< 箴言 知恵の泉 9 >

1 智慧はその家を建て その七の柱を砍成し
Amamihe ewuola ụlọ ukwu ya nʼelu ogidi asaa.
2 その畜を宰り その酒を混和せ その筵をそなへ
O doziela oriri ya nʼusoro, o gbuola anụ ya, gwaakwa mmanya.
3 その婢女をつかはして邑の高處に呼はりいはしむ
O zipụkwala ndị ozi ya ka ha gaa kpọọ mmadụ niile, site nʼebe dị elu nke obodo ka ha nọ na-akpọ oku na-asị,
4 拙者よここに來れと また智慧なき者にいふ
“Bịanụ nʼụlọ m, unu ndị niile na-enweghị uche” Ma nye ndị amamihe kọrọ, ọ na-asị,
5 汝等きたりて我が糧を食ひ わがまぜあはせたる酒をのみ
“Bịanụ, rie nri m, ṅụọkwa mmanya m gwakọtara.
6 拙劣をすてて生命をえ 聰明のみちを行め
Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ; gbasokwanụ ụzọ mmụọ ịghọta ihe.”
7 嘲笑者をいましむる者は恥を己にえ 惡人を責むる者は疵を己にえん
Onye ọbụla na-adọ onye na-akwa emo aka na ntị na-ewetara onwe ya nlelị; onye na-abara mmadụ ọjọọ mba na-enweta nkọcha.
8 嘲笑者を責むることなかれ 恐くは彼なんぢを惡まん 智慧ある者をせめよ 彼なんぢを愛せん
Abarala ndị na-akwa emo mba, ma ọ bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị; baara ndị maara ihe mba, ha ga-ahụ gị nʼanya.
9 智慧ある者に授けよ 彼はますます智慧をえん 義者を敎へよ 彼は知識に進まん
Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ọ ga-ama ihe karịa, kuziere onye ziri ezi ihe ọ ga-atụkwasị ihe ọ mụtara nʼamamihe ya.
10 ヱホバを畏るることは智慧の根本なり 聖者を知るは聰明なり
Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe, inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta.
11 我により汝の日は多くせられ 汝のいのちの年は増べし
Nʼihi na ọ bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo. A ga-etinyekwara gị ọtụtụ afọ na ndụ gị.
12 汝もし智慧あらば自己のために智慧あるなり 汝もし嘲らば汝ひとり之を負ん
Ị bụrụ onye nwere amamihe, amamihe gị ga-abara gị uru, ma ị bụrụ onye na-akwa emo, naanị gị ga-ata ahụhụ ya.
13 愚なる婦は嘩しく且つたなくして何事をも知らず
Nwanyị dị nzuzu na-eme mkpọtụ, o nweghị uche; ihere adịghịkwa eme ya.
14 その家の門に坐し邑のたかき處にある座にすわり
Ọ na-anọ ọdụ nʼọnụ ụzọ ụlọ ya, nʼelu oche nʼebe dịkarịsịrị elu nʼobodo,
15 道をますぐに過る往來の人を招きていふ
na-akpọ ndị na-aga nʼụzọ oku, bụ ndị na-aga mkpa ha,
16 拙者よここに來れと また智慧なき人にむかひては之にいふ
“Ka ndị niile amamihe kọrọ bịa nʼụlọ m.” Ọ na-asịkwa ndị na-enweghị uche,
17 竊みたる水は甘く密かに食ふ糧は美味ありと
“Mmiri e zutere nʼohi na-atọ ụtọ, nri e riri na nzuzo na-atọkarịkwa nʼụtọ.”
18 彼處にある者は死し者その客は陰府のふかき處にあることを是等の人は知らざるなり (Sheol h7585)
Ma ha adịghị aghọta na ndị nʼadịghị ndụ nọ nʼebe ahụ, na ndị ọ kpọrọ oku nri aghọọlarị ndị nọ nʼala mmụọ. (Sheol h7585)

< 箴言 知恵の泉 9 >