< 2 Hamuera 17 >

1 I mea ano a Ahitopere ki a Apoharama, Tena kia whiriwhiria etahi tangata e ahau, kia kotahi tekau ma rua mano, kia whakatika ahau ki te whai i a Rawiri i te po nei.
Ahitofel gwara Absalọm sị ya, “Kwere ka m họpụta puku ndị ikom iri na abụọ ka m duru ha chụso Devid ọsọ nʼazụ nʼabalị taa.
2 A ka huakina ia e ahau i a ia e ngenge ana, i nga ringa e kahakore ana; na ka whakaoho ahau i a ia, a ka rere tona nuinga katoa, ko reira ahau patu ai i te kingi, i a ia anake;
Aga m abịakwasị ya mgbe ike gwụrụ ya, mgbe obi ya na-ada mba. Aga m emenye ya egwu nke ga-eme ka ọ maa jijiji. Mgbe ahụ, ndị niile so ya ga-agbasasịkwa. Ọ bụ naanị eze ka m ga-egbu
3 A ka whakahokia mai e ahau te iwi katoa ki a koe: ko te hokinga mai tenei o te katoa, ki te mau te tangata e whaia nei e koe, penei ka ata noho te iwi katoa.
Aga m eme ka ndị ya niile lọghachikwute gị. Ọnwụ nke otu nwoke a ị na-achọsi ndụ ya ike ga-eme ndị ọzọ niile ịlọghachikwute gị, onye ọbụla ga-anọ nʼudo.”
4 Na tika tonu taua kupu ki te whakaaro o Apoharama, ki te whakaaro hoki o nga kaumatua katoa o Iharaira.
Atụmatụ ahụ ziri ezi nʼanya Absalọm na ndị okenye niile nke Izrel.
5 Na ka mea a Apoharama, Tena, karangatia ano hoki a Huhai Araki, kia rongo ai tatou ki tana kupu.
Ma Absalọm kwuru sị, “Kpọọ Hushaị onye Akai ka anyị jụọ ya ihe ọ chere banyere okwu a.”
6 A, no te taenga o Huhai ki a Apoharama, ka korero a Apoharama ki a ia, ka mea, Ko te kupu tenei i korero ai a Ahitopere: me mea ranei e tatou tana i korero ai? ki te kahore, korero mai?
Mgbe Hushaị bịakwutere ya, Absalọm sịrị ya, “Ahitofel nyere ndụmọdụ dị otu a. Gịnị ka ị chere? Anyị ga-eme ihe o kwuru? Ọ bụrụ na anyị agaghị eme ya, gị onwe gị kwuo nke gị.”
7 Na ka mea a Huhai ki a Apoharama, ko te whakaaro i whakaaro ai a Ahitopere i tenei wa nei, kahore i pai.
Hushaị zara Absalọm sị, “Ndụmọdụ Ahitofel dụrụ nʼoge a adịghị mma.
8 I mea hoki a Huhai, E mohio ana koe ki tou papa, ratou ko ana tangata, he toa ratou, e mamae ana hoki o ratou ngakau, e rite tonu ana ki te pea kua tangohia nei ana kuao i te parae; he tangata whawhai hoki tou papa; e kore e moe i roto i nga tang ata.
Ọ sịrị, Gị onwe gị maara nna gị na ndị ikom ya; ha bụ ndị dike nʼagha, mkpụrụobi ha dịkwa ilu ugbu a dịka anụ ọhịa bịa a gbabara aka nwa nʼọhịa. Nna gị bụ onye ihe banyere agha doro anya. Ọ gaghị eso ndị ya nọọ ọnọdụ abalị.
9 Nana, kei te piri tera i roto i tetahi rua, i tetahi atu wahi ranei; na, akauanei, hei te hinganga o etahi o ratou i te timatanga, a ka rongo tetahi, ka ki ia, Kua pa te patu ki te hunga e whai ana i a Apoharama.
Ọ bụladị ugbu a, o zoola onwe ya nʼime otu olulu maọbụ nʼime ọgba nkume. Ọ bụrụ na ọ pụta buru ụzọ buso ndị agha gị agha, onye ọbụla nụrụ ya ga-ekwu sị, ‘Etigbuola ndị agha Absalọm oke ntigbu.’
10 Ahakoa ko wai tetahi toa, i rite tona ngakau ki to te raiona, ka ngohe noa iho: e mohio ana hoki a Iharaira katoa he marohirohi tou papa, he toa hoki ana tangata.
Mgbe ahụ, ọ bụladị dimkpa nʼagha ndị nwere obi ọdụm, ụjọ ga-atụkwa ha. Ha agaghị ekwekwa ịga nʼihu ọgụ. Nʼihi na Izrel niile maara na nna gị bụ dike. Ha maakwara na ndị agha ya bụkwa ndị obi kara aka.
11 Koia ahau ka mea ai, Me ata kohikohi ki a koe a Iharaira katoa, o Rana a tae noa ki Peerehepa; kia rite ki te onepu i te moana te tini; me haere ano hoki koe, a koe na ano, ki te tatauranga.
