< Ezekieli 27 >

1 Tena neno la Yahwe likanijia, kusema,
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2 “Sasa wewe, mwanadamu, anza kuomboleza kuhusiana na Tiro,
“Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere Taịa,
3 na mwambie Tiro, aishiye kwenye malango ya bahari, manahodha wa watu hata visiwa vingi, Bwana Yahwe asema hivi kwako: Tiro, umesema, mimi ni ukamilifu katika uzuri.'
sị ya, gị oke obodo dị nʼọnụ oke osimiri, onye bụ onye ahịa nke mba niile dị nʼọnụ osimiri. ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: “‘Gị onwe gị, bụ Taịa, na-asị, “Ezuru m oke nʼịma mma.”
4 Mipaka yako iko kwenye moyo wa bahari; majengo yako yamekamilisha uzuri wako.
I meela ka oke ala gị dịrị nʼetiti oke osimiri. Ndị wuru gị emeekwala ka ịma mma gị zuo oke.
5 Wametengeneza mbao nene na pana kwa mvinje kutoka Mlima Hermoni; wamechukua mkangazi kutoka Lebanoni kuufanya mlingoti.
Osisi e ji wuo ahụ ụgbọ gị sitere nʼosisi junipa nke si Senia; ọ bụkwa osisi sida nke si Lebanọn ka e ji jidesie ihu ụgbọ ahụ ike.
6 Wametengeneza makasia yako kutoka kwenye mialo ya Bashani; wametengeza sitaha zako kwa mbao za mvinje kutoka Kitimu, na wametengeneza kwa pembe.
Osisi ook nke si Bashan ka e ji mee ụmara gị niile. Osisi e si Saiprọs bubata ka e ji wuo ala ụgbọ gị, jirikwa ọdụ machie ya nʼọnọdụ ịchọ ya mma.
7 Tanga zako zilikuwa za rangi za kitani kutoka Misri ambazo zilikuwa kama beramu!
Ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke e si Ijipt bubata, ka e ji mee ọkọlọtọ gị. Akwa ndo gị bụkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ, na odo odo, nke e si nʼobodo ọnụ mmiri Elisha bubata.
8 Wale waliokuwa wakiishi Sidoni na Arvadi walikuwa wavuta makasia wako; wenye busara wa Tire walikuwa ndani yenu; walikuwa marubani wako.
Ndị ikom si Saịdọn na Avad bụ ndị na-akwọrọ gị ụgbọ mmiri gị. Ndị ǹka ndị ikom gị, gị Taịa, nọ nʼụgbọ dịka ndị ọka nʼịkwọ ụgbọ mmiri.
9 Mafundistadi wenye uzoefu wa hali ya juu kutoka Gabeli walijaza mishono; meli zote za bahari na mabaharia wao miongoni mwenu walikuwa wakiwabeba manahodha kwaajili ya biashara.
Ndị okenye na ndị nka Gebal a maara aha ha nọ nʼime ụgbọ mmiri gị. Ọrụ ha bụ imechisi oghere ọbụla dị nʼụgbọ ahụ. Ụgbọ mmiri niile na ndị na-anya ha na-abata nʼọnụ mmiri gị nʼihi ịzụ ihe ahịa gị.
10 Uajemi, Ludi, na Putu walikuwa katika jeshi lako, watu wako wa vita. Walining'iniza ngao na chapeo ndani yako; walionyesha uzuri wako.
“‘Ndị ikom Peshịa na Lidiya, na Put, jere gị ozi dịka ndị agha nʼusuu ndị agha gị. Ha kokwasịrị ọta ha na okpu agha igwe ha nʼaja ụlọ gị, na-ewetara gị ebube.
11 Watu wa Arvadi na Heleki katika jeshi lako walikuwa juu ya kuta zako wamekuzunguka, na watu wa Gamadi walikuwa kwenye minara yako. Walinin'giniza juu ngao zao juu ya kuta zako zote zilizokuzunguka! Wakaukamilisha uzuri wako.
Ndị ikom Avad, na Helek bụ ndị na-eche mgbidi gị nʼakụkụ niile. Ndị ikom Gamad na-eche nche nʼụlọ elu gị niile e wusiri ike. Ha konyekwara ọta ha nʼusoro na mgbidi gị, ime ka ịma mma gị zuo oke.
12 Tarshishi alikuwa mdau wa biashara pamoja nawe kwa sababu ya wingi wa utajiri wako wa kuuza mizigo: fedha, chuma, bati, na risasi. Walinunua na kuuza bidhaa za biashara!
“‘Tashish bụ onye ahịa gị, nʼihi ịba ụba nke akụ gị. Ọ bụ ọlaọcha na igwe, na gbamgbam, na opu, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.
