< 哀歌 3 >

1 我はかれの震怒の笞によりて艱難に遭たる人なり
Abụ m onye hụrụla ahụhụ site na mkpara igwe nke nrubiga oke nke iwe Onyenwe anyị.
2 かれは我をひきて黑暗をあゆませ光明にゆかしめたまはず
O sitela nʼihu ya chụpụ m, mee ka m jegharịa nʼọchịchịrị kama nʼìhè.
3 まことに屢々その手をむけて終日われを攻なやまし
Nʼezie, ọ tụgharịala aka ya megide m, mgbe mgbe, ogologo ụbọchị niile.
4 わが肉と肌膚をおとろへしめ わが骨を摧き
O meela ka akpụkpọ ahụ na anụ ahụ m fịkpọọ, ọ nyajisiela ọkpụkpụ di m nʼahụ.
5 われにむかひて患苦と艱難を築きこれをもて我を圍み
O busola m agha, jiri ihe ilu na oke mkpagbu gbaa m gburugburu.
6 われをして長久に死し者のごとく暗き處に住しめ
O meela ka m biri nʼọchịchịrị dịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga.
7 我をかこみて出ること能はざらしめわが鏈索を重くしたまへり
Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ; o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị.
8 我さけびて助をもとめしとき彼わが祈禱をふせぎ
Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya, ọ bụladị mgbe m kpọkuru ya ka o nyere m aka.
9 斫たる石をもてわが道を塞ぎわが途をまげたまへり
O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile, o meela ka okporoụzọ m gbagọọ agbagọ.
10 その我に對することは伏て伺がふ熊のごとく潜みかくるる獅子のごとし
Dịka anụ ọhịa bịa nke makpu na-eche nche, na dịka ọdụm nke na-ezo onwe ya,
11 われに路を離れしめ 我をひきさきて獨くるしましめ
o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ, hapụ m na-enweghị onye inyeaka.
12 弓を張りてわれを矢先の的となし
Ọ dọọla ụta ya mee m ka m bụrụ onye àkụ ya ga-agbata.
13 矢筒の矢をもてわが腰を射ぬきたまへり
O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya gbapuo m obi.
14 われはわがすべての民のあざけりとなり 終日うたひそしらる
Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile; ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile.
15 かれ我をして苦き物に飽しめ茵蔯を飮しめ
O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ, meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ.
16 小石をもてわが齒を摧き灰をもて我を蒙ひたまへり
O meela ka m jiri okwute tajisie eze m, o kponyekwala m ntụ nʼọnụ m.
17 なんぢわが靈魂をして平和を遠くはなれしめたまへば我は福祉をわすれたり
Enweghị m udo, echezọkwaala m ihe ọganihu bụ.
18 是において我みづから言り わが氣力うせゆきぬ ヱホバより何を望むべきところ無しと
Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa. Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka Onyenwe anyị nweta.”
19 ねがはくは我が艱難と苦楚茵蔯と膽汁とを心に記たまへ
Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m, ya na ihe ilu na oluilu.
20 わがたましひは今なほ是らの事を想ひてわが衷に鬱ぐ
Mgbe m na-echeta ya, obi m na-ada mba nʼime m.
21 われこの事を心におもひ起せり この故に望をいだくなり
Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m nke na-eme ka m nwee olileanya.
22 われらの尚ほろびざるはヱホバの仁愛によりその憐憫の盡ざるに因る
Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa, nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ.
23 これは朝ごとに新なり なんぢの誠實はおほいなるかな
Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile; ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike.
24 わが靈魂は言ふ ヱホバはわが分なり このゆゑに我彼を待ち望まん
Mkpụrụobi m na-ekwu, “Onyenwe anyị bụ oke m, nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.”
25 ヱホバはおのれを待ち望む者とおのれを尋ねもとむる人に恩惠をほどこしたまふ
Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya, e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike.
26 ヱホバの救拯をのぞみて靜にこれを待は善し
Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ chere nzọpụta nke Onyenwe anyị.
27 人わかき時に軛を負は善し
Ọ bụ ihe dị mma ka mmadụ buru ibu arọ dịrị ya mgbe ọ bụ okorobịa.
