< Salmos 87 >

1 Su cimiento es en montes de santidad.
Abụ Ọma ụmụ Kora. Otu Abụ. Chineke atọọla ntọala ya nʼelu ugwu nsọ ahụ;
2 Ama Jehová las puertas de Sión, más que todas las moradas de Jacob.
Onyenwe anyị hụrụ ọnụ ụzọ ama Zayọn nʼanya, karịa ebe obibi niile nke Jekọb.
3 Cosas ilustres son dichas de ti, ciudad de Dios. (Selah)
Ihe dị iche iche nke dị ebube ka a na-ekwu banyere gị, O obodo Chineke; (Sela)
4 Yo me acordaré de Rahab y de Babilonia, entre los que me conocen: he aquí Palestina, y Tiro, con Etiopía: este nació allá.
“Aga m agụnye Rehab na Babilọn, dịka ndị na-asọpụrụ m, aga m agụnyekwa ndị Filistia, na ndị Taịa, na ndị Kush, aga m asị, ‘A mụrụ nke a na Zayọn.’”
5 Y de Sión se dirá: Este, y aquel es nacido en ella: y el mismo Altísimo la fortificará.
Nʼezie, a ga-ekwu okwu banyere Zayọn sị, “A mụrụ nke a na nke ọzọ nʼime ya, ya onwe ya, bụ Onye kachasị ihe niile elu, ga-eme ka o guzosie ike.”
6 Jehová contará, cuando se escribieren los pueblos: Este nació allí. (Selah)
Onyenwe anyị ga-ede nʼime akwụkwọ usoro nke ndị mmadụ: “A mụrụ onye a na Zayọn.”
7 Y cantores con músicos de flautas: todas mis fuentes estarán en ti.
Dịka ha na-eti egwu, ha ga-abụ abụ sị, “Isi iyi m niile dị na gị.”

< Salmos 87 >