13 Yavani, Tubali, na Mesheki-waliwauza watumwa na katika vitu kutengeneza shaba. Walibeba bidhaa zako.
“‘Ndị Griis, Tubal na Meshek, bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-ebutere gị ndị ohu, na ihe e ji bronz kpụọ, iji kwụọ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ.
14 Beth Togarma waliandaa farasi, farasi dume, na nyumbu kama kama bidhaa zako.
“‘Otu a kwa ndị ikom Bet Togama jikwa ịnyịnya ụgbọ, na ịnyịnya agha, na ịnyịnya ibu na-agbanwere ihe ha zụrụ.
15 Watu wa Dedani walikuwa wafanya biashara wako kwenye pwani nyingi. Bidhaa zilikuwa mkononi mwako; walikutumia pembe, pembe za ndovu, na mpingo kama ushuru!
“‘Ndị ahịa si na Dedan bụkwa ndị ahịa gị. Otu a kwa ọtụtụ ndị bi nʼọnụ mmiri bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ọdụ, na osisi eboni kwụọ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
16 Shamu alikuwa mchuuzi katika bidhaa zako nyingi; waliandaa zumaridi, zambarau, nguo zenye rangi mbali mbali, kitambaa kizuri, lulu, na kito chekundu cha thamani kama bidhaa zako.
“‘Ndị Aram ka gị na ha zụrụ ahịa nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa gị. Ha na-ejikwa nkume dị oke ọnụ tọkwọisi na akwa e sijiri esiji odo odo, na akwa a kpara nke ọma, na ezi akwa ọcha, na koral, na nkume oke ọnụahịa rubi na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
17 Yuda na nchi ya Israeli walikuwa wafanyabiashara pamoja nawe. Waliandaa ngano kutoka Minithi, keki, asali, mafuta, na lihamu kama bidhaa zako.
“‘Ndị Juda na ndị Izrel niile bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-eji ọka wiiti nke si nʼobodo Minit, ya na shuga, na mmanụ aṅụ, na mmanụ, na mmanụ otite na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
18 Dameski alikuwa mfanya biashara wa bidhaa zako zote, za utajiri mkubwa mno, na ya divai ya Helboni na sufu ya Zahari.
“‘Damaskọs bụkwa ndị ahịa gị, nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa na ụba ihe ndị ị nwere ire ere. Ọ bụkwa mmanya si Helbon, na ajị anụ dị ọcha nke esi Zaha weta,
19 Dani na Yavani kutoka Uzali walikwandalia bidhaa ya chuma kilichofuliwa, na mdalasini, na mchai. Hivi vikawa bidhaa yako.
na mmanya a gbara nʼudu nʼudu nke si Ụzal, na igwe nwupụrụ enwupụ, na kashia, na kalamus, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.
20 Dedani alikuwa mchuuzi katika nguo nzuri za kutandika.
“‘Dedan bụ onye ahịa gị nʼakwa a na-agbasa nʼelu ịnyịnya anọkwasị ọdụ.
21 Arabuni na wakuu wote wa Kedari walikuwa wafanyabiashara pamoja nawe; walikuandalia wanakondoo, kondoo dume na mbuzi.
“‘Arebịa na ụmụ eze niile nke Keda bụkwa ndị ahịa gị. Ọ bụ ụmụ atụrụ, na ebule, na mkpi, ka gị na ha nʼazụrịta na-erekwa.
22 Wafanya biashara wa Sheba na Raama walikuja kukuuzia kila aina ya viungo vizuri katika vito vyote vya thamani; waliuza dhahabu kwa ajili ya bidhaa.
“‘Ndị ahịa Sheba, na Raama, bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ụda dị iche iche na nkume dị oke ọnụahịa, na ọlaedo akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ.
23 Harani, Kane, na Adina walikuwa wafanya biashara pamoja nawe, karibu na Sheba, Ashuru, na Kilmadi.
“‘Ndị Haran, Kanne na Eden, na ndị ahịa Sheba, Ashọ na Kilmad, bụ ndị gị na ha zụkọrọ ahịa.
24 Hawa walikuwa wachuuzi wako mapambo ya joho ya nguo za urujuani pamoja na rangi zilibuniwa, na nguo zilizo sanifiwa vizuri katika sehemu zako za soko.
Ha na-eweta uwe mara mma dị iche iche, na akwa e tejiri anụnụ anụnụ, na akwa a kpara nke ọma, na kapeeti mara mma dị iche iche, nke e ji ụdọ kpazie nke ọma, nke e tejiri nʼụdị dịkwa iche iche nʼọma ahịa gị.
