< Ehetere 1 >

1 Na i nga ra i a Ahahueruha, ara a Ahahueruha i kingi nei i Inia a tae noa ki Etiopia, kotahi rau e rua tekau ma whitu nga kawanatanga:
Nke a bụ ihe mere nʼoge ọchịchị eze Sekses, bụ Sekses nke chiri alaeze nwere mpaghara dị iche iche nke karịrị otu narị na iri abụọ na asaa, nke gbasakwara site nʼIndia rụọ Kush.
2 I aua ra, i te mea e ata noho ana a Kingi Ahahueruha i runga i te torona o tona kingitanga i Huhana, i te whare kingi,
Nʼoge ahụ, isi ọchịchị obodo eze Sekses bụ Susa ebe ocheeze ya dịkwa.
3 I te toru o nga tau o tona kingitanga, ka tukua e ia he hakari ma ana rangatira katoa ratou ko ana tangata; i tona aroaro ano te hunga nunui o Pahia, o Meria, nga tangata rarahi, me nga rangatira o nga kawanatanga:
Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o mere mmemme oke oriri nye ndịisi ọrụ ya niile. Ndị ọzọ ọ kpọkwara bụ ndịisi agha nke Peshịa na Midia, na ụmụ eze, na ndị ọchịchị sitere na mba dị iche iche ọ na-achị.
4 I a ia e whakakite ana i te taonga me te kororia o tona kingitanga, i tona honore, i tona ataahua nui, he maha nga ra, kotahi rau e waru tekau nga ra.
Mmemme a were otu narị na iri ụbọchị asatọ. Eze jikwa oge a gosi akụnụba, na ịma mma na ebube nke alaeze ya.
5 Na, ka taka aua ra, ka tukua e te kingi he hakari ma te iwi katoa i reira i Huhana, i te whare kingi, ma te rahi, ma te iti, e whitu nga ra, i te marae i te kari te whare o te kingi;
Mgbe ụbọchị ndị a gafesịrị, eze kpọrọ oke oriri nọrọ ụbọchị asaa nʼubi a gbara ogige dị nʼụlọeze, nye ndị niile nọ na Susa, site nʼonye ukwu ruo nʼonye nta.
6 Ko nga hipoki he mea ma, he kakariki, he puru; ko nga aho he rinena pai he mea papura, ko nga mowhiti i mau ai, he hiriwa; ko nga pou he mapere; ko nga tokotoranga he koura, he hiriwa; a ko te papa o raro he mapere whero, ma, kowhai, mangu hoki.
Ihe ịchọ mma e ji dozie ogige ahụ bụ ezi akwa mgbochi dị ọcha, nke e ji ogho ọcha kpaa na nke e jikwa ogho na-acha anụnụ anụnụ kpaa. E jikwa eriri ogho dị ezi ọcha na nke na-acha odo odo kekọtaa akwa mgbochi ndị ahụ, nʼihe mgbaaka ọlaọcha dị nʼogidi nkume dị oke ọnụahịa e wuru nʼebe ahụ. A dọbakwara oche ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ nʼebe e wulitụrụ elu, nke e ji nkume mabụl na nkume ndị ọzọ dị oke ọnụahịa, ndị na-acha ezi ọcha, ndị na-acha odo odo na nke na-eji oji wuo ala ya.
7 Ko nga kapu inu i hoatu ma ratou he oko koura; rere ke tonu te ahua o tenei oko, o tenei oko; tona nui ano o te waina kingi, rite tonu ki ta te kingi tikanga.
E jikwa iko ọlaedo ṅụọ ihe ọṅụṅụ. Iko ọlaedo ọbụla e wepụtara nʼụbọchị ahụ dị iche nʼiche. O nweghị nke yiri ibe ya. E mekwara ka mmanya eze baa ụba dịka afọ ọma aka eze si dị.
8 I rite ano te inu ki ta te ture, kahore he tohe; na te kingi taua tikanga i whakatakoto ki nga rangatira katoa o tona whare, ko ta te tangata i pai ai ko tana tera e mea ai.
