< 열왕기하 10 >

1 아합의 아들 칠십인이 사마리아에 있는지라 예후가 편지들을 써서 사마리아에 보내어 이스르엘 방백 곧 장로들과 아합의 여러 아들을 교육하는 자들에게 전하니 일렀으되
Ugbu a, e nwere ụmụ Ehab ndị ikom ọnụọgụgụ ha dị iri asaa ndị nọ na Sameria, Jehu dere akwụkwọ ozi ziga Sameria, zigara ndịisi obodo Jezril, zigakwara ndị okenye na ndị na-elekọta ụmụ Ehab ndị ahụ. Ọ sịrị,
2 너희 주의 아들들이 너희와 함께 있고 또 병거와 말과 견고한 성과 병기가 너희에게 있으니 이 편지가 너희에게 이르거든
“Ugbu a, mgbe akwụkwọ a rutere unu aka, ebe unu na ụmụ ndị ikom nna unu ukwu nọ, ebe unu nwekwara ụgbọ agha na ịnyịnya, na obodo e wusiri ike na ngwa agha,
3 너희 주의 아들들 중에서 가장 어질고 정직한 자를 택하여 그 아비의 위에 두고 너희 주의 집을 위하여 싸우라 하였더라
họpụtanụ onye kachasị inwe ugwu ma kwesikwa nʼime ụmụ ndị ikom nna unu ukwu, mee ka ọ nọkwasị nʼocheeze nna ya. Mgbe ahụ, buo agha chebe ụlọ nna unu ukwu.”
4 저희가 심히 두려워하여 가로되 두 왕이 저를 당치 못하였거든 우리가 어찌 당하리요 하고
Ma ha tụrụ egwu nʼebe ọ dị ukwuu, sị, “Lee, eze abụọ enweghị ike iguzogide ya, anyị onwe anyị ga-esi aṅaa guzogide ya?”
5 궁내 대신과 부윤과 장로들과 왕자를 교육하는 자들이 예후에게 말을 전하여 가로되 우리는 당신의 종이라 무릇 명하는 것을 우리가 행하고 아무 사람이든지 왕으로 세우지 아니하리니 당신의 소견에 좋은대로 행하라 한지라
Ya mere, onye ọ dị nʼaka ilekọta ezinaụlọ eze, onyeisi obodo, ndị okenye na ndị niile na-elekọta ụmụ Ehab, dere akwụkwọ a zigara Jehu, sị ya, “Jehu, anyị niile bụ ndị ohu gị. Anyị jikeere ime ihe niile i gwara anyị. Anyị agaghị ahọpụta onye ọbụla dịka eze; gị onwe gị mee ihe ọbụla ị chere na ọ bụ ya kachasị mma.”
6 예후가 다시 저희에게 편지를 부치니 일렀으되 만일 너희가 내 편이 되어 내 말을 들으려거든 너희 주의 아들된 사람들의 머리를 취하고 내일 이맘때에 이스르엘에 이르러 내게 나아오라 하였더라 왕자 칠십인이 성중에서 그 교육하는 존귀한 자들과 함께 있는 중에
Mgbe ahụ, Jehu degaara ha akwụkwọ nke ugboro abụọ sị ha, “Ọ bụrụ na unu dịnyeere m, ọ bụrụkwa na unu ga-erube isi nye m, chịrịnụ isi ụmụ ndị ikom nna unu ukwu, bịakwute m nʼotu oge a echi na Jezril.” Nʼoge ahụ, ụmụ eze iri ndị ikom asaa nọ nʼaka ndịisi obodo ahụ, ndị na-azụlite ha.
7 편지가 이르매 저희가 왕자 칠십인을 잡아 몰수히 죽이고 그 머리를 광주리에 담아 이스르엘 예후에게로 보내니라
Mgbe akwụkwọ ozi ahụ rutere ha, ndị ikom ahụ kpọrọ ụmụ ndị ikom eze dị iri asaa nʼọnụọgụgụ gbuo ha niile, chịrị isi ha tinye na nkata zigara ya Jehu na Jezril.
8 사자가 와서 예후에게 고하여 가로되 무리가 왕자들의 머리를 가지고 왔나이다 가로되 두 무더기로 쌓아 내일 아침까지 문 어귀에 두라 하고
Mgbe onyeozi bịarutere, ọ gwara Jehu sị, “Ha ebutala isi ụmụ ndị ikom eze.” Mgbe ahụ, Jehu nyere iwu sị, “Tụkọbanụ ha ọnụ nʼoke abụọ, nʼọnụ ụzọ e si abata obodo, tutu ruo ụtụtụ.”
