< نحمیا 6 >

بازسازی حصار و چون سنبلط و طوبیا و جشم عربی و سایر دشمنان ما شنیدند که حصار را بناکرده‌ام و هیچ رخنه‌ای در آن باقی نمانده است، باآنکه درهای دروازه هایش را هنوز برپا ننموده بودم، ۱ 1
Mgbe a gwara Sanbalat, na Tobaya, na Geshem onye Arab, na ndị iro anyị ndị ọzọ na m ewuzichaala mgbidi ahụ, na ọ dịkwaghị ntipu fọdụrụ na ya, ọ bụ ezie na nʼoge ahụ, etinyebeghị m ibo nʼọnụ ụzọ ama ya niile,
سنبلط و جشم نزد من فرستاده، گفتند: «بیاتا در یکی از دهات بیابان اونو ملاقات کنیم.» اماایشان قصد ضرر من داشتند. ۲ 2
Sanbalat na Geshem zitere m ozi a, “Bịa ka anyị zụkọta nʼotu obodo nta nke dị nʼobosara ala Ono.” Ma ha na-achọ ụzọ imerụ m ahụ.
پس قاصدان نزد ایشان فرستاده گفتم: «من درمهم عظیمی مشغولم و نمی توانم فرود آیم، چراکار حینی که من آن را ترک کرده، نزد شما فرودآیم به تعویق افتد.» ۳ 3
Ya mere, azara m ha site nʼaka ndị ozi sị, “Ana m arụ ọrụ dị oke mkpa, agaghị enwe ike ịrịdata. Nʼihi gịnị ka ọrụ a ga-eji kwụsị mgbe m ga-ahapụ ya ịbịa nʼebe ị nọ?”
و ایشان چهار دفعه مثل این پیغام به من فرستادند و من مثل این جواب به ایشان پس فرستادم. ۴ 4
Ha zitere ozi ahụ ugboro anọ, ma enyere m ha otu ọsịsa ahụ ugboro anọ.
پس سنبلط دفعه پنجم خادم خود رابه همین طور نزد من فرستاد و مکتوبی گشوده دردستش بود، ۵ 5
Na nke ugboro ise, Sanbalat ziteere m onye na-ejere ya ozi, ya na akwụkwọ ozi nke e mechighị emechi o ji bịa.
که در آن مرقوم بود: «در میان امت‌ها شهرت یافته است و جشم این را می‌گویدکه تو و یهود قصد فتنه انگیزی دارید و برای همین حصار را بنا می‌کنی و تو بروفق این کلام، می‌خواهی که پادشاه ایشان بشوی. ۶ 6
Nke a bụ ihe e dere nʼime ya; “Anụla ya na mba niile, Geshem kwukwara otu ihe ahụ, na gị na ndị Juu na-akwado inupu isi. Ọ bụ ya mere i ji na-ewu mgbidi ahụ. Ozi ahụ na-ekwukwa na gị onwe gị na-achọ ịbụ eze ha,
و انبیا نیزتعیین نموده تا درباره تو در اورشلیم ندا کرده گویند که در یهودا پادشاهی است. و حال بروفق این کلام، خبر به پادشاه خواهد رسید. پس بیا تا باهم مشورت نماییم.» ۷ 7
na ị họpụtala ndị amụma ndị ga-ekwupụta na Jerusalem na ị bụ eze ndị Juda. Ugbu a, ozi a ga-eru ntị eze, ya mere, bịa ka mụ na gị kparịtaa ụka nʼetiti onwe anyị.”
آنگاه نزد او فرستاده گفتم: «مثل این کلام که تو می‌گویی واقع نشده است، بلکه آن را از دل خود ابداع نموده‌ای.» ۸ 8
Ma eziri m ya ozi sị, “O nweghị eziokwu ọbụla dị nʼihe ị na-ekwu, nʼihi na ha bụ ihe i chepụtara nʼobi gị.”
زیرا جمیع ایشان خواستند ما را بترسانند، به این قصد که دستهای ما را از کار باز دارند تا کرده نشود. پس حال‌ای خدا دستهای مرا قوی ساز. ۹ 9
Nzube ha bụ ime ka ụjọ tụọ anyị. Ha na-echekwa sị, “Ha ga-ada mba nʼọrụ a ma hapụkwa ịrụcha ya.” Ma akpọkuru m Chineke sị ya, “Biko gbaa aka m ume.”
