< Ezra 10 >

1 Wakati Ezra akiomba na kutubu, akalia na kujirusha chini mbele ya nyumba ya Mungu, kusanyiko kubwa la wanaume Israel, wanawake na watoto wakakusanyika kwake, kwa kuwa watu walikuwa wakilia sana.
Mgbe Ezra na-ekpe ekpere, na-ekwupụta mmehie ndị a, na-akwa akwa, na-atụ onwe ya nʼala nʼihu ụlọ Chineke, igwe ndị Izrel dị ukwuu, bụ ndị nwoke, na nwanyị, na ụmụntakịrị gbara ya gburugburu soro ya na-akwa akwa dị ilu.
2 Shekania mtoto wa Yehieli, mwana wa Elamu akamwambia Ezra, “Tumekuwa sio waaminifu kwa Mungu na tumeoa wanawake wa kigeni kutoka nchi nyingine. Lakini pamoja na hilo, bado kuna tumaini kwa Israel.
Mgbe ahụ, Shekanaya nwa Jehiel, onye agbụrụ Elam, sịrị Ezra, “Anyị emehiela megide Chineke anyị, nʼihi nʼịlụ ndị inyom mba ọzọ ndị gbara anyị gburugburu. Ma otu ọ dị, olileanya ka dịrị ndị Izrel.
3 sasa natuweke agano pamoja na Mungu wetu kuwaondoa wanawake wote na watoto wao kulingana na maelekezo ya Bwana, na maelekezo ya wale wanaotetemeka kutokana na amri za Mungu wetu. na hii ifanyike kutokana na sheria.
Ugbu a ka anyị gbaa ndụ nʼihu Chineke anyị, izilaga ndị inyom ndị mba ọzọ ndị a na ụmụ ha dịka ndụmọdụ onyenwe m Ezra, na ndị na-atụ egwu iwu Chineke anyị si dị. Ka e mee ihe ndị a dịka iwu si dị.
4 Simama, jambo hili linakuhusu wewe, na sisis tuko pamoja na wewe, Uwe imara na kufanya hili.
Biko, bilie gwa anyị ụzọ anyị ga-esi dozie ihe niile mebiri emebi. Anyị ga-eme ihe i kwuru.”
5 Hivyo Ezra akasimama na kufanya makuhani na walawi na waisrael wote wakaahidi kufanya kwa njia hiyo. Hivyo wote wakatoa kiapo.
Mgbe ahụ, Ezra biliri jụọ ndịisi ndị nchụaja na ndị Livayị, na Izrel niile, ma ha ga-eme ihe Shekanaya kwuru. Ha niile ṅụrụ iyi kwenye na ha ga-eme ya.
6 Ndipo Ezra akainuka kutoka mbele ya nyumba ya Mungu na kwenda kwenye chumba ya Yehohanani mtoto wa Eliashibu, Yeye hakula mkate au kunywa maji. Tangu alipokuwa akiomboleza kuhusiana na wale wenye imani haba waliokuwa uhamishoni.
Mgbe ahụ, Ezra si nʼihu ụlọ Chineke pụọ banye nʼime ọnụụlọ Jehohanan, nwa Eliashib. Mgbe ọ nọ nʼebe ahụ, o righị nri ọbụla, ọ ṅụghị mmiri ọbụla, nʼihi na ọ nọgidere na-eru ụjụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị si nʼebe a dọtara ha nʼagha lọta.
7 Hivyo wakatuma neno katika Yuda na Yerusalem kwa watu wote waliorudi kutoka utumwani kukusanyika Yerusalem.
E zisara ozi na Juda na Jerusalem niile na a chọrọ ịhụ ndị niile si esi lọta na Jerusalem.
8 Yeyote ambaye hakuja katika siku tatu kutokana na maelekezo kutoka kwa wakuu na viongozi atachukuliwa mali zote na atatengwa na kusanyiko kuu la watu ambao walikuja kutoka uhamisho.
Ndịisi na ndị okenye kpebiri na onye ọbụla nke na-abịaghị nʼụbọchị atọ, dịka atụmatụ ha si dị, na a ga-anara onye ahụ akụ niile o nwere, kewapụkwa onye ahụ site na mkpọkọta ndị Izrel e mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ.
9 Hivyo watu wote wa Yuda na Benjamini wakakusanyika Yerusalem kwa siku tatu. Ilikuwa ni mwezi wa tisa na siku ya ishirini ya mwezi. watu wote wakasimama mbele ya nyumba ya Mungu na wakatetemeka kwa sababu ya neno na mvua.
Mgbe ụbọchị atọ ahụ zuru, ndị ikom Juda na Benjamin niile zukọrọ na Jerusalem. Nʼụbọchị nke iri abụọ nke ọnwa itoolu, mmadụ niile zukọrọ nọdụ nʼama dị nʼihu ụlọnsọ Chineke. Mmiri dị ukwuu zoro nʼụbọchị ahụ. Ụjọ tụkwara ndị ahụ niile zukọrọ nʼihi oke mmiri ozuzo ahụ na nʼihi okwu ahụ.
