< 使徒の働き 1 >

1 第一款 キリスト傳と聖會史との間の事柄 テオフィロよ、我前に第一の書を作りて、総てイエズスの初より行ひ且教へ給ひしことを述べ、
Ezigbo enyi m Tiofilọs, nʼakwụkwọ m nke mbụ m dere gị banyere ihe niile Jisọs malitere ime nakwa ikuzi,
2 其選み給ひし使徒等に聖霊に由りて命じ置き、然て天に上げられ給ひし日までに及びたりしが、
ruo nʼụbọchị e mere ka ọ laghachi nʼeluigwe mgbe o sitere nʼike Mmụọ nsọ nyesịa ndị na-eso ụzọ ya iwu, bụ ndị ọ họpụtara.
3 イエズス御受難の後、多くの徴を以て、彼等に己の活きたる事を證明し、四十日の間彼等に現れ、神の國に関して談り給へり。
Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ nke ọnwụ, o gosiri ha onwe ya nʼụzọ dị iche iche nʼebe o doro anya na ya dị ndụ. O mere ka ha hụ ya anya nʼime iri ụbọchị anọ, na-akụziri ha banyere alaeze Chineke.
4 第一 キリストの御昇天 又共に食しつつ彼等に、エルザレムを離れずして父の約束を待つべしと命じ、然て曰ひけるは、「汝等我口づから其約束を聞けり、
Nʼotu oge, ọ nọnyeere ha na nri, o nyere ha iwu a, “Unu esila na Jerusalem pụọ, kama cherenụ nkwa nke Nna m, nke unu nụrụ site nʼọnụ m.
5 蓋ヨハネは水にて洗したれども、汝等は日久しからずして聖霊にて洗せらるべきなり、と。
Nʼihi na Jọn jiri mmiri mee unu baptizim, ma nʼoge na-adịghị anya, a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”
6 然れば集りたる人々問ひて、主よ、イスラエルの國を回復し給ふは此頃なるか、と云ひければ、
Mgbe ha gbakọrọ, ha jụrụ ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ ugbu a ka i ga-enyeghachi Izrel alaeze ahụ?”
7 イエズス曰ひけるは、父が其権能によりて定め給ひし時刻は、汝等の知るべきに非ず、
Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụghị ọrụ unu ịmata oge na mgbe Nna m na-akwado ihe o zubere ime nʼikike nke onwe ya.
8 但汝等に臨み給ふ聖霊の能力を受けて、汝等はエルザレム、ユデア全國、サマリア、地の極に至る迄も我が證人とならん、と。
Ma mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị unu, unu ga-anata ike. Mgbe ahụ, unu ga-agbara m ama na Jerusalem, na Judịa niile ya na Sameria ruokwa ebe niile ụwa sọtụrụ.”
9 斯く曰ひ終てて彼等の見る中に上げられ給ひしが、一叢の雲之を受けて見えざらしめたり。
Mgbe o kwusiri nke a, e weliri ya elu mgbe ha na-ele anya, igwe ojii kpuchikwara ya, zopu ya nʼanya ha.
10 彼等が猶天に昇往き給ふを眺め居たる程に、白衣の人二人忽ち彼等の傍に立ちて言ひけるは、
Mgbe ha na-elegidesi anya ike nʼeluigwe dịka ọ na-ala, na mberede, ụmụ nwoke abụọ yi uwe ọcha guzooro ha nso.
11 ガリレア人よ、何ぞ天を仰ぎつつ立てるや、汝等を離れて天に上げられ給ひし此イエズスは、汝等が其天に往き給ふを見たる如く、復斯の如くにして來り給ふべし、と。
Ha sịrị, “Ndị ikom Galili, gịnị mere unu jiri guzoro ebe a na-ele anya nʼeluigwe? Jisọs a onye e sitere nʼetiti unu kpọrọ laa nʼeluigwe ga-alọghachikwa otu ahụ unu si hụ ya o siri laa nʼeluigwe.”
12 第二 使徒等ユダの後任者を選む 然て使徒等、橄欖山と云へる山よりエルザレムに還りしが、此山はエルザレムに近く、安息日にも行かるべき道程なり。
Ha sitere nʼUgwu a na-akpọ Oliv nke dị Jerusalem nso, njem nke otu ụbọchị izuike, laghachi na Jerusalem.
