< エレミヤ書 44 >

1 エジプトの地に住るところのユダの人衆すなはちミグドル、タパネス、ノフ、パテロスの地に住る者の事につきてヱレミヤに臨みし言に曰く
Ndị a bụ okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juu ahụ niile bi nʼala Ijipt, bụ ndị bi na Migdol, na nʼime Tapanhis, na nʼime Memfis, na nʼime Patros,
2 萬軍のヱホバ、イスラエルの神かくいふ汝らは我ヱルサレムとユダの諸邑に降せしところの災をみたり視よこれらは今日すでに空曠となりて住む人なし
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu ji anya unu hụ ihe ọjọọ ahụ niile m mere ka ha bịakwasị Jerusalem, na obodo niile nke Juda. Lee, obodo ndị ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe taa, o nwekwaghị onye bi nʼime ha.
3 こは彼ら惡をなして我を怒らせしによる即ちかれらは己も汝らも汝らの先祖等も識ざるところの他の神にゆきて香を焚き且これに奉へたり
Ihe ndị a bịakwasịrị ha nʼihi ihe ọjọọ ha mere. Ha kpasuru m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na site nʼife chi ndị ọzọ, ndị ha onwe ha maọbụ nna nna ha na-amaghị.
4 われ我僕なる預言者たちを汝らに遣し頻にこれを遣して請ふ汝らわが嫌ふところの此憎むべき事を行ふ勿れといはせけるに
Site nʼoge ruo nʼoge, mgbe mgbe, eziteere m ha ndị ohu m, bụ ndị amụma, ndị gwara ha okwu sị ha, ‘Unu emela ihe arụ dị otu a nke m kpọrọ asị!’
5 彼ら聽かず耳を傾けず他の神に香を焚きてその惡を離れざりし
Ma ha egeghị ntị, ha atọkwaghị ntị ha nʼala. Ha esiteghị nʼihe ọjọọ ha na-eme chegharịa, maọbụ kwụsị ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ.
6 是によりて我震怒とわが憤恨ユダの諸邑とヱルサレムの街にそそぎて之を焚たれば其等は今日のごとく荒れかつ傾圮たり
Nʼihi ya, awụkwasịrị m ha ọnụma m na iwe m, nke rere dịka ọkụ megide obodo niile nke Juda, na okporoụzọ nke Jerusalem. Ya mere, ha ghọrọ mkpọmkpọ ebe na ebe tọgbọrọ nʼefu taa.
7 萬軍の神イスラエルの神ヱホバいまかくいふ汝ら何なれば大なる惡をなして己の靈魂を害しユダの中より汝らの男と女と孩童と乳哺子を絕て一人も遺らざらしめんとするや
“Ma ugbu a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Nʼihi gịnị ka unu ji chọọ iji aka unu wetara onwe unu ihe ọjọọ ndị a? Lee ka unu si duru ndị ikom na ndị inyom niile, na ụmụntakịrị niile, na ụmụ a mụrụ ọhụrụ niile na-agbala nʼala Ijipt, si otu a mee ka, ọ bụladị, otu mkpụrụ mmadụ hapụ ịfọdụkwa nʼala Juda.
8 何なれば汝ら其手の行爲をもて我を怒らせ汝らが往て住ふところのエジプトの地に於て他の神に香を焚きて己の身を滅し地の萬國の中に呪詛となり凌辱とならんとするや
Gịnị mere unu na-eji ọrụ aka unu na-akpasu m iwe, na-esurere chi ndị ọzọ ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼala Ijipt, ebe unu bịara ibi? Unu onwe unu ga-ala onwe unu nʼiyi, mekwaa onwe unu ihe ịbụ ọnụ nakwa ihe nkọcha nʼetiti mba niile dị nʼụwa.
9 ユダの地とヱルサレムの街にて行ひし汝らの先祖等の惡ユダの王等の惡其妻等の惡および汝らの身の惡汝らの妻等の惡を汝ら忘れしや
Unu echefuola ihe ọjọọ nna unu ha mere na ihe ọjọọ niile ndị eze Juda na ndị eze nwanyị Juda mere na ihe ọjọọ niile nke unu onwe unu na ndị nwunye unu mekwara nʼala Juda, na nʼokporoụzọ Jerusalem?
10 彼らは今日にいたるまで悔いずまた畏れず汝らと汝らの先祖等の前に立たる我律法とわが典例に循ひて行まざるなり
Ruo ụbọchị taa, o nwebeghị onye ọbụla nʼime ha wedarala onwe ya ala, maọbụ tụọ egwu m; ha adịghị ejegharị nʼiwu m, maọbụ jidesie ụkpụrụ ndị ahụ niile m debere nʼihu ha na nʼihu nna nna ha aka ike, ịgbaso ya.
