< I Paralipomenon 8 >

1 Beniamin autem genuit Bale primogenitum suum, Asbel secundum, Ahara tertium,
Benjamin mụtara ụmụ ndị ikom ise. Aha ha nʼusoro dịka e si mụọ ha bụ: Bela nke mbụ, nke abụọ Ashbel, nke atọ Ahara,
2 Nohaa quartum, et Rapha quintum.
nke anọ Noha, na nke ise Rafa.
3 Fueruntque filii Bale: Addar, et Gera, et Abiud,
Ndị ikom Bela mụrụ bụ Aada, Gera, Abihud,
4 Abisue quoque et Naaman, et Ahoe,
Abishua, Neeman, Ahoa,
5 sed et Gera, et Sephuphan, et Huram.
Gera, Shefufan na Huram.
6 Hi sunt filii Ahod, principes cognationum habitantium in Gabaa, qui translati sunt in Manahath.
Ụmụ Ehud ndị bụ ndịisi ezinaụlọ na Geba, ndị bụkwa ndị e si na Geba chụpụ mee ka ha gaa biri na Manahat bụ ndị a:
7 Naaman autem, et Achia, et Gera ipse transtulit eos, et genuit Osa, et Ahiud.
Neeman, Ahija na Gera, onye chụpụrụ ha na onye bụkwa nna Ụza na Ahihud.
8 Porro Saharaim genuit in regione Moab, postquam dimisit Husim, et Bara uxores suas.
A mụtara Shaharaim ụmụ ndị ikom na Moab mgbe ọ gbachara ndị nwunye ya abụọ bụ Hushim na Baara alụkwaghị m.
9 Genuit autem de Hodes uxore sua Iobab, et Sebia, et Mosa, et Molchom,
Nwunye ya Hodesh mụtara Jobab, Zibịa, Mesha, Malkam,
10 Iehus quoque, et Sechia, et Marma. Hi sunt filii eius principes in familiis suis.
Jeuz, Sakia na Miama. Ndị a bụ ụmụ ya ndị ikom, ndị bụkwa ndịisi ezi.
11 Mehusim vero genuit Abitob, et Elphaal.
Tupu ọ chụpụ nwunye ya Hushim, ọ mụtaara ya Abaịtub, na Elpaal.
12 Porro filii Elphaal: Heber, et Misaam, et Samad: hic ædificavit Ono, et Lod, et filias eius.
Elpaal mụrụ ndị a: Eba, Misham, Shemed (onye wuru obodo Ono na Lod, na obodo nta gbara ha gburugburu).
13 Baria autem, et Sama principes cognationum habitantium in Aialon: hi fugaverunt habitatores Geth.
Ụmụ ya ndị ọzọ bụ Beriya, na Shema, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ ndị bi nʼAijalon. Ọ bụ ha chụpụrụ ndị Gat site nʼobodo ahụ.
14 Et Ahio, et Sesac, et Ierimoth,
Beriya mụrụ Ahio, Shashak, Jeremot,
15 et Zabadia, et Arod, et Heder,
Zebadaya, Arad, Eda,
16 Michael quoque, et Iespha, et Ioha filii Baria.
Maikel, Ishpa na Joha, ndị a bụ ụmụ ndị ikom Beriya.
17 Et Zabadia, et Mosollam, et Hezeci, et Heber,
Zebadaya, Meshulam, Hizki, Heba,
18 et Iesamari, et Iezlia, et Iobab filii Elphaal,
Ishmerai, Izlaya na Jobab bụ ụmụ Elpaal.
19 et Iacim, et Zechri, et Zabdi,
Jakim, Zikri, Zabdi,
20 et Elioenai, et Selethai, et Eliel,
Elienai, Ziletai, Eliel,
21 et Adaia, et Baraia, et Samarath filii Semei.
Adaya, Beraya na Shimrat bụ ụmụ Shimei.
