< ヨハネの福音書 10 >

1 第三款 善き牧者 誠に實に汝等に告ぐ、羊の檻に入るに、門よりせずして他の處より越ゆるは、盗人なり強盗なり、
“Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-adịghị esite nʼọnụ ụzọ aba nʼọgba atụrụ kama ọ na-arị elu ka o site nʼelu ụlọ ahụ wufee, bụ onye ohi bụrụkwa onye na-apụnara mmadụ ihe.
2 門より入るは羊の牧者なり。
Onye na-esite nʼọnụ ụzọ abanye bụ onye ọzụzụ atụrụ.
3 門番は彼に戸を開き、羊は其聲を聴き、彼亦己が羊を一々に名指して引出す、
Onye nche ọnụ ụzọ na-emeghere ya ụzọ, atụrụ ya na-anụkwa olu ya. Ọ na-akpọ atụrụ nke ya aha, ma duru ha pụọ.
4 斯て其羊を出せば、彼先ちて往き羊之に從ふ、其聲を知ればなり、
Mgbe ọ kpọpụtasịrị ndị niile bụ nke ya, ọ na-aga nʼihu ha. Atụrụ ya na-esokwa ya nʼazụ nʼihi na ha maara olu ya.
5 然れども他人には從はず、却て之を避く、他人の聲を知らざればなり、と。
Ha agaghị eso onye ọbịa, kama ha gbaara ya ọsọ. Nʼihi na ha amaghị olu onye ọbịa.”
6 イエズス此喩を彼等に曰ひしかど、彼等は其語り給ふ所の何たるを暁らざりき。
Jisọs ji ihe yiri ihe gwa ha okwu. Ma ha aghọtaghị ihe ọ nọ na-agwa ha.
7 然ればイエズス再び彼等に曰ひけるは、誠に實に汝等に告ぐ、我は羊の門なり、
Ọzọ, Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, ana m agwa unu, mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ ọgba atụrụ ahụ.
8 已に來りし人は皆盗人、強盗にして、羊之に聴從はざりき。
Ndị niile bịara tupu mụ onwe m abịa bụ ndị ohi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ụmụ atụrụ aṅakwaghị ha ntị.
9 我は門なり、人若我に由りて入らば救はれ、出入して牧場を得べし。
Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri.
10 盗人の來るは盗み、殺し、亡さんとするに外ならざれども、
Onye ohi na-abịa naanị ka o zuo ohi, gbuo ma bibiekwa; abịara m ka ha nwe ndụ ma nwebigakwa ya oke.
11 我が來れるは羊が生命を得、而も尚豊に得ん為なり。我は善き牧者なり、善き牧者は其羊の為に生命を棄つ、
“Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Ezi onye ọzụzụ atụrụ na-atọgbọ ndụ ya nʼihi atụrụ ya.
12 然れども牧者に非ずして羊吾物に非ざる被雇人は、狼の來るを見れば羊を棄てて逃げ、狼は羊を奪ひ且追散す。
Onye e goro ọrụ, nke na-abụghị onye nche atụrụ, onye atụrụ na-abụghị nke ya, ọ na-ahapụ ha gbaa ọsọ mgbe ọ hụrụ agụ ka ọ na-abịa; mgbe ahụ agụ na-achụso atụrụ ahụ chụsasịa ha.
13 被雇人の逃ぐるは、被雇人にして羊を勞らざる故なり。
Onye e goro ọrụ na-agbapụ, nʼihi na ọ bụ onye e goro ọrụ, ọ naghị echegbu onwe ya banyere atụrụ ndị ahụ.
14 我は善き牧者にして我羊を知り、我羊亦我を知る、
“Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma; amaara m atụrụ m, atụrụ nke m makwaara m.
15 恰も父我を知り給ひ、我亦父を知り奉るが如し、斯て我は我羊の為に生命を棄つ。
Dị ka Nna ahụ maara m, mụ onwe m makwa Nna ahụ. Ana m atọgbọ ndụ m nʼihi atụrụ ahụ.
