< Ruka 7 >

1 Zvino wakati apedza mashoko ake ese munzeve dzevanhu, akapinda muKapenaume.
Mgbe o kwusiri okwu ndị a nye ndị na-ege ya ntị, ọ banyere na Kapanọm.
2 Zvino muranda weumwe mukuru wezana, waiva akakosha kwaari, wakange achirwara, achitandadza.
Ma e nwere otu ọchịagha nke nwere otu ohu nwoke ọ hụrụ nʼanya. Onye nọ nʼọrịa na nʼọnụ ọnwụ.
3 Zvino wakati anzwa zvaJesu, akatuma kwaari vakuru veVaJudha, achikumbira kuti auye aporese muranda wake.
Mgbe ọ nụrụ ihe banyere Jisọs, o zipụrụ ụfọdụ ndị okenye ndị Juu ka ha gaa rịọrọ ya ka ọ bịa gwọọ ohu ya.
4 Zvino ivo vakati vachisvika kuna Jesu, vakamukumbirisa zvikuru, vachiti: Wakafanira kuti mumuitire izvozvi;
Mgbe ha bịakwutere Jisọs, ha rịọsiri ya arịrịọ ike sị, “O kwesiri ka i mere ya ihe a.
5 nokuti anoda rudzi rwedu, uye ndiye wakativakira sinagoge.
Nʼihi na ọ hụrụ obodo anyị nʼanya. O wukwaara anyị ụlọ ekpere.”
6 Zvino Jesu akaenda navo. Zvino apo akange asisiri kure neimba, mukuru wezana akatuma shamwari kwaari, achiti kwaari: Ishe, musazvitambudza; nokuti handina kufanira kuti mupinde pasi pedenga reimba yangu;
Jisọs sooro ha gawa. Ma mgbe ọ nọ nso nʼụlọ ya, onye ọchịagha ahụ zipụrụ ndị enyi ya ka ha ga sị ya, “Onyenwe anyị, esogbukwala onwe gị, nʼihi na etorughị m ka ị bata nʼokpuru ụlọ m.
7 naizvozvo handina kutongofunga ini pachangu ndakafanira kuuya kwamuri; asi taurai neshoko, muranda wangu achaporeswa.
Ọ bụ ya mere na-echeghị m na m toruru ịpụta bịa zute gị. Ma kwuo okwu, ọ ga-agwọkwa odibo m.
8 Nokuti iniwo ndiri munhu wakaiswa pasi pesimba, ndine mauto pasi pangu; ndinoti kune uyu: Enda, anoenda; uye kune umwe: Uya, anouya; nekumuranda wangu: Ita ichi, achiita.
Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a ‘gaa,’ ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ ‘bịa,’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a,’ ọ na-emekwa ya.”
9 Jesu wakati anzwa zvinhu izvi, akashamisika naye, akatendeuka, akati kuchaunga chaimutevera: Ndinoti kwamuri: Handina kuwana rutendo rukuru rwakadai kunyange pakati paIsraeri.
Mgbe Jisọs nụrụ okwu niile a, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ tụgharịrị gwa igwe mmadụ ndị na-eso ya sị, “Asị m unu, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ọ bụladị nʼIzrel.”
10 Zvino avo vakange vatumwa vodzokera kumba vakawana muranda airwara ava mutano.
Mgbe ndị ozi ahụ laghachiri nʼụlọ, ha chọpụtara na ahụ adịla ohu ahụ mma.
11 Zvino zvakaitika zuva raitevera, kuti wakaenda kuguta rainzi Naini; zvino vazhinji vevadzidzi vake nechaunga chikuru vakaenda naye.
O ruo mgbe nwa oge gasịrị, ọ gara nʼobodo a na-akpọ Nain. Ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ ndị ọzọ sooro ya gaa.
12 Zvino, wakati achiswedera pasuwo reguta, zvino tarira, mushakabvu achibudiswa kunze, mwanakomana umwe wega wamai vake, uye ivo vaiva chirikadzi; nechaunga chikuru cheguta chakange chinaye.
Mgbe ọ na-abịaru nso nʼọnụ ụzọ e si abata nʼobodo ahụ, o nwere otu nwoke nwụrụ anwụ nke a na-ebupụ, otu nwa nke nne ya mụrụ. Nne ya ahụ bụ nwanyị di ya nwụrụ, oke igwe mmadụ si nʼobodo ahụ sonyekwara ya.
