< エレミヤ書 34 >

1 バビロンの王ネブカデネザルその全軍および己の手の下に屬するところの地の列國の人および諸の民を率てヱルサレムとその諸邑を攻めて戰ふ時ヱホバの言ヱレミヤに臨みていふ
Mgbe Nebukadneza eze Babilọn na ndị agha ya niile, na mba niile dị nʼalaeze nke ọ na-achị na-ebuso Jerusalem na obodo niile gbara ya gburugburu agha, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị,
2 イスラエルの神ヱホバかくいふ汝ゆきてユダの王ゼデキヤに告ていふべしヱホバかくいひたまふ視よわれ此邑をバビロン王の手に付さん彼火をもてこれを焚べし
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, Jekwuru Zedekaya bụ eze Juda, gwa ya sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ejikerela m ugbu a inyefe eze Babilọn obodo a nʼaka. Ọ ga-esurekwa ya ọkụ.
3 汝はその手を脱れず必ず擒へられてこれが手に付されん汝の目はバビロン王の目をみ又かれの口は汝の口と語ふべし汝はバビロンにゆくにいたらん
Ị gaghị agbanarị ya, nʼihi na ọ ga-ejide gị. A ga-arara gị nyefekwa ya nʼaka. Anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ eze Babilọn. Gị na ya ga-ekwurịtakwa okwu. Ị ga-agakwa Babilọn.
4 然どユダの王ゼデキヤよヱホバの言をきけヱホバ汝の事につきてかくいひたまふ汝は劍に死じ
“‘Ma nụrụkwa nkwa Onyenwe anyị na-ekwe gị, gị Zedekaya eze Juda. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere gị, Ị gaghị anwụ site na mma agha;
5 汝は安らかに死なん民は汝の先祖たる汝の先の王等の爲に香を焚しごとく汝のためにも香を焚き且汝のために嘆て嗚呼主よといはん我この言をいふとヱホバいひたまふ
ị ga-anwụ nʼudo. Dịka ndị mmadụ si mụnye ọkụ kwaa ozu nna gị ha, bụ ndị buru gị ụzọ chịa ka eze, otu a ka ha ga-esi mụnye ọkụ kwaa gị. Ha ga-eti aka nʼobi kwa akwa sị, “Ewoo, onyenwe anyị!” Ọ bụ mụ onwe m na-ekwe nkwa a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.’”
6 預言者エレミヤすなはち此言をことごとくヱルサレムにてユダの王ゼデキヤにつげたり
Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma gara gwa Zedekaya eze Juda ihe ndị a niile na Jerusalem.
7 時にバビロン王の軍勢はヱルサレムおよび存れるユダの諸の邑を攻めラキシとアゼカを攻て戰ひをる其はユダの諸邑のうちに是等の城の邑尚存りゐたればなり
Nʼoge a, ndị agha eze Babilọn na-ebuso Jerusalem agha. Ha na-ebusokwa obodo ndị ọzọ nke nọgidere na-ebuso ha agha, nke bụ obodo Lakish na Azeka. Obodo ndị a bụ naanị obodo fọdụrụ nʼala Juda nke ndị agha Babilọn na-emeribeghị.
8 ゼデキヤ王ヱルサレムに居る諸の民と契約を立てて彼らに釋放の事を宣示せし後ヱホバの言ヱレミヤに臨めり
Okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị mgbe Zedekaya bụ eze, na ndị Izrel niile gbachara ndụ na Jerusalem ịkpọsara ndị ohu niile nwere onwe ha.
9 その契約はすなはち人をしておのおの其僕婢なるヘブルの男女を釋たしめその兄弟なるユダヤ人を奴隸となさざらしむる者なりき
Onye ọbụla ga-ahapụ ohu ya bụ onye Hibru ka o nwere onwe ya, ma ohu ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị. A gaghị agụkwa onye Juu ọbụla dịka ohu ọzọ.
10 この契約をなせし牧伯等とすべての民は人おのおのその僕婢を釋ちて再び之を奴隸となすべからずといふをききて遂にそれに聽したがひてこれを釋ちしが
Ya mere, ndịisi ọchịchị niile, na ndị niile bụ ndị kwekọrịtara gbaa ndụ a, na ha ga-ahapụ ohu ha ndị nwoke na ndị nwanyị ka ha nwere onwe ha. Ha mekwara dịka ha si kwuo.
11 後に心をひるがへしてその釋ちし僕婢をひきかへりて再び之を伏從はしめて僕婢となせり
Ma mgbe oge nta gasịrị, ndị a niile gbanwere obi ha. Ha gara jide ohu ndị ahụ ha hapụrụ, mee ka ha ghọọkwa ndị ohu ha ọzọ.