22 Et Iespham, et Heber, et Eliel,
Ishpan, Eba, Eliel,
23 et Abdon, et Zechri, et Hanan,
Abdon, Zikri, Hanan,
24 et Hanania, et Ælam, et Anathothia,
Hananaya, Elam, Antotija,
25 et Iephdaia, et Phanuel filii Sesac.
Ifdeya na Penuel bụ ụmụ ndị ikom Shashak.
26 Et Samsari, et Sohoria, et Otholia,
Jeroham mụrụ Shamsherai, Sheharaya, Atalaya,
27 et Iersia, et Elia, et Zechri, filii Ieroham.
Jaareshaya, Ịlaịja na Zikri bụ ụmụ ndị ikom Jeroham.
28 Hi patriarchæ, et cognationum principes, qui habitaverunt in Ierusalem.
Ndị a niile bụ ndịisi ezi, ndị ndu, ndị bi na Jerusalem, ndị e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.
29 In Gabaon autem habitaverunt Iehiel pater Gabaon, et nomen uxoris eius Maacha:
Jeiel nna Gibiọn biri na Gibiọn. Aha nwunye ya bụ Maaka.
30 filiusque eius primogenitus Abdon, et Sur, et Cis, et Baal, et Nadab.
Ọ mụrụ Abdon, ọkpara ya, Zua, Kish, Baal, Nea, Nadab,
31 Gedor quoque, et Ahio, et Zacher, et Macelloth:
Gedoa, Ahio na Zeka
32 et Macelloth genuit Samaa: habitaveruntque ex adverso fratrum suorum in Ierusalem cum fratribus suis.
na Miklot, onye bụ nna Shimea. Ha onwe ha bikwa ndị ụmụnna ha nso na Jerusalem.
33 Ner autem genuit Cis, et Cis genuit Saul. Porro Saul genuit Ionathan, et Melchisua, et Abinadab, et Esbaal.
Nea mụrụ Kish, nna Sọl. Ma Sọl mụrụ Jonatan, Malkishua, Abinadab na Esh-Baal.
34 Filius autem Ionathan, Meribbaal: et Meribbaal genuit Micha.
Jonatan mụrụ nwa nwoke a na-akpọ Merib-Baal, nna Maịka.
35 Filii Micha, Phithon, et Melech, et Tharaa, et Ahaz.
Ụmụ Maịka mụrụ bụ, Piton, Melek, Tarea na Ehaz.
36 Et Ahaz genuit Ioada: et Ioada genuit Alamath, et Azmoth, et Zamri: porro Zamri genuit Mosa,
Ehaz amụọ Jehoada nna Alemet, Azmavet na Zimri. Zimri mụrụ Moza.
37 et Mosa genuit Banaa, cuius filius fuit Rapha, de quo ortus est Elasa, qui genuit Asel.
Moza mụrụ Binea, nna Rafa, nna Eleasa, nna Azel.
38 Porro Asel sex filii fuerunt his nominibus, Ezricam, Bocru, Ismahel, Saria, Obdia, et Hanan. Omnes hi filii Asel.
Azel mụrụ ụmụ ndị ikom isii ndị a: Azrikam, Bokeru, Ishmel, Shearaya, Ọbadaya na Hanan. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Azel.
39 Filii autem Esec fratris eius, Ulam primogenitus, et Iehus secundus, et Eliphalet tertius.
Eshek nwanne nwoke Azel mụrụ ndị ikom atọ: Ụlam, ọkpara ya na Jeush, na Elifelet.
40 Fueruntque filii Ulam viri robustissimi, et magno robore tendentes arcum: et multos habentes filios ac nepotes, usque ad centum quinquaginta. Omnes hi, filii Beniamin.
Ụmụ Ụlam bụ dike na dimkpa ndị a zụrụ ịgba ụta. Ọnụọgụgụ ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha dị otu narị na iri mmadụ ise, 150. Ha niile sikwa nʼebo Benjamin.

< I Paralipomenon 8 >