< エレミヤ書 21 >

1 ゼデキヤ王マルキヤの子パシユルと祭司マアセヤの子ゼパニヤをヱレミヤに遣し
Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị, nke ruru Jeremaya ntị mgbe eze Zedekaya zigara Pashua nwa Malkija, na onye nchụaja bụ Zefanaya nwa Maaseia,
2 バビロンの王ネブカデネザル我らを攻むれば汝われらの爲にヱホバに求めよヱホバ恒のごとくそのもろもろの奇なる跡をもて我らを助けバビロンの王を我らより退かしめたまふことあらんと曰しむ其時ヱホバの言ヱレミヤに臨めり
sị, “Jụtara anyị ase site nʼaka Onyenwe anyị, nʼihi na Nebukadneza eze Babilọn na-ebuso anyị agha. Eleghị anya Onyenwe anyị ga-emere anyị ihe ịtụnanya dịka oge gara aga, nke ga-eme ka o si nʼebe anyị nọ wezuga onwe ya.”
3 ヱレミヤ彼らにこたへけるは汝らゼデキヤにかく語ふべし
Ma Jeremaya zara sị ha, “Gwanụ Zedekaya sị ya,
4 イスラエルの神ヱホバかくいひたまふ視よわれ汝らがこの邑の外にありて汝らを攻め圍むところのバビロン王およびカルデヤ人とたたかひて手に持ところのその武器をかへし之を邑のうちに聚めん
‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru: Lee ejikerela m ugbu a ichigharị ihe agha niile dị unu nʼaka, nke unu ji na-ebuso eze Babilọn na ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu agha, e, ejikerela m ichigharị ha megide unu. Aga m akpọbata ha nʼime obodo a.
5 われ手を伸べ臂をつよくし震怒と憤恨と烈き怒をもて汝らをせむべし
Mụ onwe m ga-eji aka e setịpụrụ nke ọma, na aka dị ike, nke iwe na ọnụma dị ukwuu, buo agha megide unu.
6 我また此邑にすめる人と畜を撃ん皆重き疫病によりて死べし
Aga m etida ndị niile bi nʼobodo a, ma mmadụ ma anụ ọhịa. Ha ga-anwụkwa site nʼoke ihe otiti, nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ha.
7 ヱホバいひたまふ此後われユダの王ゼデキヤとその諸臣および民此邑に疫病と劍と饑饉をまぬかれて遺れる者をバビロンの王ネブカデネザルの手と其敵の手および凡そその生命を索る者の手に付さんバビロンの王は劍の刃をもて彼らを撃ちかれらを惜まず顧みず恤れまざるべし
Mgbe nke a mesịrị, Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, aga m ewere Zedekaya eze Juda, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị niile bi nʼobodo a, ndị mma agha na ụnwụ na ihe otiti ndị a na-egbughị, nyefee ha nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, na nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọsi ndụ ha ike. Ọ ga-eji mma agha gbuo ha. Ọ gaghị emere ha ebere, ọ gaghị egosikwa ha ọmịiko.’
8 汝また此民にヱホバかくいふと語るべし視よわれ生命の道と死の道を汝らの前に置く
“Tinyere nke a, gwanụ ndị mmadụ niile, ‘na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Lee, ana m eche nʼihu unu ụzọ abụọ, ụzọ na-eduba na ndụ, na ụzọ na-eduba nʼọnwụ.
9 この邑にとどまる者は劍と饑饉と疫病に死べしされど汝らを攻め圍むところのカルデヤ人に出降る者はいきん其命はおのれの掠取物となるべし
Onye ọbụla nʼime unu nọgidere nʼobodo a ka mma agha, maọbụ ụnwụ, maọbụ ihe otiti ga-egbu. Ma onye ọbụla nʼime unu pụkwuru ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu, were onwe ya nyefee ha nʼaka, ga-adị ndụ; ọ ga-echebekwa ndụ ya.
10 ヱホバいひたまふ我この邑に面を向しは福をあたふる爲にあらず禍をあたへんが爲なりこの邑はバビロンの王の手に付されん彼火をもて之を焚くべし
Ekpebiela m imesi obodo a ike; o nweghị ihe ọma ọbụla ga-esi nʼaka m rute ha, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. A ga-enyefe obodo a nʼaka eze Babilọn, onye ga-eji ọkụ laa ya nʼiyi.’
11 またユダの王の家に告べし汝らヱホバの言をきけ
“Karịchasịa, gwa ndị ezinaụlọ eze Juda sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị.
12 ダビデの家よヱホバかくいふ汝朝ごとに義く鞫をなし物を奪はるる人をその暴逆者の手より救へ否ざれば汝らの行の惡によりて我怒火のごとくに發で燃て滅ざるべし
Unu ụlọ Devid, otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “‘Kpeenụ ikpe ziri ezi kwa ụtụtụ niile; napụtanụ ndị a na-emegbu emegbu site nʼaka ndị na-emegbu ha. Napụtakwanụ ndị a na-apụnara ihe ha nwere site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ndị a. Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu, dịka ọkụ nʼihi ajọ omume unu, ọ dịkwaghị onye pụrụ ime ka ọ kwụsị.
13 ヱホバいひたまふ谷と平原の磐とにすめる者よみよ我汝に敵す汝らは誰か降て我儕を攻んや誰かわれらの居處にいらんやといふ
Edoola m onwe m megide gị, Jerusalem, gị onye bi nʼebe dị elu karịa ndagwurugwu a, onye bi nʼebe dị elu nke dị larịị, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Gị onye na-asị “Onye pụrụ ibuso anyị agha? Onye kwa pụrụ ịbata nʼebe anyị e wusiri ike?”
14 我汝らをその行の果によりて罰せん又其林に火を起し其四周をことごとく焚つくすべしとヱホバいひたまふ
Aga m enye gị ahụhụ nke ruuru gị nʼihi ajọ omume gị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Aga m amụnye ọkụ nʼoke ọhịa gị niile, nke ga-erechapụ ihe niile dị gị gburugburu.’”

< エレミヤ書 21 >