< 伝道者の書 11 >

1 汝の糧食を水の上に投げよ 多くの日の後に汝ふたたび之を得ん
Gbasapụ aka gị nʼinye onyinye nʼihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-anata ụgwọ ọrụ gị.
2 汝一箇の分を七また八にわかて 其は汝如何なる災害の地にあらんかを知ざればなり
Kee akụ gị ụzọ asaa maọbụ ụzọ asatọ nʼihi na ị maghị ụdị ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị gị nʼobodo.
3 雲もし雨の充るあれば地に注ぐ また樹もし南か北に倒るるあればその樹は倒れたる處にあるべし
Mgbe eluigwe rujiri, mmiri ga-ezo; mgbe osisi dara, maọbụ nʼugwu maọbụ na ndịda, ebe ahụ ka ọ na-atọgbọ.
4 風を伺ふ者は種播ことを得ず 雲を望む者は刈ことを得ず
Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla, onye na-ele igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi.
5 汝は風の道の如何なるを知ず また孕める婦の胎にて骨の如何に生長つを知ず 斯汝は萬事を爲たまふ神の作爲を知ことなし
Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si aga maọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime, otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke, onye mere ihe niile.
6 汝朝に種を播け 夕にも手を歇るなかれ 其はその實る者は此なるか彼なるか又は二者ともに美なるや汝これを知ざればなり
Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ, esepụkwala aka nʼanyasị, nʼihi na ị maghị nke ga-eto, maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ, ha niile nwere ike too nke ọma.
7 夫光明は快き者なり 目に日を見るは樂し
Ìhè dị ụtọ, ọ na-amasịkwa anya ịhụ ìhè anyanwụ.
8 人多くの年生ながらへてその中凡て幸福なるもなほ幽暗の日を憶ふべきなり 其はその數も多かるべければなり 凡て來らんところの事は皆空なり
Ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ, ya ṅụrịa nʼime ihe niile, ma ya cheta ụbọchị ọchịchịrị ga-adị ọtụtụ. Ihe niile ndị na-abịa bụ ihe efu.
9 少者よ汝の少き時に快樂をなせ 汝の少き日に汝の心を悦ばしめ汝の心の道に歩み汝の目に見るところを爲せよ 但しその諸の行爲のために神汝を鞫きたまはんと知べし
Nwa okorobịa, ọ bụ ihe oke ọṅụ na ị bụ okorobịa. Ya mere, ka obi gị nye gị ọṅụ nʼụbọchị niile nke okorobịa gị. Mee ihe niile ị chọrọ ime; gbasookwa ihe niile nke anya gị na-ahụ. Kama, ghọtakwa nke a, na ị ghaghị ịza ajụjụ nʼihu Chineke nʼihi ihe niile i mere.
10 然ば汝の心より憂を去り 汝の身より惡き者を除け 少き時と壯なる時はともに空なればなり
Ya mere, wezuga nchegbu site nʼobi, wezugakwa nsogbu nke ahụ gị, nʼihi na okorobịa na ịdị ike bụ ihe efu.

< 伝道者の書 11 >