9 이튿날 아침에 저가 나가 서서 뭇백성에게 이르되 너희는 의롭도다 나는 내 주를 배반하여 죽였거니와 이 여러 사람을 죽인 자는 누구냐
Nʼụtụtụ ya, Jehu pụrụ, guzoro nʼihu ndị niile gbakọrọ nʼebe ahụ gwa ha okwu sị, “Ndị Izrel, unu bụ ndị ezi omume. Ọ bụ mụ onwe m gbara izu ọjọọ megide nna m ukwu, gbuo ya, ma onye gburu ndị a niile?
10 그런즉 너희는 알라 곧 여호와께서 아합의 집에 대하여 하신 말씀은 하나도 땅에 떨어지지 아니하리라 여호와께서 그 종 엘리야로 하신 말씀을 이제 이루셨도다 하니라
Matanụ nke ọma na o nweghị okwu ọbụla Onyenwe anyị kwuru megide ezinaụlọ Ehab nke na-agaghị emezu. Onyenwe anyị emeela ihe o kwere nkwa na ọ ga-eme site nʼọnụ ohu ya Ịlaịja.”
11 예후가 무릇 아합의 집에 속한 이스르엘에 남아 있는 자를 다 죽이고 또 그 존귀한 자와 가까운 친구와 제사장들을 죽이되 저에게 속한 자를 하나도 남기지 아니하였더라
Emesịa, Jehu gburu ndị ikwu Ehab fọdụrụ nʼobodo Jezril, ha na ndịisi niile, na ndị enyi ya niile, na ndị nchụaja ya niile. Ọ dịkwaghị otu onye ikwu Ehab ọ hapụrụ ndụ.
12 예후가 일어나서 사마리아로 가더니 노중에 목자가 양털 깎는 집에 이르러
Emesịakwa, Jehu hapụrụ Jezril gaa Sameria. Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ọ bịaruru ebe a na-akpọ Ebe Izuike Ndị ọzụzụ atụrụ.
13 유다 왕 아하시야의 형제들을 만나 묻되 너희는 누구냐 대답하되 우리는 아하시야의 형제라 이제 왕자들과 태후의 아들들에게 문안하러 내려가노라
Nʼebe ahụ, o zutere ndị ụmụnna Ahazaya, eze Juda, jụọ sị, “Olee ndị ka unu bụ?” Ha zara, “Anyị bụ ndị ikwu Ahazaya, eze Juda, anyị bịara ka anyị jụọ maka ọdịmma ndị ezinaụlọ eze na nne eze.”
14 가로되 사로잡으라 하매 곧 사로잡아 목자가 양털 깎는 집 웅덩이 곁에서 죽이니 사십 이인이 하나도 남지 아니하였더라
O nyere iwu sị, “Jidenụ ha na ndụ.” Ha jidere ha na ndụ, gbukwaa ha niile nʼakụkụ olulu miri nke Bet-Eked. Ọnụọgụgụ ha dị iri anọ na abụọ. O nweghị onye ọbụla ọ hapụrụ ndụ.
15 예후가 거기서 떠나가다가 레갑의 아들 여호나답이 맞으러 오는 것을 만난지라 그 안부를 묻고 가로되 내 마음이 네 마음을 향하여 진실함과 같이 네 마음도 진실하냐 여호나답이 대답하되 그러하니이다 가로되 그러면 나와 손을 잡자 손을 잡으니 예후가 끌어 병거에 올리며
Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, o zutere Jehonadab nwa Rekab, ka ọ na-abịa izute ya. Jehu kelere ya, sị, “Obi gị, o ziri ezi nwee nkwekọrịta, dịka obi m dị nʼebe ị nọ?” Jehonadab zara sị ya, “E.” Jehu sịrị, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, kwe m nʼaka.” Jehonadab kwere ya nʼaka. Jehu nʼonwe ya nyeere ya aka ka ọ rigota nʼụgbọ agha ya.
16 가로되 나와 함께 가서 여호와를 위한 나의 열심을 보라 하고 이에 자기 병거에 태우고
Mgbe ahụ, Jehu sịrị ya, “Ugbu a, soro m bịa lee ụdị ịnụ ọkụ nʼobi m nwere maka ọrụ Onyenwe anyị.” Ha abụọ sooro nʼụgbọ agha Jehu.
