< Kutoka 7 >

1 Yahweh akasema na Musa, “Ona, nimekufanya kama mungu kwa Farao. Aruni kaka yako atakuwa nabii wako.
Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Emeela m gị ka ị dịrị ka Chineke nʼebe Fero nọ. Nwanne gị Erọn ga-abụkwa onye amụma gị.
2 Utasema kila kitu nitacho kuamuru kusema. Aruni kaka yako ata sema na Farao iliawaachie watu wa Israeli watoke kwenye nchi yake.
Ị ga-agwa Erọn ihe niile m gwara gị. Ọ ga-ekwukwa ha nʼihu Fero, rịọọ ya ka o kwere ka ụmụ Izrel hapụ ala Ijipt.
3 Lakini nitaufanya moyo wa Farao mgumu, na nitaonyesha ishara nyingi za nguvu zangu, maajabu mengi, katika nchi ya Misri.
Ma aga m eme ka obi Fero sie ike. Ọ bụ ezie na m ga-eme ọtụtụ ihe ịrịbama nʼihe ebube nʼala Ijipt,
4 Lakini Farao hata kusikiliza, kwahiyo nitaueka mkono wangu juu ya Misri na kutoa makundi yangu ya wanaume wapiganaji, watu wangu, wazao wa Israeli, watoke nchi ya Misri kwa matendo makubwa ya hukumu.
ma Fero agaghị ege unu ntị. Mgbe ahụ aga m eme ka aka m bịakwasị Ijipt. Aga m esite nʼoke ọrụ nke ikpe ọmụma dị oke egwu, mee ka ndị m, Izrel, dịka usuu ha niile si dị, site nʼala Ijipt pụọ.
5 Wamisri watajua kuwa mimi ni Yahweh nitapo nyoosha mkono wangu kwa Misri na kuwatoa Waisraeli kutoka miongoni mwao.”
Ndị Ijipt ga-amata nʼezie na m bụ Onyenwe anyị, mgbe m setịpụrụ aka nʼIjipt, ma site nʼetiti ha kpọpụta ụmụ Izrel.”
6 Musa na Aruni wakafanya hivyo; walifanya kama Yahweh alivyo waamuru.
Mosis na Erọn mere dịka Onyenwe anyị nyere ha iwu.
7 Musa alikuwa na miaka themanini, na Aruni miaka themanini na tatu walipo ongea na Farao.
Nʼoge a, mgbe ha gwara Fero okwu, Mosis agbaala iri afọ asatọ. Ma Erọn agbaala iri afọ asatọ na atọ.
8 Yahweh akamwambia Musa na Aruni,
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị,
9 “Wakati Farao atakapo waambia, 'Fanya muujiza,' utamwambia Aruni, 'Chukuwa gongo lako na ulirushe chini mbele ya Farao, ililigeuke nyoka.”'
“Mgbe Fero ga-agwa unu okwu sị, ‘Meenụ ihe ebube.’ Ị ga-agwa Erọn okwu sị ya, ‘Were mkpanaka gị tụpụ ya nʼala nʼihu Fero.’ Ọ ga-aghọ agwọ.”
10 Kisha Musa na Aruni wakaenda kwa Farao, na wakafanya kama Yahweh alivyo waamuru. Aruni akarusha chini gongo lake mbele ya Farao na watumishi wake, na likageuka nyoka.
Mgbe ahụ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero mee dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu. Erọn tụpụrụ mkpanaka ya nʼala nʼihu Fero na ndị ozi ya. Ọ ghọrọ agwọ.
11 Kisha naye Farao akawaita wazee wenye hekima na wachawi. Wakafanya jambo hilo hilo kwa uchawi wao.
Ma Fero kpọkọtara ndị maara ihe, na ndị mgbaasị, na ndị majiki nọ nʼIjipt. Ha bịara mee ụdị ihe ịrịbama ahụ Mosis na Erọn mere site nʼihe nzuzo nke akaọrụ ha.
12 Kila mtu akarusha chini gongo lake, na magongo yakawa nyoka. Lakini gongo la Aruni lilimeza nyoka zao.
Onye ọbụla nʼime ha tụpụrụ mkpanaka ya, nke ghọkwara agwọ. Ma mkpanaka ahụ Erọn tụpụrụ, nke ghọrọ agwọ, loro mkpanaka ndị ahụ niile ndị Ijipt tụpụrụ.
13 Moyo wa Farao ulikuwa mgumu, na akusikiliza, kama Yahweh alivyo tabiri.
Fero nyịchiri obi ya, mee ka o sie ike. O geghị Erọn na Mosis ntị dịka Onyenwe anyị kwuru.
14 Yahweh akasema na Musa, “Moyo wa Farao ni mgumu, na anakataa kuacha watu waende.
Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Obi Fero siri ike. Ọ bụ nke a mere o ji na-aga nʼihu na-ajụ ka ndị m laa.
15 Nenda kwa Farao asubui anapoenda kwenye maji. Simama kwenye chanzo cha mto kukutana naye, na uchukuwe mkononi mwako gongo ambalo liligeuka nyoka.
