< San Lucas 1 >

1 Puesto que muchos han emprendido la tarea de poner en orden una narración relativa a los asuntos que se han cumplido entre nosotros,
Ebe ọ bụ nʼọtụtụ mmadụ agbalịala otu ha nwere ike i detu nʼusoro ihe niile mezuru nʼetiti anyị.
2 tal como nos lo transmitieron los que desde el principio fueron testigos oculares y servidores de la palabra,
Dị ka e nyefere ha nʼaka anyị idebe bụ ndị ahụ sitere na malite jiri anya ha hụ ihe niile, ndị jikwa okwu a eje ozi.
3 también me pareció bien, habiendo entendido el curso de todas las cosas con exactitud desde el principio, escribirte en orden, excelentísimo Teófilo;
Ekpebikwara m, ebe mụ onwe m nyocharala ihe niile nke ọma site na mmalite, ka m dere gị ihe niile nʼusoro, Tiofilọs, gị onye dị elu a na-asọpụrụ.
4 para que conozcas la certeza relativa a las cosas en las que fuiste instruido.
Nke a ga-eme ka ị mata nke bụ eziokwu banyere ihe ndị ahụ e ziri gị.
5 Había en los días de Herodes, rey de Judea, un sacerdote llamado Zacarías, de la división sacerdotal de Abías. Tenía una esposa de las hijas de Aarón, que se llamaba Elisabet.
Nʼoge Herọd bụ eze Judịa, ọ dị otu onyeisi nchụaja aha ya bụ Zekaraya, onye si nʼotu ndị nchụaja nke Abija. Elizabet bụ nwunye ya, site nʼagbụrụ Erọn.
6 Ambos eran justos ante Dios, y andaban irreprochablemente en todos los mandamientos y ordenanzas del Señor.
Ha abụọ bụ ndị ezi omume nʼihu Chineke. Ha debere iwu na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere na-enweghị ntụpọ ọbụla.
7 Pero no tuvieron hijos, porque Elisabet era estéril, y ambos eran de edad avanzada.
Mana ha amụtaghị nwa, nʼihi na Elizabet bụ nwanyị agaa, ha abụọ emeela nnọọ agadi.
8 Mientras ejercía el oficio sacerdotal ante Dios en el orden de su división
O ruru mgbe ọ bụ ndị otu Zekaraya ga-eje ozi, ọ nọ dịka onye nchụaja na-eje ozi nʼihu Chineke.
9 según la costumbre del oficio sacerdotal, le tocaba entrar en el templo del Señor y quemar incienso.
A họpụtara ya site nʼife nza dị ka omenaala ndị nchụaja si dị ka ọ bụrụ ya ga-abanye nʼime ime ụlọnsọ Onyenwe anyị ịchụ aja nsure ọkụ nke e ji ụda na-esi isi ụtọ achụ.
10 Toda la multitud del pueblo oraba fuera a la hora del incienso.
Mgbe oge ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ ruru, igwe ndị mmadụ bịara nọ nʼezi na-ekpe ekpere.
11 Se le apareció un ángel del Señor, de pie a la derecha del altar del incienso.
Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye guzo nʼaka nri nke ebe ịchụ aja nke ihe na-esi isi ụtọ mere ka ọ hụ ya anya.
12 Zacarías se turbó al verlo y le entró miedo.
Mgbe Zekaraya hụrụ ya, obi fepụrụ ya, ọ tụkwara oke egwu.
13 Pero el ángel le dijo: “No temas, Zacarías, porque tu petición ha sido escuchada. Tu mujer, Elisabet, te dará a luz un hijo, y le pondrás por nombre Juan.
Ma mmụọ ozi ahụ gwara ya sị, “Zekaraya atụla egwu, Chineke anụla ekpere gị. Elizabet nwunye gị ga-atụrụ ime mụtara gị nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jọn.
