< 民数記 11 >

1 茲に民災難に罹れる者のごとくにヱホバの耳に呟きぬヱホバその怨言を聞て震怒を發したまひければヱホバの火かれらに向ひて燃いでその營の極端を燒り
Mgbe na-adịghị anya ụmụ Izrel bidoro itamu ntamu nʼihi ihe ike niile ha na-ezute nʼije ha. Ma ntamu a ruru Onyenwe anyị ntị. Nʼihi ya, Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide ha. Ọkụ sitere nʼebe Onyenwe anyị nọ, ree nʼetiti ha, repịa ụfọdụ ndị bi nʼakụkụ ngwụsị ọmụma ụlọ ikwu ahụ.
2 是に於て民モーセに呼はりしがモーセ、ヱホバに祈ければその火鎮りぬ
Mgbe nke a mere, ụmụ Izrel tikuru Mosis mkpu akwa. Mosis kpere ekpere nye Onyenwe anyị nʼihi ha, ọkụ ahụ kwụsịkwara.
3 ヱホバの火かれらに向ひて燃出たるに因てその處の名をタベラ(燃)と稱ぶ
Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Tabera, nʼihi ọkụ ahụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ ree nʼetiti ha.
4 茲に彼等の中なる衆多の寄集人等慾心を起すイスラエルの子孫もまた再び哭て言ふ誰か我らに肉を與へて食しめんか
Ndị amakekwu so ụmụ Izrel nʼije a malitere itamu ntamu banyere nri ndị ọzọ na-agụ ha agụụ. Nke a mere ka ụmụ Izrel malite ịkwa akwa, na-asị, “A sịkwarị na anyị nwere anụ anyị ga-ata.
5 憶ひ出るに我等エジプトにありし時は魚黄瓜水瓜韮葱靑蒜等を心のままに食へり
Anyị chetara azụ anyị tara nʼIjipt, nke na-adịghị efu anyị ego, ya na kukumba, na melọn, na liik, na ayo na galiik.
6 然るに今は我儕の精神枯衰ふ我らの目の前にはこのマナの外何も有ざるなりと
Ma ugbu a, anyị enweghịkwa agụụ iri nri, nʼihi na site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọ bụ naanị mánà bụ ihe oriri anyị nwere.”
7 マナは莞荽の實のごとくにしてその色はブドラクの色のごとし
Mánà dịka mkpụrụ kọrianda, na-acha ka eso osisi kpọrọ nkụ.
8 民行巡りてこれを斂め石磨にひき或は臼に搗てこれを釜の中に煮て餅となせりその味は油菓子の味のごとし
Ndị Izrel na-ejegharị na-achịkọta ha. Emesịa, ha na-eji nkume e ji akwọ nri na-akwọri ha. Oge ụfọdụ, ha na-eji ikwe nri sụọ ya. Emesịa, ha na-esi ya esi, maọbụ ghee ya eghe. Ọ na-atọ dịka ihe e ji mmanụ oliv ghee.
9 夜にいりて露營に降る時にマナその上に降れり
Mánà ndị a na-ada mgbe igirigi dara nʼọmụma ụlọ ikwu nʼabalị.
10 モーセ聞に民の家々の者おのおのその天幕の門口に哭く是におひてヱホバ烈しく怒を發したまふこの事またモーセの目にも惡く見ゆ
Mosis nụrụ mkpu akwa ụmụ Izrel niile, nke na-ada nʼezinaụlọ ọbụla nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha. Iwe were Onyenwe anyị nke ukwuu. Otu a kwa, obi jọrọ Mosis njọ nke ukwuu.
11 モーセすなはちヱホバに言けるは汝なんぞ僕を惡くしたまふ乎いかなれば我汝の前に恩を獲ずして汝かく此すべての民をわが任となして我に負せたまふや
Mosis jụrụ Onyenwe anyị sị, “Gịnị mere i ji bokwasị ohu gị nsogbu dị otu a nʼisi? Gịnị ka m mere na m ahụtakwaghị amara nʼebe ị nọ, nke mere i ji bukwasị m ibu arọ nke ilekọta ndị a?
12 この總體の民は我が姙みし者ならんや我が生し者ならんや然るに汝なんぞ我に慈父が乳哺子を抱くがごとくに彼らを懐に抱きて汝が昔日かれらの先祖等に誓ひたまひし地に至れと言たまふや
Ọ bụ m tụrụ ime ndị a niile? Ọ bụ m mụrụ ha? Gịnị mere i ji si m kuru ha nʼaka m gawa nʼala ahụ ị ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha, dịka m bụ nne nwa na-ekugharị nwantakịrị?
13 我何處より肉を得てこの總體の民に與へんや彼等は我にむかひて哭き我等に肉を與へて食しめよと言なり
Ebee ka m ga-achọta anụ ga-ezuru igwe mmadụ ndị a? Lee na ha na-akwasa m akwa na-asị m, ‘Nye anyị anụ!’
