< レビ記 10 >

1 茲にアロンの子等なるナダブとアビウともにその火盤をとりて火をこれにいれ香をその上に盛て異火をヱホバの前に献げたり是はヱホバの命じたまひし者にあらざりしかば
Ma ụmụ Erọn, Nadab na Abihu, were ọkụ tinye nʼihe ịgụ ọkụ ha, tinyekwa ụda na-esi isi nʼọkụ ahụ, si otu a chee ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu Onyenwe anyị, nʼụzọ megidere ihe e nyere nʼiwu.
2 火ヱホバより出て彼等を燬ほろぼせりすなはち彼等はヱホバの前に死うせぬ
Nʼihi ya, ọkụ sitere nʼihu Onyenwe anyị daa rechapụ ha, ha nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị.
3 モーセ、アロンに言けるはヱホバの宣ふところは是のごとし云く我は我に近づく者等の中に我の聖ことを顯はし又全體の民の前に榮光を示さんアロンは默然たりき
Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị bu nʼobi mgbe o kwuru sị, “‘Nʼetiti ndị niile na-abịaru m nso ka a ga-edo m nsọ ọ bụkwa nʼihu ọha mmadụ, ka a ga-asọpụrụ m.’” Ma Erọn gbara nkịtị.
4 モーセかくてアロンの叔父ウジエルの子等なるミサエルとエルザパンを呼び汝等進みよりて聖所の前より汝等の兄弟等を營の外に携へ出せと之にいひければ
Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Mishael na Elzafan, ụmụ Uziel, nwanne nna Erọn sị ha, “Bịanụ nso. Gaanụ buputa ozu ụmụnne unu site nʼihu ebe nsọ, buru ha gaa nʼazụ ebe obibi.”
5 すなはち進みよりて彼等をその裏衣のままに營の外に携へ出しモーセの言るごとくせり
Ha bịara ghanye aka nʼuwe ime ahụ ha buru ha bupụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, dịka Mosis nyere nʼiwu.
6 モーセまたアロンおよびその子エレアザルとイタマルにいひけるは汝らの頭を露すなかれまた汝らの衣を裂なかれ恐くは汝等死んまた震怒全體の民におよぶあらん但汝等の兄弟たるイスラエルの全家ヱホバのかく火をもて燬ほろぼしたまひし事を哀くべし
Mosis tụgharịrị sị Erọn na ụmụ ya, Elieza na Itama, “Unu ekwekwala ka ntutu isi unu kpasaa akpasa izipụta na unu na-eru ụjụ. Unu adọwakwala uwe unu. Nʼihi na ọ bụrụ na unu emee otu a, unu ga-anwụ. Iwe Onyenwe anyị ga-abịakwasịkwa ọgbakọ Izrel niile. Ma ndị ikwu gị, ụmụ Izrel ndị ọzọ, nwere ike ruo ụjụ nʼihi Nadab na Abihu.
7 汝等はまた集會の幕屋の門より出べからず恐くは汝等死ん其はヱホバの灌膏汝らの上にあればなりと彼等モーセの言のごとくに爲り
Ọzọ, unu ahapụla ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ka unu ghara ịnwụ, nʼihi na mmanụ nsọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ unu.” Ha mere dịka Mosis gwara ha.
8 茲にヱホバ、アロンに告て言たまはく
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Erọn sị,
9 汝も汝の子等も集會の幕屋にいる時には葡萄酒と濃酒を飮なかれ恐くは汝等死ん是は汝らが代々永く守るべき例たるべし
“Gị na ụmụ gị ndị ikom agaghị aṅụ mmanya, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya mgbe unu na-aba nʼụlọ nzute ka unu ghara ịnwụ. Agbụrụ unu niile ga-esogide iwu a ruo ọgbọ niile na-abịa.
10 斯するは汝等が物の聖と世間なるとを分ち汚たると潔淨とを分つことを得んため
Ọrụ unu ka ọ bụ ịkpa oke nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ, na nʼetiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha.
11 又ヱホバのモーセによりて告たまひし一切の法度をイスラエルの子孫に敎ふることを得んがためなり
Ọrụ unu bụkwa izi ụmụ Izrel ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼaka Mosis.”