14 Tendrás alegría y gozo, y muchos se alegrarán de su nacimiento.
Ọ ga-abụrụ gị ihe oke ọṅụ na obi ụtọ, ọtụtụ mmadụ ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ọmụmụ ya.
15 Porque será grande a los ojos del Señor, y no beberá vino ni bebida fuerte. Estará lleno del Espíritu Santo, incluso desde el vientre de su madre.
Nʼihi na ọ ga-abụ onye dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gaghị aṅụkwa mmanya ọbụla, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-egbu egbu nʼihi na site nʼafọ nne ya ọ ga-abụ onye emejupụtara na Mmụọ Nsọ.
16 Hará que muchos de los hijos de Israel se conviertan al Señor, su Dios.
Ọ ga-akpọghachite ọtụtụ ụmụ Izrel nye Onyenwe ha bụ Chineke ha.
17 Irá delante de él con el espíritu y el poder de Elías, ‘para hacer volver el corazón de los padres a los hijos’, y a los desobedientes a la sabiduría de los justos; para preparar un pueblo preparado para el Señor.”
Ma ọ ga-aga nʼihu Onyenwe anyị nʼike mmụọ na ike nke Ịlaịja, tụgharịa obi ndị bụ nna nʼebe ụmụ ha nọ. Meekwa ka ndị isiike tụgharịa obi, lekwasị anya nʼamamihe nke ndị ezi omume, na ijikere ụmụ mmadụ nʼihi Onyenwe anyị.”
18 Zacarías dijo al ángel: “¿Cómo puedo estar seguro de esto? Porque soy un anciano, y mi mujer está muy avanzada en años”.
Zekaraya sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu m ga-esi mata na nke a ga-adị otu a? Abụrụla m agadi. Nwunye m akakwaala nka.”
19 El ángel le respondió: “Soy Gabriel, que está en la presencia de Dios. He sido enviado para hablarte y traerte esta buena noticia.
Mmụọ ozi zara ya sị, “Abụ m Gebrel. Ana m eguzo nʼihu Chineke. Ezitere m ka m bịa gwa gị okwu ma wetara gị oziọma a.
20 He aquí que te quedarás callado y no podrás hablar hasta el día en que sucedan estas cosas, porque no creíste en mis palabras, que se cumplirán a su debido tiempo.”
Ma lee, ị ga-ada ogbi, ị gaghị ekwukwa okwu ọbụla, tutu ruo mgbe ihe ndị a ga-emezu nʼihi na i kwenyeghị nʼokwu m, nke ga-emezu mgbe oge ya ruru.”
21 La gente esperaba a Zacarías y se maravillaba de que se demorara en el templo.
Mgbe ihe ndị a niile na-eme, mmadụ ndị ahụ nọkwa na-eche Zekaraya ka ọ pụta. O juru ha anya na ọ nọọla ọdụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ.
22 Cuando salió, no pudo hablarles. Se dieron cuenta de que había tenido una visión en el templo. Siguió haciéndoles señales, y permaneció mudo.
Mgbe o mesịrị pụta, o nwekwaghị ike ikwuru ha okwu. Ha ghọtara na ọ hụrụ ọhụ nʼime ụlọnsọ ahụ nʼihi na ọ bụ aka ka o ji gwa ha okwu.
23 Cuando se cumplieron los días de su servicio, se fue a su casa.
Mgbe oge ịrụ ọrụ ya gwụsịrị, ọ laghachiri nʼụlọ ya.
24 Después de estos días, concibió Elisabet, su mujer, y se escondió cinco meses, diciendo:
Mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị, Elizabet bụ nwunye ya tụụrụ ime. O zoro onwe ya nʼime ụlọ ọnwa ise.
25 “Así me ha hecho el Señor en los días en que me ha mirado, para quitar mi oprobio entre los hombres.”
Ọ sịrị, “Onyenwe anyị emeerela m nke a. O gosila m ihuọma ya nʼụbọchị ndị a, ma wepụkwara m ihere nʼetiti ndị nke m.”