17 사마리아에 이르러 거기 남아있는바 아합에게 속한 자를 죽여 진멸하였으니 여호와께서 엘리야에게 이르신 말씀과 같이 되었더라
Mgbe ha bịaruru Sameria, Jehu gburu ndị enyi na ndị ikwu Ehab niile, ndị fọdụrụ site nʼikwu Ehab, o bibiri ha dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma Ịlaịja.
18 예후가 뭇백성을 모으고 이르되 아합은 바알을 조금 섬겼으나 예후는 많이 섬기리라
Emesịa, Jehu kpọkọtara ndị obodo ahụ niile sị ha, “Ehab fere Baal ofufe nke nta, Jehu ga-efe ya ebe ọ dị ukwuu.
19 그러므로 내가 이제 큰 제사를 바알에게 드리고자 하노니 바알의 모든 선지자와 모든 섬기는 자와 모든 제사장들을 한 사람도 빠치지 말고 불러 내게로 나오게 하라 무릇 오지 아니하는 자는 살리지 아니하리라 하니 이는 예후가 바알 섬기는자를 멸하려 하여 궤계를 씀이라
Ugbu a, kpọkọtaanụ ndị amụma Baal niile, ndị niile na-efe ya, na ndị nchụaja ya niile. Hụnụ na onye ọbụla nʼime ha bịara, nʼihi na a ga-eme oke mmemme ịchụ aja nye Baal. Onye ọbụla e lere anya ya nʼebe ahụ, ma a hụghị ya, agaghị adị ndụ.” Ma Jehu ji aghụghọ nʼihi ka ọ laa ndị a na-efe Baal nʼiyi.
20 예후가 바알을 위하는 대회를 거룩히 열라 하매 드디어 공포하였더라
Jehu sịrị, “Kpọsaanụ na a ga-enwe oke mkpọkọta dị nsọ nye Baal.” Ya mere, ha kwusara ya.
21 예후가 온 이스라엘에 두루 보내었더니 무릇 바알을 섬기는 사람이 하나도 빠진 자가 없이 다 이르렀고 무리가 바알의 당에 들어가매 이편부터 저편까지 가득하였더라
O zipụrụ ozi nye ndị bi nʼakụkụ Izrel niile. Ndị niile na-efe Baal bịazuru. Ọ dịghị onye fọdụrụ nke na-abịaghị. Ha jupụtara nʼụlọnsọ ukwu Baal site nʼotu isi ya ruo nʼisi nke ọzọ.
22 예후가 예복 맡은 자에게 이르되 예복을 내어다가 무릇 바알 섬기는 자에게 주라 하매 저희에게로 예복을 가져온지라
Jehu sịrị onye na-elekọta ụlọ ebe a na-edebe uwe ndị na-efe ofufe na-eyi, “Chịpụta uwe nye ndị niile na-efe Baal.” Ya mere, ọ chịpụtaara ha uwe.
23 예후가 레갑의 아들 여호나답으로 더불어 바알의 당에 들어가서 바알을 섬기는 자에게 이르되 너희는 살펴보아 바알을 섬기는 자만 여기 있게 하고 여호와의 종은 하나도 너희 중에 있지 못하게 하라 하고
Mgbe ahụ, Jehu na Jehonadab nwa Rekab, banyere nʼebe nzukọ Baal. Jehu sịrị ndị nʼefe Baal, “Chọzienụ nke ọma ka unu hụ na o nweghị onye ọbụla na-efe Onyenwe anyị nọ nʼebe a, karịakwa naanị ndị na-efe Baal.”
24 무리가 번제와 다른 제사를 드리려고 들어간 때에 예후가 팔십인을 밖에 두며 이르되 내가 너희 손에 붙이는 사람을 한 사람이라도 도망하게 하는 자는 자기의 생명으로 그 사람의 생명을 대신하리라 하니라
Mgbe ha malitere ịchụ aja na isure ihe nsure ọkụ, Jehu emeelarị ka iri ndị agha asatọ gbaa ụlọ ahụ niile gburugburu. O nyelarị iwu sị, “Ọ bụrụ na unu ekwere ka otu onye si nʼime ụlọ a gbapụ, unu ga-eji ndụ unu kwụghachi ụgwọ onye dị otu ahụ.”
