+ マタイの福音書 1 >

1 第一項 キリスト人性の系圖 アブラハムの裔なるダヴィドの裔イエズス、キリストの系圖。
Nke a bụ ndekọ usoro ọmụmụ Jisọs onye bụ Kraịst, nwa Devid, nwa Ebraham.
2 アブラハムイザアクを生み、イザアクヤコブを生み、ヤコブユダと其兄弟等とを生み、
Ebraham mụrụ Aịzik, Aịzik amụọ Jekọb, Jekọb amụọ Juda na ụmụnne ya.
3 ユダタマルによりてファレスとザラとを生み、ファレスエスロンを生み、エスロンアラムを生み、
Juda mụtara Perez na Zera site na Tama, Perez mụrụ Hezrọn, Hezrọn amụọ Aram.
4 アラムアミナダブを生み、アミナダブナアソンを生み、ナアソンサルモンを生み、
Aram mụrụ Aminadab, Aminadab mụrụ Nashọn, Nashọn amụọ Salmọn.
5 サルモンラハブによりてボオズを生み、ボオズルトによりてオベドを生み、オベドイエッセを生み、イエッセダヴィド王を生み、
Salmọn bụ nna Boaz, site na nwunye ya Rehab, Boaz mụrụ Obed, site na nwunye ya Rut, Obed amụọ Jesi.
6 ダヴィド王ウリアの[妻]たりし者によりてサロモンを生み、
Jesi amụọ Devid, bụ eze. Devid mụrụ Solomọn site na nwunye ya Ụraya.
7 サロモンロボアムを生み、ロボアムアビアを生み、アビアアザを生み、
Solomọn mụrụ Rehoboam, Rehoboam amụọ Abija, Abija amụọ Esa.
8 アザヨザファトを生み、ヨザファトヨラムを生み、ヨラムオジアを生み、
Esa mụrụ Jehoshafat, Jehoshafat amụọ Joram, Joram amụọ Ụzaịa.
9 オジアヨアタムを生み、ヨアタムアカズを生み、アカズエゼキアを生み、
Ụzaịa mụrụ Jotam, Jọtam amụọ Ehaz, Ehaz amụọ Hezekaya.
10 エゼキアマナッセを生み、マナッセアモンを生み、アモンヨジアを生み、
Hezekaya mụrụ Manase, Manase amụọ Emọn, Emọn amụọ Josaya.
11 バビロンに移さるる頃ヨジアイエコニアと其兄弟等とを生み、
Mgbe e mere ka ha gaa biri nʼala Babilọn ka Josaya mụrụ Jekonaya na ụmụnne ya.
12 バビロンに移されたる後イエコニアサラチエルを生み、サラチエルゾロバベルを生み、
Mgbe ha si Babilọn lọta Jekonaya mụrụ Shealtiel, Shealtiel amụọ Zerubabel.
13 ゾロバベルアビユドを生み、アビユドエリアキムを生み、エリアキムアゾルを生み、
Zerubabel mụrụ Abiud, Abiud amụọ Eliakịm, Eliakịm amụọ Azoa.
14 アゾルサドクを生み、サドクアキムを生み、アキムエリユドを生み、
Azoa mụrụ Zadọk, Zadọk amụọ Akịm, Akịm amụọ Eliud.
15 エリユドエレアザルを生み、エレアザルマタンを生み、マタンヤコブを生み、
Eliud mụrụ Elieza, Elieza amụọ Matan, Matan amụọ Jekọb.
16 ヤコブマリアの夫ヨゼフを生み、此マリアよりキリストと稱するイエズス生れ給へり。
Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst.
17 然れば歴代は、総てアブラハムよりダヴィドまで十四代、ダヴィドよりバビロンに移さるるまで十四代、バビロンに移されてよりキリストまで十四代[とす]。
Ya mere, site nʼEbraham ruo na Devid, e nwere ọgbọ iri na anọ. Ma site nʼoge Devid ruo mgbe a dọọrọ ha nʼagha gaa Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nʼoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Kraịst bụkwa ọgbọ iri na anọ.
18 第二項 ヨゼフとマリアとの婚姻及キリストの誕生 然てキリストの生れ給ひし次第は次の如し。其母マリアヨゼフに聘定せられしに、同居せざる前聖霊によりて懐胎せる事顕れしが、
Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ.
19 夫ヨゼフ義人にして彼を訟ふる事を好まざれば、密に之を離別せんと思へり。
Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo.
20 是等の事を思ひ回らす折しも、主の使彼が夢に現れて云ひけるは、ダヴィドの裔ヨゼフよ、汝の妻マリアを納るる事を懼るる勿れ、蓋彼に胎れるものは聖霊によれり。
Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ.
21 彼一子を生まん、汝其名をイエズスと名くべし、其は自己が民を其罪より救ふべければなり、と。
Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha.”
22 総て此事の成りしは、主が曾て預言者を以て曰ひし事の成就せん為なり、
Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị,
23 曰く「看よ童貞女懐胎して一子を生まん、其名はエンマヌエルと稱へられん」と。エンマヌエルとは我等と偕に在す神の義なり。
“Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel” (nke bụ ma asụgharịa ya, “Chineke nọnyeere anyị”).
24 ヨゼフ睡より起きて、主の使より命ぜられし如くにして其妻を納れしが、
Mgbe Josef si nʼụra teta, o mere dịka mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye ya.
25 牀を偕にせずして家子を生むに至れり、而して其子の名をイエズスと名けたり。
Ma ha abụọ edinakọghị tutu ruo mgbe ọ mụsịrị nwa nwoke, onye ọ kpọrọ aha ya Jisọs.

+ マタイの福音書 1 >