26 En el sexto mes, el ángel Gabriel fue enviado por Dios a una ciudad de Galilea llamada Nazaret,
Ma nʼọnwa isii ya, Chineke zigara mmụọ ozi ya, bụ Gebrel, ka ọ gaa nʼobodo Nazaret nke dị nʼime Galili.
27 a una virgen comprometida a casarse con un hombre que se llamaba José, de la casa de David. La virgen se llamaba María.
Ka o jekwuru otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke bụ onye otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere nʼagbụrụ Devid, kwere nkwa ịlụ. Aha nwaagbọghọ a bụ Meri.
28 Al entrar, el ángel le dijo: “¡Alégrate, muy favorecida! El Señor está contigo. Bendita eres entre las mujeres”.
O jekwuru ya sị ya, “Ekele! Gị onye ihuọma dịkwasịrị. Onyenwe anyị nọnyekwara gị.”
29 Pero cuando lo vio, se preocupó mucho por el dicho, y pensó qué clase de saludo sería éste.
Ma obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu nʼihi okwu ya. O bidokwara ịtụgharị nʼuche ya ihe ekele a pụtara.
30 El ángel le dijo: “No temas, María, porque has encontrado el favor de Dios.
Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Atụla egwu Meri, nʼihi na i chọtala ihuọma nʼebe Chineke nọ.
31 He aquí que concebirás en tu seno y darás a luz un hijo, al que pondrás por nombre “Jesús”.
Ma lee ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jisọs.
32 Será grande y se llamará Hijo del Altísimo. El Señor Dios le dará el trono de su padre David,
Ọ ga-abụ nnukwu mmadụ onye a ga-akpọ Ọkpara Onye kachasị ihe niile elu. Onyenwe anyị Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid.
33 y reinará sobre la casa de Jacob para siempre. Su Reino no tendrá fin”. (aiōn g165)
Ọ ga-achị ụlọ Jekọb ruo ebighị ebi, alaeze ya agaghị enwekwa ọgwụgwụ.” (aiōn g165)
34 María dijo al ángel: “¿Cómo puede ser esto, siendo yo virgen?”.
Meri sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe m bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke?”
35 El ángel le respondió: “El Espíritu Santo vendrá sobre ti, y el poder del Altísimo te cubrirá con su sombra. Por eso también el santo que nazca de ti será llamado Hijo de Dios.
Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe niile elu ga-ekpuchikwa gị. Ya mere onye nsọ ahụ a ga-amụ, a ga-akpọ ya Ọkpara Chineke.
36 He aquí que también Elisabet, tu pariente, ha concebido un hijo en su vejez; y éste es el sexto mes de la que se llamaba estéril.
Lekwa Elizabet onye ikwu gị atụrụla ime nwa nwoke nʼagadi ya. Nke a bụ ọnwa isii ya, bụ onye ahụ ha na-akpọ nwanyị aga.
37 Porque nada de lo dicho por Dios es imposible.”
Nʼihi na ọ dịghị okwu sitere na Chineke nke na-agaghị ere.”
38 María dijo: “He aquí la sierva del Señor; hágase en mí según tu palabra”. Entonces el ángel se alejó de ella.
Meri zaghachiri sị, “Abụ m ohu Onyenwe anyị, ka ọ dịrị m dị ka i kwuru.” Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya laa.
39 En aquellos días, María se levantó y se fue de prisa a la región montañosa, a una ciudad de Judá,
Nʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda.
40 entró en casa de Zacarías y saludó a Isabel.
Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼụlọ Zekaraya, kelee Elizabet.
41 Cuando Isabel oyó el saludo de María, el niño saltó en su seno; e Isabel quedó llena del Espíritu Santo.
Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya nʼafọ megharịrị ahụ. E mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ nsọ.