10 Ezra kuhani akasimama na kusema, “Ninyi wenyewe mmefanya uasi, ninyi mmeishi na wanawake wa kigeni na kuongeza makosa ya Israel.
Mgbe ahụ Ezra onye nchụaja, biliri ọtọ, sị ha, “Unu emehiela, nʼihi na unu lụrụ ndị inyom mba ọzọ, si otu a tụkwasị ihe nʼikpe ọmụma dịrị Izrel.
11 Lakini sasa mpeni sifa Yahwe, Mungu wa watangulizi wenu, na mfanye mapenzi yake, mjitenge na watu wa nchi na wanawake wa kigeni.
Ugbu a, sọpụrụnụ Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna unu ha, meekwanụ ihe bụ nzube ya. Kewapụnụ onwe unu site nʼebe ndị mba ọzọ nọ, nakwa ebe nwunye ndị unu si mba ọzọ lụta.”
12 Kusanyiko lote likajibu kwa sauti. “Tutatenda kama ulivyosema,
Nzukọ niile ahụ zara nʼotu olu sị. “Okwu gị ziri ezi, Anyị aghaghị ime dịka i kwuru.”
13 haijalishi, kuna watu wengi na ni kipindi cha mvua. Hatuna nguvu ya kusimama nje na hii si siku moja au mbili za kufanya kazi, kwa kuwa tumekosea katika jambo hili.
Ma ha zakwara sị, “Nke a abụghị ihe anyị ga-eme nʼotu ụbọchị maọbụ nʼụbọchị abụọ, nʼihi na aka ọtụtụ mmadụ nʼime anyị dị na mmehie ahụ. Mmiri na-ezosikwa ike, anyị enwekwaghị ike ịnọgide ruo oge dị anya.
14 Hivyo wakuu wetu wawakilishe kusanyiko lote, iwe kwamba wote walioruhusu wanawake wa kigeni kuishi katika miji yetu waje katika muda uliopangwa na viongozi wa mji na waamuzi wa mji hadi hapo hasira ya Mungu itakapoondoka kutoka kwetu.
Ka ndịisi anyị guzobe mkpọkọta niile. Ka ndị niile nọ nʼobodo anyị ndị lụrụ nwanyị site na mba ọzọ bịa nʼoge a kara aka, ha na ndị okenye na ndị ikpe nke obodo ọbụla, ruo mgbe oke iwe Chineke banyere okwu a sitere nʼebe anyị nọ pụọ.”
15 Yonathan mtoto Asaheli na Yazeya mwana wa Tikwa wakapinga hili, Meshulamu na Shabethai mlawi wakawaunga mkono wao.
Ma ndị na-ekweghị ka e mee ya otu a bụ naanị Jonatan nwa Asahel na Jazeia nwa Tikva, na Meshulam na Shabetai onye Livayị.
16 Hivyo watu waliotoka uhamishoni wakafanya hivi, Ezra kuhani akachagua wanaume, viongozi watamgulizi wa ukoo na nyumba, wao wote kwa majina na wakaliangalia suala hili siku ya kwanza ya mwezi wa kumi.
Ya mere, ndị ahụ niile si esi lọta, mere dịka mkpebi ahụ si dị. Ezra họpụtara ụfọdụ ndị ikom, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ, e si nʼezinaụlọ ọbụla họpụta otu onye. E dekwara aha ndị niile a họpụtara nʼakwụkwọ. Ya mere, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa iri, ndị a malitere inyocha okwu ndị a.
17 Siku ya kwanza ya mwezi wa kwanza wakawa wamemaliza kuchunguza wale wanaume walioishi na wanawake wa kigeni.
Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ya bụ, nʼabalị mbụ nke ọnwa mbụ nʼafọ, ha rụchara ọrụ banyere ndị ikom lụrụ ndị inyom mba ọzọ.
18 Miongoni mwa wana wa kikuhani kuna wale walioishi na wanawake wa kigeni. Miongoni mwa wana wa Yoshua mtoto wa Yosadaki na kaka zake ambao walikuwa Maasela, Eliazeri, na Yaribu na Gedalia.
A chọpụtara nʼetiti ụmụ ndị nchụaja, na ndị a lụrụ ndị inyom si na mba ọzọ. Ndị si nʼikwu Jeshua nwa Jozadak na ụmụnne ya bụ, Maaseia, Elieza, Jarib na Gedaliya.
19 Hivyo wakaamua kuwaondoa wake zao. kwa kuwa walikuwa na makosa, wakatoa sadaka ya kondoo kwenye mifugo kwa ajili ya makosa yao.
Ha niile jikọrọ aka kpebiekwa na ha ga-ezila ndị nwunye ha. Onye ọbụla wetara ebule site nʼigwe atụrụ dịka ihe ikpe ọmụma.
