< エレミヤ書 26 >

1 ユダの王ヨシヤの子ヱホヤキムが位に即し初のころヱホバより此言いでていふ
Na mmalite oge ahụ, Jehoiakim nwa Josaya eze Juda bidoro ịchị ndị Juda, Onyenwe anyị mere ka okwu ya rute Jeremaya ntị.
2 ヱホバかくいふ汝ヱホバの室の庭に立我汝に命じていはしむる諸の言をユダの邑々より來りてヱホバの室に拜をする人々に告よ一言をも減す勿れ
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Guzo nʼogige ụlọnsọ Onyenwe anyị. Nọdụ nʼebe ahụ gwa ndị niile si nʼobodo Juda bịa ịkpọ isiala nʼụlọnsọ Onyenwe anyị okwu. Gwa ha ihe ahụ niile m nyere gị nʼiwu. Mee ka ihe ndị ahụ niile m nyere gị nʼiwu rute ha ntị, na-afọdụghị otu.
3 彼等聞ておのおの其惡き途を離るることあらん然ば我かれらの行の惡がために災を彼らに降さんとせることを悔べし
Ma eleghị anya ha ga-anụ, si na mmehie ha chegharịa. Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ m na-ezube na ọ ga-abịakwasị ha ghara ịbịakwasị ha.
4 汝彼等にヱホバかくいふといへ汝等もし我に聽ずわが汝らの前に置し律法を行はず
Gwa ha sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụrụ na unu ajụ ige m ntị, jụkwa ịgbaso iwu m, nke m nyere unu.
5 我汝らに遣し切に遣せし我僕なる預言者の言を聽ずば(汝らは之をきかざりき)
Ọ bụrụkwa na unu ajụ ige ntị nʼokwu ndị ohu m bụ ndị amụma ahụ m ziteere unu site nʼoge ruo nʼoge (ndị unu nọgidekwara jụ ige ntị),
6 我この室をシロの如くになし又この邑を地の萬國に詛はるる者となすべし
mgbe ahụ, aga m eme ka ụlọnsọ a dịrị ka Shaịlo. Aga m emekwa ka obodo a bụrụ obodo a bụrụ ọnụ nʼetiti mba niile dị nʼụwa.’”
7 祭司と預言者及び民みなヱレミヤがヱホバの室に立てこの言をのぶるをきけり
Ndị nchụaja, na ndị amụma, na ndị mmadụ ndị ọzọ nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nụrụ mgbe Jeremaya kwuru okwu ndị a niile.
8 ヱレミヤ、ヱホバに命ぜられし諸の言を民に告畢りしとき祭司と預言者および諸の民彼を執へいひけるは汝は必ず死べし
Mgbe Jeremaya kwusiri okwu ndị ahụ Onyenwe anyị sị ya kwuo, ndị nchụaja ahụ, na ndị mmadụ ndị ọzọ, na ndị amụma ahụ niile, jidere ya sị ya, “Ị ghaghị ịnwụ!
9 汝何故にヱホバの名をもて預言し此室はシロの如くになりこの邑は荒蕪となりて住む者なきにいたらんと云しやと民みなヱホバの室にあつまりてヱレミヤを攻む
Gịnị mere i ji buo amụma na ụlọnsọ a ga-adị ka Shaịlo? Gịnịkwa mere i ji akwado na obodo a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke onye ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya?” Nʼoge ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gbara Jeremaya gburugburu nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
10 ユダの牧伯等この事をききて王の家をいでヱホバの室にのぼりてヱホバの家の新しき門の入口に坐せり
Mgbe ndịisi ọchịchị Juda nụrụ ihe ndị a na-eme, ha sitere nʼụlọeze bilie pụọ, jee nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Mgbe ha ruru nʼebe ahụ, ha weere ọnọdụ nʼọnụ ụzọ ama ọhụrụ nke dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
11 祭司と預言者等牧伯等とすべての民に訴ていふ此人は死にあたる者なり是は汝らが耳に聽しごとくこの邑にむかひて惡き預言をなしたるなり
Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị amụma gwara ndịisi ọchịchị ahụ okwu sị ha: “O kwesiri ka a maa nwoke a ikpe ọnwụ, nʼihi na o buru amụma megide obodo a. Unu onwe unu ji ntị unu nụrụ ihe o kwuru.”
12 是に於てヱレミヤ牧伯等とすべての民にいひけるはヱホバ我を遣し汝らが聽る諸の言をもて此宮とこの邑にむかひて預言せしめたまふ
Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndịisi ọchịchị ahụ na mmadụ niile nọ nʼebe ahụ okwu sị ha, “Ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ibu amụma megide ụlọnsọ a na obodo a. Okwu niile m kwuru, nke unu nụrụ, bụ ihe Onyenwe anyị ziri m ikwu.
13 故に汝らいま汝らの途と行爲をあらためて汝らの神ヱホバの聲にしたがへ然ばヱホバ汝らに災を降さんとせしことを悔たまふべし
Ma ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu zie ezi, ọ bụrụ na unu erube isi nye Onyenwe anyị Chineke unu, mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ o zubere na ọ ga-abịakwasị unu ghara ịbịakwasị unu.