42 Gritó en voz alta y dijo: “Bendita eres entre las mujeres y bendito es el fruto de tu vientre.
O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa.
43 ¿Por qué soy tan favorecida, para que la madre de mi Señor venga a mí?
Onye kwanụ ka m bụ na ihuọma dị otu a kpọrọ m na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m?
44 Porque cuando la voz de tu saludo llegó a mis oídos, el niño saltó de alegría en mi vientre.
Ngwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ.
45 ¡Bienaventurada la que ha creído, porque se cumplirán las cosas que se le han dicho de parte del Señor!”
Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.”
46 María dijo, “Mi alma engrandece al Señor.
Ma Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu
47 Mi espíritu se ha alegrado en Dios, mi Salvador,
mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m,
48 pues ha mirado el humilde estado de su sierva. Porque he aquí que, a partir de ahora, todas las generaciones me llamarán dichosa.
nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi.
49 Porque el que es poderoso ha hecho grandes cosas por mí. Santo es su nombre.
Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ.
50 Su misericordia es por generaciones y generaciones sobre los que le temen.
Ebere ya na-erute ndị niile na-atụ egwu ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
51 Ha demostrado poder con su brazo. Ha dispersado a los orgullosos en la imaginación de sus corazones.
O gosila ike aka ya; ọ chụsasịala ndị dị mpako nʼime echiche obi ha.
52 Ha derribado a los príncipes de sus tronos, y ha exaltado a los humildes.
O sitela nʼocheeze ndị eze dị ike kwatuo ha, buliekwa ndị dị umeala nʼobi elu.
53 Ha colmado de bienes a los hambrientos. Ha enviado a los ricos con las manos vacías.
O jirila ihe dị mma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ ma ndị ọgaranya ka o zipụrụ nʼaka efu.
54 Ha dado ayuda a Israel, su siervo, para que se acuerde de la misericordia,
O nyerela odibo ya bụ Izrel aka, ọ na-echetakwa imere ya ebere.
55 como habló con nuestros padres, a Abraham y a su descendencia para siempre”. (aiōn g165)
Dị ka ọ gwara nna nna anyị ha, nye Ebraham na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn g165)
56 María se quedó con ella unos tres meses y luego volvió a su casa.
Meri nọnyeere ya ihe dịka ọnwa atọ ma mesie laghachi nʼụlọ ya.
57 Se cumplió el tiempo en que Elisabet debía dar a luz, y dio a luz un hijo.
Mgbe oge zuru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke.
58 Sus vecinos y sus parientes oyeron que el Señor había engrandecido su misericordia con ella, y se alegraron con ella.
Ndị agbataobi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ebere dị ukwuu, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ.
59 Al octavo día vinieron a circuncidar al niño, y quisieron llamarlo Zacarías, como el nombre de su padre.
Nʼabalị nke asatọ ha bịara ibi nwata ahụ ugwu na ịgụ ya aha. Ha na-achọ ịgụ ya Zekaraya bụ aha nna ya,
60 Su madre respondió: “No, sino que se llamará Juan”.
ma Nne ya sịrị, “Mba, a ga-agụ ya Jọn.”
61 Le dijeron: “No hay nadie entre tus parientes que se llame así”.
Ha sịrị ya, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ndị ikwu gị na-aza aha ahụ.”
62 Hicieron señas a su padre de cómo quería que se llamara.
Ya mere, ha jiri ife aka jụọ nna ya, ihe ọ chọrọ ka akpọ nwata ahụ.
63 Pidió una tablilla y escribió: “Se llama Juan”. Todos se maravillaron.
Ọ rịọrọ ka e nye ya mbadamba ihe e ji ede ihe, o deere “Aha ya bụ Jọn.” Nke a jukwara mmadụ niile anya.
64 Al instante se le abrió la boca y se le liberó la lengua, y habló bendiciendo a Dios.
Ngwangwa, ọnụ ya meghere, atọpụkwara ire ya. Ya ebido ikwu okwu ma na-etokwa Chineke.
