< ヨシュア記 20 >

1 茲にヱホバ、ヨシユアに告て言たまひけるは
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya,
2 汝イスラエルの子孫に告て言へ汝等モーセによりて我が汝らに語りおきし逃遁の邑を擇び定め
“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha họpụtara onwe unu obodo mgbaba dịka m gwara unu site nʼaka Mosis.
3 誤りて知ずに人を殺せる者を其處に逃れしめよ是は汝らが仇打する者を避て逃るべき處なり
Ka obodo ndị a bụrụ ebe onye gburu mmadụ nʼọghọm na-amaghị ama ga-agbaga nʼihi izere ndụ ya site nʼaka onye ahụ ga-achọ ịbọrọ ọbọ ọchụ.
4 斯る者は是等の邑の一に逃れゆき邑の門の入口に立てその邑の長老等の耳にその事情を述べし然る時は彼ら之をその邑に受いれ處を與へて己の中に住しむべし
Mgbe onye gburu mmadụ ahụ na-amaghị ama gbabara nʼime otu obodo ndị a, ọ ga-eguzo nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ gwa ndị okenye obodo ahụ ihe niile mere. Ndị okenye ahụ ga-akpọbata ya nʼime obodo ahụ, nye ya ebe ọ ga-ebi nʼetiti ha.
5 假令仇打する者追ゆくとも彼らその人を殺せる者を之が手に交すべからず其は彼知ずして人を殺せるにて素より之を惡みをりしに非ればなり
Ọ bụrụkwa na onye ikwu onye ahụ nwụrụ anwụ abịa ịbọrọ ọbọ ọchụ ahụ, ndị okenye obodo ahụ agaghị ekwe ka e gbuo onye ahụ gburu mmadụ na-amaghị ama, nʼihi na onye ahụ akpachaghị anya mee ihe o mere.
6 その人は會衆の前に立て審判を受るまで其時の祭司の長の死る迄その邑に住をるべし然る後その人を殺せる者己の邑に歸り往てその家にいたり己が逃いでし邑に住むべし
Onye ahụ gburu mmadụ na-amaghị ama ga-anọgide nʼobodo ahụ ruo mgbe ọ ga-akwụrụ nʼihu nzukọ maka ikpe ruokwa mgbe onyeisi nchụaja nọ nʼoge ahụ nwụrụ. Mgbe ahụ, o nwere ike laghachi nʼụlọ nke aka ya na nʼobodo ya bụ ebe o si gbapụ ọsọ.”
7 爰にナフタリの山地なるガリラヤのケデシ、エフライムの山地なるシケムおよびユダの山地なるキリアテアルバ(すなはちヘブロン)を之がために分ち
Obodo ndị ha kewapụtara iche dịka obodo mgbaba bụ, Kedesh, nke dị nʼime Galili, nʼala ugwu ugwu ndị Naftalị; na Shekem, nke dị nʼala ugwu ugwu Ifrem na Kiriat Aba, nke a na-akpọkwa Hebrọn. Ọ dị nʼala ugwu ugwu Juda.
8 またヨルダンの彼旁ヱリコの東の方にてはルベンの支派の中より平地なる荒野のベゼルを擇び定めガドの支派の中よりギレアデのラモテを擇び定めマナセの支派の中よりバシヤンのゴランを擇び定めたり
Ha kewapụtara obodo atọ ọzọ nʼihi otu ihe ahụ, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan nʼofe Jeriko. Obodo atọ ndị a bụ, Beza, nke dị nʼọzara, nʼala larịị ahụ e nyere ebo Ruben, na Ramọt; nke dị nʼime Gilead bụ ala ebo Gad; na Golan, nʼime Bashan, nke e si nʼala ebo Manase wepụta.
9 是すなはちイスラエルの一切の子孫および之が中に寄寓をる他國人のために設けたる邑々にして凡て人を誤まり殺せる者を此に逃れしめ其會衆の前に立ざる中に仇打の手に死るがごときことなからしめんためなり
Obodo mgbaba ndị a a họpụtara bụ maka ndị ọbịa bi nʼetiti ụmụ Izrel, na maka ụmụ Izrel. Ọ bụ ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama ga-agbaga. Onye na-abọrọ ọbọ ọchụ agaghị egbukwa onye ahụ tupu e kpee ya ikpe nʼọgbakọ ndị Izrel.

< ヨシュア記 20 >