< 創世記 5 >

1 アダムの系図は次のとおりである。神が人を創造された時、神をかたどって造り、
Nke a bụ usoro ihe ndepụta banyere agbụrụ Adam. Mgbe Chineke kere mmadụ, o kere ya nʼoyiyi Chineke.
2 彼らを男と女とに創造された。彼らが創造された時、神は彼らを祝福して、その名をアダムと名づけられた。
O kere ha nwoke na nwanyị, gọziekwa ha. Mgbe e kere ha, ọ kpọrọ ha mmadụ.
3 アダムは百三十歳になって、自分にかたどり、自分のかたちのような男の子を生み、その名をセツと名づけた。
Mgbe Adam gbara narị afọ na iri afọ atọ, ọ mụrụ nwa ya nwoke nʼoyiyi nke ya, na nʼụdịdị nke ya. Ọ gụrụ ya Set.
4 アダムがセツを生んで後、生きた年は八百年であって、ほかに男子と女子を生んだ。
Site nʼoge a mụrụ Set, Adam dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
5 アダムの生きた年は合わせて九百三十歳であった。そして彼は死んだ。
Adam nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ atọ.
6 セツは百五歳になって、エノスを生んだ。
Set gbara narị afọ na ise mgbe ọ ghọrọ nna Enọsh,
7 セツはエノスを生んだ後、八百七年生きて、男子と女子を生んだ。
Mgbe ọ ghọchara nna Enọsh, Set dịrị ndụ ruo narị afọ asatọ na asaa ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
8 セツの年は合わせて九百十二歳であった。そして彼は死んだ。
Set nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ na abụọ.
9 エノスは九十歳になって、カイナンを生んだ。
Mgbe Enọsh gbara iri afọ itoolu, ọ ghọrọ nna Kenan.
10 エノスはカイナンを生んだ後、八百十五年生きて、男子と女子を生んだ。
Mgbe ọ ghọchara nna Kenan, Enọsh dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ na ise, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
11 エノスの年は合わせて九百五歳であった。そして彼は死んだ。
Enọsh nwụkwara mgbe ọ nọzuru narị afọ itoolu na afọ ise.
12 カイナンは七十歳になって、マハラレルを生んだ。
Mgbe Kenan gbara iri afọ asaa ka ọ ghọrọ nna Mahalalel.
13 カイナンはマハラレルを生んだ後、八百四十年生きて、男子と女子を生んだ。
Mgbe ọ ghọchara nna Mahalalel, Kenan dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ anọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
14 カイナンの年は合わせて九百十歳であった。そして彼は死んだ。
Kenan nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na afọ iri.
15 マハラレルは六十五歳になって、ヤレドを生んだ。
Mgbe Mahalalel gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Jared.
16 マハラレルはヤレドを生んだ後、八百三十年生きて、男子と女子を生んだ。
Mgbe ọ ghọchara nna Jared, Mahalalel dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
17 マハラレルの年は合わせて八百九十五歳であった。そして彼は死んだ。
Mahalalel nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asatọ na iri afọ itoolu na ise.
18 ヤレドは百六十二歳になって、エノクを生んだ。
Mgbe Jared dị narị afọ na iri afọ isii na abụọ ka ọ ghọrọ nna Enọk.
19 ヤレドはエノクを生んだ後、八百年生きて、男子と女子を生んだ。
Mgbe ọ ghọchara nna Enọk, Jared dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
20 ヤレドの年は合わせて九百六十二歳であった。そして彼は死んだ。
Jared nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na abụọ.
21 エノクは六十五歳になって、メトセラを生んだ。
Mgbe Enọk gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Metusela.
22 エノクはメトセラを生んだ後、三百年、神とともに歩み、男子と女子を生んだ。
Mgbe ọ ghọchara nna Metusela, Enọk soro ụzọ Chineke narị afọ atọ. Nʼoge a, ọ mụtara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
23 エノクの年は合わせて三百六十五歳であった。
Ọnụọgụgụ nke afọ niile Enọk biri ndụ, bụ narị afọ atọ na iri afọ isii na ise.
24 エノクは神とともに歩み、神が彼を取られたので、いなくなった。
Enọk soro ụzọ Chineke ruo na a hụkwaghị ya nʼihi na Chineke kpọọrọ ya.
25 メトセラは百八十七歳になって、レメクを生んだ。
Mgbe Metusela gbara narị afọ na iri afọ asatọ na asaa ka ọ ghọrọ nna Lamek.
26 メトセラはレメクを生んだ後、七百八十二年生きて、男子と女子を生んだ。
Mgbe ọ ghọchara nna Lamek, Metusela dịrị ndụ narị afọ asaa na iri afọ asatọ na abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
27 メトセラの年は合わせて九百六十九歳であった。そして彼は死んだ。
Metusela nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na itoolu.
28 レメクは百八十二歳になって、男の子を生み、
Mgbe Lamek gbara narị afọ na iri afọ asatọ na abụọ ka ọ mụtara nwa nwoke.
29 「この子こそ、主が地をのろわれたため、骨折り働くわれわれを慰めるもの」と言って、その名をノアと名づけた。
Lamek gụrụ ya Noa, nʼihi na ọ sịrị: “Ọ ga-akasị anyị obi nʼime oke ọrụ na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ nʼala a Onyenwe anyị bụrụ ọnụ.”
30 レメクはノアを生んだ後、五百九十五年生きて、男子と女子を生んだ。
Mgbe a mụsịrị Noa, Lamek dịrị ndụ narị afọ ise na iri afọ itoolu na ise ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
31 レメクの年は合わせて七百七十七歳であった。そして彼は死んだ。
Lamek nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asaa na iri afọ asaa na asaa.
32 ノアは五百歳になって、セム、ハム、ヤペテを生んだ。
Mgbe Noa gbara narị afọ ise ọ ghọrọ nna Shem, Ham na Jafet.

< 創世記 5 >