< Ezekieli 24 >

1 Neno la Yahwe likanijia katika mwaka wa nane mwezi wa kumi na siku ya kumi ya mwezi, kusema,
O ruo nʼafọ nke itoolu, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2 “Mwanadamu, andika kwa ajili yako jina la hii siku, siku hii sahihi mfalme wa Babeli ameizingira Yerusalimu.
“Nwa nke mmadụ, detuo ụbọchị taa nʼakwụkwọ, nʼihi na ọ bụ taa ka eze Babilọn gbara Jerusalem gburugburu.
3 Basi nena mithali juu ya hii nyumba ya kuasi, fumbo moja. Waambie, 'Bwana Yahwe asema hivi: weka sufuria ya kupikia. Iweke na weka maji kwenye hiyo.
Ugbu a, tụọrọ ndị a na-enupu isi ilu a, gwa ha: ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: “‘Sikwasịnụ ite ahụ nʼọkụ; sikwasị ya kunyekwanụ mmiri nʼime ya.
4 Vikusanye vipande vya chakula ndani yake, kila kipande kizuri-paja na bega-na ijaze kwa mifupa bora.
Tinyenụ anụ a bọrọ abọ nʼime ya. Tinye anụ dị mma, apata ya na aka ya. Tinyekwa ọkpụkpụ ndị ahụ dị mma nʼime ya.
5 Chukua kundi bora na jaza mifupa chini yake. Ilete kuchemsha na ipike mifupa ndani yake.
Werenụ naanị ndị kachasị mma na ndị ahọpụtara site nʼigwe ewu na atụrụ, kwajuokwa nkụ nʼokpuru ya maka ọkpụkpụ ndị ahụ, mee ya ka ọ gbọọ nke ọma, sie ọkpụkpụ ndị ahụ nʼime ya.
6 Kwa hiyo, Bwana Yahwe asema hivi: Ole kwa mji wa damu. Nitakiongeza chungu cha mbao. Weka kuni nyingi na washa moto. Pika nyama vizuri na changanya katika viungo na iacha mifupa iteketee.
“‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “‘Ahụhụ dịrị obodo ahụ a na-awụsi ọbara nʼime ya. E, ahụhụ dịrị ite ahụ nchara dị nʼime ya, nke a na-apụghị ịsachapụ nchara ya. Wepụtasịanụ ha nʼotu nʼotu. Ka a hapụ ifekwa nza mgbe a na-eme nke a.
7 Kwa kuwa damu iko kati yake. Ameiweka juu ya jiwe laini; hakuimwaga juu ya nchi kuifunika kwa mavumbi,
“‘Nʼihi na ọbara ọ wụsiri dị nʼetiti ya. Ọ bụkwa nʼelu nkume ka a wụsiri ya. Ọ bụghị nʼelu ala efu, ebe e nwere ike jiri aja kpochie ya.
8 hivyo inaleta hasira ya kulipa kisasi. Nimeweka damu yake juu ya jiwe laini ili isifunikwe.
Ọ bụ nʼihi ikpali ọnụma na ịbọ ọbọ ka m ji hapụ ọbara ahụ nʼelu nkume, ebe a na-apụghị iji aja kpochie ya.
9 Kwa hiyo, Bwana Yahwe asema hivi: Ole kwa mji wa damu. Nitakiongeza chungu cha mbao.
“‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “‘Ahụhụ dịrị gị obodo ahụ na-awụsi ọbara. Mụ onwe m ga-akwanyekwa nkụ dị ukwuu nʼọkụ.
10 Weka kuni nyingi na washa moto. Pika nyama vizuri na changanya katika viungo na acha mifupa iteketee.
Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu, mụnyekwanụ ọkụ. Jirinụ ụda dị iche iche sizie anụ ahụ nke ọma; surekwaanụ ọkpụkpụ ya ọkụ.
11 Kisha weka chungu kitupu juu ya mkaa, ili kuchemsha na kuchoma shaba yake, hivyo uchafu wake ndani yake itayeyushwa, kutu yake imekula.'
Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ, tutu ruo mgbe ọ nụrụ ọkụ, chagharịa, gbazee ihe niile na-abụghị ọla dị nʼime ya ga-asọpụtasị, nchara ya ga-agwụsịkwa.
12 Amechoka kwa sababu ya kazi ya taabu, lakini kutu yake haitoki kweke kwa moto.
Ndọgbu nʼọrụ niile a emeghị ka nchara ahụ pụọ. Ọ bụladị ọkụ dị ukwuu ahụ a kwanyere nʼokpuru ya emeghị ka ọ gbazee.
13 Tabia yako ya aibu iko ndani ya uchafu wako, kwa sababu nimekusafisha, lakini bado hutaweza kuwa msafi. Bado hutakuwa huru kutoka uchafu wako hadi hasira yako itakapotulia kutoka kwako.
“‘Ugbu a, adịghị ọcha gị sitere na ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị. Nʼihi na m agbalịala ime ka ị dị ọcha, ma i kweghị adị ọcha site na mmerụ gị, ị gaghị adịkwa ọcha ọzọ tutu ruo mgbe ọnụma m megide gị zuruoke.
14 Mimi, Yahwe, nimesema hili, na nitalifanya. Sintotulia wala kupumzika kwa ajili ya hili. Kama njia zako zilivyokuwa, na kama matendo yako, yatakuhukumu! -hivi ndivyo Bwana Yahwe asemavyo.”
“‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Oge m ji emezu ihe m kwuru eruola. Agaghị m ahapụ imezu ya. Agaghị m eme ebere maọbụ weghachi aka m azụ. A ga-ekpe gị ikpe dịka omume na obibi ndụ gị si dị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’”
15 Kisha neno la Yahwe likanijia, kusema,
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
16 “mwanadamu! Tazama, ninachukua tamaa ya macho yako kutoka kwako pamoja na tauni, lakini hutaomboleza wala kulia, na machozi yako hayatatoka.
“Nwa nke mmadụ, ana m aga iwere ihe otiti napụ gị onye ahụ ihe ya na-atọ gị ụtọ. Ma mgbe o mere, ị gaghị eti aka nʼobi maọbụ kwaa akwa. Anya mmiri agakwaghị esi gị nʼanya pụta.
17 Utagugumia bila kusikika. Usiendeshe mazishi kwa ajili ya aliyekufa. Funga kilemba chako juu yako na vaa makubazi miguuni pako, lakini usivalishe shela nywele zako au kula mkate wa watu waombolezao kwa ajili ya kuwapoteza wake zao.”
I nwere ike sụọ ude, ma asụsila ya ike. Ị gaghị eru uju nʼihi onye nwụrụ anwụ. Kechie isi gị, yirikwa akpụkpọụkwụ gị, ekpuchila egbugbere ọnụ gị, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ na-eri.”
18 Hivyo nimeongea na watu asubuhi, na mke wangu amekufa asubuhi. Asubuhi nimefanya kile nilichokuwa nimeambiwa kukifanya.
Agwara m ndị mmadụ okwu a nʼụtụtụ, ma nʼanyasị nwunye m nwụrụ. Nʼụtụtụ echi ya, emere m ihe niile dịka e siri nye m ya nʼiwu.
19 Watu wameniuliza, “Ji! hautatuambia haya mambo yanamaana gani, mambo ambayo unayoyafanya?”
Mgbe ahụ, ndị mmadụ sịrị m, “Ị gaghị agwa anyị ihe ihe ndị a pụtara? Gịnị mere iji eme omume dị otu a?”
20 Hivyo nimewaambia, “Neno la Yahwe likanijia, kusema,
Ya mere a sịrị m ha, “Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,
21 'Waambie nyumba ya Israeli, Bwana Yahwe asema hivi: Tazama! Nitapanajisi patakatifu pangu-fahari ya nguvu yenu, mahali panapopendeza macho yenu, na panapotamaniwa na roho zenu, na wana wenu na binti zenu ambao mliowaacha nyuma wataanguka kwa upanga.
Gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga ime ka ebe nsọ m ghara ị dị nsọ, bụ ebe e wusiri ike nke unu ji na-anya isi, ihe na-amasị anya unu, nke ihe banyere ya na-atọ obi unu ụtọ. Ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom, ndị unu hapụrụ ga-ada site na mma agha.
22 Kisha mtafanya hasa kama nilivyofanya: hutafunika nywele za sehemu ya chini za uso, wala kula mkate wa watu wanaoomboleza!
Mgbe ahụ, unu ga-eme dịka m mere. Unu agaghị ekpuchi egbugbere ọnụ unu, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ kwesiri iri.
23 Badala yake, vilemba vyenu vitakuwa juu ya vichwa, na makubadhi yenu miguuni mwenu; hutaomboleza wala kulia, kwa kuwa mtayeyuka katika maovu yenu, na kila mtu atagugumia kwa ya ajili ya ndugu yake.
Ihe ikechi isi unu ga-adịgide nʼisi unu, akpụkpọụkwụ unu ga-adịkwa nʼụkwụ unu. Unu agaghị akwa akwa maọbụ tie aka nʼobi, kama unu ga-ata ahụ nʼihi mmehie unu, sụkwaa ude nʼetiti onwe unu.
24 Hivyo Ezekieli atakuwa ishara kwenu, kama kila kitu ambacho alichokifanya mtafanya wakati hili litakapokuja. Kisha mtajua yakwamba mimi ni Bwana Yahwe!”'
Izikiel ga-abụrụ unu ihe ịmaatụ. Unu ga-emekwa dịka o mere mgbe ihe ndị a mezuru. Unu ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.’
25 “Lakini wewe, mwanadamu, siku ambayo nitachukua hekalu lao, ambalo ni furaha yao, kiburi chao, na kile waonacho na kutamani-na wakati nikiwachukua wana wao na binti-
“Ma gị, nwa nke mmadụ, nʼụbọchị ahụ m napụrụ ha ebe ha siri ike, nke bụ ọṅụ ha na ebube ha, na ihe anya ha na-achọsi ike; na ihe na-atọ obi ha ụtọ, na ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom,
26 siku hiyo, mgeni atakuja kwako kukupatia habari!
nʼụbọchị ahụ, ọ bụ onye na-agba ọsọ ndụ ga-agbakwute gị ịkọrọ gị ihe mere.
27 Siku hiyo kinywa chako kitafunguliwa kwa huyo mgeni na utaongea-hutakuwa bubu tena. Utakuwa ishara kwao hivyo basi watajua kwamba mimi ni Yahwe.
Nʼoge ahụ, ị ga-asaghe ọnụ gị. Gị na onye ahụ na-agba ọsọ ndụ ga-ekwurịta okwu. Ị gaghị anọkwa juu ọzọ. Nʼihi ya, ị ga-aghọrọ ha ihe ịrịbama. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”

< Ezekieli 24 >