< 1 Nyakati 26 >

1 Huu ulikuwa mgawanyiko wa walinzi wa lango: Kutoka kwa Wakora, Meshelemia mwana wa Kore, wa uzao wa Asafu.
Usoro otu ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Site na ndị Kora: Meshelemaia, nwa Kore, otu nʼime ụmụ Asaf.
2 Meshelemia alikuwa na wana wa kiume: Zekaria mzaliwa wa kwanza, Yediaeli wapili, Zebadia watatu, Yathinieli wanne,
Meshelemaia nwekwara ụmụ ndị ikom: nke mbụ bụ Zekaraya, na Jediael nke abụọ, Zebadaya, bụ nke atọ, Jatniel, nke anọ
3 Elamu watano, Yehohanani wasita, Eliehoenai wasaba.
Elam, nke ise na Jehohanan, bụ nke isii na Eliehoenai bụ onye nke asaa.
4 Obedi alikuwa na wana wa kiume: Shemaia wa kwanza, Yehozabadi wapili, Yoa watatu, na Sakari wanne, na Nethanieli watano,
Obed-Edọm nwekwara ụmụ ndị ikom. Ha bụ ndị a: Shemaya, nwa mbụ ya, Jehozabad, osote ya, Joa, nke atọ, Saka, bụ onye nke anọ Netanel, nke ise,
5 Amieli wasita, Isakari wasaba, Peulethai wanane, kwa kuwa Mungu alimbariki Obedi Edomu.
Amiel, nke isii Isaka, nke asaa na Peuletai, onye bụ onye nke asatọ. Nʼihi na Chineke gọziri Obed-Edọm.
6 Kwa Shemaia mwanae walizawa wana walio tawala familia zao; walikuwa wanaume wenye uwezo mbali mbali.
Shemaya, nwa ya mụtakwara ụmụ ndị ikom, ndị bụ ndị ndu nʼezinaụlọ nna ha, nʼihi na ha bụ dike na dimkpa.
7 Wana wa Shemaia walikuwa Othini, Refaeli, Obedi, na Elizabadi. Ndugu zake Elihu na Semakia walikuwa wanaume wenye uwezo mbali mbali.
Ụmụ ndị ikom Shemaya bụ, Otni, Refael, Obed na Elzabad; ụmụnne ya bụ Elihu na Semakaya bụkwa dike na dimkpa.
8 Hawa wote walikuwa uzao wa Obedi Edomu. Wao na wanao na ndugu zao walikuwa wanaume wenye uwezo wa kufanya wajibu wao katika huduma ya hema la kuabudia. Palikuwa na sitini na mbili walio kuwa na undugu na Obedi Edomu.
Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm; ha na ụmụ ha ndị ikom, na ndị ikwu ha niile bụ dimkpa ndị nwere ike ịrụ ọrụ ahụ. Ha niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm. Ha dị iri isii na abụọ nʼọnụọgụgụ.
9 Meshelemia alikuwa na wana na ndugu, wanaume wenye uwezo, jumla ya kumi na nane.
E sitekwara nʼezinaụlọ Meshelemaia họpụta ndịisi iri na asatọ ndị bụkwa ezi ndị ndu.
10 Hosa, mzao wa Merari, alikuwa na wana: Shimiri kiongozi (japo hakuwa mzaliwa wa kwanza, baba yake alimfanya kiongozi),
Hosa, nwa Merari nwekwara ụmụ ndị ikom: Shimri onye nke mbụ (ọ bụ ezie na ọ bụghị ọkpara ya ma nna ya họpụtara ya ka ọ bụrụ onye mbụ).
11 Hilikia wapili, Tebalia watatu, Zekaria wanne. Wote wa wana wa Hosa na ndugu walikuwa kumi na tatu kwa idadi.
Hilkaya, nke abụọ, Tebalaya, nke atọ na Zekaraya onye nke anọ. Ụmụ ndị ikom na ụmụnne Hosa nwere dị iri na atọ.
12 Huu mgawanyiko wa walinzi wa lango, sambamba na viongozi, ulikuwa na majukumu, kama ndugu zao, kutumika katika nyumba ya Yahweh.