“Ndụmọdụ m na-enye bụ nke a: chịkọtaa ndị Izrel niile, site na Dan ruo Bịasheba, ha dịka aja nke dị nʼakụkụ oke osimiri. Ọ bụkwa gị ga-edu ha nʼagha ahụ.
12 Na ka whakaekea ia e tatou ki tetahi wahi e kitea ai ia; a ka tau iho ki runga ki a ia, ka pera ano me te tomairangi e tau ana ki runga ki te oneone: a ko ia me ana tangata katoa, e kore e mahu tetai i a tatou ahakoa kia kotahi nei.
Mgbe ahụ, anyị ga-ebuso ya agha ebe ọbụla anyị hụrụ ya; anyị ga-abịakwasị ya dịka igirigi si adakwasị ala. Anyị ga-egbu ya, gbukwaa ndị niile so ya. Otu onye agaghị afọdụkwa nʼime ha.
13 A ki te tomo ia ki tetahi pa, na, ka mau taura atu a Iharaira katoa ki taua pa, ka toia taua pa e tatou ki roto ki te awa, kia kore ra ano e kitea tetahi kohatu, ahakoa ririki, ki reira.
Ọ bụrụkwa na o zoo onwe ya nʼotu obodo, mgbe ahụ Izrel niile ga-eweta ụdọ nʼobodo ahụ, anyị ga-adọtu ya dọbanye ya na ndagwurugwu, ruo mgbe ọ bụladị otu nkume ga-afọdụ nʼebe ahụ.”
14 Na ka mea a Apoharama ratou ko nga tangata katoa o Iharaira, Pai atu te whakaaro o Huhai Araki i te whakaaro o Ahitopere. Na Ihowa hoki te tikanga kia whakataka te whakaaro pai o Ahitopere, kia kawea ai he kino e Ihowa ki runga ki a Apoharama.
Absalọm na ndị ikom Izrel niile sịrị, “Ndụmọdụ Hushaị, onye Akai dị mma karịa nke Ahitofel.” Ma Onyenwe anyị ekpebielarị imebi ezi ndụmọdụ Ahitofel ka o si otu a wetara Absalọm ihe ndakwasị ọjọọ.
15 Katahi a Huhai ka mea ki nga tohunga, ki a Haroko raua ko Apiatara, Ko nga whakaaro tenei o Ahitopere ki a Apoharama ratou ko nga kaumatua o Iharaira; ko oku whakaaro hoki enei i whakatakoto atu nei.
Hushaị gwara Zadọk na Abịata, ndị nchụaja, “Otu a na ihe ndị a ka Ahitofel dụrụ Absalọm na ndị okenye Izrel nʼọdụ ka ha mee, ma otu a na nke a ka mụ onwe dụkwaranụ nʼọdụ.
16 Na kia hohoro te tono tangata ki te whakaatu ki a Rawiri. Mea atu, Kaua e moe i tenei po ki nga kauanga i te koraha; engari kia hohoro te whiti atu, kei horomia ake te kingi me tona nuinga katoa.
Ugbu a, meenụ ngwa, ziga ozi gwa Devid sị, ‘Anọkwala ọnọdụ abalị nʼụzọ ngabiga nke osimiri nʼime ọzara, kama gabiga na-atụfughị oge, ma ọ bụghị otu a, ma eze ma ndị niile ya na ha soo ga-abụ ndị elodara.’”
17 Na i Enerokere a Honatana raua ko Ahimaata e tatari ana; kihai hoki i ahei kia kitea e haere mai ana ki te pa: na ka haere tetahi pononga wahine, ka whakaatu ki a raua, a haere ana raua ki te whakaatu ki a Kingi Rawiri.
Jonatan na Ahimaaz nọ nʼakụkụ En-Rogel ka a ghara ihu ha mgbe ha na-abata nʼobodo. Otu nwaagbọghọ na-eje ozi na-aga zie ha ozi, ha onwe ha agaa zie eze Devid.
18 Otiia i kitea raua e tetahi taitamariki, a korerotia atu ana e ia ki a Apoharama: heoi hohoro tonu raua, a ka tae ki te whare o tetahi tangata i Pahurimi. Na he poka wai tana i tona marae, a heke iho ana raua ki reira.
Ma otu nwokorobịa hụrụ ha gaa gwa Absalọm. Ya mere, ha abụọ mere ngwangwa baa nʼụlọ otu nwoke onye Bahurim, onye nwere olulu mmiri nʼogige ya, ha rịdara nʼime olulu ahụ
19 Na ka tikina tetahi hipoki e te wahine, taupokina ana e ia ki te poka, na horahia ana e ia he witi tuki ki runga, a kihai taua mea i mohiotia.
Nwunye nwoke ahụ weere ihe mkpuchi ya tụsaa nʼọnụ olulu mmiri ahụ gbasaakwa mkpụrụ ọka nʼelu ya. Ọ dịghị onye maara maka ya.
