< ヨブ 記 28 >

1 白銀掘いだす坑あり 煉るところの黄金は出處あり
Olulu e si egwupụta ọlaọcha dị; ebe a na-anụcha ọlaedo dịkwa.
2 鐡は土より取り 銅は石より鎔して獲るなり
E si nʼime ala ewepụta igwe, ọlanchara na-agbazepụta site nkume na-aghọ ọla.
3 人すなはち黑暗を破り極より極まで尋ね窮めて黑暗および死蔭の石を求む
Mmadụ na-eme ka ọchịchịrị nwee ọgwụgwụ; ọ na-enyochapụta ihe dị ebe dị anya, na-achọ igwe nʼime oke ọchịchịrị.
4 その穴を穿つこと深くして上に住む人と遠く相離れ その上を歩む者まつたく之を覺えず 是のごとく身を縋下げ 遙に人と隔りて空に懸る
Ọ na-egwu olulu nʼebe dị anya site nʼebe mmadụ bi, nʼebe ụkwụ mmadụ na-adịghị eru, nʼebe ahụ dị anya site nʼebe mmadụ bi ka ha na-akwụfegharị.
5 地その上は食物を出し 其下は火に覆へさるるがごとく覆へる
Ala ahụ e si na ya enweta nri, abụrụla ihe e ji ọkụ gbanwee nʼokpuru ya.
6 その石の中には碧の玉のある處あり 黄金の沙またその内にあり
Safaia bụ nkume dị oke ọnụahịa dị na nkume ya; aja ya nwekwara mkpụrụ ọlaedo.
7 その逕は鷙鳥もこれを知ず 鷹の目もこれを看ず
Ọ dịghị anụ ufe nke na-eri anụ maara ụzọ ahụ zoro ezo; anya agụ nkwọ ọbụla ahụtụbeghị ya.
8 鷙き獸も未だこれを踐ず 猛き獅子も未だこれを通らず
Anụ ọhịa dị nganga anaghị azọnye ụkwụ nʼelu ya, ọdụm ọbụla adịghị awagharị nʼebe ahụ.
9 人堅き磐に手を加へまた山を根より倒し
Ndị mmadụ na-eji aka na-etiwasị nkume ahụ na-enwu ọkụ mee ka mgbọrọgwụ ugwu ahụ pụta ìhè.
10 岩に河を掘り各種の貴き物を目に見とめ
Ha na-awapụta ọwa ụzọ nʼetiti nkume ahụ, anya ha na-ahụkwa akụnụba ya niile.
11 水路を塞ぎて漏ざらしめ隱れたる寳物を光明に取いだすなり
Ha na-achọpụta isi mmiri niile ma meekwa ka ihe nzuzo pụta ìhè.
12 然ながら智慧は何處よりか覓め得ん 明哲の在る所は何處ぞや
Ma olee ebe ka a ga-achọta amamihe? Olee kwa ebe nghọta bi?
13 人その價を知ず人のすめる地に獲べからず
Mmadụ apụghị ịghọta ọnụahịa ya, agaghị achọtakwa ya nʼala ndị dị ndụ.
14 淵は言ふ我の内に在ずと 海は言ふ我と偕ならずと
Ogbu mmiri na-asị, “Ọ dịghị nʼime m,” osimiri na-asị, “Ọ dịghị nʼaka m.”
15 精金も之に換るに足ず 銀も秤りてその價となすを得ず
A gaghị eji ọlaedo a nụchara nke ọma zụta ya, apụghị ịtụ ihe bụ ọnụahịa ya nʼọlaọcha.
16 オフルの金にてもその價を量るべからず 貴き靑玉も碧玉もまた然り
A gaghị eji ọlaedo nke Ọfịa zụta ya, a gaghị ejikwa nkume dara oke ọnụahịa nke ọniks maọbụ safaia zụta ya,
17 黄金も玻璃もこれに並ぶ能はず 精金の器皿も之に換るに足ず
A gaghị eji ọlaedo maọbụ kristal tụnyere ya, maọbụ iji ejiji ọlaedo nweta ya.
18 珊瑚も水晶も論にたらず 智慧を得るは眞珠を得るに勝る
Koral na jaspa erughị ihe a na-akpọtụ aha nʼebe ọ dị; ọnụahịa nke amamihe karịrị ọtụtụ rubi.
19 エテオビアより出る黄玉もこれに並ぶあたはず 純金をもてするともその價を量るべからず
A gaghị eji ọla topaazi nke Kush tụnyere ya; a pụghị iji ọlaedo a nụchara anụcha zụta ya.
20 然ば智慧は何處より來るや 明哲の在る所は何處ぞや
Olee ebe amamihe si abịa? Olee ebe nghọta bi?
21 是は一切の生物の目に隱れ 天空の鳥にも見えず
E zoro ya ezo site nʼanya ihe niile dị ndụ, e kpuchikwara ya nye ọ bụladị anụ ufe nke eluigwe.
22 滅亡も死も言ふ 我等はその風聲を耳に聞し而已
Mbibi na ọnwụ na-asị; “Naanị akụkọ ya ruru anyị ntị.”
23 神その道を曉り給ふ 彼その所を知りたまふ
Chineke ghọtara ụzọ ya, naanị ya makwara ebe obibi ya dị.
24 そは彼は地の極までも觀そなはし天が下を看きはめたまへばなり
Nʼihi na ọ na-ahụ nsọtụ nke ụwa, na-ahụkwa ihe niile dị nʼokpuru eluigwe.
25 風にその重量を與へ 水を度りてその量を定めたまひし時
Mgbe o hiwere ike nke ikuku, tụọkwa mmiri nʼihe ọtụtụ,
26 雨のために法を立て 雷霆の光のために途を設けたまひし時
mgbe o nyere mmiri ozuzo iwu meekwa ụzọ nye egbe eluigwe na oke ikuku,
27 智慧を見て之を顯はし之を立て試みたまへり
mgbe ahụ, o lere amamihe anya, nyochasịa ya, meekwa ka o guzosie ike, ma nwapụtakwa ya.
28 また人に言たまはく視よ主を畏るるは是智慧なり 惡を離るるは明哲なり
Ọ sịrị mmadụ, “Ịtụ egwu Onyenwe anyị, nke ahụ bụ amamihe; ọzọ, ị sị nʼihe ọjọọ wezuga onwe bụ nghọta.”

< ヨブ 記 28 >