< Книга пророка Наума 2 >

1 Взыде вдыхаяй в лице твое, отемляй от оскорбления: усмотри путь, укрепи чресла, возмужай крепостию зело:
Onye na-ebuso gị agha na-abịakwasị gị. Chee ebe gị niile e wusiri ike nche. Chee ụzọ niile nche, mee ka ụkwụ gị sie ike nʼala. Chịkọtakwa ike gị niile.
2 понеже отврати Господь укоризну Иаковлю, якоже укоризну Израилеву: зане отрясающии отрясоша я и лозы их растлиша.
Onyenwe anyị ga-eme ka ịma mma Jekọb laghachi, dịka ịma mma nke Izrel ọ bụ ezie na ndị mbibi ebibiela ha, lakwaa alaka osisi vaịnị ha niile nʼiyi.
3 Оружия силы их от человек, мужы сильныя играющыя во огни: брозды колесниц их в день уготования его, и конницы возмятутся на путех,
Ọta ndị agha ya na-acha ọbara ọbara, ndị bụ dike nʼagha yikwa uwe na-acha uhie uhie. Igwe e ji wuo ụgbọ agha na-egbu amụma nʼụbọchị ahụ ha na-ejikere agha, otu a kwa, ha na-efegharịkwa ùbe ha eji osisi fịa mee.
4 и смятутся колесницы и сплетутся на стогнах: вид их яко свещы огненны, и яко молния протекающая.
Ụgbọ agha na-eme mkpọtụ dị ukwuu nʼezi, ha na-agbagharị ihu na azụ nʼama niile. Ha na-enwu dịka ire ọkụ, na-agbagharịkwa dịka amụma.
5 И помянутся старейшины их, и побегнут в день, и изнемогут в пути своем, и потщатся на забрала его, и уготовят предния стражбы своя.
Ọ na-akpọkọta ndị agha ya a zụziri azụzi, ma ha na-asọ ngọngọ nʼije ha. Ha ji ọsọ gbaga ruo nʼelu mgbidi ha, dozie ọta nche ha niile nʼusoro.
6 Врата градная отверзошася, и царства падоша, и имение открыся.
Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri, ụlọeze na-amakwa jijiji.
7 Сия же восхождаше, и рабыни ея ведяхуся, яко голубицы воркующя в сердцах своих:
E nyela ya ka ọ bụrụ iwu na obodo a aghaghị ịbụ obodo a dọtara nʼagha. Ndị ohu ha ndị inyom so ha nʼazụ na-akwa akwa dịka nduru, na-etikwa aka nʼobi.
8 и Ниневиа, аки купель водная воды ея, и тии бежаще не сташа, и не бе взирающаго.
Ninive dịka ọdọ mmiri nke mmiri ya na-ehifusị. “Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe, ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ.
9 Расхищаху сребро, расхищаху злато, и не бяше конца имения ея: отяготишася паче всех сосудов вожделенная ея.
Kwakọrọnụ ọlaọcha, kwakọrọnụ ọlaedo dịka ihe a kwatara nʼagha. Akụnụba dị nʼụlọakụ ya na ihe ndị ọzọ bara uru nʼobodo ahụ, enweghị ọgwụgwụ.
10 Истрясение и вострясение, и воскипение и сердца сокрушение, и разслабление колен и болезни по всем чреслом, и лице всех, аки опаление котла.
E bibiela ya. A gbahapụla ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Obi ndị nọ nʼime ya na-alọ mmiri, ikpere ha niile na-ama jijiji, anụ ahụ ha niile na-amakwa jijiji, ihu niile achagharịakwala.
11 Где есть виталище львов и пажить сущая львичищем? Камо иде лев, еже влезти тамо львичищу, и не бяше устрашающаго.
Ebeekwa ka ọgba ọdụm ahụ dị ugbu a, bụ ebe ahụ ha na-anọ enye ụmụ ha nri, ebe oke ọdụm na nne ọdụm na-ejegharị, na ebe ụmụ ọdụm na-anọ na-atụghị egwu ihe ọbụla?
12 Лев восхити доволная львичищем своим и удави львицам своим, и наполни ловитвы гнездо свое и виталище свое похищения.
Ọdụm ahụ na-adọgbu anụ na-ezuru ụmụ ya, nke na-anyagburu nne ọdụm anụ, na-ekpoju anụ ọ dọgbutara nʼụlọ ya niile. Ebe obibi ya jupụtara nʼanụ ọ dọgburu.
13 Се, Аз на тя, глаголет Господь Вседержитель, и пожгу дымом множество твое, и львы твоя пояст оружие: и потреблю от земли ловитву твою, и не услышатся ктому дела твоя.
“Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, “Aga m esure ụgbọala gị niile nʼanwụrụ ọkụ, mma agha ga-ala ụmụ ọdụm gị niile nʼiyi. Agaghị m ahapụkwara gị anụ ọbụla ị ga-adọgbu nʼụwa. A gaghị anụkwa olu ndị ozi gị ọzọ.”

< Книга пророка Наума 2 >