< اول قرنتیان 1 >

پولس به اراده خدا رسول خوانده شده عیسی مسیح و سوستانیس برادر، ۱ 1
Pọl, onye a kpọrọ ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst site nʼọchịchọ Chineke, na nwanna anyị nwoke Sostenis,
به کلیسای خدا که در قرنتس است، ازمقدسین در مسیح عیسی که برای تقدس خوانده شده‌اند، با همه کسانی که در هرجا نام خداوند ماعیسی مسیح را می‌خوانند که (خداوند) ما و(خداوند) ایشان است. ۲ 2
Ọ bụ unu nzukọ Chineke dị na Kọrint ka a na-edere akwụkwọ a, ndị e doro nsọ nʼime Kraịst Jisọs, na ndị a kpọrọ ibi ndụ dị nsọ, tinyere ndị ahụ niile na-akpọku aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye bụ Onyenwe ha na Onyenwe anyị:
فیض و سلامتی ازجانب پدر ما خدا و عیسی مسیح خداوند بر شماباد. ۳ 3
Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
خدای خود را پیوسته شکر می‌کنم درباره شما برای آن فیض خدا که در مسیح عیسی به شما عطا شده است، ۴ 4
Ana m ekele Chineke ekele nʼihi onyinye amara niile o nyere unu site na Kraịst Jisọs.
زیرا شما از هرچیز دروی دولتمند شده‌اید، در هر کلام و در هرمعرفت. ۵ 5
Nʼihi na e emeela ka unu baa ụba nʼụzọ niile, nʼime ya, ma nʼokwu unu ma na nghọta unu. O meekwala ka unu nwee nghọta zuru ezu banyere eziokwu niile. Ọ na-emekwa ka unu nwee ike na-ekwupụta okwu banyere oziọma ya.
چنانکه شهادت مسیح در شما استوارگردید، ۶ 6
Nʼihi na ịgba akaebe banyere Kraịst pụtara ihe, guzosiekwa ike na ndụ unu.
بحدی که در هیچ بخشش ناقص نیستیدو منتظر مکاشفه خداوند ما عیسی مسیح می‌باشید. ۷ 7
Otu ihe si dị, ọ dịghị onyinye mmụọ fọdụrụ unu nke unu na-enweghị, ka unu nọrọ na-eche mgbe Chineke ga-egosipụta Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
که او نیز شما را تا آخر استوار خواهدفرمود تا در روز خداوند ما عیسی مسیح بی‌ملامت باشید. ۸ 8
Ọ ga-eme ka unu dị ike ruo na mgbe ikpeazụ, meekwa ka unu bụrụ ndị na-enweghị ịta ụta nʼụbọchị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
امین است خدایی که شما را به شراکت پسر خود عیسی مسیح خداوند ماخوانده است. ۹ 9
Chineke, onye kpọbatara unu ka unu na Ọkpara ya bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na-enwe mmekọrịta kwesiri ntụkwasị obi.
لکن‌ای برادران از شما استدعا دارم به نام خداوند ما عیسی مسیح که همه یک سخن گوییدو شقاق در میان شما نباشد، بلکه در یک فکر ویک رای کامل شوید. ۱۰ 10
Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu niile na-ekwekọrịta nʼihe ọbụla unu kwuru, ka nkewa ọbụla gharakwa ịbata nʼetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nʼotu, nʼechiche obi unu na nʼizu unu.
زیرا که‌ای برادران من، از اهل خانه خلوئی درباره شما خبر به من رسیدکه نزاعها در میان شما پیدا شده است. ۱۱ 11
Nʼihi na ụmụnna m, esi m nʼọnụ ndị si nʼezinaụlọ Kloyi bịara nʼebe a nụta na esemokwu dị nʼetiti unu.
غرض اینکه هریکی از شما می‌گوید که من از پولس هستم، و من از اپلس، و من از کیفا، و من از مسیح. ۱۲ 12
Anụrụ m na ịkpa iche iche abatala nʼetiti unu. Na ụfọdụ nʼime unu na-asị, “Abụ m onye na-eso Pọl”; ndị ọzọ na-asịkwa, “Abụ m onye na-eso Apọlọs”; ndị ọzọkwa na-asị, “Ana m eso Sefas”; ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụ Kraịst ka m na-eso.”
آیا مسیح منقسم شد؟ یا پولس در راه شمامصلوب گردید؟ یا به نام پولس تعمید یافتید؟ ۱۳ 13
Kraịst, ọ dị abụọ? Ọ bụ Pọl ka a kpọgidere nʼobe nʼihi unu? Ọ dị onye e mere baptizim nʼaha Pọl?
خدا را شکر می‌کنم که هیچ‌یکی از شما راتعمید ندادم جز کرسپس و قایوس، ۱۴ 14
Ana m ekele Chineke ekele na ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu m mere baptizim, ewezugakwa Krispọs na Gaiọs.
که مباداکسی گوید که به نام خود تعمید دادم. ۱۵ 15
Ya mere, ọ dịghị onye nʼime unu ga-asị na e mere ya baptizim nʼaha m.
وخاندان استیفان را نیز تعمید دادم و دیگر یادندارم که کسی را تعمید داده باشم. ۱۶ 16
(Ahaa! Emekwara m Stefanas na ezinaụlọ ya baptizim. Ewezuga ndị a, amaghị m ma m ga-echetakwa onye ọzọ m mere baptizim nʼonwe m.)