11 是故に萬軍のヱホバ、イスラエルの神かくいふ視よわれ面を汝らにむけて災を降しユダの人衆を悉く絕ん
“Nʼihi ihe ndị a niile, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ekpebiela m ime ka ihe ọjọọ bịakwasị unu; ekpebiela m ibibi Juda.
12 又われエジプトの地にすまんとてその面をこれにむけて往しところの彼ユダの遺れる者を取らん彼らは皆滅されてエジプトの地に仆れん彼らは劍と饑饉に滅され微者も大者も劍と饑饉によりて死べし而して呪詛となり詫異となり罵詈となり凌辱とならん
Aga m eme ka ndị ahụ niile fọdụrụ nʼala Juda, bụ ndị ahụ kpebiri nʼobi ha ịga biri nʼala Ijipt ghara ịdịkwa. A ga-ala ha nʼiyi nʼala Ijipt; ha ga-ada site na mma agha, maọbụ site nʼụnwụ. Ndị niile dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha na ndị niile dịkarịsịrị nta ga-anwụ. Ha ga-aghọkwa ihe ịbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe ọmụma ikpe na ihe nkọcha.
13 われヱルサレムを罰せし如く劍と饑饉と疫病をもてエジプトに住る者を罰すべし
Dịka m si taa Jerusalem ahụhụ, otu a ka m ga-esi jiri mma agha, na ụnwụ, na ọrịa na-efe efe, taa ndị ahụ bi nʼIjipt ahụhụ.
14 是をもてエジプトの地に往て彼處に住るところのユダの遺れる者の中に一人も逃れまたは遺りてその心にしたひて歸り住はんとねがふところのユダの地に歸るもの無るべし逃るる者の外には歸る者無るべし
O nweghị onye ọbụla nʼime ndị Juda ahụ fọdụrụ, ndị gara biri nʼIjipt nke ga-agbanarị ọnwụ. Ọ bụ ezie na ọ na-agụsị ha agụụ ike ịlọghachi nʼala Juda, ma o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-alọghachi, karịakwa mmadụ ole na ole ndị ga-agbapụ agbapụ.”
15 是に於てその妻が香を他の神に焚しことを知れる人々および其處に立てる婦人等の大なる群衆並にエジプトの地のパテロスに住るところの民ヱレミヤに答へて云けるは
Ndị nọ nʼebe ahụ mgbe ahụ Jeremaya kwuru okwu ndị a bụ ndị ikom ahụ niile maara na ndị nwunye ha na-achụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, na ndị niile bi nʼIjipt nʼakụkụ Patros. Ndị a zara Jeremaya sị ya,
16 汝がヱホバの名をもてわれらに述し言は我ら聽かじ
“Anyị agaghị anabata okwu ahụ i si nʼaha Onyenwe anyị gwa anyị
17 我らは必ず我らの口より出る言を行ひ我らが素なせし如く香を天后に焚きまた酒をその前に灌ぐべし即ちユダの諸邑とヱルサレムの街にて我らと我らの先祖等および我らの王等と我らの牧伯等の行ひし如くせん當時われらは糧に飽き福をえて災に遇ざりし
Nʼihi na anyị aghaghị ime ihe ndị ahụ anyị kpebiri ime. Anyị ga-achụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Anyị ga-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ dịka anyị na nna anyị ha, ndị eze anyị na ndịisi ọchịchị anyị mere nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem. Nʼoge ahụ, anyị na-eriju afọ, ihe na-agakwara anyị nke ọma, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị anyị.
18 我ら天后に香を焚くことを止め酒をその前に灌がずなりし時より諸の物に乏しくなり劍と饑饉に滅されたり
Ma site nʼoge anyị kwụsịrị ịchụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja, ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na ịwụsara ya aja ihe ọṅụṅụ, ihe niile akọla anyị, ọ bụkwa site na mma agha na oke ụnwụ ka anyị na-ala nʼiyi.”
19 我らが天后に香を焚き酒をその前に灌ぐに方りて之に象りてパンを製り酒を灌ぎしは我らの夫等の許せし事にあらずや
Ndị inyom ahụ niile kwukwara sị, “Mgbe ahụ anyị na-eji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-achụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja na mgbe ahụ anyị na-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ, ọ bụ na ndị di na-alụ anyị amaghị na anyị na-eme achịcha nʼoyiyi ya, na-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ?”
20 ヱレミヤ即ち男女の諸の人衆および此言をもて答へたる諸の民にいひけるは
Mgbe ahụ, Jeremaya gwara mmadụ ahụ niile okwu, ma ndị ikom ma ndị inyom ahụ niile zara ya okwu sị ha,
21 ユダの諸邑とヱルサレムの街にて汝らと汝らの先祖等および汝等の王等と汝らの牧伯等および其地の民の香を焚しことはヱホバ之を憶えまた心に思ひたまふにあらずや
“Onyenwe anyị chetara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile unu na nna unu ha, na ndị eze unu, na ndịisi ọchịchị unu, na ndị Izrel niile ji chụọ aja nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem niile.
