< ヨシュア記 5 >

1 ヨルダンの彼旁に居るアモリ人の諸の王および海邊に居るカナン人の諸の王はヱホバ、ヨルダンの水をイスラエルの人々の前に乾涸して我らを濟らせたまひしと聞きイスラエルの人々の事によりて神魂消え心も心ならざりき
Mgbe ndị eze ndị Amọrait niile, ndị bi nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, na ndị eze ndị Kenan niile bi nʼakụkụ oke osimiri Mediterenịa, nụrụ na Onyenwe anyị emeela ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu ụmụ Izrel, ruo mgbe anyị niile gafesịrị, obi lọrọ ha mmiri. Ọ dịkwaghị ike ọbụla fọdụụrụ ha iguzo nʼihu ụmụ Izrel.
2 その時ヱホバ、ヨシユアに言たまひけるは汝石の小刀を作り重て復イスラエルの人々に割禮を行なへと
Ma nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya, “Jiri nkume mee mma ị ga-eji bie ụmụ Izrel niile ugwu ọzọ.”
3 ヨシユアすなはち石の小刀を作り陽皮山にてイスラエルの人々に割禮を行へり
Ya mere, Joshua ji nkume mee mma ntakịrị e ji bie ụmụ Izrel niile ugwu. Ebe a nọ bie ụmụ Izrel ugwu bụ ebe a na-akpọ Gibịat Haaralot.
4 ヨシユアが割禮を行ひし所以は是なりエジプトより出きたりし民の中の一切の男すなはち軍人は皆エジプトを出し後途にて荒野に死たりしが
Nke a bụ ihe mere o ji mee otu a: Ndị ikom niile si nʼIjipt pụta, ndị tozuru ije agha, nwụrụ nʼụzọ, nʼime ọzara, mgbe ha hapụchara Ijipt.
5 その出來し民はみな割禮を受たる者なりき然どエジプトを出し後途にて荒野に生れし民には皆割禮を施こさざりき
Mgbe ụmụ Izrel niile si Ijipt pụta, e biri ndị nwoke niile nọ nʼetiti ha ugwu. Ma nʼime iri afọ anọ ahụ ha na-awagharị nʼọzara, o nweghị ụmụ ha ndị nwoke a mụrụ nʼoge a e biri ugwu.
6 そもそもイスラエルの人々は四十年の間荒野を歩みをりて終にそのエジプトより出來し民すなはち軍人等ことごとく亡はてたり是ヱホバの聲に聽したがはざりしに因てなり是をもてヱホバかれらの先祖等に誓ひて我等に與へんと宣まひし地なる乳と蜜との流るる地を之に見せじと誓たまへり
Ndị Izrel niile awagharịala nʼọzara iri afọ anọ tutu ruo mgbe ndị ikom niile toruru ije agha, bụ ndị hapụrụ Ijipt nwụchara, ebe ọ bụ na ha jụrụ irubere Onyenwe anyị isi. Nʼihi na Onyenwe anyị ṅụrụ iyi sị ha na ha agaghị ahụ ala ahụ anya, bụ ala ahụ o kwere nna nna ha na nkwa, inye anyị, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.
7 かれらに継て興らしめたまひしその子輩にはヨシユア割禮を行へりかれらは途にて割禮を施さざりしによりて割禮なきものなりければなり
Onyenwe anyị mere ka ụmụ ndị nnupu isi a mụtara nọchie anya ha. Ọ bụkwa ndị a ka Joshua biri ugwu, nʼihi na tutu ruo ugbu a, e bibeghị ha ugwu.
8 一切の民に割禮を行ふこと畢りぬれば民は陣營に其儘居てその痊るを待り
Mgbe e bizuru mba niile ahụ ugwu, ha nọdụrụ nʼebe ahụ ha mara ụlọ ikwu tutu ọnya obibi ugwu ha alaa.
9 時にヱホバ、ヨシユアにむかひて我今日エジプトの羞辱を汝らの上より轉ばし去りと宣まへり是をもてその處の名を今日までギルガル(轉)と稱ふ
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị, “Taa, ewezugala m site nʼebe unu nọ ihe nkọcha nke ya na Ijipt so.” Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ Gilgal. Ọ bụkwa aha ya ruo taa.
10 イスラエルの人々ギルガルに營を張りその月の十四日の晩ヱリコの平野にて逾越節を行へり
Mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal nʼala ihe nʼadịghị nke Jeriko, ha mere Mmemme Ngabiga nʼuhuruchi nke ụbọchị iri na anọ nke ọnwa ahụ.
11 而して逾越節の翌日その地の穀物酵いれぬパンおよび烘麥をその日に食ひけるが
Nʼụbọchị sotere ụbọchị ngabiga, nʼotu ụbọchị ahụ, ha riri ụfọdụ ihe ubi nke ala Kenan. Ọ bụ achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na ọka ahụrụ nʼọkụ ka ha tara.
12 その地の穀物を食ひし翌日よりしてマナの降ることを止みてイスラエルの人々かさねてマナを獲ざりき其年はカナンの地の產物を食へり
Mánà kwụsịkwara nʼechi ya mgbe ha riri nri sitere nʼala ahụ. Ụmụ Izrel ahụkwaghị mánà anya ọzọ, ma nʼafọ ahụ ha riri ihe omume ubi si nʼala Kenan.
13 ヨシユア、ヱリコの邊にあひける時目を擧て觀しに一箇の人劍を手に抜持て己にむかひて立ゐければヨシユアすなはちその許にゆきて之に言ふ汝は我等を助くるか將われらの敵を助くるか
Mgbe Joshua nọ nso obodo Jeriko, o weliri anya ya elu hụ otu nwoke ka o guzo nʼihu ya. Nwoke a mịpụtara mma agha ya jide ya nʼaka ya. Joshua jekwuru ya jụọ ya sị ya, “Ị dịnyeere anyị ka ị dịnyeere ndị iro anyị?”
14 かれいひけるは否われはヱホバの軍旅の將として今來れるなりとヨシユア地に俯伏て拝し我主なにを僕に告んとしたまふやと之に言り
Nwoke ahụ zaghachiri ya sị, “Ọ dịghị onye m dịnyeere, kama abịara m ugbu a dịka ọchịagha usuu ndị agha Onyenwe anyị.” Joshua dara nʼala kpuo ihu ya nʼala kpọọ isiala nye ya, sị ya, “Ejikerela m ime ihe ọbụla i nyere nʼiwu. Onyenwe m, gịnị ka ị chọrọ ka m mee?”
15 ヱホバの軍旅の將ヨシユアに言けるは汝の履を足より脱され汝が立をる處は聖きなりとヨシユア然なしぬ
Ọchịagha usuu ndị agha Onyenwe anyị zara sị Joshua, “Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ.” Joshua mere dịka ọ gwara ya.

< ヨシュア記 5 >