25 번제 드리기를 다하매 예후가 호위병과 장관들에게 이르되 들어가서 한 사람도 나가지 못하게 하고 죽이라 하매 호위병과 장관 들이 칼로 저희를 죽여 밖에 던지고
Ngwangwa Jehu chụchasịrị aja nsure ọkụ, ọ pụrụ gwa ndị agha ya, na ndịisi ha okwu sị, “Baanụ nʼime ụlọ gbuo ndị niile nọ nʼebe ahụ. Unu ekwela ka otu onye nʼime ha gbapụ.” Ha jiri mma agha gbuo ndị ahụ nọ nʼime ụlọ Baal, tụpụta ozu ha nʼezi. Emesịa, ndị agha Jehu banyere nʼime ime ụlọ ebe ịchụ aja Baal,
26 바알의 당있는 성으로 가서 바알의 당에서 목상들을 가져다가 불사르고
ha bupụtara ogidi nsọ e ji efe Baal, kpọọ ha ọkụ.
27 바알의 목상을 헐며 바알의 당을 훼파하여 변소를 만들었더니 오늘날까지 이르니라
Ha kwaturu ogidi nsọ Baal, kwatukwaa ụlọ ịchụ aja ya. Ya mere e megharịrị ya ka ọ bụrụ ebe ọha mmadụ na-aga ogwe ruo taa.
28 예후가 이와 같이 이스라엘 중에서 바알을 멸하였으나
Jehu kpochapụrụ ofufe Baal nʼala Izrel niile.
29 이스라엘로 범죄케 한 느밧의 아들 여로보암의 죄 곧 벧엘과 단에 있는 금송아지를 섬기는 죄에서는 떠나지 아니하였더라
Ma otu ọ dị, o siteghị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya. Mmehie nke Jeroboam mere ka Izrel mehie, ya bụ, mmehie nke ife arụsị ụmụ ehi e ji ọlaedo kpụọ, dị na Betel na Dan.
30 여호와께서 예후에게 이르시되 네가 나 보기에 정직한 일을 행하되 잘 행하여 내 마음에 있는대로 아합집에 다 행하였은즉 네 자손이 이스라엘 왕위를 이어 사대를 지나리라 하시니라
Onyenwe anyị gwara Jehu sị, “Nʼihi na i mere nke ọma mezuo ihe niile ziri ezi nʼanya m, nʼebe ezinaụlọ Ehab nọ, nʼusoro ihe niile dị nʼuche m ime, ụmụ ụmụ gị ga-anọkwasị nʼocheeze Izrel, ruo nʼọgbọ nke anọ ha.”
31 그러나 예후가 전심으로 이스라엘 하나님 여호와의 율법을 지켜 행하지 아니하며 여로보암이 이스라엘로 범하게 한 그 죄에서 떠나지 아니하였더라
Ma Jehu akpachapụghị anya iji obi ya niile debe iwu Onyenwe anyị, Chineke Izrel. O siteghị na mmehie Jeroboam wezuga onwe ya, bụ mmehie ahụ o mere ka Izrel mee.
32 이때에 여호와께서 비로소 이스라엘을 찢으시매 하사엘이 그 사방을 치되
Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị malitere ime ka ndị Izrel bido ịdị nta. Hazael eze Aram, buru agha merie ọtụtụ akụkụ Izrel,
33 요단 동편 길르앗 온 땅 곧 갓 사람과 르우벤 사람과 므낫세 사람의 땅 아르논 골짜기에 있는 아로엘에서부터 길르앗과 바산까지 하였더라
nke dị nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, na ala niile nke Gilead (nʼoke ala ndị Gad, na nke ndị Ruben, na Manase), site nʼAroea nke dị nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn, ruo Gilead na Bashan.
34 예후의 남은 사적과 무릇 행한 일과 모든 권세는 이스라엘 왕 역대지략에 기록되지 아니하였느냐
Akụkọ gbasara ọchịchị eze Jehu, na ihe niile o mere, na ịkpa ike ya niile, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel?
35 예후가 그 열조와 함께 자매 사마리아에 장사되고 그 아들 여호아하스가 대신하여 왕이 되니라
Jehu sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Nwa ya bụ Jehoahaz nọchiri anya ya dịka eze.
36 예후가 사마리아에서 이스라엘을 다스린 햇수는 이십 팔년이더라
Ma ụbọchị niile Jehu bụ eze Izrel nʼime Sameria dị iri afọ abụọ na asatọ.

< 열왕기하 10 >