14 我は一人にてはこの總體の民をわが任として負ことあたはず是は我には重きに過ればなり
Agaghị m ebulite ibu ịchịkọta ndị a niile nʼonwe m! Ibu a dị m arọ nke ukwuu.
15 我もし汝の前に恩を獲ば請ふ斯我を爲んよりは寧ろ直に我を殺したまへ我をしてわが困苦を見せしめたまふ勿れ
Ọ bụrụ na ị ga-esi otu a meso m mmeso, biko napụ m ndụ m ugbu a, nʼihi na ọnwụ m ga-egosi na m natara amara nʼebe ị nọ. Site nʼọnọdụ a ga-ewetara m mbibi wezuga m.”
16 是においてヱホバ、モーセに言たまはくイスラエルの老人の中民の長老たり有司たるを汝が知るところの者七十人を我前に集め集會の幕屋に携きたりて其處に汝とともに立しめよ
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Kpọkọta iri ndị okenye ụmụ Izrel asaa, ndị ị maara na ha bụ ndị ndu, na ndị nlekọta ije ozi nʼetiti ụmụ Izrel. Kpọta ha nʼụlọ nzute m ka ha soro gị guzoro.
17 我降りて其處にて汝と言はん又われ汝の上にあるところの霊を彼等にも分ち與へん彼等汝とともに民の任を負ひ汝をして只一人にて之を負ふこと無らしむべし
Aga m abịa nʼebe ahụ gwa gị okwu. Mgbe ahụ kwa, aga m ewere ụfọdụ nʼime Mmụọ m dị nʼime gị tinye nʼime iri ndị ndu asaa ahụ. Ha ga-enyere gị aka ibu ibu arọ nke ịchịkọta ụmụ Izrel. Nʼụzọ dị otu a, ọ gaghị abụkwa ibu dịrị naanị gị ibu.
18 汝また民に告て言へ汝等身を潔めて明日を待て必ず肉を食ふことを得ん汝等ヱホバの耳に哭て誰か我等に肉を與へて食しめん我らエジプトにありし時は却て善りしと言たればヱホバなんぢらに肉を與へて食しめたまふべし
“Ugbu a, gwa ndị Izrel niile si ha, ‘Doonụ onwe unu nsọ, kwadoonụ maka echi, mgbe unu ga-ata anụ. Onyenwe anyị nụrụ mgbe unu kwara akwa sị, “A sịkwa na anyị nwere anụ anyị ga-ata. Ihe dịrị anyị mma nʼIjipt karịa otu ọ dị ugbu a.”
19 汝等がこれを食ふは一日や二日や五日や十日や二十日にはあらずして
Anụ unu ga-eri abụghị naanị nke otu ụbọchị, maọbụ ụbọchị abụọ, maọbụ ụbọchị ise, maọbụ iri, ma ọ bụkwanụ iri ụbọchị abụọ!
20 一月におよび遂に汝らの鼻より出るにいたらん汝等これに饜はつべし是なんぢら己等の中にいますヱホバを軽んじてその前に哭き我等何とてエジプトより出しやと言たればなり
Kama unu ga-eri ya otu ọnwa zuru ezu, ruo mgbe ọ ga-esi unu nʼimi sọpụta, ghọrọ unu ihe ịsọ oyi. Nʼihi na unu ajụla Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti unu, kwaa akwa nʼihu ya, sị, “Gịnị mere anyị ji site nʼala Ijipt pụta?”’”
21 モーセ言けるは我が偕にをる民は歩卒のみにても六十萬あり然るに汝は我かれらに肉を與へて一月の間食しめんと言たまふ
Ma Mosis sịrị Onyenwe anyị, “Ọnụọgụgụ ndị ikom dị narị puku isii ndị ji ụkwụ eje ka m nọ nʼetiti ha, ma ị na-asị, ‘Aga m enye ha anụ otu ọnwa.’
22 羊と牛の群を宰るとも彼等を飽しむることを得んや海の魚をことごとく集むるとも彼等を飽しむることを得んや
Ọ ga-ezuru ha ma ọ bụrụ na e gbuoro ha igwe ehi na atụrụ? Ọ bụ azụ niile nke dị nʼoke osimiri ga-ezuru ha ma egbuo ha niile nye ha?”
23 ヱホバ、モーセに言たまはくヱホバの手短からんや吾言の成と然らざるとは汝今これを見るあらん
Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Aka Onyenwe anyị ọ dị mkpụmkpụ? Ugbu a, ị ga-ahụ ma m ga-emezu okwu m, maọbụ na m agaghị emezu ya.”
24 是に於てモーセ出きたりてヱホバの言を民に告げ民の長老七十人を集めて幕屋の四圍に立しめけるに
Ya mere, Mosis pụrụ ga gwa ụmụ Izrel ihe Onyenwe anyị kwuru. Ọ chịkọtara iri ndị okenye asaa ahụ nye ha ọnọdụ gburugburu ụlọ nzute ahụ.
