< 詩篇 146 >

1 ヱホバを讃稱へよ わがたましひよヱホバをほめたたへよ
Toonu Onyenwe anyị. O mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.
2 われ生るかぎりはヱホバをほめたたへ わがながらふるほどはわが神をほめうたはん
Aga m eto Onyenwe anyị ogologo ndụ m niile; aga m abụ abụ otuto nye Chineke m mgbe m nọ na-adị ndụ.
3 もろもろの君によりたのむことなく 人の子によりたのむなかれ かれらに助あることなし
Atụkwasịla ụmụ eze obi gị, ndị bụ mmadụ efu na-apụghị ịzọpụta.
4 その氣息いでゆけばかれ土にかへる その日かれがもろもろの企圖はほろびん
Mgbe mmụọ ha pụrụ, ha na-alaghachi nʼaja; nʼụbọchị ahụ, atụmatụ ha na-aghọ ihe efu.
5 ヤコブの神をおのが助としその望をおのが神ヱホバにおくものは福ひなり
Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye inyeaka ya bụ Chineke nke Jekọb, onye olileanya ya dị na Onyenwe anyị, Chineke ya.
6 此はあめつちと海とそのなかなるあらゆるものを造り とこしへに眞實をまもり
Onye kere eluigwe na ụwa, na osimiri, na ihe niile dị nʼime ha, Onyenwe anyị, onye ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
7 虐げらるるもののために審判をおこなひ 饑ゑたるものに食物をあたへたまふ神なり ヱホバはとらはれたる人をときはなちたまふ
Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-akpagbu na-enyekwa ndị agụụ na-agụ nri. Onyenwe anyị na-eme ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ nwere onwe ha,
8 ヱホバはめしひの目をひらき ヱホバは屈者をなほくたたせ ヱホバは義しきものを愛しみたまふ
Onyenwe anyị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì, Onyenwe anyị na-akwagide ndị niile dara mba, Onyenwe anyị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya.
9 ヱホバは他邦人をまもり 孤子と寡婦とをささへたまふ されど惡きものの徑はくつがへしたまふなり
Onyenwe anyị na-echebe ndị ọbịa, na-elekọtakwa ndị na-enweghị nna na ndị di ha nwụrụ anwụ, ma ọ na-eme ka ihe ghara ịgara ndị ajọ omume nke ọma.
10 ヱホバはとこしへに統治めたまはん シオンよなんぢの神はよろづ代まで統治めたまはん ヱホバをほめたたへよ
Onyenwe anyị na-achị ruo ebighị ebi, Chineke gị, o Zayọn, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Toonu Onyenwe anyị.

< 詩篇 146 >