16 我は又此檻に属せざる他の羊を有てり、彼等をも引來らざるべからず、然て彼等我聲を聞き、斯て一の檻、一の牧者となるべし。
Enwere m ụmụ atụrụ ọzọ ndị na-anọghị nʼọgba atụrụ a. Aghaghị m ịkpọbatakwa ha. Ha onwe ha ga-anụ olu m, a ga-enwekwa otu igwe atụrụ na otu onye ọzụzụ atụrụ.
17 父の我を愛し給へるは、之を再び取らんが為に我生命を棄つるに因る、
Maka nke a ka Nna jiri hụ m nʼanya, nʼihi na ana m atọgbọ ndụ m, ka m wereghachikwa ya ọzọ.
18 誰も之を我より奪ふ者はあらず、我こそ自ら之を棄つるなれ。我は之を棄つるの権を有し、又再び之を取るの権を有す、是我父より受けたる命なり、と。
O nweghị onye ọbụla pụrụ ịnara m ya, kama ana m atọgbọ ya nʼike nke onwe m. Enwere m ikike ịtọgbọ ya, nweekwa ikike iwereghachi ya ọzọ. Anatara m iwu a site nʼaka Nna m.”
19 是等の談の為に、ユデア人の中に復諍論起れり、
Ọzọkwa, nkewa batara nʼetiti ndị Juu nʼihi okwu ndị a.
20 其中には、彼は惡魔に憑かれて狂へるなり、汝等何ぞ之に聴くや、と云ふ人多かりしが、
Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu, “Ọ bụ onye mmụọ ọjọọ na-achị ya, onye isi mebiri. Ọ bara uru ige ya ntị?”
21 他の人は、是惡魔に憑かれたる者の言に非ず、惡魔豈瞽者の目を明くことを得んや、と云ひ居たり。
Ma ndị ọzọ na-ekwu, “Okwu ndị a adịghị ka nke onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya. Mmụọ ọjọọ o nwere ike ime ka anya onye kpuru ìsì meghee?”
22 第四款 イエズス奉殿記念祭に上り給ふ 然てエルザレムに奉殿記念祭行はれて、時は冬なりしが、
Nʼoge ahụ, mmemme icheta mgbe e doro ụlọnsọ ukwu ahụ nsọ ruru na Jerusalem. Ọ bụ oge oke oyi,
23 イエズス[神]殿に在りてサロモンの廊を歩み居給ふに、
ma Jisọs nọ na-ejegharị nʼụlọnsọ ukwu, nʼịba Solomọn.
24 ユデア人之を取圍みて、汝何時まで我等の心を疑惑せしむるぞ、汝若キリストならば、明白に我等に告げよ、と云ひければ、
Ndị Juu gbara ya gburugburu sị ya, “Ruo ole mgbe ka ị ga-edebe anyị nʼọnọdụ olileanya? Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst ahụ, gwaghee anyị ọnụ.”
25 イエズス彼等に答へ給ひけるは、我汝等に語れども汝等信ぜざるなり、我が父の御名を以て行へる業、是ぞ我を證明するものなるに、
Jisọs zara ha, “Agwara m unu, ma unu ekweghị. Ọrụ m na-arụ nʼaha Nna m na-agba ama banyere m.
26 汝等尚之を信ぜず、是我羊の數に入らざればなり。
Ma unu ekwenyeghị, nʼihi na unu esoghị nʼigwe atụrụ m.
27 我羊は我聲を聴き、我彼等を知り、彼等我に從ふ、
Atụrụ m na-anụ olu m. Amaara m ha, ha na-esokwa m.