13 然て入りてペトロとヨハネ、ヤコボとアンデレア、フィリッポとトマ、バルトロメオとマテオ、アルフェオの子ヤコボとゼロテなるシモンと、ヤコボの兄弟ユダとの宿れる高間に登りしが、
Mgbe ha batara nʼobodo, ha rigoro nʼime ụlọ ahụ dị nʼụlọ elu, ebe ha na-anọ. Ndị a bụ ndị nọ nʼụlọ ahụ: Pita, Jọn, Jemis na Andru, Filip na Tọmọs, Batalomi na Matiu, Jemis nwa Alfiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt na Judas nwa Jemis.
14 彼等皆婦人等及びイエズスの母マリア、及びイエズスの兄弟等と共に、心を同じうして耐忍びつつ祈祷に從事し居たり。
Ndị a niile ji otu obi nọgidesie ike nʼekpere. Ndị sonyere ha bụ ụfọdụ ndị inyom na Meri nne Jisọs, na ụmụnna ya.
15 其頃、共に集れる人約百廿名なりしが、ペトロ兄弟の中に立ちて云ひけるは、
Nʼoge ahụ, Pita bilitere nʼetiti ndị kwere ekwe ọnụọgụgụ ha dị ihe dị ka narị na iri abụọ, sị,
16 兄弟の人々よ、イエズスを捕へし者等の案内者となりしユダに就きて、聖霊がダヴィドの口を以て預言し給ひたる聖書は、成就せざるべからず。
“Ụmụnna m, ọ dị mkpa ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ mezuo banyere Judas onye duuru ndị jidere Jisọs bịa. Mmụọ Nsọ kwuru na nke a ga-eme mgbe o sitere nʼọnụ Devid kwuo okwu nʼoge gara aga.
17 彼は我等の員に入りて此聖役に與りたれども、
Ọ bụ otu nʼime anyị. O nwere oke nʼime ọrụ a.”
18 不義の價を以て畑を求め、(吊されて)俯伏に倒れ、其身眞中より裂けて腸悉く迸り出でたり。
Ego ọ natara nʼihi ọrụ ọjọọ ya ka o jiri zụọ ala. Nʼala ahụ ka ọ dara sụọ isi nʼala, afọ ya etipuo, eriri afọ ya awụsịakwa.
19 此事エルザレムの住民に知れ渡りて、此畑は彼等の方言にてハケルダマ、即ち血の畑と呼ばれたり。
Ndị niile bi na Jerusalem nụrụ akụkọ banyere ya. Nʼihi ya, ha kpọrọ ala ahụ nʼasụsụ ha Akeldama, nke pụtara Ala Ọbara.
20 蓋詩の書に録して、「彼の檻は荒れて、之に住む人なかるべし」、又「他人其務を受くべし」、とあれば、
Pita sịrị, “Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ Abụ Ọma: “‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya,’ na, “‘Ka onye ọzọ nọchiekwa ọnọdụ ya ka onyeisi.’
21 我等と共に集れる此人々の中より、総て主イエズス、キリストが我等の中に出入し給ひし間、
Ya mere, otu onye nʼime ndị anyị na ha nọ nʼoge niile Onyenwe anyị Jisọs nọ nʼetiti anyị,
22 即ちヨハネの洗禮より始め、我等を離れて上げられ給ひし日に至るまで、一所に在りし者の一人、我等と共に其復活の證人とならざるべからず、と。
bido nʼoge Jọn na-eme baptizim ruo nʼụbọchị Jisọs si nʼetiti anyị rigoro nʼeluigwe. Otu onye nʼime ndị a ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite nʼọnwụ ya.”
23 是に於て彼等、バルサバと呼ばれ、義人と綽名されたるヨゼフと、マチアとの二人を挙げ、
Ya mere, ha họpụtara mmadụ abụọ, Josef onye a na-akpọ Basabas (aha ya ọzọ bụkwa Jọstus) na Mataias.
24 祈りて云ひけるは、総ての人の心を知り給へる主よ、ユダの己が處に往かんとて退きし此務と使徒職とを引受くべく、
Ha kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, ị maara obi mmadụ niile. Gosi anyị onye ị họpụtara nʼime mmadụ abụọ ndị a.
25 此二人の何れを選み給へるかを知らしめ給へ、と。
Ka ọ bụrụ onyeozi na onyendu nke ga-anọchi anya Judas onye nke hapụrụ ma gawa ebe o kwesiri ka ọ gaa.”
26 斯て彼等に鬮を與へしに、鬮はマチアに當りしかば、彼十一人の使徒に加へられたり。
Ha fere ha nza. Nza ahụ makwara Mataias, ha gụnyere ya dị ka otu nʼime ndị ozi iri na otu ahụ.

< 使徒の働き 1 >