< ヨブ 記 37 >

1 之がためにわが心わななき その處を動き離る
“Nʼihi nke a, obi m na-ama jijiji, na-amali elu site nʼọnọdụ ya.
2 神の聲の響およびその口より出る轟聲を善く聽け
Gee ntị! Gee ntị nụrụ ụda olu ya, na ụzụ nke si nʼọnụ ya apụta.
3 これを天が下に放ち またその電光を地の極にまで至らせたまふ
Ọ na-atọpụ amụma ya ka ọ na-ejeru nʼokpuru eluigwe niile, ọ na-ezisakwa ya ebe niile ụwa sọtụrụ.
4 その後聲ありて打響き 彼威光の聲を放ちて鳴わたりたまふ その御聲聞えしむるに當りては電光を押へおきたまはず
Nke a gasịa, ihe ọzọ na-eso ya bụ mbigbọ nke olu ike ya; ụda olu ya na ada ụda dịka egbe eluigwe, mgbe olu ahụ dara dakwasị, ọ naghị egbochi amụma igbu egbu.
5 神奇しくも御聲を放ちて鳴わたり 我儕の知ざる大なる事を行ひたまふ
Nʼụzọ dị ebube ka olu Chineke si ada dịka egbe eluigwe; ọ na-eme ọtụtụ ihe ukwuu nke anyị na-apụghị ịghọta.
6 かれ雪にむかひて地に降れと命じたまふ 雨すなはちその權能の大雨にも亦しかり
Nʼihi na ọ bụ ya na-agwa snoo okwu sị: ‘Daa nʼelu ala,’ na-agwakwa mmiri ozuzo okwu sị, ‘Zoo nnukwu mmiri ozuzo.’
7 斯かれ一切の人の手を封じたまふ 是すべての人にその御工作を知しめんがためなり
Ka mmadụ o kere mata akaọrụ ya; ọ na-emekwa ka mmadụ ọbụla kwụsị ịdọgbu onwe ya nʼọrụ.
8 また獸は穴にいりてその洞に居る
Ụmụ anụmanụ bi nʼọhịa na-agbaba zoo onwe; ha na-anọgide nʼebe obibi ha.
9 南方の密室より暴風きたり 北より寒氣きたる
Oke ifufe na-esite nʼụlọ ya na-abịa, oyi na-esitekwa nʼikuku na-agbasa agbasa.
10 神の氣吹によりて氷いできたり 水の寛狹くせらる
Iku ume Chineke na-emepụta mkpụrụ mmiri, ogbu mmiri na-akpụkọtakwa.
11 かれ水をもて雲に搭載せまた電光の雲を遠く散したまふ
Ọ na-eme ka igwe ojii jupụta na mmiri; na-eme ka amụma gbuo nʼime igwe ojii.
12 是は神の導引によりて週る 是は彼の命ずるところを盡く世界の表面に爲んがためなり
Site na ntụziaka ya ka ha na-echigharị onwe ha gburugburu imezu ihe ọbụla ọ chọrọ ka ha mee nʼelu ụwa niile.
13 その之を來らせたまふは或は懲罰のため あるひはその地のため 或は恩惠のためなり
Ọ na-ewebata igwe ojii maka ịta ndị mmadụ ahụhụ, na-eweta ya maka ime ka mmiri zokwasị elu ala igosi ịhụnanya ya.
14 ヨブよ是を聽け 立ちて神の奇妙き工作を考がへよ
“Job, gee ntị. Tulee ọrụ ebube niile Chineke na-arụ.
15 神いかに是等に命を傳へその雲の光明をして輝やかせたまふか汝これを知るや
Ị maara otu Chineke si achịkọta igwe ojii na-eme ka amụma gbuo?
16 なんぢ雲の平衡知識の全たき者の奇妙き工作を知るや
Ị maara otu Chineke si kwụba igwe ojii na mbara eluigwe, nke bụ ọrụ ebube onye ihe ọmụma ya zuruoke?
17 南風によりて地の穩かになる時なんぢの衣服は熱くなるなり
Gị onye uwe i yi nʼahụ na-ekpo gị ọkụ mgbe ụwa dere jii nʼihi ifufe na-esite na ndịda na-abịa,
18 なんぢ彼とともに彼の堅くして鑄たる鏡のごとくなる蒼穹を張ることを能せんや
ị pụrụ iso ya tụsaa mbara eluigwe nke dị ike dịka enyo bronz a wụrụ awụ?
19 われらが彼に言ふべき事を我らに敎へよ 我らは暗昧して言詞を列ぬること能はざるなり
“Gwa anyị ihe anyị ga-azaghachi ya; ebe ọ bụ na anyị apụghị ido okwu anyị nʼusoro nʼihi ọchịchịrị nke anyị nọ nʼime ya.
20 われ語ることありと彼に告ぐべけんや 人あに滅ぼさるることを望まんや
A ga-agwa ya na m nwere okwu? Ọ dị mmadụ ọbụla ga-achọ ka e loda ya?
21 人いまは雲霄に輝やく光明を見ること能はず 然れど風きたりて之を吹清む
Ugbu a, ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ilekwasị anyanwụ anya ka ọ na-achake na mbara igwe, mgbe ifufe ji ngwangwa gabiga mee ka o nwuo ọcha.
22 北より黄金いできたる 神には畏るべき威光あり
Nʼugwu ka ebube na-enwu dịka ọlaedo si apụta; Chineke na-eji ebube dị egwu na-abịa.
23 全能者はわれら測りきはむることを得ず 彼は能おほいなる者にいまし審判をも公義をも抂たまはざるなり
Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye anyị na-enweghị ike chọta. Ike ya dị ukwuu, nʼikpe ikpe ya ziri ezi na ezi omume ya bara ụba, ọ naghị emegbu mmadụ.
24 この故に人々かれを畏る 彼はみづから心に有智とする者をかへりみたまはざるなり
Ya mere, ụmụ mmadụ na-atụ egwu ya, ọ bụ na o nweghị nsọpụrụ nye ndị niile obi ha maara ihe?”

< ヨブ 記 37 >