E kere ndị nche ụlọnsọ ukwu niile nʼotu nʼotu. Otu ndị a nwekwara ndịisi. E kenyekwara otu ọbụla ọrụ dịka e si kenye ụmụnna ha ọrụ ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
13 Walirusha kura, wadogo kwa wakubwa, kulingana na familia zao, kwa kila lango.
E sitere nʼife nza kenye ma nwantakịrị ma okenye, ọnụ ụzọ ha ga-eche nche, dịka ezinaụlọ ha si dị.
14 Kura ilipo rushwa kwa lango la mashariki, ilimuangukia Shelemia. Kisha wakarusha kura kwa Zekaria mwana wake, mshauri makini, na kura yake ikatokea lango la kaskazini.
Site nʼife nza, Shelemaya ketara iche ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nche. Zekaraya nwa ya, onye ndụmọdụ nwere uche, sitekwara nʼife nza keta iche ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ugwu, ya na ndị otu ya.
15 Kwa Obedi Edomu kulipangiwa lango la kusini, na wanae walipangiwa nyumba za ghala.
Obed-Edọm na ndị otu ya na-eche ụzọ dị na ndịda. Ụmụ ya bụ ndị na-eche ụlọ ebe a na-achịkọta ihe.
16 Shufimu na Hosa walipangiwa lango la magharibi pamoja na lango la Shalekethi, kwa barabara ya juu. Lindo lilikabiidhiwa kwa kila familia.
Shupim na Hosa na-eche ọnụ ụzọ dị nʼọdịda anyanwụ ya na ọnụ ụzọ ama Shaleket nke dị nʼụzọ elu elu. Ndị nche na-esota ndị nche ibe ha.
17 Kwa mashariki walikuwa Walawi sita, kaskazini kwa siku moja, kusini kwa siku moja, na nyumba za ghala wawili.
Ya mere, ọ bụ ndị Livayị isii na-eche nche nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ụbọchị niile. Mmadụ anọ na-anọ nʼugwu, anọ na ndịda, abụọ nʼebe a na-achịkọbata ihe.
18 Katika ua kuelekea magharibi wanne walipangwa, wanne barabarani, na wawili katika ua.
Nʼogige nke dị nʼọdịda anyanwụ e nwere ndị nche anọ nʼụzọ, ndị nche abụọ ọzọ nʼime ogige nʼonwe ya.
19 Haya yalikuwa magawanyiko ya walinzi wa lango. Palijazwa na uzao wa Kora na Merari.
A họpụtara ndị nche ndị a site nʼikwu Kora na Merari.
20 Miongoni mwa Walawi, Ahija alikuwa kiongozi wa hazina ya nyumba ya Mungu, na hazina ya vitu vya Yahweh.
Ụfọdụ ndị Livayị ka e nyefere ọrụ ilekọta ụlọakụ, na ụlọ a na-echekọta onyinye niile e doro nsọ nke e webatara nʼụlọnsọ ukwu Chineke.
21 Wazao wa Ladani, walitoka kwa Gerishoni kupitia kwake na walio kuwa viongozi wa familia za Ladani Mgerishoni, walikuwa Yehieli na wanae,
Ndị agbụrụ Ladan, ndị si nʼikwu Geshọn, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ nna ha Ladan, bụ onye Geshọn, bụ Jehieli,
22 Zethamu, na Yoeli kaka yake, aliyesimamia ghala za nyumba ya Yahweh.
na ụmụ ndị ikom Jehieli, Zetam na nwanne ya nwoke Juel. Ndị a bụ ndị na-elekọta ụlọakụ niile dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
23 Kulikuwa na askari walio chukuliwa kwa koo za Amramu, Izhari, Hebroni, na uzieli.
Site na ndị Amram, na ndị Izha, na ndị Hebrọn, na ndị Uziel.
24 Shebueli mwana wa Gerishomu mwana wa Musa, alikuwa msimamizi wa nyumba za ghala.
Shubuel nwa Geshọm, na nwa nwa Mosis ka e nyere ọrụ ịbụ onyeisi ụlọakụ dị nʼụlọnsọ ahụ.
25 Ndugu zake wa ukoo wa Eliezeri walikuwa Rehabia mwanae, mwana wa Rehabia Yeshaia, mwana wa Yeshaia Yoramu, mwana wa Yoramu Zikiri, na mwana wa Zikiri Shelomothi.