28 斯て我永遠の生命を彼等に與ふ、彼等長久に亡びず、誰も彼等を我手より奪はじ、 (aiōn g165, aiōnios g166)
Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nʼiyi. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nʼaka m. (aiōn g165, aiōnios g166)
29 之を我に賜ひたる我父は、一切に優れて偉大に在し、誰も我父の御手より之を奪ひ得る者なし、
Nna m onye nyere m ha dị ukwuu karịa ihe niile. O nweghị onye nwere ike ịnapụ ha site nʼaka Nna m.
30 我と父とは一なり、と。
Mụ na nna m bụ otu.”
31 是に於てユデア人石を取りてイエズスに擲たんとせしかば、
Ndị Juu tụtụlitekwara nkume ọzọ ịtụ ya.
32 イエズス彼等に曰ひけるは、我わが父に由れる善業を多く汝等に示ししが、汝等其孰の為に我に石を擲たんとはするぞ。
Ma Jisọs zara ha, “E zila m unu ọtụtụ ọrụ ọma nke sitere nʼaka Nna m, olee nke unu na-achọ ịtụ m nkume nʼihi ya?”
33 ユデア人答へけるは、我等が汝に石を擲つは善業の為に非ず、冒涜の為、且汝が人にてありながら己を神とする故なり。
Ndị Juu zara ya, “Anyị achọghị ịtụ gị nkume nʼihi ọrụ ọma ndị a, kama nʼihi nkwulu na nʼihi na gị bụ mmadụ efu, ma ị na-eme onwe gị Chineke.”
34 イエズス彼等に答へ給ひけるは、汝等の律法に録して「我言へらく、汝等は神なり」とあるに非ずや、
Jisọs zara ha, “Edeghị ya nʼiwu unu, sị, ‘Mụ onwe m sịrị na unu bụ chi’?
35 斯く神の言を告げられたる人々を神と呼びたるに、而も聖書は廃すべからず、我は神の子なりと言ひたればとて、
Ọ bụrụ na a kpọrọ ndị ahụ nabatara okwu Chineke ‘chi,’ apụghịkwa imebi ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ.
36 汝等は、父の聖成して世に遣はし給ひし者に向ひて、汝は冒涜すと謂ふか、
Unu na-ekwu na onye ahụ Chineke doro nsọ ma zitekwa ya nʼime ụwa na-ekwulu Chineke nʼihi na m sịrị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke?’
37 我もし我父の業を為さずば我を信ずること勿れ、
Unu ekwenyela na m, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ọrụ Nna m ka m na-arụ.
38 然れど我もし之を為さば、敢て我を信ぜずとも業を信ぜよ、然らば父の我に在し我の父に居る事を暁りて信ずるに至らん、と。
Ma ọ bụrụ na m na-arụ ya, a sịkwarị na unu ekweghị na m, kwerenụ nʼọrụ ndị a, ka unu nwee ike mata ma ghọtakwa na Nna ahụ nọ nʼime m, mụ onwe m nọkwa nʼime Nna ahụ.”
39 是に於て彼等イエズスを捕へんと謀れるを、彼等の手を遁れて、
Ọzọkwa, ha gbalịrị ijide ya ma ọ siri nʼaka ha pụọ.
40 ヨルダン[河]の彼方、ヨハネが初に洗しつつありし處に至り、其處に留り給ひしに、
Mgbe ahụ ọ laghachiri azụ nʼofe osimiri Jọdan, bụ ebe Jọn nọrọ na mbụ mee baptizim, ebe ahụ ka ọ nọdụrụ.
41 多くの人御許に來りて、ヨハネは何の奇蹟をも行はざりしかど、
Ọtụtụ ndị mmadụ bịakwutere ya. Ha na-asị, “Jọn arụghị ọrụ ihe ịrịbama ọbụla, ma ihe niile Jọn kwuru banyere nwoke a bụ eziokwu.”
42 此人に就きて告げし事は悉く眞なりき、と云ひつつイエズスを信仰せる者多かりき。
Ọtụtụ mmadụ kwenyekwara na ya nʼebe ahụ.

< ヨハネの福音書 10 >