< 1 Samweli 27 >

1 Daudi alisema moyoni mwake, “Basi, siku moja nitaangamia kwa mkono wa Sauli; hakuna jambo zuri kwangu kuliko kutoroka hadi nchi ya Wafilisti; Sauli atakata tamaa asinitafute tena ndani ya mipaka yote ya Israeli; kwa njia hii nitaponyoka kutoka mkono wake.”
Devid chere nʼime onwe ya sị, “Otu ụbọchị Sọl ga-enweta m, bibie m. Ihe ka mma m ga-eme bụ ịgbaga nʼala ndị Filistia. Nke a ga-eme ka Sọl kwụsị ịchọgharị m ebe ọbụla nʼIzrel. Aga m esikwa otu a, nwere onwe m site nʼaka ya.”
2 Daudi akaondoka na kuvuka, akiwa pamoja na watu mia sita hadi kwa Akishi mwana wa Maoki, mfalme wa Gathi.
Ya mere, Devid na narị ndị ikom isii ya, na ezinaụlọ ha, biliri jekwuru Akish nwa Maok, eze ndị Gat.
3 Daudi akaishi na Akishi huko Gathi pamoja na watu wake, na kila mtu na familia yake, na Daudi akiwa na wake zake wawili, Ahinoamu Myezreeli, na Abigaili Mkarmeli aliyekuwa mke wa Nabali.
Devid na ndị agha ya sooro Akish biri na Gat. Onye ọbụla du ezinaụlọ ya. Devid nʼonwe ya du ndị inyom abụọ ya: Ahinoam onye Jezril, na Abigel onye Kamel, nwunye ochie Nebal.
4 Sauli akaambiwa kuwa Daudi amekimbilia Gathi, hivyo hakumtafuta tena.
Ọ dịghị anya, Sọl nụrụ na Devid agbalaala Gat, nʼihi ya ọ kwụsịrị ịchụso ya.
5 Daudi akamwambia Akishi, “Kama nimepata kibali machoni pako, wanipatie mahali katika mojawapo ya miji ya nchi, ili nikae huko: kwa nini mtumishi wako akae pamoja na wewe katika mji wa kifalme?”
Devid gwara Akish sị ya, “Ọ bụrụ na m anatala amara nʼebe ị nọ, ọ ga-adị mma ka enye m otu obodo nʼime obodo nke ala a, ka m biri. Nʼihi gịnị ka ohu gị ga-eji soro gị biri nʼobodo eze?”
6 Hivyo siku hiyo Akishi akampa Daudi Ziklagi; ndiyo sababu mji wa Ziklagi ni mali ya wafalme wa Yuda hadi leo.
Akish nyere ya Ziklag, nʼihi ya, Ziklag bụ obodo ndị eze Juda ruo taa.
7 Idadi ya siku ambazo Daudi aliishi katika nchi ya Wafilisti ulikuwa mwaka mmoja na miezi minne.
Devid biri nʼoke ala ndị Filistia otu afọ na ọnwa anọ.
8 Daudi na watu wake walizipiga sehemu mbalimbali, wakiteka nyara Wageshuri, Wagirizi, na Waamaleki; kwa maana mataifa hayo ndio walikuwa wakaaji wa nchi, kwa uelekeo wa kwenda Shuri hadi kufika nchi ya Misri. Walikuwa wamekaa katika nchi hiyo toka nyakati za zamani.
Devid na ndị ikom ya nọgidere oge ahụ niile na-emegide ndị Geshua, ndị Gizi na ndị Amalek. (Site na mgbe ochie ndị a bi nʼala ahụ gbatịrị ruo Shua na Ijipt)
9 Daudi aliipiga nchi na hakumwacha mwanaume wala mwanamke akiwa hai; akatwaa kondoo, ng'ombe, punda, ngamia, na nguo; kisha alirudi na kufika tena kwa Akishi.
Mgbe ọbụla Devid wakporo akụkụ ọbụla, ọ dịghị ahapụ nwoke maọbụ nwanyị ndụ. Ma ọ na-akpụrụ atụrụ ha, na ehi ha, na ịnyịnya ibu ha, na ịnyịnya kamel ha, nakwa uwe ha. Emesịa, ọ na-alọghachikwuru Akish.
10 Ndipo Akishi humuuliza, “Je, leo umefanya mashambulizi dhidi ya nani?” Daudi humjibu, “Nimefanya dhidi ya kusini mwa Yuda,” au dhidi ya kusini mwa Wayerameeli,” au “dhidi ya kusini mwa Wakeni.”
Ọ bụrụ na Akish ajụọ Devid ajụjụ sị, “Ndị ole ka unu busoro agha taa?” Devid ga-aza sị, “Ọ bụ ndị bi na ndịda Juda”, maọbụ “ndị ndịda Jerahmel”, maọbụ “ndị ndịda Ken.”
11 Daudi asingemwacha mwanaume wala mwanamke akiwa hai awalete hadi Gathi, akisema, “ili wasije kututeta, 'Daudi amefanya hivi na vile.”' Hivi ndivyo alivyofanya kwa kipindi chote alichokaa katika nchi ya Wafilisti.
Ma ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị onye ọ hapụrụ ndụ, nke a ga-akpọta na Gat, nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ha nwere ike ịbịa kwuo megide anyị, sị, ‘Otu a ka Devid mere.’” Otu a ka ọ na-emekwa ọtụtụ oge ahụ niile o bi nʼetiti ndị Filistia.
12 Akishi alimwamini Daudi, akisema, “Amesababisha watu wake Israeli wamchukie kabisa; kwa hiyo atakuwa mtumishi wangu milele.”
Akish kwenyere Devid, kwuo nʼobi ya sị, “Devid abụrụla ihe a kpọrọ asị nʼebe ndị nke ya bụ ndị Izrel nọ. Ọ ga-abụkwara m ohu ruo mgbe niile.”

< 1 Samweli 27 >