< Imisebenzi 2 >

1 Kwathi selugcwalisekile usuku lwePentekoste, babendawonye bengqondonye bonke.
Mgbe ụbọchị Pentikọọsụ ruru, ha niile zukọtara nʼotu ebe.
2 Kwahle kwezwakala-ke umdumo ovela ezulwini onjengowokuvunguza komoya olamandla, njalo wagcwalisa indlu yonke ababehlezi kuyo,
Na mberede, ụzụ yiri nke oke ifufe dị ike sitere nʼeluigwe bịa jupụta nʼụlọ ahụ ha nọ.
3 kwasekubonakala kubo inlimi ezehlukanisiweyo kungathi ngezomlilo, zasezihlala phezu kwalowo lalowo wabo.
Ha hụrụ ihe dịka ire ọkụ ka o kewara nọkwasị nʼisi ha nʼotu nʼotu.
4 Basebegcwaliswa bonke ngoMoya oNgcwele, baqala ukukhuluma ngezinye indimi, njengalokhu uMoya wabanika ukuphumisela.
Ha niile jupụtara na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ nyere ha ike.
5 Kwakuhlala-ke eJerusalema amaJuda, amadoda aqotho, avela kuso sonke isizwe salezo ezingaphansi kwezulu.
Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị Juu ji obi ọcha na-efe Chineke nọ na Jerusalem. Ndị si na mba dị iche iche nʼokpuru eluigwe.
6 Kwathi sekulalo umdumo, ixuku labuthana ndawonye lasanganiseka, ngoba ngulowo lalowo wabezwa bekhuluma ngolimi lwakibo.
Igwe mmadụ gbakọtara nʼọnọdụ mgbagwoju anya mgbe ha nụrụ ụzụ ahụ, nʼihi na ha nụrụ ka ha na-asụ asụsụ nke onye ọbụla nʼime ha na-aghọta, nʼasụsụ obodo ha dị iche iche.
7 Basebemangala kakhulu bonke bababaza, bakhulumisana bathi: Khangelani, bonke laba abakhulumayo kayisibo abeGalili yini?
Nʼoke iju anya, ha kwurịtara nʼonwe ha, “Ndị a niile na-ekwu okwu ha abụghị ndị Galili?
8 Kungani, pho, thina sibezwa ngamunye wabo ngolimi lwakithi esazalwa lalo?
Gịnị mere onye ọbụla nʼime anyị ji na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ ala anyị dị iche iche?
9 AmaPathiya lamaMede lamaElamu, labahlali beMesopotamiya, labeJudiya labeKaphadosiya, abePontusi labeAsiya,
Ndị Patia, na ndị Midia, na ndị Elam, ndị bikwa nʼime Mesopotamịa, ndị Judịa, na ndị Kapadosia, ndị Pọntọs, na ndị Eshịa,
10 abeFrigiya labePamfiliya, abeGibhithe labengxenye zeLibiya eduze leKurene, lezihambi ezingamaRoma, kokubili amaJuda labaphendukela kumaJuda,
ndị Frigia, na ndị Pamfilia, na ndị Ijipt, na ndị akụkụ Libiya nke dị Sirini nso, na ndị ọbịa si na Rom bịa
11 amaKrete lamaArabhiya, siyabezwa bekhuluma ngendimi zakithi imisebenzi emikhulu kaNkulunkulu.
(ndị Juu na ndị kwere nʼokpukpe ndị Juu). Ndị Kriit na ndị Arab; anyị na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ anyị dị iche iche banyere ọrụ ebube Chineke.”
12 Bonke basebemangala kakhulu badideka, bakhulumisana besithi: Lokhu kungaba yini?
O juru ha anya, gbaakwa ha gharịị. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka nke a bụ?”
13 Kodwa abanye bahleka usulu bathi: Basuthi iwayini elitsha.
Ma ụfọdụ ndị ọzọ na-akwa ha emo na-asị, “Ndị a bụ ndị mmanya na-egbu.”