و به خانه شمعیا ابن دلایا ابن مهیطبئیل رفتم و او در را بر خود بسته بود، پس گفت: «در خانه خدا در هیکل جمع شویم و درهای هیکل راببندیم زیرا که به قصد کشتن تو خواهند آمد. شبانگاه برای کشتن تو خواهند آمد.» ۱۰ 10
Otu ụbọchị, a gara m nʼụlọ Shemaya, nwa Delaya, nwa Mehetabel, onye e mechibidoro ụzọ nʼụlọ ya. Ọ sịrị m, “Ka anyị zukọta nʼụlọ Chineke, nʼime ụlọnsọ, ka anyị mechiekwa ụzọ niile nke ụlọnsọ ahụ, nʼihi na ndị ikom na-abịa igbu gị, e, nʼabalị ka ha na-abịa igbu gị.”
من گفتم: «آیا مردی چون من فرار بکند؟ وکیست مثل من که داخل هیکل بشود تا جان خودرا زنده نگاه دارد؟ من نخواهم آمد.» ۱۱ 11
Ma azara m si; “O kwesiri ka mụ onwe m bụ onyeisi ọchịchị gbaa ọsọ? O kwesiri ka mmadụ dịka m gbaa ọsọ gbaba nʼụlọnsọ Chineke ịzọpụta ndụ ya? Agaghị m aga.”
زیرا درک کردم که خدا او را هرگز نفرستاده است بلکه خودش به ضد من نبوت می‌کند و طوبیا و سنبلطاو را اجیر ساخته‌اند. ۱۲ 12
Mgbe ahụ ka o doro m anya na Chineke agwaghị ya okwu ọbụla, kama na ọ bụ Tobaya na Sanbalat zụrụ ya.
و از این جهت او را اجیرکرده‌اند تا من بترسم و به اینطور عمل نموده، گناه ورزم و ایشان خبر بد پیدا نمایند که مرا مفتضح سازند. ۱۳ 13
E goro ya ọrụ ka o yinye m egwu, ka m site na-ime otu a mehie, mgbe ahụ, ha ga-ahụ ihe ha ga-eji nye m aha ọjọọ, kwaa m emo.
‌ای خدایم، طوبیا و سنبلط را موافق این اعمال ایشان و همچنین نوعدیه نبیه و سایر انبیا راکه می‌خواهند مرا بترسانند، به یاد آور. ۱۴ 14
“Chineke m, cheta Tobaya na Sanbalat, nʼihi ihe ndị a niile ha mere, chetakwa Noadaya, bụ onye amụma nwanyị, na ndị amụma ndị ọzọ niile fọdụrụ, bụ ndị ahụ chọrọ ime ka m tụọ egwu.”
پس حصار در بیست و پنجم ماه ایلول درپنجاه و دو روز به اتمام رسید. ۱۵ 15
E wuchara mgbidi ahụ nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Elul, nʼime iri ụbọchị ise na abụọ.
و واقع شد که چون جمیع دشمنان ما این را شنیدند و همه امت هایی که مجاور ما بودند، این را دیدند، درنظر خود بسیار پست شدند و دانستند که این کاراز جانب خدای ما معمول شده است. ۱۶ 16
Mgbe ndị iro anyị niile nụrụ ya, mba niile ndị nọ anyị gburugburu tụrụ ụjọ, obi jụkwara ha oyi, nʼihi na ha matara na-arụrụ ọrụ a site nʼinyeaka Chineke.
و در آن روزها نیز بسیاری از بزرگان یهودا مکتوبات نزد طوبیا می‌فرستادند و مکتوبات طوبیا نزد ایشان می‌رسید، ۱۷ 17
Ọzọ, nʼụbọchị ndị ahụ ndị Juda a na-asọpụrụ na e zigara Tobaya ọtụtụ akwụkwọ ozi, akwụkwọ ozi Tobaya na-erutekwa ha aka.
زیرا که بسا از اهل یهودا با اوهمداستان شده بودند، چونکه او داماد شکنیا ابن آره بود و پسرش یهوحانان، دختر مشلام بن برکیارا به زنی گرفته بود، ۱۸ 18
Nʼihi na ọtụtụ ndị Juda ṅụrụ iyi ịnọ ya nʼukwu, nʼihi na ọgọ ya nwoke nʼala Juda bụ Shekanaya nwa Ara. Ọzọkwa, Jehohanan nwa nwoke Tobaya na-alụ nwa nwanyị Meshulam, nwa Berekaya.
و درباره حسنات او به حضور من نیز گفتگو می‌کردند و سخنان مرا به اومی رسانیدند. و طوبیا مکتوبات می‌فرستاد تا مرابترساند. ۱۹ 19
Ha niile nọgidere na-agwa m otu Tobaya si bụrụ ezigbo mmadụ. Ma ha na-apụkwa gaa kọọrọ ya ihe niile m kwuru. Nʼihi ya Tobaya zitere ọtụtụ akwụkwọ ozi ime ka ụjọ tụọ m.

< نحمیا 6 >