13 Zvino Ishe wakati amuona, akamunzwira tsitsi, akati kwaari: Usachema.
Mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, o meere ya obi ebere ma sị ya, “Ebela akwa.”
14 Zvino akaswedera akabata hwanyanza; zvino vatakuri vakamira; akati: Jaya, ndinoti kwauri: Muka!
Mgbe ahụ ọ gara nso metụ igbe ozu ahụ aka, ndị bu ya kwụsịrị. Ọ sịrị, “Nwokorobịa, asị m gị bilie!”
15 Mushakabvu akamuka ndokugara, akatanga kutaura; akamupa kuna mai vake.
Nwoke ahụ nwụrụ anwụ biliri, nọdụ ala, bido ikwu okwu, ọ kpọnyere ya nne ya.
16 Kutya ndokubata vese; vakarumbidza Mwari, vachiti: Muporofita mukuru wamuka pakati pedu; nekuti: Mwari washanyira vanhu vake.
Egwu tụrụ ha niile, ha tokwara Chineke sị, “Onye amụma dị ukwuu apụtala nʼetiti anyị, Chineke abịala inyere ndị ya aka!”
17 Zvino iri shoko maererano naye rikabudira muJudhiya rese nenharaunda yese yakapoteredza.
Akụkọ a banyere ya ruru Judịa niile na obodo nta niile gbara ya gburugburu.
18 Vadzidzi vaJohwani ndokumupira zvezvinhu izvozvi zvese.
Ndị na-eso ụzọ Jọn kọọrọ ya maka ihe ndị a niile. Jọn kpọrọ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya,
19 Johwani akadanira kwaari vamwe vaviri vevadzidzi vake, akavatuma kuna Jesu achiti: Imwi ndimwi anouya here, kana tichakataririra umwe?
zie ha ka ha jekwuru Onyenwe anyị jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa. Ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?”
20 Zvino varume vakati vasvika kwaari, vakati: Johwani Mubhabhatidzi watituma kwamuri achiti: Imwi ndimwi anouya here, kana titaririre umwe?
Mgbe ụmụ nwoke ahụ bịakwutere ya, ha sịrị, “Jọn omee baptizim ziri anyị ka anyị jụọ gị sị, ‘Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?’”
21 Zvino munguva iyoyo akaporesa vazhinji pazvifo neurwere, nepamweya yakaipa; nekumapofu mazhinji akapa kuona.
Mgbe ahụ ọ gwọrọ ọtụtụ ndị nwere ọrịa, na nrịa nrịa dị iche iche, na mmụọ ọjọọ. O mekwara ka ọtụtụ ndị kpuru ìsì hụ ụzọ ọzọ.
22 Zvino Jesu achipindura akati kwavari: Endai munoudza Johwani zvamakaona nezvamakanzwa; zvekuti, mapofu anoonazve, vanokamhina vanofamba, vane maperembudzi vanonatsva, matsi dzinonzwa, vakafa vanomutswa, varombo vanoparidzirwa evhangeri.
Ọ zaghachiri ndị ozi ahụ sị, “Laghachinụ azụ gaa kọrọ Jọn ihe unu hụrụ na nke unu nụrụ; ndị kpuru ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-aga ije, ndị ekpenta ka a na-eme ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie, a na-ezisara ndị ogbenye oziọma.
23 Uye wakaropafadzwa ani nani asingagumbuswi neni.
Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.”
24 Zvino vatumwa vaJohwani vakati vabva, wakatanga kutaura kuzvaunga pamusoro paJohwani, achiti: Makabudira kurenje kunoonei? Rutsanga rwunozununguswa nemhepo here?
Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn pụrụ, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ ahụ okwu banyere Jọn sị, “Gịnị ka unu gara nʼọzara ịhụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị?
25 Asi makange mabuda kunoonei? Munhu wakapfeka nguvo dzakapfava here? Tarirai, vari munguvo dzinobwinya, vachirarama zvakanaka, vari mudzimba dzemadzimambo.
Ma gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? Ọ bụ nwoke yi uwe mara mma? E e, ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa, ndị na-ebikwa nʼoke oriri na oke ọṅụṅụ bi nʼụlọeze.
26 Asi makange mabuda kunoonei? Muporofita here? Hongu, ndinoti kwamuri: Kunyange anopfuura zvikuru muporofita.
Ma gịnị ka unu pụrụ ka unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, ana m a gwa unu, unu hụrụ onye karịrị onye amụma.
