< エペソ人への手紙 1 >

1 神の思召によりてイエズス、キリストの使徒たるパウロ、エフェゾに在る(凡ての)聖徒、並にキリスト、イエズスに於る信徒に[書簡を贈る]。
Akwụkwọ ozi a sitere nʼaka mụ onwe m bụ Pọl, onye Chineke họpụtara ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst. Ọ bụ unu ndị nsọ bi nʼEfesọs, unu bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼime Kraịst Jisọs, ka m na-edere ya:
2 願はくは我父にて在す神及び主イエズス、キリストより、恩寵と平安とを汝等に賜はらん事を。
Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
3 第一項 エフェゾ信徒の為に感謝し祈祷す 第一編 聖會の比なき光榮 祝すべき哉、我主イエズス、キリストの神及び父、是はキリストに於て諸の霊的祝福を以て我等を天より祝し給ひ、
Ka otuto dịrị Chineke, na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ onye gọziri anyị site nʼinye anyị ngọzị niile nke ime mmụọ nke si nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst.
4 御前に於て聖にして汚なき者たらしめんとて、寵愛を以て、世界開闢以前よりキリストによりて選み給ひ、
Dịka o si họpụta anyị nʼime Kraịst tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị bụrụ ndị dị nsọ na ndị na-enweghị ịta ụta nʼihu ya nʼịhụnanya.
5 思召のまにまに、イエズス、キリストを以て己が子とならしめん事を預定し給ひたればなり。
O kpebiri ime anyị ụmụ ya site nʼihi Kraịst Jisọs. Ma o mekwara ihe ndị a niile nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ nʼobi, bụrụkwa ihe o zubere ime.
6 是最愛なる御子に於て我等に賜ひし榮光ある恩寵の誉の為なり。
Ka e si otu a too ịdị ebube nke amara ya, nke o ji obi ya niile nye anyị nʼime Onye ahụ ọ hụrụ nʼanya.
7 我等が贖を得、罪の赦を得るは、キリストに在りて其御血によれり、即ち神の豊なる恩寵に由れるなり。
Nʼime ya, anyị nwere mgbapụta site nʼọbara ya, bụ mgbaghara nke njehie niile anyị; dị ka ịba ụba nke amara ya si dị,
8 其恩寵我等に溢れて、諸の智恵及び悟を開けり、
nke o mere ka ọ babigara anyị ụba oke site nʼamamihe na nghọta niile.
9 是御旨に從ひて、キリストを以て預定し給ひし思召の奥義を、我等に諭し給はん為なり。
O meela ka anyị mata ihe omimi nzube ya, dị ka o si tọọ ya ụtọ, bụ ihe omimi o zubere ime nʼime Kraịst.
10 此思召は、時期の満つるに及びて一切のもの、即ち天に在るものをも地に在るものをも悉くキリストに於て一の首の下に輯め給ふに在り。
Nke ọ ga-eme ka o mezuo mgbe oge ya niile zuru, nke bụ ịchịkọta ihe niile nʼime ya, bụ ihe ndị dị nʼeluigwe na nʼụwa nʼokpuru Kraịst.
11 我等もキリストに於て選まれ、思召す儘に萬事を行ひ給ふものの量に從ひて預定せられたり、
Nʼime Kraịst ka e mere anyị ndị nketa, ndị e bururị ụzọ họpụta na mbụ, dị ka atụmatụ onye ahụ na-arụpụta ihe niile nʼizuoke nke nzube na ebumnuche ya.
12 是先んじてキリストを希望せし我等が、其光榮の誉とならん為なり。
Nke mere na anyị, ndị buuru ụzọ nwee olileanya na Kraịst, ga-ebi ndụ nʼotuto nke ebube ya.
13 汝等も亦キリストに於て、眞理の言なる汝等の救霊の福音を聞き、且之を信じて約束せられ給ひたりし聖霊を以て證印せられしが、
Unu bụkwa ndị a gụnyere nʼime Kraịst mgbe unu nụrụ ozi nke eziokwu ahụ bụ oziọma nke nzọpụta. Mgbe unu kwenyere, a kara unu akara nʼime ya bụ akara nke nkwa ahụ bụ Mmụọ Nsọ.
14 之汝等の世嗣の保證として、獲られたる人々の贖となり、其光榮の誉と成らん為に賜はりたるなり。
Nke a bụ ihe nketa anyị tutu ruo mgbe a rụzuru ọrụ mgbapụta nke ndị ahụ niile bụ ihe nweta Chineke. Ka e si otu a too ebube ya.
15 故に我も、主イエズスに於る汝等の信仰と、凡ての聖徒に對する愛情とを聞きて、
Nʼihi nke a, ebe m nụrụ akụkọ banyere okwukwe unu nʼime Onyenwe anyị Jisọs, nụkwa maka ịhụnanya unu nwere nʼebe ndị nsọ niile nọ,
16 不絶汝等の為に感謝し、我祈祷の中に汝等を記念す。
esepụghị m aka ikele ekele nʼihi unu, mgbe niile m na-echeta unu nʼekpere m niile.
17 祈る所は我主イエズス、キリストの神、光榮の父が、汝等に知識と黙示との霊を賜ひて神を識らしめ、
Ana m arịọ Chineke nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst bụ Nna Onyenwe ebube niile, ka o nye unu Mmụọ amamihe na ezi nghọta ka unu nwee ike matazie nke ọma onye ọ bụ,
18 汝等の心の眼を明にして、其召によれる希望の如何を識らしめ、聖徒等に賜ふべき世嗣の光榮富の如何を識らしめ
ka o meghee anya nke ime mmụọ unu ka unu matakwa ụdị olileanya unu nwere nʼihi ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, na akụ, na ihe nketa dị ebube o nwere nʼime ndị nsọ.
19 其全能の勢力の作為によりて、信奉る我等に於て、其勢力の如何に優れて偉大なるかを識らしめ給はん事是なり。
Na ịdị ukwuu nke ike ya nke na-enweghị atụ dịrị anyị, bụ ndị kwere ekwe, dịka ịrụsị ọrụ ike nke ike ya si dị.
20 其勢力をキリストに於て顕し、之を死者の中より復活せしめ、天に於て之を己の右に置き、
Nke ọ rụrụ nʼime Kraịst mgbe o si nʼọnwụ kpọlite ya mee ya ka ọ nọdụ nʼaka nri ya nʼebe niile nke eluigwe.
21 一切の権勢と能力と、勢力と主権との上、又凡て今世のみならず來世にも名けられて名[あるもの]の上に置き給ひ、 (aiōn g165)
Ọnọdụ ya dị elu karịa ọchịchị niile, na ikike ọchịchị niile, na ike niile na ịchị isi niile, na aha ọkwa ọchịchị nke e nwere ike inye mmadụ, ọ bụghị naanị nʼọgbọ a, kama ma nʼọgbọ ọzọ na-abịa. (aiōn g165)
22 萬物を其御足の下に服せしめ、教會の萬事の上に頭となし給へり。
O mere ka ihe niile dị nʼokpuru ya, meekwa ya ka ọ bụrụ onyeisi ihe niile nye nzukọ ya bụ chọọchị.
23 即ち教會はキリストの御體にして、萬物に萬事を満たし給へるものの充満ち給ふ所なり。
Nke bụ ahụ ya, ozuzu oke nke onye ahụ na-emejupụta ihe niile nʼụzọ niile.

< エペソ人への手紙 1 >