Ma otu ọ dị; nʼisi ụtụtụ echi, jekwuru Fero tupu ọ gaa nʼosimiri. Guzoro nʼakụkụ osimiri Naịl, jidekwa mkpanaka ahụ ghọrọ agwọ nʼaka gị.
16 Mwambie, 'Yahweh, Mungu wa Waebrania, amenituma kwako, “Acha watu wangu waende, iliwaniabudu nyikani. Mpaka sasa haujanisikiliza.”
Ị ga-agwa Fero sị, ‘Onyenwe anyị, Chineke ndị Hibru, ezitela m ka m gwa gị sị, hapụ ndị m ka ha gaa nʼọzara fee m ofufe. Tutu ruo ugbu a, ị jụrụ ige ntị.’
17 Yahweh anasema hili: “Kwa hili utajua kuwa mimi ni Yahweh. Ninaenda kupiga maji ya mto wa Misri kwa gongo langu lililo mikono mwangu, na mto utageuzwa kuwa damu.
Ugbu a Onyenwe anyị kwuru nke a sị, ‘Ị ga-amata site na nke a na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. Aga m ewere mkpanaka a nke m ji nʼaka tie nʼosimiri Naịl. Ọ ga-agbanwe ghọọ ọbara.
18 Samaki walio kwenye mto watakufa, na mto utanuka. Wa Misri Hawataweza kunywa maji yalio kwenye mto.”'''
Azụ niile dị nʼime ya ga-anwụ. Osimiri ahụ ga-esikwa isi dịka ihe rere ure. Nke a ga-eme ka ọ bụrụ ihe rara ahụ nye ndị Ijipt ịṅụ mmiri site na ya.’”
19 Kisha Yahweh akasema na Musa, “Mwambie Aruni, 'Chukuwa gongo lako na unyooshe mkono kwenye maji ya Misri, na juu ya mito yake, mifereji, visima, na madimbwi yote, ili maji yao ya damu. Fanya hivi ilikuwe na damu nchi nzima ya Misri, hadi kwenye vyombo vyote vya mbao na mawe.”'
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn ka o setịpụ mkpanaka ya nʼelu mmiri niile dị nʼIjipt. Nke a metụtara osimiri ha niile, mmiri ntakịrị ha niile, ọdọ mmiri ha niile, na ebe niile ha na-echekọta mmiri. Ọbara ga-ejupụta ebe niile nʼIjipt, ite mmiri na ite aja na ite osisi niile.”
20 Musa na Aruni walifanya kama Yahweh alivyo waamuru. Aruni alinyanyua gongo na kupiga maji ya mto, machoni pa Farao na watumishi wake. Maji yote kwenye mto yaligeuga damu.
Mosis na Erọn mere dị ka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu ime. Nʼihu Fero na ndịisi ọrụ ya, Erọn weliri mkpanaka ya tie ya nʼelu mmiri dị nʼosimiri Naịl. Nʼotu ntabi anya, mmiri ahụ gbanwere ghọọ ọbara.
21 Samaki kwenye mto wakafa, na mto ukaanza kunuka. Wamisri hawakuweza kunywa maji kwenye mto, na damu ilikuwa kila mahali katika nchii ya Misri.
Ka azụ dị nʼime mmiri Naịl nwụsịrị, mmiri ahụ malitere na-esi isi ọjọọ, nke mere ka ndị Ijipt hapụ inwe ike ịṅụ mmiri sitere na ya. Ọbara jupụtakwara nʼala Ijipt niile.
22 Lakini wachawi walifanya vivyo hivyo na uchawi wao. Kwaiyo moyo wa Farao ukawa mgumu, na akakataa kuwasikiliza Musa na Aruni, kama Yahweh alivyo sema itatokea.
Ma ndị majiki Ijipt jikwa ihe nzuzo ha mee ka mmiri chaa ọbara ọbara. Nke a mere ka Fero nyịchie obi ya. Ọ ṅaghị Mosis na Erọn ntị, dịka Onyenwe anyị gwara ha na ọ ga-eme.
23 Kisha Farao akarudi na kwenda nyumbani kwake. Wala hakutilia maanani hili.
Fero tụgharịrị laghachi nʼụlọeze ya, na-echeghị echiche banyere ihe niile ahụ e mere.
24 Wamisri wote walichimba pembeni ya mto kwa ajili ya maji ya kunywa, lakini hawakuweza kunywa maji ya mto.
Ya mere, ndị Ijipt niile gwuru olulu mmiri nʼakụkụ osimiri ahụ ịchọ mmiri ọṅụṅụ ebe ha na-enweghị ike ịṅụ mmiri sitere nʼosimiri Naịl.
25 Siku saba zilipita baada ya Yahweh kushambulia mto.
Ụbọchị asaa gasịrị, site nʼụbọchị Onyenwe anyị tichara ihe otiti ahụ na Naịl.

< Kutoka 7 >