28 ヱホバこれを負せたまふなれば獨坐して默すべし
Ya nọrọkwa duu naanị ya, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị bokwasịrị ya ibu ahụ.
29 口を塵につけよ あるひは望あらん
Ya tinye ihu ya nʼaja, nʼihi na olileanya nwere ike dịrị.
30 おのれを撃つ者に頬をむけ 充足れるまでに恥辱をうけよ
Ya cheziere onye ahụ chọrọ iti ya ihe ntị ya, ya kwerekwa ka ihe ihere ju ya afọ.
31 そは主は永久に棄ることを爲たまはざるべければなり
Nʼihi na Onyenwe anyị adịghị ajụ onye ọbụla ruo mgbe ebighị ebi.
32 かれは患難を與へ給ふといへどもその慈悲おほいなればまた憐憫を加へたまふなり
Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka mmekpa ahụ bịa, ma ọ na-emesịakwa gosi obi ebere ya, nʼihi na ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ, dị ukwuu.
33 心より世の人をなやましかつ苦しめ給ふにはあらざるなり
Nʼihi na ọ naghị elezi anya eweta ahụhụ, maọbụ mee ka ụmụ mmadụ nọọ na mmekpa ahụ.
34 世のもろもろの俘囚人を脚の下にふみにじり
Iji ụkwụ zọgbuo ndị mkpọrọ nọ nʼala ahụ
35 至高者の面の前にて人の理を抂げ
ime ka ihe ruru mmadụ hapụ iru ya aka nʼihu Onye kachasị ihe niile elu,
36 人の詞訟を屈むることは主のよろこび給はざるところなり
ime ka ikpe ziri ezi ghara irute mmadụ. Ọ bụ na Onyenwe anyị agaghị ahụ ihe ndị a?
37 主の命じたまふにあらずば誰か事を述んにその事即ち成んや
Onye pụrụ ikwu okwu mekwa ka ọ dị ire ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyeghị iwu ka ọ dị otu ahụ?
38 禍も福もともに至高者の口より出るにあらずや
Ọ bụghị site nʼọnụ Onye kachasị ihe niile elu ka ihe ọma na ihe ọjọọ si abịa?
39 活る人なんぞ怨言べけんや 人おのれの罪の罰せらるるをつぶやくべけんや
Gịnị mere mmadụ dị ndụ ga-eji tamuo ntamu mgbe ọ na-ahụ ahụhụ nʼihi mmehie ya?
40 我等みづからの行をしらべかつ省みてヱホバに歸るべし
Ka anyị nyochaanụ ụzọ anyị nwapụta ya. Ka anyị lọghachikwutenụ Onyenwe anyị.
41 我ら天にいます神にむかひて手とともに心をも擧べし
Ka anyị welie aka anyị abụọ na obi anyị elu nye Chineke nọ nʼeluigwe, sị:
42 われらは罪ををかし我らは叛きたり なんぢこれを赦したまはざりき
“Anyị emehiela, nupu isi, ma ị gbagharabeghị.
43 なんぢ震怒をもてみづから蔽ひ 我らを追攻め殺してあはれまず
“I jirila iwe kpuchie onwe gị, si otu a chụọ anyị ọsọ. I gbuola anyị, jụ imere anyị ebere.
44 雲をもてみづから蔽ひ 祈禱をして通ぜざらしめ
I jiri igwe ojii kpuchie onwe gị ka ekpere anyị ghara irute gị.
45 もろもろの民の中にわれらを塵埃となしたまへり
I meela ka anyị ghọọ unyi na ihe a zachapụrụ azachapụ nʼetiti mba niile.
46 敵は皆われらにむかひて口を張れり
“Ndị iro anyị niile asaghepụla ọnụ ha megide anyị.
47 恐懼と陷阱また暴行と滅亡我らに來れり
Anyị ahụọla ahụhụ site nʼoke ihe egwu na ihe ndaba dị iche iche, na mbibi na ịla nʼiyi.”