25 ヱホバ雲の中にありて降りモーセと言ひモーセのうへにある霊をもてその長老七十人にも分ち與へたまひしがその霊かれらの上にやどりしかば彼等預言せり但し此後はかさねて爲ざりき
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime igwe ojii. Ya na Mosis kparịtaa ụka. Onyenwe anyị weere ụfọdụ nʼime Mmụọ dị nʼime Mosis, tinye ya nʼime iri ndị okenye asaa ndị ahụ. Mgbe Mmụọ a batara nʼime ha, ha niile buru amụma. Ma ha ebughị amụma gaa nʼihu.
26 時に彼等の中なる二人の者營に止まり居るその一人の名はエルダデといひ一人の名はメダデと曰ふ霊またかれらの上にもやどれり彼らは其名を録されたる者なりしが幕屋に往ざりければ營の中にて預言をなせり
Ma mmadụ abụọ nʼime iri ndị okenye asaa ndị ahụ, Eldad na Medad nọgidere nʼọmụma ụlọ ikwu ha. Ọ bụ ezie na e depụtara aha ha dịka ndị ndu, ma ha esoghị ndị ọzọ gaa nʼụlọ nzute. Ma Mmụọ ahụ bịakwasịrị ha nʼebe ahụ ha nọ. Ha bukwara amụma.
27 時に一人の少者奔りきたりモーセに告てエルダデとメダデ營の中にて預言すと言ければ
Otu okorobịa gbapụrụ ọsọ gaa kọọrọ Mosis sị ya, “Eldad na Medad na-ebu amụma nʼọmụma ụlọ ikwu ha.”
28 その少時よりしてモーセの從者たりしヌンの子ヨシユアこたへて曰けるは吾主モーセこれを禁めたまヘ
Joshua nwa Nun, onyeozi Mosis site na mgbe ọ bụ okorobịa, gwara Mosis okwu sị ya, “Onyenwe m Mosis, mee ka ndị a kwụsị ibu amụma.”
29 モーセこれに言けるは汝わがために媢嫉を起すやヱホバの民の皆預言者とならんことまたヱホバのその霊を之に降したまはんことこそ願しけれ
Ma Mosis zara sị, “Ọ bụ nʼihi ikwochitara m ekworo ka i ji chọọ ka m kwụsị ha? Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na ndị Onyenwe anyị niile bụ ndị amụma, ndị Onyenwe anyị ga-etinye Mmụọ ya nʼime ha!”
30 斯てモーセ、イスラエルの長老等とともに營に返れり
Mgbe ahụ Mosis na ndị okenye Izrel ndị ahụ niile lọghachiri nʼebe ụlọ ikwu ha dị.
31 茲にヱホバの許より風おこり出て海の方より鶉を吹きたりこれをして營の周圍に堕しめたりその堕ひろがれること營の四周此旁も大約一日路彼旁も大約一日路地の表より高きこと大約二キユビトなりき
Otu oke ifufe sitere nʼebe Onyenwe anyị nọ bịa si nʼosimiri bute ọtụtụ nnụnụ a na-akpọ kweel. O mere ka nnụnụ ndị a daa nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha, nʼime ogige ya niile. Nnụnụ ndị a fere ihe dịka otu mita site nʼelu ala, nʼakụkụ niile, ruo nʼebe mmadụ pụrụ iji ụkwụ jeruo nʼotu ụbọchị. Ha jupụtakwara ebe niile.
32 民すなはち起あがりてその日終日その夜終夜またその次の日終日鶉を拾ひ斂めけるが拾ひ斂むることの至て寡き者も十ホメルほど拾ひ斂めたり皆これを營の周圍に陳べおけり
Ya mere ndị Izrel biliri ụbọchị ahụ niile, na nʼabalị ahụ niile, na echi ya niile pụọ ịchịkọta nnụnụ kweel ndị a! Onye gbutere nke nta gbutezuru ihe ọtụtụ homa iri. Ha gbasara ha akụkụ niile nke ogige ọmụma ụlọ ikwu ahụ.
33 肉なほ歯のあひだにありていまだ食つくさざるにヱホバ民にむかひて怒を發しこれを撃ておほいに滅ぼしたまへり
Ma mgbe anụ ndị a ka dị ha nʼọnụ, Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide ha. O tiri ha nrịa nrịa na-efe efe.
34 是をもてその處の名をキブロテハッタワ(慾心の墓)とよべり其は慾心をおこせる人々を其處に埋たればなり
Nʼihi nke a, a kpọrọ aha ebe ahụ Kibrọt Hataava, nʼihi na nʼebe ahụ ka e liri ndị Izrel nwụrụ nʼihi oke ọchịchọ nri.
35 斯て民キブロテハツタワよりハゼロテに進みゆきてハゼロテに居ぬ
Site na Kibrọt Hataava, ndị Izrel biliri njem rute Hazerọt ebe ha nọrọ.

< 民数記 11 >