27 Uyu ndiye wakanyorwa pamusoro pake, zvichinzi: Tarira, ini ndinotuma mutumwa wangu pamberi pechiso chako, achagadzira nzira yako pamberi pako.
Ọ bụ onye a bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya sị, “‘Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.’
28 Nokuti ndinoti kwamuri: Pakati pevakaberekwa nevakadzi, hakuna muporofita mukuru kuna Johwani Mubhabhatidzi; asi mudikisa muushe hwaMwari mukuru kwaari.
Agwa m unu, nʼetiti ndị nwanyị mụrụ, ọ dịghị onye dị ukwuu karịa Jọn, ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze Chineke dị ukwuu karịa ya.”
29 Zvino vanhu vese nevateresi vakati vachizvinzwa vakati Mwari wakarurama, zvavakange vabhabhatidzwa nerubhabhatidzo rwaJohwani.
(Ndị mmadụ niile nụrụ nke a, tinyekwara ndị ọna ụtụ, nabatara nʼụzọ Chineke bụ nke ziri ezi, nʼihi na Jọn emela ha baptizim.
30 Asi VaFarisi nenyanzvi dzemutemo vakaramba zano raMwari vachizvipikisa, vakasabhabhatidzwa naye.
Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ imezu ebumnobi Chineke nye ha onwe ha, nʼihi na ha anabataghị ka Jọn mee ha baptizim.)
31 Asi Ishe akati: Zvino vanhu vezera iri ndichavafananidza nei? Vakafanana nei?
Ọ gara nʼihu sị ha, “Ma gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nʼọgbọ a? Gịnị ka ha yiri?
32 Vakafanana nevana vadiki vagere pamisika vachidanidzirana vachiti: Takakuridzirai nyere asi hamuna kutamba, takakuririrai asi hamuna kuchema.
Ha dị ka ụmụntakịrị nọ nʼọma ahịa na-akpọ ibe ha oku na-asị, “‘Anyị gburu unu ọja, ma unu adịghị ete egwu. Anyị bụrụ abụ ịkwa ozu, ma unu ebeghị akwa.’
33 Nokuti Johwani Mubhabhatidzi akauya asingadyi chingwa kana kunwa waini, zvino moti: Ane dhimoni;
Nʼihi na Jọn omee baptizim bịara na-erighị achịcha maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ma unu sịrị, ‘Mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.’
34 Mwanakomana wemunhu wauya achidya, achinwa, zvino moti: Tarirai munhu wemakaro nemunwi wewaini, shamwari yevateresi nevatadzi.
Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, ma unu sịrị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’
35 Asi uchenjeri hunonzi hwakarurama nevana vahwo vese.
Ma e sitela nʼụmụ ya niile nwapụta amamihe nʼonye ziri ezi.”
36 Zvino umwe weVaFarisi wakamukumbira kuti adye naye; akapinda mumba memuFarisi, akagara pakudya.
Otu onye nʼime ndị Farisii kpọrọ ya oriri. Ọ gara nʼụlọ onye Farisii ahụ, ma nọdụ ala nʼoche nri.
37 Zvino tarira, mukadzi muguta iro, waiva mutadzi, wakati aziva kuti agere pakudya mumba memuFarisi, akauya nechinu chearibhasiteri chechizoro.
Ma otu nwanyị nke bi nʼobodo ahụ, onye birila ndụ mmehie, mgbe ọ matara na ọ nọ nʼụlọ onye Farisii ahụ na-eri nri, o jiri otu karama alabasta mmanụ otite bata nʼụlọ ahụ.
38 Akamira patsoka dzake mushure make achichema, akatanga kunyorovesa tsoka dzake nemisodzi, akapukuta nevhudzi remusoro wake, ndokutsvoda tsoka dzake ndokudzizodza nechizoro.
Ka o guzoro nʼazụ ụkwụ ya na-ebe akwa, ọ malitere iji anya mmiri ya na-awụsa nʼụkwụ ya. O jiri agịrị isi ya hichaa anya mmiri ahụ, sutu ụkwụ ya ọnụ, ma wụsa mmanụ otite isi ụtọ ahụ na ha.
