< コリント人への手紙第二 3 >

1 第二項 新約に於る使徒職 我等は又己を立てんとするか、将或人々の如く、汝等に對して、若くは汝等より、添書を要する者なるか、
Anyị na-ebido ito onwe anyị ọzọ? Ọ dị a mkpa anyị inye unu, maọbụ ịnata nʼaka unu akwụkwọ nkọwa iji too onwe anyị dịka ụfọdụ mmadụ ndị ọzọ si eme?
2 汝等こそ我等が心に録されたる我等の書簡にして、萬民に知られ且読まるるなれ。
Unu onwe unu bụ akwụkwọ ozi anyị nke e dere nʼobi anyị nke mmadụ niile maara ma gụọkwa.
3 汝等は明に、我等に由りて認められたるキリストの書簡にして、而も墨を以てせず活給る神の霊を以てし、又石碑の上ならで心の肉碑の上に書きたるものなり。
Unu na-egosikwa na unu bụ akwụkwọ ozi si nʼebe Kraịst nọ, mpụta ihe nke ozi anyị jere. Ọ bụghị ihe e ji inki dee na mbadamba nkume, kama ọ bụ mmụọ Chineke na-adị ndụ ka e ji dee ya na mbadamba obi mmadụ.
4 我等キリストに由りて斯の如く神の御前に確信す、
Nke a bụ ntụkwasị obi anyị nwere site na Kraịst nʼebe Chineke nọ.
5 是何事かを己より思ひ得るには非ず、我等の得るは神によれり。
Ọ dịkwaghị mgbe anyị ji chee nʼime onwe anyị, na anyị nwere ike ime ihe ọbụla bara uru site nʼike aka anyị, kama ihe ọbụla anyị nwere, ihe ọbụla anyị rụpụtara, sitere nʼaka Chineke.
6 即ち神は我等を新約の相當なる役者とならしめ給へり、其は儀文の役者に非ず霊の役者なり、蓋儀文は殺し霊は活かし給ふ。
Onye mere ka anyị zuo oke ịbụ ndị ozi ya nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke edeghị nʼakwụkwọ iwu kama nʼime Mmụọ. Ihe e dere nʼakwụkwọ iwu na-eweta ọnwụ, ma Mmụọ na-enye ha ndụ.
7 イスラエルの子等、モイゼの顔の終ある光榮の為に、其顔を熟視め得ざりし程に、死の役すら文字にて石に刻銘けられ、光榮の中に在りたれば、
Ma ọ bụrụ nʼije ozi ahụ nke na-eweta ọnwụ bụ nke e gbunyere nʼelu nkume ji ebube dị ukwuu bịa, nke mere na ụmụ Izrel apụghị ilegide Mosis anya nʼihu mgbe o si nʼelu ugwu Saịnaị rịdata nʼihi ebube nke ihu ya, bụ ebube nke na-agabiga agabiga,
8 霊の役は豈一層光榮あらざらんや。
ọ bụ nʼije ozi nke Mmụọ nsọ agaghị adị ebube karịa?
9 蓋罪に定むる役は光榮なれば、况や義に定むる役は尚豊に光榮あるべきをや。
Ọ bụrụ na-enwere ebube nʼime ije ozi nke amamikpe, ije ozi nke ezi omume ga-adị ebube karịa ya.
10 彼時に輝きしは、勝れたる光榮に對しては光榮ならず、
Nʼezie, ihe jupụtara nʼebube mgbe ochie enwekwaghị ebube ọbụla ugbu a, nʼihi na ebube nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ekpuchiela ya.
11 蓋終るべきものすら光榮を以て成りたれば、况や永存すべきものは増りて光榮あるべきをや。
Ọ bụrụ na ihe na-agafe agafe nwere ebube dị otu a, ihe ga-anọgide mgbe niile ga-enwe ebube karịa ya.
12 然れば我等は斯る希望を懐ける上に、憚らず言ひて、
Ya mere, ebe ọ bụ na anyị nwere olileanya dị otu a, anyị enweghị egwu ọbụla.
13 モイゼの如くには為ざるなり。彼は終るべき其役の終をイスラエルの子等に見せざらん為、己が顔に覆を置きたり。
Anyị agaghị adị ka Mosis onye weere akwa kpuchie ihu ya, nʼihi na ọ chọghị ka ụmụ Izrel hụ ebube ahụ na-agbanwe agbanwe.
14 斯て彼等の精神鈍りて、今日に至るまで、舊約を読むに其覆は依然として取除かれず。蓋舊約はキリストに於て終るものなれども、
Kama e mechiri obi ha ruo taa. Nʼihi na mgbe ọbụla ha gụrụ akwụkwọ ọgbụgba ndụ ochie ahụ, akwa mkpuchi ahụ na-anọgidekwa apụghị apụ nʼobi ha, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼime Kraịst ka ọ ga-eji pụọ.
15 今日に至るまでモイゼの書を読む時に、覆は彼等の心の上に置かれたり。
Ee, tutu ruo taa, mgbe ọbụla ha na-agụ akwụkwọ iwu ahụ Mosis dere, ihe mkpuchi na-adịgide nʼobi ha.
16 然れど主に立歸らん時、其覆は取除かるべし。
Ma mgbe onye ọbụla tụgharịrị nʼebe Onyenwe anyị nọ, a na-ewepụ akwa mkpuchi ahụ.
17 然て主は彼霊なり、主の霊ある處には自由あり、
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Mmụọ, ma ebe ọbụla kwa Mmụọ Onyenwe anyị nọ, nʼebe ahụ ka mmadụ pụrụ inwere onwe ya.
18 我等は皆素顔にて主の光榮を鏡に映すが如く見奉りて、光榮より光榮に進み、主と同じ像に化す、是主の霊に由りてなるが如し。
Anyị niile bụ ndị e wepụrụla akwa mkpuchi site nʼihu, na-egosi ebube nke Onyenwe anyị. A na-agbanwe anyị ịbanye nʼoyiyi ya site nʼebube ruo nʼebube, nke si nʼaka Onyenwe anyị, onye bụ Mmụọ.

< コリント人への手紙第二 3 >