14 Kodwa uPetro emi labalitshumi lanye, waphakamisa ilizwi lakhe, wasesithi kubo: Madoda maJuda, lani lonke elihlala eJerusalema, kakwaziwe kini lokhu, njalo lilalelisise amazwi ami.
Pita guzoro, ya na ndị ozi iri na otu ahụ welie olu gwa ọgbakọ ahụ okwu, “Ndị Juu na unu ndị bi na Jerusalem, matanụ nke a, geekwanụ ntị na ihe m na-ekwu.
15 Ngoba laba kabadakwanga, njengoba lina licabanga; ngoba kulihola lesithathu losuku;
Ọ bụghị mmanya na-egbu ndị a dị ka unu chere. Lee, ọ bụ naanị elekere itoolu nke ụtụtụ na-akụ.
16 kodwa lokhu yikho okwakhulunywa ngumprofethi uJoweli:
Mba, nke a bụ mmezu ihe Juel onye amụma kwuru,
17 Njalo kuzakuthi ensukwini zokucina, utsho uNkulunkulu, ngizathulula okoMoya wami phezu kwayo yonke inyama; lamadodana enu lamadodakazi enu azaprofetha, lamajaha enu abone imibono, labadala benu baphuphe amaphupho;
“‘Chineke sịrị, nʼoge ikpeazụ, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma, ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ, ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ.
18 njalo laphezu kwenceku zami laphezu kwencekukazi zami ngalezonsuku ngizathulula okoMoya wami, njalo zizaprofetha.
Ọ bụladị ndị ohu m, nwoke ha na nwanyị nʼime ha, ka m ga-awụkwasị Mmụọ m. Ha ga-ebukwa amụma.
19 Njalo ngizaveza izimangaliso ezulwini phezulu, lezibonakaliso emhlabeni phansi, igazi, lomlilo, leyezi lentuthu;
Aga m egosi ihe ịtụnanya na mbara eluigwe, gosikwa ihe ịrịbama nʼụwa na nʼokpuru ụwa, ọbara na ọkụ na alulu anwụrụ ọkụ.
20 ilanga lizaphendulwa umnyama, lenyanga igazi, lungakafiki usuku lweNkosi olukhulu loludumisekayo;
Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa ebube.
21 kuzakuthi, wonke obiza ibizo leNkosi uzasindiswa.
Ọ ga-erukwa, na onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.’
22 Madoda maIsrayeli, zwanini la amazwi: UJesu weNazaretha, umuntu ofakazelwe nguNkulunkulu phambi kwenu ngemisebenzi yamandla langezimangaliso langezibonakaliso, uNkulunkulu azenza ngaye phakathi kwenu, njengalokhu lisazi lani uqobo lwenu,
“Ndị Izrel, geenụ ntị nʼokwu a, Jisọs onye Nazaret bụ nwoke Chineke gosiri unu, site nʼọrụ dị ike, nʼọrụ ebube nakwa ihe ịrịbama niile nke Chineke rụrụ nʼetiti unu site nʼaka ya, dịka unu ji anya unu hụ.
23 yena lo esenikelwe ngecebo elimisiweyo langokwazi okuphambili kukaNkulunkulu lamthatha, ngezandla zabangelamthetho lambethela lambulala;
Onye a ka e weere nyefee unu nʼaka site na nzube nke Chineke buru ụzọ tụọ atụmatụ ya, na dịka o siri mara na mbụ, ọ bụ ya ka unu gburu ma kpọgidekwa nʼobe site nʼaka ndị na-amaghị iwu.
24 yena uNkulunkulu wamvusa, esethukulule inhlungu zokufa, ngoba kwakungelakwenzeka ukuthi abanjwe yikho.
Ma Chineke emela ka o site nʼọnwụ bilie mgbe ọ tọpụchara ihe mgbu nke ọnwụ, nʼihi na ọnwụ enweghị ike ijide ya.
