< ローマ人への手紙 10 >

1 兄弟等よ、我が切に心に望む所、神に祈る所は、彼等の救はれん事なり。
Ụmụnna m, ihe na-agụ nnọọ obi m agụụ nke ukwu na ekpere m na-ekpe nye Chineke bụ ịhụ na a zọpụtara ha.
2 我彼等が神に熱心なる事を證明す、然れど其熱心は知識に一致せず、
Ana m agba akaebe na ihe banyere Chineke na-anụ ha ọkụ nʼobi nke ukwuu. Kama ịnụ ọkụ nʼobi ha abụghị site na mmazu Chineke.
3 其は神の義を知らず、且己が義を立てんことを力めて、神の義に服せざればなり。
Ebe ha na-amaghị ezi omume nke si na Chineke bịa kama ha chọrọ ihiwe nke onwe ha, ha ewedaghị onwe ha nʼokpuru ezi omume nke Chineke.
4 蓋律法の終はキリストにして、是信ずる人の各義とせられん為なり。
Kraịst bụ ọgwụgwụ iwu. Ya mere, ezi omume ga-adịrị onye ọbụla nke kwere.
5 斯てモイゼは律法に由る義に就きて、「之を為せる人は律法に由りて活くべし」と録したるに、
Mosis si otu a dee banyere ezi omume nke sitere nʼiwu, “Onye ọbụla na-eme ihe ndị a ga-adị ndụ site na ha.”
6 信仰に由る義に就きては謂へらく、「汝心の中に謂ふこと勿れ、誰か天に昇らんと」、是キリストを引下す為ならん。
Ma ezi omume ahụ nke sitere nʼokwukwe na-asị, “Asịla nʼime obi gị, ‘onye ga-arịgo nʼime eluigwe?’” (nke bụ, ikudata Kraịst)
7 「或は誰か陰府に降らんと」、是キリストを死より呼起す為ならん。 (Abyssos g12)
“maọbụ, ‘Onye ga-arịda nʼime ili?’” (nke a bụ, ịkpọlite Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ). (Abyssos g12)
8 然るに(聖書に)何と言へるぞ、「御言は汝に近く、汝の口に在り、汝の心に在り」と、是即ち我等が宣ぶる所の信仰の言なり。
Ma gịnị ka ọ na-ekwu? “Okwu ahụ nọ gị nso, ọ dị nʼọnụ gị dịrịkwa nʼobi gị,” ọ bụ ya, bụ okwu okwukwe ahụ anyị na-ekwusa.
9 蓋汝もし口を以て主イエズスを宣言し、心を以て神の之を死者の中より復活せしめ給ひしことを信ぜば救はるべし。
Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị.
10 其は心には信じて義とせられ、口には宣言して救霊を得べければなり。
Nʼihi na ọ bụ obi gị ka ị ga-eji kwere; a gụọ gị nʼonye ezi omume, ọ bụkwa ọnụ gị ka ị ga-eji kwupụta, a zọpụta gị.
11 即ち聖書に曰く、「(誰にもあれ)彼を信ずる人は辱められじ」と。
Dịka akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”
12 蓋萬民の主は唯一に在して、頼み奉る一切の人に對して豊に在せば、ユデア人とギリシア人との別ある事なし。
Nʼihi na o nweghị ihe dị iche nʼetiti onye Juu na onye mba ọzọ, otu Onyenwe anyị ahụ bụ Onye nwe mmadụ niile, ọ na-agọzibigakwa ndị na-akpọku ya oke.
13 故に誰にもあれ主の御名を呼び頼む人は救はるべし。
Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.”
14 然らば未だ信ぜざりし者を如何にしてか之を呼び頼まん、未だ聞かざりし者を如何にしてか之を信ぜん、宣ぶる人なくば如何にしてか之を聞くべき、
Ma olee otu ha ga-esi kpọkuo aha ya ma ọ bụrụ na ha ekwereghị na ya? Olee otu ha ga-esikwa kwere nʼonye ahụ ha anụbeghị ihe gbasara ya? Olee otu ha ga-esi nụkwa ma ọ bụrụ na ndị nkwusa adịghị?
15 遣はされずば如何にしてか宣べん、録して「嗟麗し、幸に平和を告げ、善事を告ぐる人々の足」、とあるが如し。
Oleekwanụ otu ha ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma ọ bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ha? Dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, sị, “Lee, ka ha si maa mma bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma.”
16 然れども皆福音に随へるには非ず、即ちイザヤ曰く、「主よ、我等に聞きて信ぜし者は誰ぞや」と。
Ma ọ bụghị mmadụ niile nabatara oziọma ahụ. Nʼihi na Aịzaya kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị?”
17 然れば信仰は聞くより起り、聞くはキリストの御言を以てす。
Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst.
18 然れど我は言はん、彼等は聞こえざりしか、と。然らず、而も「其聲は全世界に行渡り、其言は地の極にまで及べり」
Ma ana m ajụ, Ọ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie. “Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.”
19 然れど我は言はん、イスラエルは知らざりしかと、[然らず]、モイゼ先曰く「我民たらざる者を以て汝等を妬ましめ、愚なる民に對して怒らしめん」と。
Ọzọkwa, ana m ajụ, ọ bụ na Izrel aghọtaghị? Na mbụ, Mosis sịrị, “Aga m esite na ndị na-abụghị mba kpalie mmụọ ekworo nʼime unu; aga m esitekwa nʼobodo na-enweghị nghọta kpasuo unu iwe.”
20 イザヤも亦敢て曰く、「我探さざりし人々に見出だされ、尋ねざりし人々に公然と顕れたり」と。
Ma Aịzaya jiri nkwuwa okwu sị, “Ndị chọtara m bụ ndị na-adịghị ajụ ase m, ekpugheere m onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.”
21 又イスラエルに向ひて曰く、「我信ぜずして逆らへる民を、終日手を伸べて待てり」と。
O kwuru banyere ndị Izrel, “Agbasara m aka m ogologo ụbọchị niile nye ndị nnupu isi na ndị na-ekwesị olu ike.”

< ローマ人への手紙 10 >