Ụmụnna ya site na Elieza bụ ndị a, Rehabaya nwa ya nwoke, Jeshaya nwa nwoke Rehabaya, Joram nwa nwoke Jeshaya na Zikri nwa nwoke Shelomit.
26 Shelomothi na ndugu zake walikuwa wasimamizi wa nyumba zote za ghala zinazo hifadhi vitu vyote vya Yahweh, ambavyo Daudi mfalme, viongozi wa familia, wakuu wa maelfu na mamia, na wakuu wa jeshi walivyo vitenga.
Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị nʼaka ilekọta ụlọakụ nke ihe nsọ niile, nke Devid bụ eze, na ndịisi ezinaụlọ niile, ndị bụ ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi agha ndị ọzọ, doro nsọ.
27 Walitenga vitu walivyo vichukuwa kwenye mapambano kwa ajili ya kutunza nyumba ya Yahweh.
Ụfọdụ ihe agha na ihe sitere nʼihe a kwatara nʼagha ka ha doro nsọ maka idozi ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
28 Pia walikuwa wahusika wa kila kitu kilicho tengwa kwa ajili ya Yahweh na Samweli nabii, Sauli mwana wa Kishi, Abneri mwana wa Neri, na Yoabu mwana wa Zeruia. Kila kitu kilicho tengwa kwa ajili ya Yahweh kilikuwa chini ya ulinzi wa shelomothi na ndugu zake.
Ya na ihe niile nke Samuel, bụ onye ọhụ ụzọ, na Sọl, nwa Kish na Abna, nwa Nea na Joab, nwa Zeruaya na ihe niile ndị ọzọ e doro nsọ. Ọ bụ nʼaka Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị ilekọta ha.
29 Wa uzao wa Izhari, Kenania na wana wake walikuwa wahusika wa mambo ya ndani ya Israeli. Walikuwa maafisa na waamuzi.
Site nʼikwu Izha, Kenaniya, na ụmụ ndị ikom ya ka ozi dịrị pụọ nʼụlọnsọ, dịka ndịisi na ndị ikpe nye ndị Izrel.
30 Wa uzao wa Hebroni, Hashabia na kaka zake, wanaume wenye uwezo 1, 700, walikuwa wahusika wa kazi ya Yahweh na kazi ya mfalme. Walikuwa upande wa mgharibi mwa Yordani.
Site na ndị Hebrọn, Hashabaya na ụmụnna ya ndị bụkwa dimkpa, ọnụọgụgụ ha dị otu puku na narị asaa, ka e mere ndịisi ala Izrel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Ihe niile banyere ọrụ Onyenwe anyị, na ijere eze ozi dị ha nʼaka.
31 Kutoka uzao wa Hebroni, Yeriya alikuwa kiongozi wa uzao wake, walihesabiwa kutoka orodha za familia zao. Katika mwaka wa arobaini wa utawala wa Daudi walitathimini kumbukumbu na kugundua miongoni mwao wanaume wa uwezo katika Yazeri ya Gileadi.
Jeraya bụ onyendu ndị Hebrọn, dịka akwụkwọ e dekọrọ usoro ọmụmụ si gosi. Nʼihi na nʼafọ nke iri anọ nke ọchịchị eze Devid nʼIzrel, ka e mere nnyocha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ chọpụta na e nwere ndị dị ike ọrụ nʼetiti ndị Hebrọn. A chọpụtara ndị a nʼobodo Jeza nke dị na Gilead.
32 Yerija alikuwa na ndugu 2, 700, walio kuwa viongozi wenye uwezo katika familia. Daudi aliwafanya waangalizi wa makabila ya Rubeni na Gadi, na nusu kabila la Manase, kwa kila jambo linalo muhusu Mungu, na kwa mambo ya mfalme.
Jeraya nwere ndị ikwu ya, ndị bụ dimkpa, na ndị dị ike ọrụ, ọnụọgụgụ ha dị puku abụọ na narị asaa. Ndị a niile bụkwa ndị ndu ezinaụlọ dị iche iche. Ya mere, Devid, eze Izrel, mere ha ndịisi ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase. Ọrụ ha bụ ilekọta ihe banyere ofufe Chineke na ije ozi niile metụtara eze.

< 1 Nyakati 26 >