25 Merikebu za Tarshishi zilikuwa misafara ya bidhaa yako! Hivyo ulijaa, shehena nzito katika moyo wa bahari!
“‘Ụgbọ mmiri niile nke Tashish bụ ndị na-ebu ihe ahịa gị. I jupụtara nʼihe ahịa, gị obodo dị nʼetiti mmiri.
26 Wapiga makasia wako walikuleta kwenye bahari kuu mno; upepo wa mashariki umekuvunja kati yao.
Ndị na-anyagharị ụgbọ mmiri gị na-ebuba gị nʼosimiri. Ma ifufe siri ike nke si nʼọwụwa anyanwụ ga-etiwasị gị nʼetiti osimiri.
27 Utajiri wako, bidhaa, na mizigo ya biashara; wapiga makasia wako na marubani, na waunzi wa meli; wafanya biashara wako wa bidhaa na watu wote wa vita walio ndani yako, na jeshi lako-watazama kwenye kina cha bahari siku ya kuangamia kwako.
Akụ gị niile, na ngwa ahịa gị niile, na ihe ịzụ ahịa gị niile, na ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ mmiri gị, na ndị na-anya ụgbọ mmiri, ma ndị na-edozi ụgbọ mmiri gị, ma ndị na-azụ ahịa gị, ma ndị agha gị niile, ha na ndị niile nọ nʼime ụgbọ gị ka mmiri ga-eri nʼetiti mmiri, nʼụbọchị ahụ ụgbọ gị ga-emikpu.
28 Miji iliyopo kwenye bahari sauti itatetemeka kulia kwa rubani zako;
Ala niile dị nʼọnụ mmiri ga-ama jijiji mgbe ndị ọka ụgbọ mmiri gị ga-eti mkpu akwa.
29 Wote wavutao kasia watashuka chini kutoka meli katika zao; wanamaji na marubani wote juu ya bahari watasimama juu ya nchi.
Ndị niile na-anya ụgbọ mmiri, na ndị ọka ụgbọ niile nke oke osimiri, ga-esitekwa nʼụgbọ ha rịdata guzo nʼelu ala.
30 Kisha watakufanya kusikiliza sauti yao na kulia kwa uchungu; watarusha vumbi juu ya vichwa vyao. Watabingirika katika majivu.
Ha ga-eti mkpu akwa, ha ga-akwa akwa nke ukwuu, werekwa aja wụkwasị onwe ha nʼisi, na-atụrụkwa onwe ha na ntụ.
31 Watanyo vichwa vyao upara kwa ajili yako na kujifunga wenyewe kwa nguo za magunia, na watalia kwa sauti.
Ha ga-akpụchapụ agịrị isi ha, yirikwa akwa mkpe, kwaa akwa nʼihi ịdị ilu nke mkpụrụobi ha. Ha ga-etikwa aka ha nʼobi.
32 Watakuinulia maombolezo ya kuomboleza kwa ajili yako na kuimba nyimbo za maombolezo juu yako, ni nani aliye kama Tiro, ambaye sasa ameletwa kunyamazishwa kati ya bahari?
Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị, nke a bụ abụ akwa a ga-abụ banyere gị, “Onye ka e mere ka o dere duu ka e si mee obodo Taịa, nke osimiri gbara gburugburu?”
33 Wakati bidhaa yako ilipoenda ufukweni kutoka kwenye bahari, imewarithisha watu wengi; uliwatajirisha wafalme wa dunia kwa wingi wa utajiri wako mkubwa na bidhaa!
Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị, e ji ha na-enyeju mba dị iche iche afọ. E sitekwara nʼakụ gị dị ukwuu na ngwa ahịa gị mee ka ọtụtụ ndị eze nke ụwa bụrụ ọgaranya.
34 Lakini wakati ulipo vunjwavunjwa kwa bahari, kwa vilindi vya maji, bidhaa yako na wafanya kazi wako wote kuzama!
Ugbu a, mmiri e riela gị, ọ bụ nʼokpuru osimiri ka ị tọgbọ. Akụ gị niile na ihe ahịa gị niile, na ndị niile nọ nʼime gị esorola gị laa nʼiyi.
35 Wote wakaao pwani walikuogopa, na wafalme wao kuvunjwa vunjwa katika kitisho! Nyuso zao zimetetemeka!
Ihe ndị a niile ga-eju ndị bi nʼala ọnụ mmiri osimiri niile anya. Ndị eze ha niile tụkwara egwu nke ukwuu; ihu ha gbarụkwara agbarụ site nʼegwu.
36 Wafanya biashara wa meli wa watu wakuzomea; umekuwa tishio, na hutakuwepo tena milele.”
Ndị ahịa nke mba dị iche iche na-efufe isi ha, nʼihi na ihe mere gị dị egwu. Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’”

< Ezekieli 27 >