48 わが民の女の滅亡によりてわが眼には涙の河ながる
Anya mmiri nke dịka iyi na-asọ asọ si nʼanya m na-asọpụta nʼihi ndị m a lara nʼiyi.
49 わが目は斷ず涙をそそぎて止ず
Anya mmiri si m nʼanya ga-anọgide na-asọpụta na-akwụsịghị akwụsị,
50 天よりヱホバの臨み見て顧みたまふ時にまで至らん
tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-esite nʼeluigwe ledata anya ma hụ.
51 わが邑の一切の女等の故によりてわが眼はわが心をいたましむ
Ihe anya m na-ahụ na-ewetara mkpụrụobi m ihe mgbu, nʼihi ọnọdụ nke ndị inyom niile nọ nʼime obodo m.
52 故なくして我に敵する者ども鳥を追ごとくにいたく我をおひ
Ndị ahụ mere onwe ha ndị iro m, ndị m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla, na-achụ m ọsọ dịka m bụ nnụnụ.
53 わが生命を坑の中にほろぼし わが上に石を投かけ
Ha gbalịrị ime ka m nwụọ nʼime olulu site nʼịtụ m nkume.
54 また水わが頭の上に溢る 我みづから言り滅びうせぬと
Mmiri kpuchiri m isi, echere m na-efuola m.
55 ヱホバよ われ深き坑の底より汝の名を呼り
Esitere m na nsọtụ olulu ahụ kpọkuo aha gị, gị Onyenwe anyị.
56 なんぢ我が聲を聽たまへり わが哀歎と祈求に耳をおほひたまふなかれ
Ị nụrụ arịrịọ m rịọrọ gị, “Biko, emechila ntị gị. Nụrụ arịrịọ inyeaka nke m na-arịọ gị.”
57 わが汝を龥たりし時なんぢは近よりたまひて恐るるなかれと宣へり
Ị bịara nso mgbe m kpọkuru gị. Ị sịrị, “Atụla egwu.”
58 主よなんぢはわが靈魂の訴を助け伸べ わが生命を贖ひ給へり
Gị onwe gị, Onyenwe anyị, kpechitere ọnụ m, gị gbapụtara ndụ m.
59 ヱホバよ なんぢは我がかうむりたる不義を見たまへり 願はくは我に正しき審判を與へたまへ
Onyenwe anyị, ị hụla ihe ọjọọ ha mere m. Kpechitere m ọnụ m.
60 なんぢは彼らが我を怨み われを害せんとはかるを凡て見たまへり
Ị hụla ịbọ ọbọ ha niile na nzube niile ha na-ezube megide m.
61 ヱホバよなんぢは彼らが我を詈り 我を害せんとはかるを凡て聞たまへり
Onyenwe anyị, ị nụla nkọcha niile ha na-akọcha m na nzube niile ha na-ezube megide m.
62 かの立て我に逆らふ者等の言語およびその終日われを攻んとて運らす謀計もまた汝これを聞たまへり
Ị na-anụ izu na ntamu nke ndị iro m megide m ogologo ụbọchị niile.
63 ねがはくは彼らの起居をかんがみたまへ 我はかれらに歌ひそしらる
Lee ha! Ha na-akọcha m mgbe ha guzoro ọtọ, na-akọcha m mgbe ha nọdụrụ ala. Ha ji abụ na-akọcha m.
64 ヱホバよ なんぢは彼らが手に爲すところに循がひて報をなし
Onyenwe anyị, biko, kwụghachi ha ihe ruuru ha, nʼihi ihe niile aka ha rụpụtara.
65 かれらをして心くらからしめたまはん なんぢの呪詛かれらに歸せよ
Jiri ihe mkpudo kpuchie obi ha. Meekwa ka ịbụ ọnụ gị dịkwasị ha.
66 なんぢは震怒をもてかれらを追ひ ヱホバの天の下よりかれらをほろぼし絶たまはん
Site nʼiwe gị chụọ ha ọsọ. Laakwa ha nʼiyi nʼiwe gị, ka ha ghara ịdịkwa nʼokpuru eluigwe nke Onyenwe anyị ọzọ.

< 哀歌 3 >