< Hakaraia 6 >

1 A ka maranga ake ano oku kanohi, ka kite, na e wha nga hariata e puta mai ana i waenganui o nga maunga e rua; na, ko nga maunga, he maunga parahi.
Elelikwara m anya elu ọzọ hụ ụgbọ ịnyịnya anọ nke si nʼetiti ugwu abụọ na-apụta. Ugwu ndị a bụ ugwu e ji bronz mee.
2 I te hariata tuatahi he whero nga hoiho; i te hariata tuarua he mangu nga hoiho;
Ụgbọ ịnyịnya nke mbụ ka ịnyịnya na-acha ọbara ọbara na-adọkpụ. Nke abụọ ka ịnyịnya na-eji nji na-adọkpụ.
3 I te toru o nga hariata he ma nga hoiho, i te wha o nga hariata he kopurepure, he pakaka nga hoiho.
Nke atọ ka ịnyịnya dị ọcha na-adọkpụ, ma nke anọ ka ịnyịnya tụrụ agwa siekwa ike na-adọkpụ.
4 Katahi ahau ka oho atu, ka mea ki te anahera i korero ra ki ahau, He aha enei, e toku ariki?
Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, “Gịnị ka ihe ndị a bụ, nna m ukwu?”
5 Na ka whakahoki mai te anahera, ka mea ki ahau, Ko nga hau e wha enei o te rangi, e haere mai ana i te tu i te aroaro o te Ariki o te whenua katoa.
Mmụọ ozi ahụ zara m, sị, “Ndị a bụ mmụọ anọ nke eluigwe, ka ha na-apụ mgbe ha guzochara nʼihu Onyenwe elu ụwa niile.
6 Ko te hariata i nga hoiho mangu, e haere ana ratou ki te whenua i te raki; a i haere nga mea ma i muri i a ratou; na ko nga mea kopurepure i ahu pera ki te whenua ki te tonga.
Ụgbọala nke ịnyịnya ndị dị oji na-adọkpụ na-aga nʼakụkụ ugwu. Nke ịnyịnya ndị dị ọcha na-adọkpụ na-aga nʼọdịda anyanwụ. Nke ahụ ndị ịnyịnya na-adịghị ezi ọcha na-adọkpụ na-aga nʼakụkụ ndịda.”
7 I haere atu ano nga mea pakaka, i whai kia haereere, kia kopikopiko ratou i te whenua: na ka mea ia, Haere atu koe, kopikopiko i te whenua. Na kei te kopikopiko ratou i te whenua.
Mgbe ịnyịnya ndị ahụ dị ike pụtara, chọọ ka e nye ha ike ijegharị nʼụwa niile, ọ gwara ha sị, “Gaanụ jegharịa nʼụwa niile.” Nʼihi ya, ha pụrụ jegharịa nʼụwa niile.
8 Katahi tera ka karanga ki ahau, ka korero mai hoki ki ahau, ka mea, Nana, ko enei i ahu atu nei ki te whenua ki te raki, kua marie i a ratou toku wairua i te whenua ki te raki.
Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Ndị ahụ jere nʼakụkụ ugwu emeela ka Mmụọ m dajụọ nʼala dị nʼakụkụ ugwu.”
9 I puta mai ano te kupu a Ihowa ki ahau, i mea,
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
10 Tangohia ta nga whakarau, ara ta Hererai, ta Topia, ta Ieraia; haere mai ano koe i taua ra, ka tomo ki te whare o Hohia tama a Tepania, ki te whare i tae mai ai ratou i Papurona;
“Gaa nata Heldai, Tobaija na Jedaya, ndị a dọtara nʼagha si Babilọn lọta ọlaọcha na ọlaedo. Nʼotu ụbọchị ahụ, gakwaa nʼụlọ Josaya nwa Zefanaya.
11 Ae ra, ka tango i ta ratou hiriwa, koura hoki, ka hanga ai i etahi karauna, a ka potae atu ki te mahunga o te tino tohunga, o Hohua tama a Iohereke;
Jiri ọlaọcha na ọlaedo ahụ kpụọ otu okpueze, were ya kpukwasị Joshua nwa Jehozadak bụ onyeisi nchụaja nʼisi.
12 Korero atu hoki ki a ia, mea atu, Ko te kupu tenei a Ihowa o nga mano, e ki ana, Nana, te tangata ko tona ingoa nei ko te Manga; a ka tupu ake ano ia i tona wahi, a mana e hanga te temepara o Ihowa:
Gwa ya na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nke a bụ nwoke ahụ aha ya bụ Ngalaba. Ọ ga-esi nʼebe nke ya wapụta wuo ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
13 Mana rawa e hanga te temepara o Ihowa; a mana e waha te kororia, ka noho hoki ia ka whakahaere tikanga i runga i tona torona; a hei tohunga ia i runga i tona torona: a ka whakaaro ngatahi raua mo te rongo mau.
Ọ bụ ya ga-arụ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. A ga-eyikwasịkwa ya ịma mma dịka uwe, ọ ga-anọdụ nʼocheeze ya na-achị. Ọ ga-abụ onye nchụaja ga-anọ nʼocheeze ya, mee ka ịdị nʼotu dịrị nʼetiti ha abụọ.’
14 Ka ai hoki nga karauna hei whakamahara ki a Hereme ratou ko Topia, ko Ieraia, ko Hene tama a Tepania, i roto i te temepara o Ihowa.
Okpueze ahụ ka a ga-enye Heldaya, Tobaija, Jedaya na Hen, nwa Zefanaya, ka ọ bụrụ ihe ncheta nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
15 Ka haere mai ano te hunga i tawhiti, ka hanga i roto i te temepara o Ihowa, a ka mohio koutou na Ihowa o nga mano ahau i unga mai ki a koutou. A e puta ano tenei, ki te ata whakarongo koutou ki te reo o Ihowa, o to koutou Atua.
Ndị nọ nʼebe dị anya ga-esi ebe ahụ bịa nye aka nʼọrụ iwu ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. Unu ga-amatakwa na ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ịbịakwute unu. Ihe ndị a niile ga-eme ma ọ bụrụ na unu akpachapụ anya rubere Onyenwe anyị Chineke unu isi.”

< Hakaraia 6 >