E nyeghịkwa iwu ọbụla banyere iko mmanya ole mmadụ kwesiri ịṅụ kama ndị chọrọ ga-aṅụ dịka o si masị ha. Nʼihi na eze agwalarị ndịisi ozi ya na onye ọbụla kwesiri ịṅụ dịka o si chọọ.
9 I tukua ano e te kuini, e Wahati, he hakari ma nga wahine i roto i te whare kingi o Kingi Ahahueruha.
Nʼotu oge ahụ, eze nwanyị Vashti, kpọkwara oke oriri nye ụmụ nwanyị niile nọ nʼụlọeze, Sekses.
10 I te whitu o nga ra, i te mea e koa ana te ngakau o te kingi i te waina, ka mea ia ki a Mehumana ratou ko Pitita, ko Harapona, ko Pikita, ko Apakata, ko Tetara, ko Karakaha, ki nga rangatira ruma tokowhitu i mahi i te aroaro o Kingi Ahahueruha,
Nʼụbọchị nke asaa, mgbe obi dị eze Sekses mma nʼihi mmanya ọ ṅụrụ, ọ nyere ndị onozi asaa ndị a na-ejere ya ozi iwu, ha bụ, Mehuman, na Bizta, na Habona, na Bigta, na Abagta, na Zeta, na Kakas,
11 Kia kawea mai te kuini, a Wahati, ki te aroaro o te kingi, me te karauna kuini, kia whakakitea atu ai tona ataahua ki nga iwi, ki nga rangatira: he pai hoki tona ahua.
sị ha gaa kpọọ Vashti nwunye eze ka ọ bịakwute ya. Eze nyekwara iwu ka Vashti kpuru okpueze nʼisi ya, maka igosi ndị mmadụ niile na ndị a na-asọpụrụ nọ nʼebe ahụ ịma mma ya. Nʼihi na Vashti mara mma.
12 Otiia kihai a Kuini Wahati i pai kia haere mai i ta te kingi kupu i korerotia e ana rangatira ruma. Na reira i riri rawa ai te kingi, a mura ana tona riri i roto i a ia.
Ma mgbe e mere ka ozi eze ruo ya ntị, eze nwanyị, bụ Vashti jụrụ ịbịa. Nke a mere ka iwe wee eze nke ukwuu.
13 Katahi te kingi ka korero ki nga tangata whai whakaaro i mohio nei ki nga taima, ko ta te kingi tikanga hoki ia, ki te hunga katoa e mohio ana ki te ture, ki te whakarite tikanga;
Dịka eze Sekses na-eme, ọ kpọkwara ndị ọkachamara nʼihe gbasara iwu na ikpe ziri ezi. Eze na ndị a mara ihe, bụ ndị maara ihe ụbọchị nyere kparịtara ụka.
14 Ko Karahena hoki i tata ki a ia, ko Hetara, ko Aramata, ko Tarahihi, ko Merehe, ko Marahena, ko Memukana, ara ko nga rangatira tokowhitu o Pahia, o Meria, i kite nei i te mata o te kingi, a i noho hei tuatahi i te kingitanga;
Ha bụkwa ndị na-anọkarị eze nso. Aha ha bụ Kashena, na Sheta, na Admata, na Tashish, na Meres, na Masena, na Memukan. A maara aha mmadụ asaa ndị a nʼala Midia na Peshịa. Ha bụ ndị na-aga nʼihu eze mgbe ọbụla ha chọrọ, bụrụkwa ndị dịkarịsịrị elu nʼalaeze ahụ.
15 Ki ta te ture, ko te aha kia meatia ki te kuini, ki a Wahati, mona kihai i whakarite i te kupu a Kingi Ahahueruha i kawea atu e nga rangatira ruma?
Eze jụrụ sị, “Dịka iwu si dị, gịnị ka a ga-eme Vashti bụ nwunye eze nʼihi na o nupuru isi nʼiwu eze Sekses nyere nke o zigaara ya site nʼọnụ ndị onozi ya?”
