihe dị mma na ihe ziri ezi, ka Onyenwe anyị mezuoro Ebraham ihe niile o kwere ya na nkwa.”
20 Kisha Yahwe akasema, “Kwa sababu kilio cha Sodoma na Gomora ni kikuu, na kwa kuwa dhambi yao ni kubwa,
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru sị, “Mkpu akwa m na-anụ site na Sọdọm na Gọmọra dị ukwuu, otu a kwa, mmehie ha jọbigara njọ oke.
21 sasa nitashuka pale na kuona kilio kilicho nifikia dhidi yake, ikiwa kweli wamefanya au hawakufanya, nitajua.”
Ugbu a, ana m aga ka m jiri anya m hụ ma ihe ha mere ọ dị njọ dịka mkpu akwa m na-anụ si dị. Ma o sighị otu ahụ dịrị, aga m amata.”
22 Kwa hiyo wale wanaume wakageuka toka pale, na kuelekea Sodoma, lakini Abraham akabaki amesimama mbele ya Yahwe.
Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ nʼime ha gawara Sọdọm. Ma Ebraham nọ na-eguzo nʼihu Onyenwe anyị.
23 Kisha Abraham alikaribia na kusema, “Je utawafutilia mbali watakatifu pamoja na waovu?
Ebraham jeruru Onyenwe anyị nso jụọ ya sị, “Uche gị ọ bụ ikpochapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume?
24 Huenda wakawepo wenye haki hamsini katika mji. Je utawakatilia mbali na usiuache mji kwa ajili ya hao watakatifu hamsini walioko hapo?
Ọ bụrụ na ị chọta iri ndị ezi omume ise nʼime obodo ahụ, ị ga-ekpochapụ obodo ahụ? Ị gaghị agbaghara ya nʼihi iri ndị ezi omume ise nọ nʼime ya?
25 Hasha usifanye hivyo, kuwauwa watakatifu pamoja na waovu, ili kwamba watakatifu watendewe sawa na waovu. Hasha! Je muhukumu wa ulimwengu wote hatatenda haki?”
Ọ bụghị ezi ihe na ị ga-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi. Nʼihi na ị gaghị emeso ndị ezi omume dịka i si mesoo ndị na-eme ajọ ihe. O kwesighị ka onye ga-ekpe ụwa niile ikpe, kpee ikpe ziri ezi?”
26 Yahwe akasema, “Katika Sodoma nikipata watakatifu hamsini kwenye mji, nita uacha mji wote kwa ajili ya hao.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara sị ya, “Ọ bụrụ na m achọta iri ndị ezi omume ise nʼobodo Sọdọm, aga m agbaghara obodo ahụ niile nʼihi ha.”
27 Abraham akajibu na kusema, “Tazama, Nimeshika kusema na Bwana wangu, hata kama mimi ni mavumbi na majivu!
Ebraham kwukwara ọzọ sị, “Ugbu a m nwere ike kwuwapụta okwu nʼihu Onyenwe anyị, mụ onye bụ naanị aja na ntụ.
28 Itakuwaje ikiwa kuna watano pungufu katika idadi ya hao watakatifu hamsini? Je utaangamiza mji wote kwa upungufu wa hao watano?” Akasema, “Sitaangamiza, ikiwa nitapata watu arobaini na watano pale.”
Eleghị anya ọ bụrụ na e nweta naanị iri ndị ezi omume anọ na ise, ị ga-emebi obodo ahụ?” Onyenwe anyị zara sị, “Agaghị m ebibi ya ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ anọ na ise nʼime ya.”
29 Akaongea naye tena, na kusema, “Itakuwaje ikiwa arobaini watapatikana pale?” Akajibu, “Sitafanya kwa ajili ya hao arobaini.”
Ọzọkwa, ọ sịrị ya, “Ọ bụrụkwanụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ anọ?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Nʼihi iri mmadụ anọ, agaghị m ebibi ya.”
30 Akasema, Tafadhali usikasirike, Bwana, nikiongea. Pengine thelathini watapatikana pale.” Akajibu, 'Sitafanya, ikiwa nitapata thelathini pale.”
Mgbe ahụ ọ sịrị, “Biko, ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị ma m kwuo okwu. Eleghị anya, achọta naanị iri mmadụ atọ nʼebe ahụ?” Onyenwe anyị zaghachiri sị ya, “Agaghị m emebi ya, ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ atọ nʼime ya.”
31 Akasema, Tazama, Nimeshika kusema na Bwana wangu! Pengine ishirini watapatikana pale.” Akajibu, “Sitaharibu kwa ajili ya hao ishirini.”
O kwuru sị, “Ebe ọ bụ na m amalitela ịgwa gị, Onyenwe anyị okwu, biko kwere ka m gaa nʼihu. Ọ bụrụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ abụọ?” Onyenwe anyị zara sị, “Nʼihi iri mmadụ abụọ ahụ agaghị m emebi ya.”
32 Akasema, “Tafadhali usikasirike, Bwana, na nitasema jambo hili kwa mara ya mwisho. Huenda kumi wakaonekana kule.” Na akasema, sitaangamiza kwa ajili ya hao kumi.”
Nʼikpeazụ, Ebraham kwuru sị, “Ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị. Ka m kwuo naanị otu ugboro a. Ọ bụrụkwanụ na a chọta naanị mmadụ iri nʼebe ahụ?” Onyenwe anyị zara sị, “Nʼihi mmadụ iri ahụ, agaghị m ebibi ya.”
33 Yahwe akaendelea na njia yake mara tu baada ya kumaliza kuongea na Abraham, na Abraham akarudi nyumbani.
Mgbe Onyenwe anyị gwachara Ebraham okwu, ọ hapụrụ ya gawa ebe ọ na-aga. Ebraham laghachiri azụ nʼụlọ ya.

< Mwanzo 18 >