20 Miongoni mwa wana wa Imeri, Hanani, na Zebadia.
Ndị si nʼikwu Imea bụ Hanani, na Zebadaya.
21 Miongoni mwa wana wa Harimu, Maaseya, na Eliya na Shemaya, na Yehieli na Uzia.
Ikwu Harim: Maaseia, Ịlaịja, Shemaya, Jehiel na Uzaya.
22 Miongoni mwa wana wa Pashuri, Elasa
Ndị si nʼikwu Pashua: Elioenai, Maaseia, Ishmel, Netanel, Jozabad, na Eleasa.
23 Miongoni mwa walawi: Yozabadi na Shimei na Kelaya (ndiye Kelita) na Pethaia, na Yuda na Eliezeri. Miongoni mwa waimbaji Eliashibu na. Miongoni mwa walinzi Shalumu, Telemu na Uri.
Nʼime ndị Livayị: Jozabad, Shimei, Kelaya (onye a na-akpọkwa Kelita), Petahaya, Juda na Elieza.
24 Miongoni mwa Israel waliobaki -
Nʼime ndị na-abụ abụ, Eliashib. Nʼime ndị nche ọnụ ụzọ: Shalum, Telem, na Uri.
25 Miongoni mwa wana wa Paroshi, Ramia na Izia na Malkiya na Miyamini na Eliazari na Malkiya na Benaya
Nʼetiti ndị Izrel ndị ọzọ: Site nʼikwu Parosh: Ramaya, Izaya, Malkija, Mijamin, Elieza, Malkija na Benaya.
26 Miongoni mwa wana wa Elamu Mataniana Zekaria, na yeehieli, na Abdi na Yeremothi na Eliya.
Site nʼikwu Elam: Matanaya, Zekaraya, Jehiel, Abdi, Jeremot na Ịlaịja.
27 Miongoni mwa wana wa Zatu: Elionai, na Eliashibu, na Matania na Yeremothi na Zabadi na Aziza.
Site nʼikwu Zatu: Elioenai, Eliashib, Matanaya, Jeremot, Zabad na Aziza.
28 Miongoni mwa wana wa Bebai Yehohanani, na Hanania na Zakai na Athlai.
Site nʼikwu Bebai: Jehohanan, Hananaya, Zabai, na Atlai.
29 Miongoni mwa wana wa bani: Meshulami na Maluki, na Adaya na Yashubu na Sheali na Yeremothi.
Site nʼikwu Bani, Meshulam, Maluk, Adaya, Jashub, Sheal na Jeremot.
30 Miongoni mwa wana wa Pahath-Moabu, Adna, na kelali, na Benaya na Maaseya, na Matania, na Besaleli na Binti na Manase.
Site nʼikwu Pahat-Moab, Adna, Kelal, Benaya, Maaseia, Matanaya, Bezalel, Binui, na Manase.
31 Na miongoni mwa wana wa Harimu: Eliezeri na Ishiya, na Malkiya na Shemaya na Shimeoni, na
Site nʼikwu Harim: Elieza, Ishija, Malkija, Shemaya, Shimeon,
32 Benyamini na Maluki na Shemaria
Benjamin, Maluk na Shemaraya.
33 Miongoni mwa wana Hashumu: Matenai, na Matatana Zabadi, na Elifereti na Yeremai, na Manase, na Shimei.
Site nʼikwu Hashum, Matenai, Matata, Zabad, Elifelet, Jeremai, Manase na Shimei.
34 Miongoni mwa wana wa Bani: Maadai, na Amramu na Aueli, na
Site nʼikwu Bani, Maadai, Amram, Uel,
35 Benaya, na Bedeya na Keluhi, na
Benaya, Bedeia, Keluhi
36 wania, na Meremothi, Eliashibu,
Venaya, Meremot, Eliashib
37 Matania, na Matenai. na
Matanaya, Matenai na Jaasu.
38 Yaasi. Miongoni mwa wana wa Binui: Shimei,
Site nʼikwu Bani: Binui na Shimei,
39 Sheremia, na Nathani, na Adaya, na
Shelemaya, Netan, Adaya,
40 Maknadebai, na Shashai, na Sharai
Maknadebai, Shashai, Sharai,
41 Azareri, na Sheremia, na Shemaria, na
Azarel, Shelemaya, Shemaraya,
42 Shalumu, na Amaria, na Yusufu.
Shalum, Amaraya na Josef.
43 Miongoni wa wana wa Nebo: Yeieli, na Mathiana zabadi, na Zebina, na Ido, na Yoeli na Benaya.
Site nʼikwu Nebo: Jeiel, Matitaia, Zabad, Zebina, Jadai, Juel na Benaya.
44 Hawa wote walikuwa wameoa wanawake wa kigeni na walikuwa wamezaa watoto baadhi yao.
Ndị a niile lụrụ ndị inyom site na mba ọzọ. Ha zilagara ha na ụmụ ha.

< Ezra 10 >