< エレミヤ書 47 >

1 パロがガザを撃ざりし先にペリシテ人の事につきて預言者ヱレミヤに臨みしヱホバの言
Okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere ndị Filistia. Okwu ndị a bịara tupu Fero ebuso obodo Gaza agha.
2 ヱホバかくいひたまふ視よ水北より起り溢れながれて此地と其中の諸の物とその邑と其中に住る者とに溢れかかるべしその時人衆は叫びこの地に住る者は皆哭くべし
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee ka mmiri si ala elu nʼakụkụ ugwu; ha ga-aghọkwa mmiri nke na-erubiga oke. Ha ga-erukwasị ala ahụ, kpuchiekwa ihe niile dị nʼime ya, ọ ga-ekpuchikwa obodo niile dị nʼala ahụ, na ndị bi nʼime ya. Ndị niile bi nʼala ahụ ga-eti mkpu akwa, mmadụ niile ga-akwasikwa akwa ike.
3 その逞しき馬の蹄の蹴たつる音のため其車の響のため其輪の轟のために父は手弱りて己の子女を顧みざるなり
Mgbe ha ga-anụ ụzụ ikiri ụkwụ nke ọtụtụ ịnyịnya, nke na-agbata ọsọ na-abịa nʼebe ha nọ, mgbe ha ga-anụkwa ụzụ ụgbọ agha ndị iro, na ụzụ nzọ ụkwụ igwe ha. Nʼoge ahụ, ndị bụ nna agaghị enwe ike nyere ụmụ ha aka, nʼihi na aka ha ga-akụda nʼakụkụ ha.
4 是ペリシテ人を滅しつくしツロとシドンにのこりて助力をなす者を悉く絕す日來ればなりヱホバ、カフトルの地に遺れるペリシテ人を滅したまふべし
Nʼihi na ụbọchị ahụ abịala mgbe a ga-ebibi ndị Filistia niile, mgbe a ga-ebipụ ndị niile fọdụrụ, ndị nwere ike inyere obodo Taịa na Saịdọn aka. Nʼihi na Onyenwe anyị akwadoola ibibi ndị Filistia, o kwadoola ibibi ndị ahụ fọdụrụ nʼọnụ mmiri Kafto.
5 ガザには髮を剃るの事はじまるアシケロンと其剩餘の平地は滅ぼさる汝いつまで身に傷くるや
Gaza ga-akpụcha isi ya nʼọnọdụ iru ụjụ. A ga-eme ka Ashkelọn dere duu. Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-egbukasị onwe unu ahụ, unu bụ ndị fọdụrụ afọdụ bi nʼala dị larịị?
6 ヱホバの劍よ汝いつまで息まざるや汝の鞘に歸りて息み靜まれ
“‘Ewoo, gị mma agha Onyenwe anyị, ole mgbe ị ga-ezu ike? Mịnye onwe gị nʼọbọ gị, kwụsị ịkpa ike gị ma dere duu.’
7 ヱホバこれに命じたるなればいかで息むことをえんやアシケロンと海邊を攻ることを定めたまへり
Ma ọ ga-esikwanụ aṅaa zuru ike, ebe ọ bụ Onyenwe anyị nyere ya iwu ibu agha megide Ashkelọn, na ndị bi nʼọnụ mmiri oke osimiri?”

< エレミヤ書 47 >