< サムエル記Ⅱ 1 >

1 サウルの死し後ダビデ、アマレク人を撃てかへりチクラグに二日とどまりけるが
Mgbe Sọl nwụsịrị, Devid si ebe ọ gara tigbuo ndị Amalek lọghachi. Devid nọrọ ụbọchị abụọ na Ziklag.
2 第三日に及びて一個の人其衣を裂き頭に土をかむりて陣營より即ちサウルの所より來りダビデの許にいたり地にふして拝せり
O ruo, nʼụbọchị nke atọ, otu nwoke si nʼọmụma ụlọ ikwu Sọl bịakwutere ya. Uwe nwoke a yi nʼahụ dọwara adọwa. Isi ya dịkwa aja aja. Ọ batara daa nʼala nʼihu Devid nʼọnọdụ inye ya nsọpụrụ.
3 ダビデかれにいひけるは汝いづくより來れるやかれダビデにいひけるはイスラエルの陣營より逃れきたれり
Devid jụrụ ya sị, “Ebee ka i si bịa?” Nwoke ahụ zara sị, “Esi m nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel gbapụta.”
4 ダビデかれにいひけるは事いかん請ふ我につげよかれこたへけるは民戰に敗れて逃げ民おほく仆れて死りまたサウルと其子ヨナタンも死り
Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere? Biko gwa m.” Nwoke ahụ zara sị, “Ndị agha Izrel niile agbaala ọsọ. Ọtụtụ nʼime ndị agha Izrel anwụọkwala. Sọl na Jonatan nwa ya nwụkwara!”
5 ダビデ其おのれにつぐる少者にいひけるは汝いかにしてサウルと其子ヨナタンの死たるをしるや
Devid jụrụ ya sị, “Olee otu i si mata na Sọl na Jonatan anwụọla?”
6 ダビデにつぐる少者いひけるは我はからずもギルボア山にのぼり見しにサウル其槍に倚かかりをりて戰車と騎兵かれにせめよらんとせり
Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Ọ dapụtara na m nọ nʼugwu Gilboa hụ Sọl mgbe ọ dabeere nʼùbe ya. Mgbe ahụ ụgbọ agha ndị iro na ndị na-agba ịnyịnya agha na-esosi ya ike.
7 彼うしろにふりむきて我を見我をよびたれば我こたへて我ここにありといふ
Mgbe ọ hụrụ m, ọ kpọrọ m ka m bịakwute ya. Azara m ya sị, ‘Gịnị ka m nwere ike ime?’
8 かれ我に汝は誰なるやといひければ我かれにこたへて我はアマレク人なりといふ
“Ọ jụrụ m sị, ‘Ị bụ onye?’ “Azara m ya sị, ‘Abụ m onye Amalek.’
9 かれまた我にいひけるはわが身いたく攣ば請ふ我うへにのりて我をころせわが生命なほわれの中にまつたければなりと
“Ọ sị m, ‘Biko, bịa guzo nʼakụkụ m ka ị gbuo m, nʼihi na ọ bụ ezie na m dị ndụ, ma anọ m nnọọ nʼoke ihe mgbu nke ọnwụ.’
10 我すなはちかれの上にのりてかれを殺したり其は我かれが旣に仆て生ることをえざるをしりたればなりしかして我その首にありし冕とその腕にありし釧を取りてこれをわが主に携へきたれり
“Ya mere, eguzoro m nʼakụkụ ya, gbuo ya, nʼihi na amaara m na ọ gaghị adị ndụ tee anya. Ọ bụkwa mgbe m gbusịrị ya ka m kpupụrụ ya okpueze dị ya nʼisi, gbapụtakwa ya mgbaaka dị nʼogwe aka ya, chịrị ha, ka m chịtara gị ha, onyenwe m.”
11 是においてダビデおのれの衣を執てこれを裂けりまた彼とともにある者も皆しかせり
Mgbe Devid na ndị ikom ya nụrụ ihe ndị a. Ha dọwara uwe ha.
12 彼等サウルのためまた其子ヨナタンのためまたヱホバの民のためイスラエルの家のために哭きかなしみて晩まで食を斷り其は彼ら劍にたふれたればなり
Ha ruru ụjụ. Kwaa akwa. Bukwaa ọnụ ruo oge anyasị nʼihi Sọl na Jonatan nwa ya nwoke, na nʼihi ndị agha Onyenwe anyị na ụlọ Izrel. Nʼihi na ha dara site na mma agha.
13 ダビデおのれに告し少者にいひけるは汝は何處の者なるやかれこたへけるは我は他國の人すなはちアマレク人なりと
Mgbe ahụ, Devid jụrụ nwokorobịa ahụ wetara ozi ahụ ajụjụ sị, “Olee ebe i si bịa?” Ọ zara sị ya, “Abụ m onye ọbịa, onye Amalek.”