16 Na ka mea a Memukana i te aroaro o te kingi ratou ko nga rangatira, Ehara i te mea ki te kingi anake ta Kuini Wahati he; engari ki nga rangatira katoa ano, ki nga iwi katoa o nga kawanatanga katoa a Kingi Ahahueruha.
Memukan kwuchitere ọnụ ndị ọzọ sị, “Ihe Vashti nwunye eze mere jọrọ njọ. O mehiela eze, mehiekwa ndị ọchịchị niile, na ndị niile bi nʼakụkụ niile nke alaeze Sekses.
17 Ka haere hoki te rongo o tenei mahi a te kuini ki nga wahine katoa, a ka whakahawea o ratou kanohi ki a ratou tane, ina ka korerotia, i mea a Kingi Ahahueruha kia kawea mai a Kuini Wahati ki tona aroaro, a kihai tera i haere mai.
Nʼihi na ndị inyom niile ga-amata ihe eze nwanyị mere, malite ilelị ndị di ha anya, ma na-ekwu sị, ‘Eze Sekses nyere Vashti nwunye ya iwu ka ọ bịa nʼihu ya, ma ọ jụrụ ịbịa.’
18 Ka pena ano aianei te kupu a nga wahine rangatira o Pahia, o Meria. kua rongo nei ki te mahi a te kuini ki nga rangatira katoa a te kingi. Na tera e nui atu te whakahawea me te riri.
Nʼụbọchị taa ka ndị inyom ndịisi nke Peshịa na Midia, bụ ndị nụrụ banyere omume nwunye eze mere, ga-azakwa ndịisi ọchịchị alaeze gị nʼụzọ dị otu a. A ga-enwe nleda anya na esemokwu nʼala a mgbe niile.
19 Ki te pai te kingi, kia puta he kupu kingi mana, me tuhituhi hoki ki roto ki nga ture o nga Pahi, o nga Meri, kei taka, ara kia kaua a Wahati e haere mai ki te aroaro o Kingi Ahahueruha; ko tona kuinitanga hoki kia hoatu e te kingi ki tetahi atu e pai ake ana i a ia.
“Ya mere, ọ bụrụ na ọ masị eze, ya nye iwu, nke a ga-edepụta, ka ọ bụrụ iwu nʼala Peshịa na Midia, nke na-agaghị agbanwe, na Vashti agaghị abatakwa nʼihu eze Sekses ọzọ. Ka eze werekwa ọnọdụ eze nwanyị ahụ nye onye ọzọ ka ya mma.
20 A, ka rangona ta te kingi tikanga e whakatakoto ai ia puta noa i tona kingitanga nui nei, katahi nga wahine katoa ka whakahonore i a ratou tane, i te iti, i te rahi.
Ọ ga-erukwa na mgbe a gụpụtara iwu a eze nyere nʼakụkụ alaeze a niile, ndị inyom niile ga-asọpụrụ ndị di ha site nʼonye dịkarịsịrị nta nʼetiti ha ruo nʼonye dị ukwuu.”
21 Na pai tonu te kupu ki te whakaaro o te kingi, o nga rangatira; a rite tonu ki te kupu a Memukana ta te kingi i mea ai.
Eze na ndịisi ọchịchị ya nabatara ndụmọdụ a, nʼihi ya, eze mere ihe Memukan kwuru.
22 I tukua hoki e ia he pukapuka ki nga kawanatanga katoa a te kingi, ki tenei kawanatanga, ki tenei kawanatanga, he mea whakarite ki to reira tikanga mo te tuhituhi, ki tenei iwi, ki tenei iwi, he mea whakarite ki to reira reo, ara ko nga tane kat oa hei rangatira i roto i o ratou whare; a kia korerotia i te reo o to reira iwi.
O zipụrụ akwụkwọ ozi a nye akụkụ niile a na-achị achị nke alaeze ahụ. E dekwara akwụkwọ ozi ahụ nʼasụsụ dị iche iche, na-ekwupụta nʼasụsụ ọbụla na nwoke ọbụla kwesiri ịbụ onye na-achị ezinaụlọ ya.

< Ehetere 1 >