20 Na ka tae nga tangata a Apoharama ki te wahine, ki te whare, ka mea, Kei hea a Ahimaata raua ko Honatana? Na ka mea te wahine ki a ratou, Kua whiti raua i te awa wai. Na ka rapu ratou, a kihai i kitea, a hoki ana ki Hiruharama.
Mgbe ndị ozi Absalọm bịaruru jụọ nwanyị ahụ, “Olee ebe Ahimaaz na Jonatan nọ”? Nwanyị ahụ zara, “Ha agafeela mmiri iyi.” Ndị ozi Absalọm chọrọ ha ma ha ahụghị ha. Ha laghachiri na Jerusalem.
21 A, i muri i to ratou haerenga, ka piki ake raua i roto i te poka, a haere ana, whakaatu ana ki a Kingi Rawiri; i mea ki a Rawiri, Whakatika, hohoro koutou te whiti atu i te wai nei; ko te whakaaro hoki tenei o Ahitopere mo koutou.
Mgbe ha lawara, mmadụ abụọ ahụ sitere nʼolulu mmiri ahụ rigopụta, gaa gwa eze Devid. Ha sịrị ya, “Bilie gafeenụ mmiri ngwangwa, nʼihi na Ahitofel adụọla Absalọm ọdụ otu a na otu a megide gị.”
22 Katahi ka whakatika a Rawiri ratou ko tona nuinga katoa, a whiti ana i Horano: ao rawa ake te ra, kihai tetahi i kore te whiti i Horano.
Nke a mere Devid na ndị niile so ya biliri gafee osimiri Jọdan. Mgbe chi ụtụtụ na-abọ, ha niile nọ nʼofe nke ọzọ Jọdan.
23 A, i te kitenga o Ahitopere kihai i meatia tana i whakaaro ai, whakanohoia ana e ia tana kaihe, a whakatika ana, haere ana ki tona whare ki tona pa, na kei te whakariterite i nga mea o tona whare, tarona ana i a ia, a mate ake, tanumia iho ki te tanumanga o tona papa.
Mgbe Ahitofel hụrụ na-emeghị ndụmọdụ ya, o biliri jikwaa ịnyịnya ibu ya, laa nʼụlọ ya nʼobodo ya. Mgbe o ruru nʼụlọ ya, o doziri nʼezinaụlọ ya nʼusoro, were ụdọ kwụgbuo onwe ya. Ọ nwụrụ. E lie ya nʼili nna ya.
24 Katahi ka haere a Rawiri ki Mahanaima. A i whiti ano a Apoharama i Horano me nga tangata katoa o Iharaira.
Devid batara Mahanaim oge Absalọm gabigara Jọdan, ya na ndị ikom Izrel so ya.
25 A ka meatia a Amaha e Apoharama hei whakakapi mo Ioapa, hei rangatira mo te ope: na he tama a Amaha na tetahi tangata, ko Itira tona ingoa, no Iharaira, i haere nei ki roto, ki a Apikaira tamahine a Nahaha, ki te teina o Teruia whaea o Ioapa.
Absalọm họpụtakwara Amasa mee ya onyeisi ndị agha, nʼọnọdụ Joab. Amasa bụ nwa nwoke Itra, onye Ishmel, onye lụrụ Abigel, nwa nwanyị Nahash, onye bụkwa nwanne nwanyị Zeruaya nne Joab.
26 Na noho ana a Iharaira ratou ko Apoharama ki te whenua o Kireara.
Absalọm na ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼala Gilead.
27 A, no te taenga o Rawiri ki Mahanaima, ka kawea mai e Hopi tama a Nahaha o Rapa o nga tama a Amona, e Makiri tama a Amiere o Rotepara, ratou ko Paratirai Kireari o Rokerimi,
Mgbe Devid bịarutere Mahanaim, Shobi nwa Nahash onye obodo Raba nke dị nʼala ndị Amọn, na Makia nwa Amiel onye si Lo Deba, na Bazilai, onye Gilead si Rogelim
28 He moenga, he peihana, he oko oneone, he witi, he parei, he paraoa, he kanga pahuhu, he pini, he pi, me etahi atu mea pahuhu,
wetara ute e ji edina ala, na ite isi nri, na efere e ji eri nri bụ ọrụ onye ọkpụ ite. Tinyere ọka wiiti na ọka balị, ụtụ ọka na ọka a ṅara nʼọkụ, akịdị na lentil.
29 He honi, he pata, he hipi, me te tiihi, hei kai ma Rawiri ratou ko tona nuinga: i mea hoki ratou, E matekai ana te iwi, e ngenge ana, e matewai ana i te koraha.
O wetakwara mmanụ aṅụ, na bọta, atụrụ na chiizi nke sitere na mmiri ara ehi nye Devid na ndị so ya ka ha rie. Nʼihi na ha sịrị, “Ike agwụla ndị mmadụ, agụụ na-agụ ha, akpịrị na-akpọkwa ha nkụ, nʼime ọzara.”

< 2 Hamuera 17 >