< エペソ人への手紙 5 >

1 然れば汝等至愛なる小兒の如く神に倣う者となり、
Ya mere bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ nʼanya.
2 又愛の中に歩みて、キリストも我等を愛し、我等の為に己を馨しき香の献物とし、犠牲として神に捧げ給ひしが如くにせよ。
Na-agakwanụ nʼime ịhụnanya, dịka Kraịst siri hụ anyị nʼanya ma were ndụ ya nye Chineke maka anyị dịka aja na onyinye nke isi ụtọ.
3 私通及び凡ての淫亂貪欲は、其名すらも汝等の中に稱へらるべからざること、聖徒たる者に相應しかるべし。
Ma nʼetiti unu, ka a ghara ịkpọta mmehie ịkwa iko, maọbụ nke adịghị ọcha, maọbụ nke inwe anya ukwu aha, nʼihi na ihe ndị a ekwesighị nʼetiti ndị nsọ.
4 或は汚行、愚なる談話、惡き戯言、是皆相應しからず、寧感謝すべきなり。
Ọ dịkwaghị mma ka unu na-ekwu okwu rụrụ arụ maọbụ okwu nzuzu maọbụ njakịrị, kama ka e nwee inye ekele.
5 汝等覚りて知らざるべからず、凡ての私通者、淫亂者、貪欲者は、偶像を崇拝するに等しき者にして、キリスト及び神の國に於て世嗣たらざるなり。
Matanụ nke ọma na onye na-akwa iko, maọbụ onye rụrụ arụ, maọbụ onye anya ukwu, nʼihi na anya ukwu dị ka ikpere arụsị, enweghị ike ịbata nʼalaeze Kraịst na Chineke.
6 誰も空言を以て汝等を欺くべからず、其は是等の事の為に、神御怒は不信の子等の上に降ればなり。
Unu ekwela ka onye ọbụla jiri okwu efu duhie unu. Ọ bụ nʼihi omume ọjọọ ndị a ka iwe Chineke ji abịakwasị ndị na-anaghị erubere ya isi.
7 故に汝等彼等に與する事勿れ。
Unu na ndị dị otu a enwela mmekọ.
8 蓋汝等曾ては暗黒なりしかど、今は主に在りて光なり、光の子の如くに歩め。
Nʼihi nʼoge gara aga, unu bụ ọchịchịrị, ma ugbu a, unu bụ ìhè nʼime Onyenwe anyị. Na-ebinụ ndụ ka ụmụ nke ìhè
9 光の結ぶ果は、凡ての慈愛と正義と眞實とに在り。
(nʼihi na a na-ahụ mkpụrụ nke ìhè nʼihe niile dị mma, na ihe ziri ezi, na eziokwu).
10 如何なる事の神の御意に適ふかを試し看よ。
Gbalịanụ ịchọpụta ihe na-amasị Onyenwe anyị.
11 且果を結ばざる暗黒の業に與する事なく、寧却て之を咎めよ。
Unu etinyela aka nʼọrụ ọchịchịrị nke na-adịghị amị mkpụrụ ọbụla, kama gbaanụ ha nʼanwụ.
12 蓋彼等の窃に行ふ所は、之を口にするすら耻なり。
Ọ bụ ihe ihere ikwu okwu banyere ihe ndị a na-eme na nzuzo.
13 凡ての咎むべき事は光によりて顕る、凡て顕るるは光なればなり。
Mgbe a gbara ihe ọbụla nʼanwụ, ọ na-apụta ìhè nke ọma. Nʼihi na ihe ọbụla e mere ka ọ pụta ìhè nke ọma bụ ìhè.
14 是故に言へる事あり、「眠れる人よ起て、死者の中より立上れ、キリスト汝を照らし給はん」と。
Nke a mere na e kwuru, “Bilie gị onye na-arahụ ụra. Site nʼọnwụ bilie. Kraịst ga-emekwa ka ihe ya mụkwasị gị.”
15 然れば兄弟等よ、如何に慎みて歩むべきかに心せよ。愚者の如くにせず、
Kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe.
16 智者の如くに歩みて、日惡しければ良き機會を求めよ、
Jirinụ ohere niile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nʼihi na ụbọchị ndị a dị njọ.