25 Ngoba uDavida uthi ngaye: Ngangibona iNkosi phambi kwami njalonjalo; ngoba ingakwesokunene sami, ukuze nginganyikinyeki;
Devid kwuru banyere ya, “‘Ana m ahụ Onyenwe anyị ka ọ na-anọgide nʼihu m mgbe niile. Nʼihi na ọ nọ nʼaka nri m. Agaghị m ama jijiji.
26 ngakho inhliziyo yami yajabula, lolimi lwami lwathokoza; ngitsho lenyama yami izahlala ethembeni;
Ya mere, ọṅụ jupụtara m obi, ire m na-aṅụrịkwa ọṅụ; anụ ahụ m ga-ezukwa ike nʼolileanya,
27 ngoba kawuyikutshiya umphefumulo wami esihogweni, kawuyikunikela oNgcwele wakho ukuthi abone ukubola. (Hadēs g86)
nʼihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụobi m nʼala mmụọ, ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure. (Hadēs g86)
28 Wangazisa indlela zempilo; uzangigcwalisa ngenjabulo ebusweni bakho.
I mere ka m mara ụzọ nke ndụ; ị ga-emekwa ka m jupụta nʼọṅụ nʼihu gị.’
29 Madoda bazalwane, ake ngikhulume kini ngokusobala ngokhokho uDavida, ukuthi wafa njalo wangcwatshwa, lengcwaba lakhe likhona kithi kuze kube lamuhla.
“Ụmụnna m, eji m nkwuwa okwu na-agwa unu banyere nna nna anyị Devid, bụ onye nwụrụ anwụ e lie ya. Ili ya dịkwa nʼetiti anyị taa.
30 Ngakho, yena engumprofethi, ekwazi ukuthi uNkulunkulu wafunga ngesifungo kuye, ukuthi esithelweni sokhalo lwakhe ngokwenyama uzavusa uKristu, ukuze ahlale esihlalweni sakhe sobukhosi,
Ma ọ bụ onye amụma marakwa na Chineke jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa na otu nʼime ụmụ ya ga-anọkwasị nʼocheeze ya.
31 ebonile ngaphambili wakhuluma ngokuvuka kukaKristu, ukuthi umphefumulo wakhe kawutshiywanga esihogweni, lenyama yakhe kayikubonanga ukubola. (Hadēs g86)
Ebe o buuru ụzọ hụ ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu, o kwuru banyere mbilite nʼọnwụ nke Kraịst, mgbe ọ sịrị, a hapụghị ya nʼala mmụọ; anụ ahụ ya ahụghịkwa ire ure. (Hadēs g86)
32 UJesu lo uNkulunkulu wamvusa, esingabafakazi balokhu thina sonke.
Ọ bụ Jisọs a ka Chineke mere ka ọ dị ndụ ọzọ. Anyị niile bụkwa ndị akaebe banyere ya.
33 Ngakho ephakanyiswe ngakwesokunene sikaNkulunkulu, esemukele kuBaba isithembiso sikaMoya oNgcwele, uthulule lokhu elikubonayo lelikuzwayo khathesi.
Ebe ọ bụ na e buliela ya elu nʼaka nri Chineke. Ọ natala Mmụọ Nsọ dịka Nna ya kwere na nkwa. Ihe a unu na-ahụ na nke unu na-anụ bụ onyinye ya ọ wụkwasịrị anyị.
34 Ngoba uDavida kenyukelanga emazulwini, kodwa yena uqobo lwakhe uthi: INkosi yathi eNkosini yami: Hlala ngakwesokunene sami,
Ọ dịghị oge Devid jiri rigoro nʼeluigwe, ma ya onwe ya sịrị, “‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m sị, “Nọdụ ala nʼaka nri m,
35 ngize ngenze izitha zakho zibe yisenabelo senyawo zakho.
ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.”’
36 Ngakho indlu kaIsrayeli yonke kayazi isibili, ukuthi uNkulunkulu umenzile kokubili ukuba yiNkosi loKristu, uJesu lo elambethelayo lina.