22 ヱホバは汝らの惡き爲のため汝らの憎むべき行の爲に再び忍ぶことをえせざりきこの故に汝らの地は今日のごとく荒地となり詫異となり呪詛となり住む人なき地となれり
Nʼihi ya, mgbe Onyenwe anyị na-enweghịkwa ike ịnagide ihe ọjọọ niile ndị a unu mere, na ihe arụ niile unu mere, o mere ka ala unu ghọọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, nke mmadụ na-ebighị nʼime ya, dịka ọ dị taa.
23 汝ら香を焚きヱホバに罪を犯しヱホバの聲に聽したがはずその律法と憲法と證詞に循ひて行まざりしに由て今日のごとく此災汝らにおよべり
Nʼihi na unu surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nʼihi na unu mehiere megide Onyenwe anyị, ghara irubere ya isi, maọbụ ịgbaso iwu ya, maọbụ idebe ụkpụrụ ya, maọbụ imezu ihe niile ọ sịrị ka unu mee, nʼihi ya ka ihe ọjọọ ndị a ji dakwasị unu dịka unu na-ahụ ugbu a.”
24 ヱレミヤまたすべての民と婦等にいひけるはエジプトの地に居るユダの子孫よヱホバの言をきけ
Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndị inyom ahụ, na ndị Izrel niile okwu sị ha, “Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Juda niile nọ nʼIjipt.
25 萬軍のヱホバ、イスラエルの神かくいひたまふ汝らと汝らの妻等は口をもていひ手をもて成し我ら香を天后に焚き酒を灌ぎて立しところの誓を必ず成就んといふ汝ら必ず誓をたてかならず其誓を成就んとす
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu na ndị nwunye unu esitela nʼomume unu gosi na unu na-emezu ihe ndị ahụ unu ji ọnụ kwuo sị, ‘Anyị aghaghị imezu nkwa niile anyị kwere banyere ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nke ihe ọṅụṅụ nye Eze nwanyị mbara Eluigwe.’ “Gaanụ nʼihu mezuo nkwa unu kwere! Mezuokwanụ iyi unu ṅụrụ.
26 この故にエジプトの地に住るユダの人々よヱホバの言をきけヱホバいひたまふわれ我大なる名を指て誓ふエジプトの全地にユダの人々一人もその口に主ヱホバは活くといひて再び我名を稱ふることなきにいたらん
Ma nụrụkwanụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị Juu niile bi nʼIjipt, ‘Eji m aha m dị ukwuu na-aṅụ iyi,’ ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘na o nweghị onye Juda ọbụla bi nʼakụkụ ọbụla nke Ijipt, nke ga-akpọkukwa aha m ọzọ, maọbụ jiri ya ṅụọ iyi sị, “Dịka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-adị ndụ.”
27 視よわれ彼らをうかがはん是福をあたふる爲にあらず禍をくださん爲なりエジプトの地に居るユダの人々は劍と饑饉に滅びて絕るにいたらん
Nʼihi na anya m na-ele ha abụghị maka ime ha mma, kama ọ bụ maka ime ha ihe ọjọọ. Ndị Juu niile bi nʼIjipt ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼoke ụnwụ, tutu ruo mgbe e bibichara ha dum.
28 然ど劍を逃るる僅少の者はエジプトの地を出てユダの地に歸らん又エジプトの地にゆきて彼處に寄寓れるユダの遺れる者はその立ところの言は我のなるか彼らのなるかを知るにいたるべし
Naanị mmadụ ole na ole ga-esi Ijipt gbalata Juda ịgbanarị mma agha. Mgbe ahụ ndị Juda niile fọdụrụ, bụ ndị bịara biri nʼIjipt, ga-amata onye okwu ya na-eguzosi ike, maọbụ nke m, maọbụ nke ha.
29 ヱホバいひ給ふわがこの處にて汝らを罰する兆は是なり我かくして我汝らに禍をくださんといひし言の必ず立ことを知しめん
“‘Nke a ga-abụrụ unu ihe ama nke ga-egosi unu na m ga-ata unu ahụhụ nʼebe a,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Ka unu si otu a mara na mba m na-aba na m ga-emesi unu ike aghaghị iguzosi ike.’
30 すなはちヱホバかくいひたまふ視よわれユダの王ゼデキヤを其生命を索むる敵なるバビロンの王ネブカデネザルの手に付せしが如くエジプトの王パロホフラを其敵の手その生命を索むる者の手に付さん
Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m arara Fero Hofra, eze Ijipt nyefee nʼaka ndị iro ya, bụ ndị na-achọ ndụ ya, dịka m si rara Zedekaya eze Juda, nyefee nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, bụ onye iro ahụ chọrọ ndụ ya.’”

< エレミヤ書 44 >