14 ダビデかれにいひけるは汝なんぞ手をのばしてヱホバの膏そそぎし者をころすことを畏ざりしやと
Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji setịpụ aka gị, na-atụghị ụjọ, tigbuo onye Onyenwe anyị tere mmanụ?”
15 ダビデ一人の少者をよびていひけるは近よりてかれをころせとすなはちかれをうちければ死り
Devid kpọrọ otu nʼime ndị ikom ya sị ya, “Gbuo ya!” Nwoke ahụ weere mma agha gbuo ya.
16 ダビデかれにいひけるは汝の血は汝の首に歸せよ其は汝口づから我ヱホバのあぶらそそぎし者をころせりといひて己にむかひて證をたつればなり
Mgbe ahụ Devid sịrị ya, “Ọbara gị laa gị nʼisi, nʼihi na ị ji ọnụ gị kwupụta sị, ‘Egburu m onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’”
17 ダビデ悲歌をもてサウルと其子ヨナタンを吊ふ
Emesịa, Devid depụtara abụ akwa a nʼihi Sọl na Jonatan.
18 ダビデ命じてこれをユダの族にをしへしむ即ち弓の歌是なり是はヤシル書に記さる
O nyere iwu ka akụziere ndị Juda, abụ ùta a. E dere ya nʼime akwụkwọ Jesha.
19 イスラエルよ汝の榮耀は汝の崇邱に殺さる嗚呼勇士は仆れたるかな
“Ebube gị, gị Izrel, abụrụla ihe e gburu nʼebe gị niile dị elu. Lee ka ndị bụ dike si daa!
20 此事をガテに告るなかれアシケロンの邑に傳るなかれ恐くはペリシテ人の女等喜ばん恐くは割禮を受ざる者の女等樂み祝はん
“Ekwutela ya na Gat. Ekwusala ya nʼokporoụzọ Ashkelọn. Ka ada ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ. Ka ụmụ inyom ndị a na-ebighị ugwu ghara iti mkpu ọṅụ.
21 ギルボアの山よ願は汝の上に雨露降ることあらざれ亦供物の田園もあらざれ其は彼處に勇士の干棄らるればなり即ちサウルの干膏を沃がずして彼處に棄らる
“Unu ugwu Gilboa, ka igirigi maọbụ mmiri ozuzo ghara ịbịakwasị unu. Ka mmiri ozuzo gharakwa izokwasị nʼaja mbuli elu unu. Nʼihi na nʼelu unu ka a nọ merụọ ọta ndị dị ike. E, ọta Sọl, nke a na-adịghị etekwa mmanụ.
22 殺せし者の血をのまずしてヨナタンの弓は退かず勇士の脂を食ずしてサウルの劍は空く歸らず
“Site nʼọbara ndị e gburu egbu, site nʼanụ ahụ ndị dị ike. Ụta Jonatan alọghachighị azụ. Mma agha Sọl agbaghịkwa aka lọghachi.
23 サウルとヨナタンは愛らしく樂げにして生死ともに離れず二人は鷲よりも捷く獅子よりも強かりき
Sọl na Jonatan, na ndụ ha bụ ndị a hụrụ nʼanya. Ndị jupụtara nʼamara. Ma nʼọnwụ, nkewa ọbụla adịghị nʼetiti ha. Ha dị gara gara karịa ugo. Ha dị ike karịa ọdụm.
24 イスラエルの女等よサウルのために哀けサウルは絳き衣をもて汝等を華麗に粧ひ金の飾を汝等の衣に着たり
“Ụmụada Izrel, kwaaranụ Sọl akwa. Onye na-eji uwe uhie uhie chọọ unu mma. Onye ji uwe na ihe ịchọ mma ọlaedo chọọ unu mma.
25 嗚呼勇士は戰の中に仆たるかなヨナタン汝の崇邱に殺されぬ
“Lee ka ndị dị ike si daa nʼetiti ọgbọ agha. E gbuola Jonatan nʼelu ugwu;
26 兄弟ヨナタンよ我汝のために悲慟む汝は大に我に樂き者なりき汝の我をいつくしめる愛は尋常ならず婦の愛にも勝りたり
ana m eruru gị ụjụ, gị Jonatan, nwanne m nʼihi na ihe dị oke ọnụahịa ka ị bụụrụ m. Ịhụnanya i nwere nʼebe m nọ dị omimi karịa ịhụnanya ndị nwanyị.
27 嗚呼勇士は仆たるかな戰の具は失たるかな
“Lee ka ndị dị ike si daa! Ngwa agha niile abụrụla ihe lara nʼiyi!”

< サムエル記Ⅱ 1 >