زیرا که مسیح مرا فرستاد، نه تا تعمید دهم بلکه تا بشارت رسانم، نه به حکمت کلام مبادا صلیب مسیح باطل شود. ۱۷ 17
Nʼihi na Kraịst ezighị m ime ndị mmadụ baptizim. O zitere m iji okwu dị mfe kwusaa oziọma ya. Ọ bụghị iji okwu oke mmụta na amamihe nke mmadụ ka ike nke obe Kraịst ghara ịbụ ihe efu.
زیرا ذکر صلیب برای هالکان حماقت است، لکن نزد ما که ناجیان هستیم قوت خداست. ۱۸ 18
Nʼihi na okwu maka obe bụ ihe nzuzu nye ndị na-efu efu, ma nye anyị ndị a na-azọpụta, ọ bụrụ anyị ike nke Chineke.
زیرا مکتوب است: «حکمت حکما را باطل سازم و فهم فهیمان را نابود گردانم.» ۱۹ 19
E dere ya, “Aga m emebi amamihe ndị maara ihe. Aga m emekwa ka oke nghọta nke ndị maara ihe bụrụ ihe efu.”
کجا است حکیم؟ کجا کاتب؟ کجا مباحث این دنیا؟ مگرخدا حکمت جهان را جهالت نگردانیده است؟ (aiōn g165) ۲۰ 20
Olee ebe ndị oke amamihe nọ? Olee ebe ndị ode akwụkwọ nọ? Olee ebe ndị oke ịrụ ụka nke oge a nọ? Chineke o mebeghị ka amamihe nke ụwa a bụrụ ihe efu? (aiōn g165)
زیرا که چون برحسب حکمت خدا، جهان ازحکمت خود به معرفت خدا نرسید، خدا بدین رضا داد که بوسیله جهالت موعظه، ایمانداران رانجات‌بخشد. ۲۱ 21
Ma ebe ọ bụ site nʼamamihe nke Chineke, ụwa enweghị ike ịmata Chineke site na amamihe nke ya, ọ dị Chineke ezi mma isite nʼoziọma nke a na-ekwusa nke ndị mmadụ na-akpọ ihe nzuzu zọpụta ndị kweere.
چونکه یهود آیتی می‌خواهند ویونانیان طالب حکمت هستند. ۲۲ 22
Ndị Juu chọrọ ịhụ ihe ịrịbama, ndị Griik na-achọkwa amamihe.
لکن ما به مسیح مصلوب وعظ می‌کنیم که یهود را لغزش و امت هارا جهالت است. ۲۳ 23
Ma anyị onwe anyị na-ekwusa Kraịst, onye a kpọgburu nʼobe, onye bụ ihe mgbochi nʼebe ndị Juu nọ, ma na ntị ndị mba ọzọ, ọ dị ka okwu nzuzu.
لکن دعوت‌شدگان را خواه یهود و خواه یونانی مسیح قوت خدا و حکمت خدا است. ۲۴ 24
Ma nye ndị niile a kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị Griik, Kraịst bụ ike nke Chineke bụrụkwa amamihe nke Chineke.
زیرا که جهالت خدا از انسان حکیمتر است و ناتوانی خدا از مردم، تواناتر. ۲۵ 25
Nʼihi na nzuzu Chineke dị mma karịa amamihe niile nke mmadụ, adịghị ike Chineke dịkwa ukwuu karịa ike niile nke mmadụ.
زیرا‌ای برادران دعوت خود را ملاحظه نمایید که بسیاری بحسب جسم حکیم نیستند وبسیاری توانا نی و بسیاری شریف نی. ۲۶ 26
Ụmụnna m, chetakwanụ ihe unu bụ mgbe a kpọrọ unu. Chetanụ na ọ bụ ole na ole nʼime unu bụ ndị maara ihe nʼusoro ogugo mmadụ, ndị dị ike, na ndị a maara aha ha nʼobodo.
بلکه خدا جهال جهان را برگزید تا حکما را رسوا سازدو خدا ناتوانان عالم را برگزید تا توانایان را رسواسازد، ۲۷ 27
Ma lee na ọ bụ ihe ahụ ụwa gụrụ dịka ihe nzuzu, ka Chineke họrọ iji mee ka ihere mee ndị amamihe. Ọ bụkwa ihe ha gụrụ dịka ihe na-adịghị ike ka Chineke họọrọ iji mee ka ihere mee ndị dị ike.
و خسیسان دنیا و محقران را خدابرگزید، بلکه نیستیها را تا هستیها را باطل گرداند. ۲۸ 28
Nʼihi na Chineke họọrọ ihe dịkarịrị ala nke ụwa, na ihe a jụrụ ajụ, jiri ha mee ka ihe ụwa chere na ọ baghị uru, bụrụ ihe bara uru.
تا هیچ بشری در حضور او فخر نکند. ۲۹ 29
Ka mmadụ ọbụla ghara ịnya isi nʼebe Chineke nọ.
لکن از او شما هستید در عیسی مسیح که از جانب خدابرای شما حکمت شده است و عدالت قدوسیت و فدا. ۳۰ 30
Ma ọ bụ nʼihi ya ka unu ji nọrọ nʼime Kraịst Jisọs, onye ghọrọ isi amamihe nye anyị site na Chineke, nke bụ ezi omume anyị na nke ido anyị nsọ, na onye mgbapụta anyị.
تا چنانکه مکتوب است هر‌که فخر کنددر خداوند فخر نماید. ۳۱ 31
Ya mere, dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa nʼime Onyenwe anyị.”

< اول قرنتیان 1 >