65 El temor se apoderó de todos los que vivían alrededor, y todos estos dichos fueron comentados en toda la región montañosa de Judea.
Ibubo wụrụ ndị agbataobi ha niile nʼahụ, ndị mmadụ kọkwara akụkọ banyere ihe ndị a niile ruo obodo niile dị nʼakụkụ ugwu Judịa.
66 Todos los que los oían los guardaban en su corazón, diciendo: “¿Qué será entonces este niño?” La mano del Señor estaba con él.
Ndị niile nụrụ akụkọ a chere nʼobi ha na-ajụ sị, “Gịnịkwa ka nwa nke a gaje ịbụ?” Nʼihi na aka Onyenwe anyị dịnyeere ya.
67 Su padre Zacarías fue lleno del Espíritu Santo y profetizó diciendo,
E mere ka Zekaraya bụ nna ya jupụta na Mmụọ Nsọ. O buru amụma sị,
68 “Bendito sea el Señor, el Dios de Israel, porque ha visitado y redimido a su pueblo;
“Ngọzị dịrị Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel, nʼihi na ọ bịala leta ma gbapụtakwa ndị nke ya.
69 y nos ha levantado un cuerno de salvación en la casa de su siervo David
O welielara anyị Onye nzọpụta site nʼụlọ odibo ya bụ Devid.
70 (como habló por boca de sus santos profetas que han sido desde la antigüedad), (aiōn g165)
(Dị ka o kwuru na mgbe ochie, site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ). (aiōn g165)
71 salvación de nuestros enemigos y de la mano de todos los que nos odian;
Na ọ ga-azọpụta anyị site nʼaka ndị iro anyị na sitekwa nʼaka ndị niile kpọrọ anyị asị.
72 para mostrar misericordia hacia nuestros padres, para recordar su santa alianza,
O meere ndị nna nna anyị ha ebere site nʼicheta ọgbụgba ndụ ya dị nsọ.
73 el juramento que hizo a Abraham, nuestro padre,
Iyi nke ọ ṅụụrụ nna anyị bụ Ebraham, kwekwa nkwa:
74 que nos conceda que, siendo liberados de la mano de nuestros enemigos, debe servirle sin miedo,
Na ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, nyekwa anyị ike ife ya ofufe na-atụghị egwu.
75 en santidad y justicia ante él todos los días de nuestra vida.
Nʼịdị nsọ na ezi omume nʼihu ya ụbọchị niile nke ndụ anyị.
76 Y tú, niño, serás llamado profeta del Altísimo; porque irás delante de la cara del Señor para preparar sus caminos,
“Ma gị nwa m, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye kachasị ihe niile elu; nʼihi na ị ga-aga nʼihu Onyenwe anyị kwadoro ya ụzọ.
77 para dar conocimiento de la salvación a su pueblo por la remisión de sus pecados,
Ime ka ndị nke ya nwee amamihe nke nzọpụta site na ịgbaghara mmehie ha.
78 por la tierna misericordia de nuestro Dios, por la que nos visitará la aurora de lo alto,
Nʼihi oke obi ebere Chineke anyị, nke ọwụwa anyanwụ ga-ewetara anyị site nʼigwe.
79 para iluminar a los que están en las tinieblas y en la sombra de la muerte; para guiar nuestros pies por el camino de la paz”.
Ka ọ chakwasị ndị bi nʼọchịchịrị na nʼonyinyo nke ọnwụ, na iduzi ụkwụ anyị nʼụzọ nke udo.”
80 El niño crecía y se fortalecía en espíritu, y estuvo en el desierto hasta el día de su aparición pública ante Israel.
Nwata ahụ toro, bụrụ onye dị ike nʼime mmụọ. O biri nʼime ọzara tutu ruo mgbe oge zuru igosi ụmụ Izrel onwe ya.

< San Lucas 1 >