17 是故に神の御旨の如何を覚りて、思慮なき者と成る事勿れ。
Unu emela dị ka ndị na-enweghị uche, kama gbalịanụ ịchọpụta ihe Onyenwe anyị chọrọ ka unu mee,
18 又酒に酔ふ事勿れ、其中に淫亂あるなり。寧ろ(聖)霊に満たされて、
Unu aṅụbigala mmanya oke nʼihi na ọ na-eduba na ndụ ịla nʼiyi. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ,
19 霊的の詩と讃美歌と歌とを以て語合ひ、又心の中に謳ひて主を讃美し奉り、
werenụ abụ ọma, na abụ nke ime mmụọ na-ekwe ukwe nʼetiti onwe unu. Werekwanụ obi unu niile na-abụrụ Onyenwe anyị abụ dị ụtọ.
20 常に我主イエズス、キリストの御名を以て、萬事に就きて父にて在す神に感謝し、
Na-enyenụ Chineke bụ Nna ekele mgbe niile na nʼihe niile, nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
21 キリストを畏れ奉りつつ互に歸服せよ。
Na-edonụ onwe unu nʼokpuru ibe unu site nʼegwu Kraịst.
22 第三項 家庭に於る信者の義務 妻たる者は己が夫に從ふ事、主に於るが如くにすべし、
Unu ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nʼokpuru Onyenwe anyị.
23 其は夫が妻の頭たる事、キリストが教會の頭にして、自ら其體の救主に在せるが如くなればなり、
Nʼihi na di bụ isi nwunye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na Onye nzọpụta ya nke bụ anụ ahụ ya.
24 然れば教會のキリストに從ふが如く、妻も亦萬事夫に從ふべし。
Ya mere, dị ka nzukọ si edo onwe ya nʼokpuru Kraịst, otu a ka ndị bụ nwunye kwesiri ido onwe ha nʼokpuru di ha nʼihe niile.
25 夫たる者よ、汝等の妻を愛する事、キリストも教會を愛して、之が為に己を付し給ひしが如くにせよ、
Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya.
26 己を付し給ひしは、(生命の)言により、水洗にて之を潔めて聖とならしめん為、
O mere nke a ka o nwee ike doo ya nsọ, jirikwa okwu ya na ịsa mmiri nke baptizim mee ka ọ dị ọcha.
27 光榮ある教會、即ち染なく、皺なく、然る類の事もなき教會を、自ら己が為に備へて、之をして聖なるもの、汚なきものたらしめん為なり。
Ka o chee nzukọ nʼihu ya onwe ya dị ka ihe jupụtara nʼebube, nke na-enweghị ntụpọ, maọbụ ihu mgbarụ ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla dị otu a. Kama nke dị nsọ na-enweghị ịta ụta.
28 斯の如く、夫たるものも亦己が妻を我身として愛すべきなり、妻を愛する人は是己を愛する者なり。
Nʼotu ụzọ ahụ kwa, ndị bụ di kwesiri ịhụ nwunye ha nʼanya dị ka ha si hụ anụ ahụ ha nʼanya. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ nwunye ya nʼanya na-ahụ onwe ya nʼanya.
29 蓋曾て如何なる人も、己が肉身を嫌ひし事なく、却て之を養ひ守る事、猶キリストが教會に為し給ひしが如し、
Ọ dịghị onye ọbụla nke kpọrọ anụ ahụ ya asị. Kama, ọ na-azụ ya na-edozikwa ya, dị ka Kraịst na-emere chọọchị.
30 其は我等は其御體の肢にして、其肉より其骨より成りたればなり。
Nʼihi na anyị niile bụ akụkụ anụ ahụ ya.
31 故に人は父母を措きて己が妻に添ひ、而して二人一體と成るべし、
“Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.”
32 是大いなる奥義なり、我はキリスト及び教會に就きて之を言ふ。
Nke a bụ ihe omimi dị ukwuu ma eji m ya atụnyere Kraịst na chọọchị ya.
33 然れば汝等も各己が妻を己として愛し、又妻は夫を畏敬すべし。
Ma otu ọ dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka ọ hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.

< エペソ人への手紙 5 >