14 みよ我は汝らの手にあり汝らの目に善とみゆるところ義とみゆることを我に行へ
Ma nʼebe mụ onwe m nọ, lee adị m unu nʼaka, jirinụ m mee ihe ọbụla ziri unu ezi nʼanya nke dịkwa mma nʼanya unu.
15 然ど汝ら善くこれを知れ汝らもし我を殺さば必ず無辜ものの血なんぢらの身とこの邑と其中に住る者に歸せんヱホバ我を遣してこの諸の言を汝らの耳につげしめたまひしなればなり
Ma ghọtakwanụ nke ọma, na ọ bụrụ na unu emee ka m nwụọ, unu ga-eweta ikpe ọmụma nke igbu onye aka ya dị ọcha nʼisi unu. Ikpe ọmụma ga-adịkwara obodo a na ndị bi nʼime ya, nʼihi na eziokwu, Onyenwe anyị zitere m ikwupụta na ntị unu okwu ndị a niile.”
16 牧伯等とすべての民すなはち祭司と預言者にいひけるは此人は死にあたる者にあらず是は我らの神ヱホバの名によりて我儕に語りしなりと
Mgbe ahụ, ndịisi ọchịchị na ndị mmadụ ahụ niile gwara ndị nchụaja na ndị amụma okwu sị ha, “O kwesighị ka a maa nwoke a ikpe ọnwụ nʼihi na ọ gwara anyị okwu site nʼaha Onyenwe anyị Chineke anyị.”
17 時にこの地の長老數人立て民のすべての集れる者につげていひけるは
Ụfọdụ nʼime ndị okenye nọ nʼebe ahụ pụtara nʼihu ọha mmadụ ahụ gwa ha okwu sị,
18 ユダの王ヒゼキヤの代にモレシテ人ミカ、ユダの民に預言して云けらく萬軍のヱホバかくいひ給ふシオンは田地のごとく耕されヱルサレムは邱墟となり此室の山は樹深き崇邱とならんと
“Maịka onye Moreshet buru amụma nʼoge Hezekaya, bụ eze Juda. Ọ gwara ndị Juda niile, sị ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “‘A ga-akọgharị Zayọn dịka ala ubi. Jerusalem ga-aghọ ebe e kpokọtara nkume na ngwongwo ụlọ dakpọrọ adakpọ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ ga-aghọ ebe dị elu nke oke ọhịa tochiri.’
19 ユダの王ヒゼキヤとすべてのユダ人は彼を殺さんとせしことありしやヒゼキヤ、ヱホバを畏れヱホバに求ければヱホバ彼らに降さんと告給ひし災を悔給ひしにあらずや我儕かく爲すは自己の靈魂をそこなふ大なる惡をなすなり
“Hezekaya bụ eze Juda, na ndị Juda niile, ha mere ya ka ọ nwụọ? Hezekaya ọ tụghị egwu Onyenwe anyị, rịọọ amara na ihuọma ya? Ọ bụ na Onyenwe anyị atụgharịghị uche, mee ka ihe ọjọọ o kwuru megide ya gharakwa imezu? Ma anyị na-achọ iwetara onwe anyị ihe ọjọọ nke oke mbibi.”
20 又前にヱホバの名をもて預言せし人あり即ちキリヤテヤリムのシマヤの子ウリヤなり彼ヱレミヤの凡ていへるごとく此邑とこの地にむかひて預言せり
(Ụraya nwa Shemaya, onye si Kiriat Jearim pụta, bụkwa onye ọzọ buru amụma site nʼaha Onyenwe anyị. Amụma o buru megide obodo a na ala a bụkwa ụdị amụma nke Jeremaya na-ebu.
21 ヱホヤキム王と其すべての勇士とすべての牧伯等その言を聽り是において王彼を殺さんと欲ひしがウリヤこれをきき懼てエジプトに逃ゆきしかば
Mgbe Jehoiakim bụ eze na ndịisi ọchịchị nụrụ amụma Ụraya na-ebu, ha gbalịrị ijide ya gbuo ya, ma Ụraya nụrụ ihe ha zubere ime. Ya mere, Ụraya nụrụ ya gbapụ ọsọ gbalaa Ijipt nʼihi egwu.
22 ヱホヤキム王人をエジプトに遣せり即ちアクボルの子エルナタンに數人をそへてエジプトにつかはしければ
Ma eze bụ Jehoiakim, zipụrụ Elnatan nwa Akboa na ụfọdụ ndị ikom ọzọ ka ha gaa Ijipt jide Ụraya.
23 彼らウリヤをエジプトより引出しヱホヤキム王の許に携きたりしに王劍をもて之を殺し其屍骸を賤者の墓に棄させたりと
Ha si nʼIjipt kpọlata Ụraya, duru ya gaa nʼihu Jehoiakim bụ eze, onye nyere iwu ka e jiri mma agha gbuo ya. A tụnyere ozu ya nʼebe a na-eli ndị mmadụ efu nʼala ahụ.)
24 時にシヤパンの子アヒカム、ヱレミヤをたすけこれを民の手にわたして殺さざらしむ
Ma otu ọ dị, Ahikam nwa Shefan, dịnyeere Jeremaya, nʼihi ya a raraghị Jeremaya nye nʼaka ndị mmadụ ka ha gbuo ya.

< エレミヤ書 26 >