12 是故にヱホバの言ヱホバよりヱレミヤにのぞみて云
Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
13 イスラエルの神ヱホバかくいふ我汝らの先祖をエジプトの地その奴隸たりし宅より導きいだせし時彼らと契約を立ていひけらく
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, kwuru, Mụ na nna nna unu ha gbara ndụ mgbe m si nʼala Ijipt, bụ ala ebe ha bụ ohu kpọpụta ha. Mgbe ahụ agwara m ha sị,
14 汝らの兄弟なるヘブル人の身を汝らに賣たる者をば七年の終に汝らおのおのこれを釋つべし彼六年汝につかへたらば之を釋つべしと然るに汝らの先祖等は我に聽ず亦その耳を傾けざりし
‘Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhapụ onye Hibru ibe unu resiri unu onwe ya dịka ohu, ka o nwerekwa onwe ya. Mgbe onye ahụ jeere unu ozi afọ isii, unu kwesiri ịhapụ ya ka o nwere onwe ya.’ Ma nna nna unu ha egeghị m ntị, ha etinyeghịkwa uche ha nʼiwu m nyere ha.
15 然ど汝らは今日心をあらためておのおの其鄰人に釋放の事を示してわが目に正とみゆる事を行ひ且我名をもて稱へらるる室に於て我前に契約を立たり
Na nwa oge nta gara aga unu chegharịrị mee ihe ziri ezi nʼanya m. Onye ọbụla nʼime unu kpọsara inwere onwe nye ndị unu. Unu gara nʼihu gbaa ndụ nʼihu m nʼime ụlọnsọ ahụ a kpọkwasịrị aha m.
16 然るに汝ら再び心をひるがへして我名を汚し各自釋ちて其心に任せしめたる僕婢をひき歸り再び之を伏從はしめて汝らの僕婢となせり
Ma ugbu a, unu echigharịala, merụọ aha m; onye ọbụla nʼime unu akpọghachikwala nye onwe ya ndị ohu ndị ikom na ndị inyom ahụ unu hapụrụ ka ha nwere onwe ha, gaa dịka o si masị mkpụrụobi ha. Unu akwagidekwala ha ka ha bụrụkwa ndị ohu unu ọzọ.
17 この故にヱホバかくいひたまふ汝ら我に聽ておのおの其兄弟とその鄰に釋放の事を示さざりしによりて視よわれ汝らの爲に釋放を示して汝らを劍と饑饉と疫病にわたさん我汝らをして地の諸の國にて艱難をうけしむべし
“Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu erubeghị isi nye m, unu ekwusaghị nwere onwe nye ndị unu. Ya mere, ugbu a mụ onwe m na-akpọsa ‘Inwere onwe’ nye unu, ka Onyenwe anyị kwubiri, ‘inwere onwe’ nke ịda nʼihi mma agha, na ajọ ọrịa na-efe efe, na oke ụnwụ. Aga m emekwa unu ka unu ghọọ ihe ịsọ oyi nye alaeze niile nke ụwa.
18 ヱホバこれを云ふ犢を兩にさきて其二個の間を過り我前に契約をたてて却つて其言に從はずわが契約をやぶる人々
Ma ndị ikom ahụ niile merụrụ ọgbụgba ndụ m, ndị ahụ na-edebezughị ọgbụgba ndụ ha gbara nʼihu m, ka m ga-eme ka ha dịrị ka nwa ehi ọgbụgba ndụ ahụ ha kpọwara abụọ, nke ha si nʼetiti ọkara abụọ ya gafee, maka imesi ọgbụgba ndụ ha ike.
19 即ち兩に分ちし犢の間を過りしユダの牧伯等ヱルサレムの牧伯等と寺人と祭司とこの地のすべての民を
Ndị ndu Juda na Jerusalem na ndị ozi eze na ndị nchụaja na ndị niile bi nʼala a ndị si nʼetiti ọkara nwa ehi ahụ gabiga
20 われ其敵の手とその生命を索る者の手に付さんその屍體は天空の鳥と野の獸の食物となるべし
ka m ga-enyefe nʼaka ndị iro ha ndị na-achọ iwepụ ndụ ha. Ozu ha ga-abụ ihe oriri nye anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa.
21 且われユダの王ゼデキヤとその牧伯等をその敵の手其生命を索むる者の手汝らを離れて去しバビロン王の軍勢の手に付さん
“Aga m enyefe Zedekaya eze Juda na ndịisi ọchịchị ya nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọ ndụ ha. Aga m enyefe ha nʼaka ndị agha eze Babilọn, ndị siterela nʼibuso unu agha wezuga onwe ha.
22 ヱホバいひたまふ視よ我彼らに命じて此邑に歸らしめん彼らこの邑を攻て戰ひ之を取り火をもて焚くべしわれユダの諸邑を住人なき荒地となさん
Aga m enye iwu, ka Onyenwe anyị kwubiri, mee ka a kpọghachi ha azụ nʼobodo a. Ha ga-ebuso ya agha, merie ya, surekwaa ya ọkụ. Aga m emekwa ka obodo Juda niile tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya.”

< エレミヤ書 34 >