< ゼカリヤ書 6 >

1 我また目を擧て觀しに四輌の車二の山の間より出きたれりその山は銅の山なり
Elelikwara m anya elu ọzọ hụ ụgbọ ịnyịnya anọ nke si nʼetiti ugwu abụọ na-apụta. Ugwu ndị a bụ ugwu e ji bronz mee.
2 第一の車には赤馬を着け第二の車には黑馬を着け
Ụgbọ ịnyịnya nke mbụ ka ịnyịnya na-acha ọbara ọbara na-adọkpụ. Nke abụọ ka ịnyịnya na-eji nji na-adọkpụ.
3 第三の車には白馬を着け第四の車には白點なる強馬を着く
Nke atọ ka ịnyịnya dị ọcha na-adọkpụ, ma nke anọ ka ịnyịnya tụrụ agwa siekwa ike na-adọkpụ.
4 我すなはち我に語ふ天の使に問て我主よ是等は何なるやと言けるに
Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, “Gịnị ka ihe ndị a bụ, nna m ukwu?”
5 天の使こたへて我に言ふ是は四の天風にして全地の主の前より罷り出たる者なり
Mmụọ ozi ahụ zara m, sị, “Ndị a bụ mmụọ anọ nke eluigwe, ka ha na-apụ mgbe ha guzochara nʼihu Onyenwe elu ụwa niile.
6 黑馬は北の地をさして進み行き白馬その後に從ふ又白點馬は南の地をさして進みゆき
Ụgbọala nke ịnyịnya ndị dị oji na-adọkpụ na-aga nʼakụkụ ugwu. Nke ịnyịnya ndị dị ọcha na-adọkpụ na-aga nʼọdịda anyanwụ. Nke ahụ ndị ịnyịnya na-adịghị ezi ọcha na-adọkpụ na-aga nʼakụkụ ndịda.”
7 強馬は進み出て地を徧く行めぐらんとす彼汝ら往き地を徧くめぐれと言たまひければ則ち地を行めぐれり
Mgbe ịnyịnya ndị ahụ dị ike pụtara, chọọ ka e nye ha ike ijegharị nʼụwa niile, ọ gwara ha sị, “Gaanụ jegharịa nʼụwa niile.” Nʼihi ya, ha pụrụ jegharịa nʼụwa niile.
8 彼われを呼て我に告て言ふこの北の地に往る者等は北の地にて我靈を安んず
Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Ndị ahụ jere nʼakụkụ ugwu emeela ka Mmụọ m dajụọ nʼala dị nʼakụkụ ugwu.”
9 ヱホバの言われに臨めり曰く
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
10 汝かの囚虜人の中の者ヘルダイ、トビヤおよびヱダヤより取ことをせよ即ちその日に汝かれらがバビロンより歸りて宿りをるゼパニヤの子ヨシヤの家に到り
“Gaa nata Heldai, Tobaija na Jedaya, ndị a dọtara nʼagha si Babilọn lọta ọlaọcha na ọlaedo. Nʼotu ụbọchị ahụ, gakwaa nʼụlọ Josaya nwa Zefanaya.
11 金銀を取て冠冕を造りヨザダクの子なる祭司の長ヨシユアの首にこれを冠らせ
Jiri ọlaọcha na ọlaedo ahụ kpụọ otu okpueze, were ya kpukwasị Joshua nwa Jehozadak bụ onyeisi nchụaja nʼisi.
12 彼に語りて言べし萬軍のヱホバ斯言たまふ視よ人ありその名を枝といふ彼おのれの處より生いでてヱホバの宮を建ん
Gwa ya na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nke a bụ nwoke ahụ aha ya bụ Ngalaba. Ọ ga-esi nʼebe nke ya wapụta wuo ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
13 即ち彼者ヱホバの宮を建て尊榮を帶びその位に坐して政事を施しその位にありて祭司とならん此二の者の間に平和の計議あるべし
Ọ bụ ya ga-arụ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. A ga-eyikwasịkwa ya ịma mma dịka uwe, ọ ga-anọdụ nʼocheeze ya na-achị. Ọ ga-abụ onye nchụaja ga-anọ nʼocheeze ya, mee ka ịdị nʼotu dịrị nʼetiti ha abụọ.’
14 偖またその冠冕はヘレム、トビヤ、ユダヤおよびゼパニヤの子ヘンの記念のために之をヱホバの殿に納むべし
Okpueze ahụ ka a ga-enye Heldaya, Tobaija, Jedaya na Hen, nwa Zefanaya, ka ọ bụrụ ihe ncheta nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
15 遠き處の者等來りてヱホバの殿を建ん而して汝らは萬軍のヱホバの我を遣したまひしなるを知にいたらん汝らもし汝らの神ヱホバの聲に聽したがはば是のごとくなるべし
Ndị nọ nʼebe dị anya ga-esi ebe ahụ bịa nye aka nʼọrụ iwu ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. Unu ga-amatakwa na ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ịbịakwute unu. Ihe ndị a niile ga-eme ma ọ bụrụ na unu akpachapụ anya rubere Onyenwe anyị Chineke unu isi.”

< ゼカリヤ書 6 >