12 モーセまたアロンおよびその遺れる子エレアザルとイタマルに言けるは汝等ヱホバの火祭の中より素祭の遺餘を取り酵をいれずして之を壇の側に食へ是は至聖物なり
Mosis sịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom fọdụrụ, bụ Elieza na Itama, “Werenụ onyinye mkpụrụ ọka nke fọdụrụ site na onyinye nsure ọkụ, nke a kwadoro na-etinyeghị ihe iko achịcha ọbụla, bụ nke e nyere Onyenwe anyị. Rienụ ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja, nʼihi na ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
13 是はヱホバの火祭の中より汝に歸する者また汝の子等に歸する者なれば汝等これを聖所にて食ふべし我かく命ぜられたるなり
Rienụ ya nʼime ebe nsọ ahụ, nʼihi na ọ bụ oke ruru unu na ụmụ unu ndị ikom site nʼonyinye nsure ọkụ e nyere Onyenwe anyị; nʼihi na nke a bụ ihe e nyere m nʼiwu.
14 また搖る胸と擧たる腿は汝および汝の男子と女子これを淨處にて食ふべし是はイスラエルの子孫の酬恩祭の中より汝の分と汝の子等の分に與へらるる者なればなり
Ma unu na ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom ka ọ dịkwara iri obi anụ na apata ya, nke e fufere nʼihu Onyenwe anyị. Kama, ọ bụ nʼebe dị ọcha ka unu ga-anọ rie ya. Nke a bụ oke enyere unu na ụmụ unu site nʼaja udo nke ụmụ Izrel.
15 彼等その擧るところの腿と搖ところの胸を火祭の脂とともに持きたりこれをヱホバの前に搖て搖祭となすべし其は汝と汝の子等に歸すべし是は永く守るべき例にしてヱホバの命じたまふ者なり
Apata ụkwụ anụ nke aja mbuli na obi anụ ahụ nke e fufere, ka a ga-eweta ya na abụba ya nye dịka onyinye sitere nʼọkụ. A ga-efufe ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Nke a ga-abụ oke ruuru unu na ụmụ unu mgbe niile, dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.”
16 斯てモーセ罪祭の山羊を尋ね索めけるに旣にこれを燬たりしかばアロンの遺れる子等エレアザルとイタマルにむかひてモーセ怒を發し言けるは
Mgbe Mosis jụrụ ajụjụ banyere mkpi ahụ e ji chụọ aja mmehie, ọ chọpụtara na a kpọọla ya ọkụ. O wesoro Elieza na Itama ụmụ ndị ikom Erọn iwe sị ha,
17 罪祭の牲は至聖かるに汝等なんぞ之を聖所にて食ざりしや是は汝等をして會衆の罪を任て彼等のためにヱホバのまへに贖をなさしめんとて汝等に賜ふ者たるなり
“Gịnị mere unu erighị anụ ahụ e ji chụọ aja mmehie nʼakụkụ ebe nsọ ahụ? Ọ bụ nke dịkarịsịrị nsọ; e nyere unu ya maka iwepụ ọmụma ikpe dịrị ọgbakọ Izrel, na ikpuchi mmehie ha nʼihu Onyenwe anyị.
18 視よその血はまだこれを聖所に携へいることをせざりきかの物は我が命ぜしごとくに汝等これを聖所にて食ふべかりしなり
Ebe ọ bụ na e webataghị ọbara ya nʼime Ebe Nsọ ahụ, unu gaara anọ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ rie anụ ewu ahụ, dịka m nyere unu nʼiwu.”
19 アロン、モーセに言けるは今日彼等その罪祭と燔祭をヱホバの前に献げしが斯る事我身に臨めり今日もし我罪祭の牲を食はばヱホバこれを善と觀たまふや
Ma Erọn zara Mosis sị ya, “Lee, taa ka ha chụrụ aja mmehie na aja nsure ọkụ ha nʼihu Onyenwe anyị. Ma lee ụdị ihe dakwasịrị m. Ọ gaara atọ Onyenwe anyị ụtọ ma a sị na m riri anụ aja mmehie ndị a nʼụbọchị dị otu a?”
20 モーセこれを聽て善とせり
Mgbe Mosis nụrụ nke a, o nwere afọ ojuju nʼihi ọsịsa Erọn nyere.

< レビ記 10 >