39 Zvino muFarisi wakange amudana wakati achizviona, akataura mukati make, achiti: Uyu dai aiva muporofita, angadai aiziva kuti ndiani, uye ndewakadini mukadzi anomubata, nokuti mutadzi.
Mgbe onye Farisii ahụ kpọrọ ya oriri hụrụ ihe nke a, o kwuru nʼobi ya sị, “A sị na nwoke a bụ onye amụma, ọ gaara amata ụdị mmadụ nwanyị a na-emetụ ya aka bụ, na ọ bụ onye mmehie.”
40 Jesu ndokupindura akati kwaari: Simoni, ndine chekutaura kwauri. Iye ndokuti: Mudzidzisi, revai.
Jisọs zara ya sị, “Saimọn, e nwere m ihe m chọrọ ịgwa gị.” Ọ sịrị ya, “Onye ozizi gwa m ya.”
41 Kwakange kune vakwereti vaviri kune umwe mukweretesi; umwe wakange ane chikwereti chamadhenario mazana mashanu, uye umwe makumi mashanu.
“Ndị ikom abụọ ji onye na-ebinye ndị mmadụ ego nʼọmụrụnwa ụgwọ. Otu onye ji ya narị ego ise, onye nke ọzọ ji ya iri ego ise.
42 Vakati vasina chekuripisa, akavakanganwira vari vaviri. Naizvozvo ndeupi wavo, taura, achamuda kupfuura umwe?
Mgbe ha na-enweghị ike ịkwụghachi ụgwọ ha ji ya, ọ gbaghara ha ụgwọ ahụ. Ugbu a, onye nʼime ha ga-ahụ ya nʼanya karịa?”
43 Simoni akapindura akati: Ndinofunga ndouyo waakakanganwira kupfuura umwe. Akati kwaari: Watonga zvakarurama.
Saimọn zara sị, “Ọ dị m ka ọ bụ onye nke ọ gbaghara ụgwọ dị ukwuu.” Ọ sịrị ya, “Ị kpeziri.”
44 Zvino akatendeukira kumukadzi, akati kuna Simoni: Unoona mukadzi uyu here? Ndapinda mumba mako, mvura yetsoka dzangu hauna kundipa; asi uyu wanyorevesa tsoka dzangu nemisodzi, akapusika nevhudzi remusoro wake.
Mgbe ahụ ọ tụgharịrị nʼebe nwanyị ahụ nọ gwa Saimọn sị, “Ị hụrụ nwanyị a? A batara nʼụlọ gị, i kunyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ m, ma nwanyị a ejirila anya mmiri ya sachaa ụkwụ m, jirikwa agịrị isi ya hichaa ha.
45 Hauna kunditsvoda, asi iye chinguri chandapinda, haana kumira kutsvoda tsoka dzangu.
Ị sutughị m ọnụ, ma kemgbe m batara nʼụlọ a, o zubeghị ike isutu ụkwụ m ọnụ.
46 Nemafuta musoro wangu hauna kuuzodza; asi iye wazodza tsoka dzangu nechizoro.
Ị teghị m mmanụ ọbụla nʼisi, ma lee, o werela mmanụ otite isi ụtọ wụkwasị m nʼụkwụ.
47 Naizvozvo, ndinoti kwauri: Zvivi zvake zvizhinji zvakanganwirwa, nokuti wada zvikuru; asi anokanganwirwa zvishoma, anoda zvishoma.
Ya mere, ana m agwa gị sị, a gbagharala ya mmehie ya niile o mehiere, nʼihi na ọ nwere ịhụnanya dị ukwuu. Ma onye nwetara mgbaghara dị nta, na-enwe ịhụnanya dị nta.”
48 Zvino akati kwaari: Zvivi zvako zvakanganwirwa.
Mgbe ahụ ọ gwara ya sị, “A gbagharala gị mmehie gị.”
49 Zvino avo vakange vagere pakudya naye vakatanga kureva mukati mavo, vachiti: Ndiani uyu anokanganwirawo zvivi?
Ma ndị ọzọ soro ya nọdụ na-eri nri bidoro ikwu nʼetiti onwe ha na-asị, “Onye bụ onye a nwere ike ọ bụladị ịgbaghara mmehie?”
50 Akati kumukadzi: Rutendo rwako rwakuponesa; enda nerugare.
Ọ sịrị nwanyị ahụ, “Okwukwe gị azọpụtala gị, laa nʼudo.”

< Ruka 7 >