“Ya mere, ana m eme ka ezinaụlọ Izrel niile mara nke ọma, na Chineke emeela Jisọs a onye unu kpọgidere nʼobe ka ọ bụrụ Onyenwe anyị na Kraịst.”
37 Sebekuzwa lokhu bahlabeka enhliziyweni, basebesithi kuPetro lakwabanye abaphostoli: Madoda bazalwane, sizakwenzani?
Mgbe ha nụrụ ihe ndị a, akọnuche ha mara ha ikpe. Ha sịrị Pita na ndị ozi ndị ọzọ, “Ụmụnna, gịnị ka anyị ga-eme?”
38 UPetro wasesithi kubo: Phendukani, libhabhathizwe lonke ngamunye wenu ebizweni likaJesu Kristu ethethelelweni lwezono, njalo lizakwemukela isipho sikaMoya oNgcwele.
Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ unu niile. Ka e mekwa unu baptizim nʼaha Jisọs Kraịst, maka mgbaghara mmehie unu. Unu ga-anatakwa onyinye nke Mmụọ Nsọ.
39 Ngoba isithembiso ngesenu, lesabantwana benu, lesabo bonke abakhatshana, bonke iNkosi uNkulunkulu wethu ezababizela kuyo.
Nkwa a dịrị unu na ụmụ ụmụ unu na mmadụ niile nọ nʼebe dị anya, dịkwara ndị niile Onyenwe anyị Chineke ga-akpọ ka ha bịakwute ya.”
40 Langamanye amazwi amanengi wafakaza wakhuthaza wathi: Zisindiseni kulesisizukulwana esiphambeneyo.
O jiri ọtụtụ okwu ndị ọzọ gbaa ama, ma dụọkwa ha ọdụ sị, “Sitenụ nʼetiti ọgbọ a jọrọ njọ zọpụta onwe unu.”
41 Ngakho abalemukelayo ilizwi lakhe ngokuthokoza babhabhathizwa; njalo ngalolosuku kwengezelelwa imiphefumulo engaba zinkulungwane ezintathu.
E mere ndị nabatara okwu ya baptizim, ha dị ihe ruru puku mmadụ atọ, a gụnyere nʼọnụọgụgụ ha.
42 Basebephikelela ekufundiseni kwabaphostoli lebudlelwaneni, lekuhlephuleni isinkwa lemikhulekweni.
Ha nyefere onwe ha nʼozizi nke ndị ozi, ya na ife ofufe na ịnyawa achịcha nakwa ikpe ekpere.
43 Lokwesaba kwehlela phezu kwayo yonke imiphefumulo; njalo kwenziwa ngabaphostoli izimangaliso lezibonakaliso ezinengi.
Onye ọbụla nʼime ha jupụtara na egwu, nʼihi na ndị ozi na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube, na ihe ịrịbama dị iche iche.
44 Njalo bonke abakholwayo babendawonye, babelezinto zonke bezihlanganyela,
Ndị niile kwere ekwe nọkọtara ọnụ, nwekọkwaa ihe niile ọnụ.
45 basebethengisa izinto lempahla zabo, basebesabelana bonke, njengokuswela komunye lomunye.
Ha rere ihe ha nwere na nke ha kpatara, kenye onye ọbụla dịka mkpa ya siri dị.
46 Insuku ngensuku basebephikelela nganhliziyonye ethempelini, behlephula isinkwa izindlu ngezindlu, besidla ndawonye ngentokozo langenhliziyo emhlophe,
Ha gara nʼihu na-ezukọta nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere kwa ụbọchị. Ha na-erikọkwa nri nʼụlọ ha, nʼobi ọṅụ na ekele.
47 bedumisa uNkulunkulu, bethandeka ebantwini bonke. LeNkosi yengezelela ebandleni insuku ngensuku labo abasindiswayo.
Dịka ha gara nʼihu na-eto Chineke, ha nwetara ihuọma nʼaka ndị mmadụ. Onyenwe anyị na-atụkwasịkwara ha ndị a na-azọpụta kwa ụbọchị.

< Imisebenzi 2 >